Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

Gịnị Mere I Ji Kwesị Inwe Mmasị n’Ihe E Dere na Baịbụl?

Gịnị Mere I Ji Kwesị Inwe Mmasị n’Ihe E Dere na Baịbụl?

Baịbụl bụ akwụkwọ a kacha mara amara n’ụwa niile. Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Otu ihe kpatara ya bụ na ihe e dere na Baịbụl gbasara anyị niile. Baịbụl kọọrọ anyị akụkọ ụmụ mmadụ ndị dịrị ndụ n’ụwa, otú ha na ibe ha si mekọrịta ihe nakwa otú ha na Chineke si mekọrịta ihe. Ihe ndị ahụ Baịbụl kọrọ na-akụziri anyị ọtụtụ ihe. Otú e si dee ha dị mfe nghọta nke mere na e nwere ike ịsụgharị ha n’ọtụtụ asụsụ, ndị mmadụ aghọta ha n’agbanyeghị ebe ha bi ma ọ bụ mgbe ha dịrị ndụ. Ihe ọzọ bụ na ihe niile Baịbụl kwuru na-abara anyị uru.

Nke ka nke bụ na Baịbụl sịrị na ya bụ akwụkwọ si n’aka Chineke nke kwuru gbasara Chineke. Ọ gwara anyị aha Chineke, ụdị onye ọ bụ, na ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ. Ihe ahụ Chineke bu n’obi agbanwebeghị, ọ gakwanụghị agbanwe. Baịbụl gwakwara anyị na o teela Setan mawara Jehova aka, gwakwa anyị otú Jehova ga-esi akwụsị ihe ọjọọ niile ma gosi na Setan bụ onye ụgha. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl maka na anyị chọrọ ịmụta ihe n’aka Chineke, anyị ga-enwe okwukwe na olileanya.

Ọ bụ na Baịbụl ka anyị nwere ike ịmata ọtụtụ ihe ọ na-enweghị ebe ọzọ anyị ga-esi amata ha. Dị ka ihe atụ, Baịbụl gwara anyị nke bụ́ eziokwu n’ihe ndị a:

  • Otú anyị si malite ịdị ndụ n’ụwa na ihe mere anyị ji ata ahụhụ

  • Ihe Chineke merela ka o nwee ike napụta ụmụ mmadụ

  • Ihe Jizọs meerela anyị

  • Otú ihe ga-adị n’ụwa n’ọdịnihu nakwa otú ihe ga-adịrị ụmụ mmadụ n’ọdịnihu

Ọ́ gaghị adị mma ka i lebatụ anya n’ihe ndị e kwuru na peeji ndị na-esonụ ma hụ ihe Baịbụl na-akụziri anyị?