Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AKỤKỌ NDỤ

Ihe Mere Ndụ Anyị Ji Nwee Isi

Ihe Mere Ndụ Anyị Ji Nwee Isi

MGBE m mụrụ nwa m nwoke aha ya bụ Gary n’afọ 1958, obi m gwara m na ahụ́ adịchaghị ya. Ma, o were ndị dọkịta ọnwa iri tupu ha achọpụta ihe na-arịa ya. O wekwara ndị ọkachamara nọ n’ụlọ ọgwụ dị na Lọndọn afọ ise tupu ha achọpụta na ọ bụ ihe ahụ ndị dọkịta mbụ ahụ chọpụtara ka ọ na-arịa n’eziokwu. Mgbe Gary dị afọ itoolu, amụrụ m nwa ọzọ. Ọ bụ nwa nwaanyị. Aha ya bụ Louise. Obi gbawara m mgbe a chọpụtara na ọrịa nke ya kadị nke nwa m nwoke njọ.

Ndị dọkịta weturu obi gwa m na ụmụ m abụọ ahụ na-arịa ọrịa si ha n’ọbara nakwa na ọrịa ha enweghị ngwọta. * N’oge ahụ, ndị mmadụ amachaghị banyere ọrịa a. E nwere ọtutụ ihe e ji ama onye na-arịa ụdị ọrịa a. Ụfọdụ n’ime ha bụ na onye ahụ nwere ike ghara ịna-ahụ ụzọ, nwee ihe karịrị mkpịsị aka ise, na-arịa ọrịa shuga, na-arịa ogbu na nkwonkwo, ma ọ bụ na-arịa ọrịa akụrụ. N’ihi ya, ilekọta ha abụọ ga-esiri m ezigbo ike. Nchọpụta e mere n’oge na-adịbeghị anya gosiri na ọtụtụ ndị na Briten anaghị arịa ọrịa a, ma e nwere mmadụ ole na ole na-arịatụ ya.

JEHOVA BỤỤRỤ ANYỊ “EBE DỊ ELU E WUSIRI IKE”

Obere oge m lụchara di, otu nwaanyị Onyeàmà Jehova ziri m ozi ọma. Aghọtara m ozugbo ahụ na ihe ha na-akụzi bụ eziokwu. Ma, di m enweghị mmasị n’ihe ha na-akụzi. Enweghị m ike ịga ọmụmụ ihe n’ihi na ọrụ di m na-arụ mere ka anyị ghara ịna-ebite otu ebe aka. Ma, m nọ na-agụ Baịbụl, na-ekpegakwara Jehova ekpere. Ihe m gụtara n’Abụ Ọma 9:9, 10 kasiri m nnọọ obi. Ebe ahụ kwuru, sị: “Jehova ga-abụrụ onye ọ bụla e gburu mmụọ ya ebe dị elu e wusiri ike, ebe dị elu e wusiri ike n’oge ahụhụ.” O kwukwara na ‘Jehova agaghị ahapụ ndị na-achọ ya.’

Gary nwa m nwoke anaghị ahụcha ụzọ. N’ihi ya, mgbe ọ dị afọ isii, a kpọgara ya n’ụlọ akwụkwọ ebe a na-azụ ndị nwere ụdị nsogbu ahụ n’Ingland. O bi ebi n’ụlọ akwụkwọ ahụ. Ọ na-akpọkarị m n’ekwentị ma e nwee ihe na-enye ya nsogbu n’obi, m nyekwaara ya aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru anyị kwesịrị ịna-eme. Ka m mụchara Louise, afọ ole na ole agaa, m malitere ịrịa ọrịa akwara na ọrịa na-akụrisị ahụ́. Mgbe Gary dị afọ iri na isii, ọ lọtara n’ụlọ. Ma ka oge na-aga, nsogbu anya ya kakwuru njọ. N’ihi ya, n’afọ 1975, e denyere aha ya ná ndị kpuru ìsì n’obodo anyị. N’afọ 1977, di m hapụrụ anyị.

Obere oge ka Gary lọtachara, anyị malitere ịga ọmụmụ ihe. Ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ hụrụ anyị n’anya. E mere m baptizim n’afọ 1974. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe otu okenye nyeere Gary aka ịmata otú ọ ga-esi na-edi nsogbu ndị ọ na-enwe mgbe ọ na-eto eto. Ụmụnna ndị ọzọ na-enyekwara m aka arụ ọrụ n’ụlọ m. Ndị gọọmenti mechara kwụwa ụmụnna ise na-elekọta anyị ụgwọ. Ihe a niile bụ ihe ọma Jehova meere anyị.

Gary nọ na-eme nke ọma n’ọgbakọ. N’ihi ya, e mere ya baptizim n’afọ 1982. Ọ chọsiri ike ịsụ ụzọ inyeaka. N’ihi ya, m kpebiri iso ya sụọ ụzọ, anyị sụkwara ụzọ ruo afọ ole na ole. Ka obere oge gafere, onye nlekọta sekit anyị jụrụ Gary ma ọ̀ ga-achọ ịbụ onye ọsụ ụzọ oge niile. Obi tọrọ Gary  ezigbo ụtọ, o kpebikwara ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. N’afọ 1990, Gary malitere ịsụ ụzọ oge niile.

A gbanweela ọkpụkpụ úkwù Gary ugboro abụọ. Otu bụ n’afọ 1999, ọzọ abụrụ n’afọ 2008. Ma, nsogbu Louise kacha njọ. O kpuru ìsì mgbe m mụrụ ya. Mgbe m hụrụ na o nwere mkpịsị ụkwụ isii n’otu ụkwụ ya, m matara na o butere otu ọrịa ahụ nwanne ya na-arịa. Mgbe e lere ya ahụ́, a chọpụtakwuru na ọtụtụ ihe n’ime ahụ́ ya anaghị arụ ọrụ otú ha kwesịrị. Kemgbe ọtụtụ afọ, a waala ya ahụ́ ọtụtụ ugboro. A waala akụrụ ya ugboro ise. Ya na Gary na-arịa ọrịa shuga.

Ebe Louise ma na nsogbu nwere ike ịpụta mgbe ọ bụla a chọrọ ịwa ya ahụ́, ọ na-ebu ụzọ agwa ma ndị dọkịta ma ndị niile ga-elekọta ya n’ụlọ ọgwụ ihe mere na ya agaghị achọ ka a mịnye ya ọbara. N’ihi ya, ya na ndị niile na-elekọta ya na-adị ná mma.

NDỤ ANYỊ ENWEELA ISI

E nwere ọtụtụ ihe gbasara ofufe Jehova anyị na-eme n’ụlọ anyị. Tupu ngwá ọgbara ọhụrụ ndị dị ka kọmputa apụta, m na-eji ọtụtụ awa agụrụ Gary na Louise Baịbụl na akwụkwọ anyị ndị ọzọ. Ma ugbu a, anyị na-akpọ siidi, diiviidi na ihe ndị anyị si n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet nweta ma anyị kwadowe ọmụmụ ihe kwa izu. O meekwala ka anyị nwee ike ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka eziokwu magburu onwe ya ndị dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl

Mgbe ụfọdụ, Gary na-ebu ihe ọ ga-aza n’ọmụmụ ihe n’isi. Mgbe ọ bụla o nwere ihe omume n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ọ na-eme ya n’agụpụtaghị ihe ọ na-ekwu agụpụta. N’afọ 1995, a họpụtara ya ka ọ bụrụ ohu na-eje ozi. Ọ na-arụsikwa ọrụ ike n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, na-enyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ aka, sorokwa ná ndị na-apị aka n’ígwè.

Ebe ọ bụ na Gary na-arịa ọrịa ogbu na nkwonkwo, ụmụnna ndị na-eso ya aga ozi ọma na-akwara ya ígwè ndị ngwọrọ ya. Otu nwanna enyerela ya aka ịmụrụ otu onye nwere mmasị Baịbụl. Gary gbakwara otu nwanna nwaanyị kwụsịrị ịbịa ọmụmụ ihe kemgbe iri afọ abụọ na ise ume ka ọ bịawa ọmụmụ ihe. Ma onye ahụ nwere mmasị ma nwanna nwaanyị ahụ na-abịazi ọmụmụ ihe.

Mgbe Louise dị afọ itoolu, mama m kụziiri ya otú e si eji owu akpa ihe. Mụ na onye ọzọ na-elekọta ya kụzikwaara ya otú e si akpa ihe n’ákwà. Ịkpa ihe na-atọ ya ụtọ. N’ihi ya, ọ na-akpara ụmụ a mụrụ ọhụrụ na ndị agadi nọ n’ọgbakọ anyị blanket ndị mara mma. Ọ na-arụkwa kaadị, nyado ihe osise na ha, zigara ha ndị mmadụ. Ndị ọ na-ezigara kaadị ndị ahụ adịghị eji ha egwu egwu. Louise mụtara ịpị taịpraịta mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na atọ. Ugbu a, ọ na-eji ụdị kọmputa na-ekwu okwu ezigara ndị enyi ya ozi, ha ana-ezitekwara ya. E mere Louise baptizim mgbe ọ dị afọ iri na asaa. Anyị na-asụkwa ụzọ inyeaka mgbe ọ bụla e nwere mkpọsa pụrụ iche. Louise na-ebukwa amaokwu Baịbụl n’isi otú Gary si ebu. Ihe mere o ji ebu ha n’isi bụ ka o nwee ike ịgwa ndị ọzọ gbasara nkwa Chineke kwere na “a ga-emeghe anya ndị ìsì,” nakwa na oge ga-eru mgbe ‘onye bi n’ụwa na-agaghị asị: “Ana m arịa ọrịa.”’—Aịza. 33:24; 35:5.

Obi dị anyị ezigbo ụtọ maka eziokwu magburu onwe ya ndị dị n’Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Anyị jikwa obi anyị niile na-ekele ụmụnna anyị ndị na-akwado anyị, n’ihi na anyị agaghị enwe ike ime ọtụtụ ihe ma e wezụga ha. Ma karịchaa, anyị na-ekele Jehova n’ihi na o nyere aka mee ka ndụ anyị nwee isi.

^ para. 5 Ihe a na-akpọ ọrịa e kwuru okwu ya ebe a bụ ọrịa Laurence-Moon-Bardet-Biedl. E si n’aha ndị dọkịta anọ chọpụtara ọrịa a nweta aha ya. Onye na-arịa ọrịa a na-esi n’ọbara nne na nna ya ebute ya. Ihe a na-akpọkarị ya taa bụ ọrịa Bardet-Biedl. Ọrịa a enweghị ngwọta.