Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jehova ‘Na-eburu M Ibu M Kwa Ụbọchị’

Jehova ‘Na-eburu M Ibu M Kwa Ụbọchị’

N’agbanyeghị na m na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche m chere na mụ agaghị edili, Nna m nke eluigwe na-enyere m aka kemgbe a mụrụ m. Kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ, obi dị m ezigbo ụtọ na m bụ ọsụ ụzọ.

A mụrụ m n’afọ 1956. Mgbe a mụrụ m, a chọpụtara na e nwere oghere n’ọkpụkpụ azụ m. O meziri ka ịga ije na-ara m ahụ́, meekwa ka m na-arịa ọrịa ndị ọzọ.

Tupu a mụọ m, ndị ozi ala ọzọ bụ́ Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ papa m na mama m Baịbụl. Mgbe m bụ nwata, e nwere naanị ndị nkwusa ole na ole n’obodo anyị bụ́ Usakos, dị na Namibia. E nwebeghị ọgbakọ n’ebe ahụ mgbe ahụ. N’ihi ya, anyị na-atụle ihe ndị e kwesịrị ịmụ n’ọmụmụ ihe ọgbakọ n’ezinụlọ anyị. Mgbe m dị afọ asaa, a wara m ahụ́ tinye ebe m ga-esi na-anyụ mamịrị. Mgbe m dị afọ iri na anọ, arịawara m akwụkwụ. Agarughị m ụlọ akwụkwọ sekọndịrị n’isi n’ihi na ọ dị anya n’ebe anyị bi. Ihe ọzọ kpatara ya bụ na mama m na papa m kwesịrị ịna-elekọta m mgbe niile.

Ma, m kpebiri na m ga-eme ka mụ na Jehova dịkwuo ná mma. Asụsụ anyị bụ Afrịkans. Ma, ọtụtụ akwụkwọ anyị adịbeghị n’asụsụ anyị mgbe ahụ. N’ihi ya, m mụrụ otú e si agụ Bekee ka m nwee ike ịna-agụ ọtụtụ akwụkwọ a na-ebipụtara anyị. Aghọrọ m onye nkwusa, e meekwa m baptizim mgbe m dị afọ iri na itoolu. Malite mgbe ahụ ruo afọ anọ ọzọ, arịara m ụdị ọrịa dị iche iche. Obi anaghịkwa adị m mma. Ihe ọzọ bụ na egwu mmadụ mere ka m ghara ịna-agachi ozi ọma anya n’obodo anyị, n’ihi na mmadụ niile na-emekọ ihe ọnụ ka ụmụnne.

Mgbe m dị ihe dị ka iri afọ abụọ na atọ, anyị si Namibịa kwaga Saụt Afrịka. Ebe ahụ bụ ebe mbụ m so ọgbakọ mụọ ihe. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ mgbe ahụ. Ma, e mechara waa m ahụ́ ọzọ tinye ebe m ga-esi na-anyụ nsị.

N’oge na-adịghị anya, egere m okwu otu onye nlekọta sekit kwuru gbasara ịsụ ụzọ. Ihe o kwuru ruru m n’obi. M ma na ọrịa m na-arịa ga-eme ka ịsụ ụzọ siere m ike, ma echetara m otú Jehova si na-enyere m aka n’ọtụtụ nsogbu ndị bịaara m. Etinyere m akwụkwọ ka m bụrụ ọsụ ụzọ oge niile. Ma, ndị okenye ekweghị abịanye aka n’akwụkwọ ahụ n’ihi ọrịa m na-arịa.

Ma, ekpebiri m iji ike m niile na-ekwusa ozi ọma. N’ihi otú mama m na ụmụnna ndị ọzọ si nyere m aka, ejisiri m ike nye awa ole ndị ọsụ ụzọ na-enye. M nyere awa ole ahụ ruo ọnwa isii. Ihe ahụ m mere gosiri na m kpebisiri ike ịsụ ụzọ oge niile, gosikwa na m ga-asụli ụzọ n’agbanyeghị ọrịa m na-arịa. N’ihi ya, mgbe m tinyere akwụkwọ ọzọ, ndị okenye bịanyere aka na ya. Aghọrọ m ọsụ ụzọ oge niile n’abalị mbụ n’ọnwa Septemba, n’afọ 1988.

Kemgbe m na-asụ ụzọ, Jehova ahapụbeghị m. Kama ịnọ na-echegbu onwe m maka ọrịa m na-arịa, eji m oge m na-akụziri ndị ọzọ eziokwu dị na Baịbụl. O meela ka obi na-adị m mma, mee ka m mụta ọtụtụ ihe, meekwa ka mụ na Chineke dịkwuo ná mma. Obi dị m ụtọ na enyerela m ọtụtụ ndị aka, ha enyefee Jehova onwe ha, e meekwa ha baptizim.

Mụ na ọrịa ka na-alụ. Ma, Jehova ‘na-eburu m ibu m kwa ụbọchị.’ (Ọma 68:19) Ọ bụghị naanị na ọ na-eme ka m na-edi nsogbu ndị na-abịara m, ọ na-emekwa ka obi na-adị m ụtọ na m dị ndụ.