Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | CHINEKE Ọ̀ BAARA ANYỊ URU?

Gịnị Mere E Ji Jụọ Ajụjụ A?

Gịnị Mere E Ji Jụọ Ajụjụ A?

N’otu obodo, e nwere ihe ụfọdụ ndị dere n’oge na-adịbeghị anya n’otu nnukwu bọọdụ e ji agbasa ozi. Ha dere, sị: “Ò nwere uru Chineke baara gị? Ọtụtụ nde mmadụ chere na o nweghị uru ọ baara ha.” Ihe a ha dere gosiri na ha ekweghị na Chineke.

E nwekwara ọtụtụ ndị sịrị na ha kweere na Chineke, ma ha na-ebi ndụ ka à ga-asị na Chineke adịghị. Otu achịbishọp nke chọọchị Katọlik, onye aha ya bụ Salvatore Fisichella, kwuru gbasara ndị chọọchị ya, sị: “Ọ bụrụ na e lewe otú anyị si ebi ndụ, o nweghị onye ga-amata na anyị bụ Ndị Kraịst n’ihi na otú anyị si ebi ndụ bụkwa otú ndị na-ekweghị na Chineke si ebi ndụ.”

Ọtụtụ ndị anaghị ewepụta oge chee echiche banyere Chineke. Ha weere Chineke ka onye nọ ebe dị anya ma ọ bụ onye na-abaghị uru ọ bụla ná ndụ ha. Naanị mgbe ha na-echeta Chineke bụ mgbe ha nọ ná nsogbu ma ọ bụ mgbe ha chọrọ ka Chineke meere ha ihe ọma, ka à ga-asị na Chineke bụ ohu ha.

Ndị ọzọ anaghị eme ihe a na-akụziri ha na chọọchị ha n’ihi na ha chere na o nweghị uru ọ ga-abara ha. Dị ka ihe atụ, na Jamanị, mmadụ atọ n’ime mmadụ anọ ọ bụla bụ́ ndị Katọlik chere na nwoke na nwaanyị ibikọ ọnụ tupu ha alụọ adịghị njọ n’agbanyeghị na chọọchị ha kwuru na ọ dị njọ, Baịbụl ekwuokwa na ọ jọgburu onwe ya. (1 Ndị Kọrịnt 6:18; Ndị Hibru 13:4) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na e nwekwara chọọchị ndị ọzọ chọpụtara na ọ na-abụ chọọchị ha na-ekwu otu ihe, ndị òtù ha ana-eme ọzọ. E nwere ndị isi chọọchị na-ekwu na ndị na-abịa chọọchị ha na-akpa àgwà ka ndị na-ekweghị na Chineke.

Ihe ndị a anyị lebarala anya emeela ka ndị mmadụ jụọ, sị: “Ò nwere uru Chineke baara anyị?” Ọ bụghị n’oge anyị a ka a malitere ịjụ ajụjụ a. Ebe mbụ a jụrụ ajụjụ a bụ n’akwụkwọ mbụ dị na Baịbụl. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ dị mkpa e kwuru n’akwụkwọ Jenesis n’ihi na ọ ga-eme ka anyị mata azịza ajụjụ a.