Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | GỊNỊ MERE O JI ESIRI ỤFỌDỤ NDỊ IKE ỊHỤ CHINEKE N’ANYA?

Eziokwu Ga-eme Ka I Nwere Onwe Gị

Eziokwu Ga-eme Ka I Nwere Onwe Gị

Otu ụbọchị, mgbe Jizọs nọ na Jeruselem, ọ kụziiri ndị mmadụ banyere Nna ya, bụ́ Jehova, ma mee ka ha mata na ihe ndị isi okpukpe e nwere n’oge ahụ na-akụzi bụ ụgha. (Jọn 8:12-30) Ihe Jizọs kwuru n’ụbọchị ahụ na-akụziri anyị otú anyị ga-esi amata ma ihe ọtụtụ ndị kweere banyere Chineke n’oge anyị a hà bụ eziokwu. Jizọs sịrị: “Ọ bụrụ na unu anọgide n’okwu m, unu bụ n’ezie ndị na-eso ụzọ m, unu ga-amarakwa eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.”—Jọn 8:31, 32.

Ọ bụ ihe a Jizọs kwuru, ya bụ, ‘nọgide n’okwu m’ ga-enyere anyị aka ịmata ma ihe okpukpe dị iche iche na-akụzi hà bụ “eziokwu.” Mgbe ọ bụla ị nụrụ ihe ndị mmadụ kwuru gbasara Chineke, jụọ onwe gị, sị: ‘Ihe a ha kwuru ọ̀ dabara n’ihe Jizọs kwuru na ihe ndị ọzọ Akwụkwọ Nsọ kwuru?’ Gbalịa ka ị na-eme ihe ndị Beria mere mgbe Pọl onyeozi kụziiri ha ihe. Baịbụl sịrị na ha ‘nyochara Akwụkwọ Nsọ nke ọma kwa ụbọchị iji mara ma ihe ndị a [ya bụ, ihe ndị a na-akụziri ha] hà dị otú ahụ.’—Ọrụ Ndịozi 17:11.

Marco, Rosa, na Raymonde, bụ́ ndị e kwuru okwu ha n’isiokwu nke mbụ n’Ụlọ Nche a, gụrụ Akwụkwọ Nsọ nke ọma ka ha mata ma ihe ndị ha kweere hà bụkwa eziokwu. Otú ha si mee ya bụ na ha na Ndịàmà Jehova bidoro ịmụ Baịbụl. Ma gịnị ka ha mụtara?

Marco: “Onye na-akụziri mụ na nwunye m Baịbụl si na Baịbụl zaa ajụjụ niile anyị jụrụ ya. Nke a mere ka anyị malite ịhụ Jehova n’anya, mụ na nwunye m malitekwara ịdịkwu ná mma.”

Rosa: “M na-echebu na Baịbụl bụ akwụkwọ nkịtị ndị mmadụ dere ihe ha chere gbasara Chineke. Ma, m ji nke nta nke nta hụ azịza nke ajụjụ m niile na Baịbụl. Ugbu a, amatala m onye Jehova bụ. Ọ bụ Onye m nwere ike ịtụkwasị obi.”

Raymonde: “M kpegaara Chineke ekpere ka o nyere m aka ka m mata onye ọ bụ. O teghị aka, mụ na di m ebido ịmụ Baịbụl. Anyị mechara mata nke bụ́ eziokwu banyere Jehova. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ mgbe anyị mụtara ụdị Chineke ọ bụ.”

Ihe Baịbụl mere ka anyị mata abụghị naanị ụgha dị iche iche a na-akụzi gbasara Chineke, o mekwara ka anyị mata àgwà ọma ndị Chineke nwere. Baịbụl bụ Okwu Chineke e dere n’ike mmụọ nsọ. Ọ na-enyere anyị aka ‘ka anyị mara ihe niile Chineke ji obiọma nye anyị.’ (1 Ndị Kọrịnt 2:12) Ọ́ gaghị adị mma ka i jiri aka gị chọpụta otú Baịbụl si zaa ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa ndị mmadụ na-ajụkarị gbasara Chineke, gbasara ihe ndị o bu n’obi ime nakwa ihe ga-eme anyị n’ọdịnihu? I nwere ike ịgụ azịza nke ụfọdụ ajụjụ ndị a na www.pr418.com/ig. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ ebe e dere “Ihe Ndị Baịbụl Na-akụzi.” Pịa ebe e dere “Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara.” I nwekwara ike ịnọ n’ebe ahụ kwuo ka a bịa kụziwere gị Baịbụl ma ọ bụkwanụ gị agwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka ọ bịa kụziwere gị Baịbụl. Ọ bụrụ na i mee otú ahụ, obi siri anyị ike na ọ ga-adịrị gị mfe ịhụ Chineke n’anya karịa otú i chere.