Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-egosi na Obi Tara Chineke Mmiri?

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha—Hà Na-egosi na Obi Tara Chineke Mmiri?

IHE ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU: “Ọ bụ Chineke na-achị ụwa, n’ihi ya, ọ bụ ya na-akpata ọdachi ndị na-eme n’ụwa. Nke a na-egosi na obi tara ya mmiri.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ònye bụ “ajọ onye ahụ”? Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan. (Matiu 13:19; Mak 4:15) Ihe a Baịbụl kwuru ò siri ike nghọta? Chegodị echiche: Ọ bụrụ na ụwa dị n’aka Setan, ihe ọ pụtara bụ na ọ na-eme ka ụmụ mmadụ dị ka ya, ya bụ, ka ha dịrị anyaukwu ma na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ọ na-emekwa ka ndị mmadụ ghara ịchọ ịma nsogbu ihe ndị ha na-eme ga-akpatara ha na ndị ọzọ. Ọ̀ bụ na nke a anaghị eme ka anyị ghọta ihe mere ụmụ mmadụ ji na-emebisị ụwa a ha bi na ya? Ndị ọkachamara kwuru na o nwere ike ịbụ otú a ndị mmadụ si na-emebisị ụwa na-akpata ọdachi ndị na-emere onwe ha ma ọ bụ na-eme ka ọdachi ndị ahụ na-aka njọ, ma ọ bụkwanụ na-asụkwu ndị mmadụ akwụ ma ha mee.

Gịnịzi mere Chineke ji hapụ Satan ka ọ na-eduhie ụmụ mmadụ? Anyị ga-amata azịza nke ajụjụ a ma ọ bụrụ na anyị echeta ihe mere obere oge e kechara mmadụ. N’oge ahụ, nne na nna anyị mbụ jụrụ ọchịchị Chineke. Kemgbe ahụ, ọtụtụ ụmụ mmadụ emeekwala otu ihe ahụ. Ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ achọghị ka Chineke chịwa ha, ihe ọ pụtara bụ na ha họọrọ ka Setan, bụ́ onyeiro Chineke, na-achị ha. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kpọọ Setan “onye na-achị ụwa.” (Jọn 14:30) Ma Setan ọ̀ ga-achị ruo mgbe ebighị ebi? Mba.

Nke a apụtaghị na ahụhụ Setan na-akpatara anyị anaghị emetụ Jehova * n’obi. N’eziokwu, ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata na-ewute Chineke. Dị ka ihe atụ, lekwa ihe Baịbụl kwuru n’oge ụmụ Izrel na-ata ahụhụ. Ọ sịrị na “n’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” (Aịzaya 63:9) Ebe Chineke bụ Chineke obi ebere, o kpebiela na ọchịchị Setan ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. O meekwala Ọkpara ya Jizọs Kraịst, bụ́ onye ezi omume nke dịkwa obiọma, eze ka ọ chịa ruo mgbe ebighị ebi.

OTÚ IHE A BAỊBỤL KWURU SI GBASA GỊ: N’agbanyeghị n’ọchịchị Setan enwebeghị ike ime ka ọdachi ndị na-emere onwe ha ghara ịkpatara ụmụ mmadụ nsogbu, ọchịchị Jizọs ga-eme ka ọdachi ndị na-emere onwe ha kwụsị. O nwere mgbe Jizọs mere ka oké ifufe nke fere n’oké osimiri ghara imerụ ndị na-eso ụzọ ya ahụ́. Baịbụl kwuru, sị: ‘O wee bilie baara ifufe ahụ mba, sịkwa oké osimiri ahụ: ‘Shịị! Daa jụụ!’ Ifufe ahụ wee kwụsị, ebe niile wee daa jụụ.” Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe merenụ, ha sịrị: “Ònye n’ezie ka onye a bụ, n’ihi na ọbụna ifufe na oké osimiri na-erubere ya isi?” (Mak 4:37-41) Ihe ahụ Jizọs mere na-eme ka obi sie anyị ike na mgbe ọ ga-achịwa ụwa, ọ ga-echebe ndị niile na-erubere Chineke isi.—Daniel 7:13, 14.

^ para. 5 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.