Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jọn 11:35 kwuru na anya mmiri gbara Jizọs tupu ya akpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Gịnị mere anya mmiri ji gbaa ya?

Ọ bụrụ na onye anyị hụrụ n’anya anwụọ, anyị na-ebe ákwá n’ihi na anyị agaghị na-ahụ ya. Ọ bụ eziokwu na Jizọs hụrụ Lazarọs n’anya, ihe mere anya mmiri ji gbaa ya abụghị na Lazarọs nwụrụ. Ihe ndị ọzọ Jọn kwuru na Jọn isi iri na otu gosiri na ihe mere anya mmiri ji gbaa ya bụ na ọ na-emetere ụmụnne Lazarọs na ndị enyi ha ebere.—Jọn 11:36.

Mgbe Jizọs nụrụ na Lazarọs na-arịa ọrịa, ọ gbaraghị ozugbo gawa ka ọ gwọọ Lazarọs. Baịbụl kwuru, sị: “Mgbe [Jizọs] nụrụ na ọ na-arịa ọrịa, ọ nọrọ ụbọchị abụọ n’ebe ahụ ọ nọ.” (Jọn 11:6) Gịnị mere na Jizọs agbaraghị gawa ozugbo? O nwere ihe kpatara ya. Jizọs kwuru, sị: “Ihe ga-esi n’ọrịa a pụta abụghị ọnwụ, kama ọ bụ inye Chineke otuto, ka e wee site na ya nye Ọkpara Chineke otuto.” (Jọn 11:4) Ihe ga-emecha si n’ọrịa Lazarọs pụta abụghị ọnwụ. Kama, Jizọs chọrọ iji ọnwụ Lazarọs mee ka ‘e nye Chineke otuto.’ Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-arụ ọrụ ebube, ya bụ, ịkpọlite Lazarọs enyi ya ọ hụrụ n’anya n’ọnwụ.

Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-akparịta ụka gbasara ọnwụ Lazarọs, Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra. Ọ bụ ya mere o ji gwa ha na ya “na-eje ebe ahụ ịkpọte [Lazarọs].” (Jọn 11:11) Jizọs weere na ịkpọlite Lazarọs n’ọnwụ yiri ebe nne ma ọ bụ nna na-akpọte nwa ya n’ụra. N’ihi ya, ọ bụghị ọnwụ Lazarọs mere Jizọs ji bee ákwá.

Gịnịzi mere anya mmiri ji gbaa Jizọs? Ihe ndị ọzọ e kwuru na Jọn isi iri na otu ga-enyekwara anyị aka ịza ajụjụ a. Mgbe Jizọs hụrụ ebe Meri nwanne Lazarọs na ndị ọzọ na-ebe ákwá, ọ “sụrụ ude n’ime mmụọ ya, o nyekwara ya nsogbu.” Ákwá ahụ ha na-ebe wutere Jizọs, ya ‘asụọ ude n’ime mmụọ ya.’ Ọ bụ ya mere ‘anya mmiri ji gbaa ya.’ O wutere ya mgbe ọ hụrụ na ndị enyi ya ọ hụrụ n’anya na-eru uju.—Jọn 11:33, 35.

Taa, ọtụtụ ndị anyị hụrụ n’anya anwụọla. Akụkọ a gosiri na Jizọs ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha ebiri n’ụwa ọhụrụ anyị na-atụ anya ya. N’oge ahụ, ha agaghịzi arịa ọrịa. Akụkọ a gosikwara na otú ahụ o si ewute anyị ma onye anyị hụrụ n’anya nwụọ ka o si ewutekwa Jizọs. Ihe ọzọ akụkọ a na-akụziri anyị bụ na anyị kwesịrị ịna-emetere ndị mmadụ ebere mgbe ha na-eru uju ndị ha hụrụ n’anya.

Anya mmiri gbara Jizọs n’agbanyeghị na ọ ma na ya ga-akpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Ihe mere anya mmiri ji gbaa ya bụ na o ji obi ya niile hụ ndị enyi ya n’anya, na-emetekwara ha ebere. Ọ bụrụ na anyịnwa ana-emetere ha ebere, o nwere ike ime ka anyị soro “ndị na-akwa ákwá kwaa ákwá.” (Rom 12:15) Ibe ákwá ma mmadụ nwụọ apụtaghị na anyị enweghị okwukwe na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Anyị ahụla na anya mmiri gbara Jizọs mgbe Lazarọs nwụrụ n’agbanyeghị na ọ ma na ya ga-akpọlite ya n’ọnwụ. N’ihi ya, ọ bụghị ihe ọjọọ ma anyị bee ákwá ma mmadụ nwụọ.