Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A: GỊNỊ MERE NDỊ MMADỤ JI ATAGBU ONWE HA N’AHỤHỤ? OLEE MGBE Ọ GA-EBI?

Ọtụtụ Ndị Ọ Na-enweghị Ihe Ha Mere Na-anwụ Ọnwụ Ike

Ọtụtụ Ndị Ọ Na-enweghị Ihe Ha Mere Na-anwụ Ọnwụ Ike

N’abalị ise n’ọnwa Eprel afọ 2013, otu nnukwu bọs bu ndị mmadụ na otu ụgbọala bu mmanụ ụgbọala nwere ihe mberede n’okporo ụzọ awara awara si Binin gaa Ore na Naịjirịa. Ọkụ malitere ịgba ozugbo. Ọ gbagburu ihe dị ka mmadụ iri atọ nọ na bọs ahụ. O nwekwara ụmụaka abụọ nọ n’otu ebe a na-edozi ụgbọala ọkụ ahụ gbagburu.

N’abalị iri na anọ n’ọnwa Disemba afọ 2012, a gbagburu ụmụ akwụkwọ iri abụọ ndị na-akarịbeghị afọ asaa n’ụlọ akwụkwọ dị na Kọnetikọt ná mba Amerịka. Ha so na mmadụ iri abụọ na isii a gbagburu n’ụbọchị ahụ. Mgbe a na-ekwu okwu olili ozu ha, onyeisi ala mba Amerịka bụ́ Obama gụpụtara aha ụmụaka ahụ. Aha ụfọdụ n’ime ha bụ Charlotte, Daniel, Olivia, na Josephine. Ọ gwara ndị bịara ịnụrụ okwu olili ozu ụmụaka ahụ, sị: “Nsogbu a ga-akwụsịrịrị.”

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Bano na ndị ezinụlọ ya si mba Ịrak kwaga Nọọwee n’afọ 1996. Ma n’abalị iri abụọ na abụọ n’ọnwa Julaị afọ 2011, Bano nwụrụ ọnwụ ike. O so na mmadụ iri asaa na asaa otu onye na-agba ọchịchị mgba okpuru gburu n’ike. Onye ahụ gburu ha turu ọnụ, sị: “O wutere m na . . . ọ bụ naanị mmadụ ole a ka m gburu.”

A na-anụ ụdị akụkọ ọjọọ a n’ebe niile n’ụwa. Ihe mberede, mpụ, agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, na nsogbu ndị ọzọ akpatarala ọtụtụ ndị obi mgbawa. Ọtụtụ ndị ọ na-enweghị ihe ha mere atagbuola onwe ha n’ahụhụ ma nwụọ n’ihi nsogbu ndị a.

Ọtụtụ ndị na-asị na ọ bụ Chineke na-akpata ihe ọjọọ niile ahụ na-emenụ. Ha chere na Onye kere anyị enweghị ihe o ji ụmụ mmadụ kpọrọ. Ndị ọzọ na-ekwu na Chineke na-ahụ ahụhụ anyị na-ata, ma ọ ma ụma gba nkịtị ka ihe ndị ahụ na-eme. E nwere ndị na-ekwu na Chineke eburula ụzọ kpebie na ihe ndị ahụ ga-eme tupu ha ana-eme. E nwekwara ihe ndị ọzọ ndị mmadụ na-ekwu. Ma, olee ebe anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu? N’isiokwu ndị na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl, ka ọ gwa anyị ihe kpatara ndị mmadụ ji ata ahụhụ na otú ahụhụ niile ga-esi akwụsị.