Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ KA BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ?

Chineke Kwuru Otú Ọ Ga-esi Azọpụta Ụmụ Mmadụ

Chineke Kwuru Otú Ọ Ga-esi Azọpụta Ụmụ Mmadụ

Chineke kwere nwoke ezi omume, bụ́ Ebreham, nkwa na a ga-esi n’ezinụlọ ya nweta “mkpụrụ” ahụ e buru n’amụma. A ga-esi n’aka mkpụrụ ahụ gọzie “mba niile.” (Jenesis 22:18) Nwa nwa Ebreham, bụ́ Jekọb, mechara kwaga Ijipt. Ọ bụ n’ebe ahụ ka ezinụlọ ya nọ ghọọ mba Izrel.

Mgbe ha nọ n’Ijipt, Fero ọjọọ chịrị Ijipt ji ụmụ Izrel mere ndị ohu ruo mgbe Chineke mere ka onye amụma ya, bụ́ Mozis, duru mba Izrel pụọ n’Ijipt. Mgbe ha na-apụ n’Ijipt, Jehova rụrụ ọrụ ebube nke mere ka Osimiri Uhie kewaa abụọ, ụmụ Izrel esi na ya gafere. Chineke mechara nye ụmụ Izrel iwu ga na-edu ha ma na-echebe ha. Iwu Iri ahụ so n’iwu ndị o nyere ha. Iwu ndị ahụ kwuru ihe ndị ha ga na-eji achụ àjà ka a gbaghara ha mmehie ha. Chineke si n’ike mmụọ nsọ gwa Mozis na ya ga-ezitere ha onye amụma ọzọ. Ọ bụ onye amụma ahụ ga-abụ “mkpụrụ” ahụ e kwere ná nkwa.

Mgbe ihe karịrị narị afọ anọ gachara, Chineke kwere Eze Devid nkwa na “mkpụrụ” ahụ e kwuru okwu ya n’Iden ga-abụ eze, kwuokwa na alaeze ya ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya ga-abụ Mesaya ahụ, bụ́ Onye Chineke họpụtara ka ọ napụta ụmụ mmadụ ma mee ka ụwa bụrụghachi paradaịs.

Chineke ji nke nta nke nta mee ka ndị mmadụ matakwuo onye Mesaya ahụ ga-abụ. O si n’ọnụ Devid nakwa n’ọnụ ndị amụma ya ọzọ mee ka ha matakwuo ya. Ha buru amụma na Mesaya ahụ ga-adị umeala n’obi, dịrịkwa obiọma. Ha kwukwara na mgbe ọ ga-achịwa ụwa, agụụ, mmegbu, na agha agazighị adị. Ndị mmadụ na ibe ha ga-adị n’udo. Ha na ụmụ anụmanụ ga-adịkwa n’udo. Ọrịa, ahụhụ, na ọnwụ agakwaghị adị n’ihi na o nwedịghị mgbe ọ bụ uche Chineke ka ha dịrị. Ndị nwụrụ anwụ ga-esi n’ọnwụ bilie ma bidokwa ịdị ndụ n’ụwa.

Chineke si n’ọnụ Maịka onye amụma kwuo na a ga-amụ Mesaya ahụ na Betlehem. O sikwa n’ọnụ Daniel onye amụma kwuo na a ga-emecha gbuo ya. Ma, Chineke kwuru na ya ga-akpọlite Mesaya ahụ ma mee ya Eze n’eluigwe. Daniel hụkwara n’ọhụụ na Alaeze Mesaya ahụ ga-emecha nọchie ọchịchị niile dị n’ụwa. Mesaya ahụ ò mecharanụ bịa otú ahụ e buru ya n’amụma?

Ihe a kọrọ n’isiokwu a si na Jenesis 22-50, nakwa Ọpụpụ, Diuterọnọmi, 2 Samuel, Abụ Ọma, Aịzaya, Daniel, Maịka, Zekaraya 9:9.