Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 KỤZIERE ỤMỤ GỊ IHE

Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Akụkọ Otu Onye Omekome?

Gịnị Ka Anyị Nwere Ike Ịmụta n’Akụkọ Otu Onye Omekome?

Onye omekome anyị nwere ike ịmụta ihe n’akụkọ ya bụ onye a ị na-ahụ Jizọs na-agwa okwu. Ihe ọjọọ onye omekome a mere wutere ya. Ọ bụ ya mere o ji rịọ Jizọs, sị: “Cheta m mgbe ị banyere n’alaeze gị.” Na foto a ị na-ahụ, Jizọs na-agwa onye omekome ahụ okwu. Ị̀ ma ihe Jizọs na-agwa ya? * Jizọs na-ekwe ya nkwa. Ọ sịrị ya: “N’ezie, ana m asị gị taa, Mụ na gị ga-anọ na Paradaịs.”

Olee otú i chere paradaịs ahụ ga-adị?— Ka anyị leba anya n’otú paradaịs ahụ Chineke kere ma mee ka Adam na Iv biri na ya dị. Ọ ga-enyere anyị aka ịmata otú paradaịs ahụ Jizọs kwuru okwu ya ga-adị? Olee ebe paradaịs ahụ Adam na Iv biri na ya dị? Ọ̀ bụ n’eluigwe ka ọ̀ bụ n’ụwa?

Ị zatara ya ma i kwuo na ọ bụ n’ụwa. Mgbe ọ bụla anyị kwuru na onye omekome ahụ ga-anọ “na paradaịs,” ihe anyị na-ekwu bụ na ọ ga-ebi n’ụwa a mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Olee otú paradaịs ahụ ga-adị?— Ka anyị hụ.

Mgbe Jehova Chineke kechara Adam na Iv, Baịbụl kwuru na Chineke mere ka ha biri na paradaịs n’ụwa ebe a. A kpọrọ ebe ahụ ha bi ‘ubi Iden.’ Olee otú i chere ‘ubi Iden’ ahụ maruru ná mma?— Ọ mara ezigbo mma. O nweghị ebe mara mma ka ya n’ụwa taa.

Ì chere na Jizọs ga-abịa n’ụwa ka ya na onye omekome ahụ nọrọ?— Mba. Jizọs ga-anọ n’eluigwe na-achị ụwa mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Otú Jizọs na onye omekome ahụ ga-esi nọrọ na paradaịs bụ na Jizọs ga-akpọlite ya n’ọnwụ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs ma na-elekọta ya. Ma gịnị mere Jizọs ga-eji ekwe ka onye omekome ahụ biri na paradaịs?— Ka anyị kwuo ihe mere ya.

 N’eziokwu, onye omekome ahụ mere ihe ndị jọgburu onwe ha. Ọtụtụ ijeri mmadụ ndị birila n’ụwa mekwara ihe ọjọọ ka nwoke ahụ. Ma ihe mere ọtụtụ n’ime ha ji mee ihe ọjọọ bụ na o nweghị onye kụziiri ha banyere Jehova na ihe ndị Jehova chọrọ ka ha na-eme.

Ọ bụ ya mere a ga-eji kpọlite onye omekome ahụ n’ọnwụ, kpọlitekwa ndị ajọ omume dị ka ya mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. Mgbe ahụ, a ga-akụziri ha uche Chineke. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha ga-egosi ma hà hụrụ Jehova n’anya.

Ị̀ ma otú ha ga-esi egosi ma hà hụrụ Chineke n’anya?— Ha ga-egosi na ha hụrụ Chineke n’anya ma ọ bụrụ na ha emee ihe Chineke chọrọ. Ibi na paradaịs mgbe ahụ ga-atọ anyị ụtọ. Ihe mere ọ ga-eji atọ anyị ụtọ bụ na ọ bụ naanị ndị hụrụ Jehova n’anya na ndị hụrụ mmadụ ibe ha n’anya ka anyị na ha ga-ebi mgbe niile.

Gụọ ebe ndị a na Baịbụl gị

^ para. 3 Ọ bụrụ nwatakịrị ka ị na-agụrụ akụkọ a, akara ùhiè ndị dị n’isiokwu a na-echetara gị ka ị kwụsịtụ gbaa ya ume ka ọ zaa ajụjụ ndị ahụ.