Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 BỊARUO CHINEKE NSO

“Lee! Ana M Eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ”

“Lee! Ana M Eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ”

Ị̀ chọrọ ka ahụ́ gbasie gị na ndị ezinụlọ gị ike, unu adịrịkwa ndụ ruo mgbe ebighị ebi? Ị̀ chọrọ ibi n’ụwa mgbe ihe mgbu, ịta ahụhụ, na ọnwụ na-agaghịzi adị? Ihe ndị a abụghị akụkọ ifo. N’oge na-adịghị anya, ụwa ga-aghọ paradaịs n’ihi na ọ bụ otú Jehova Chineke chọrọ ka ụwa dịrị mgbe o kere ya. Ị ga-ahụ ihe o bu n’obi ime ná Mkpughe 21:3-5.—Gụọ ya.

‘Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ha.’ (Mkpughe 21:4) Olee ụdị anya mmiri ọ ga-ehichapụ? Ọ bụghị ụdị nke na-agba anyị mgbe obi na-atọ anyị ụtọ ma ọ bụ nke na-eme ka anya anyị na-arụ ọrụ nke ọma. Anya mmiri Chineke ga-ehichapụ bụ nke na-agba anyị ma anyị tawa ahụhụ ma ọ bụ ruwe uju. Ma, ihe Chineke ga-eme abụghị naanị ihichapụ anyị anya mmiri nkịtị, kama ọ ga-ewepụ ihe niile na-akpata ahụhụ na iru uju.

“Ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Ọ bụ onye iro anyị, bụ́ ọnwụ, kacha akpatara ndị mmadụ anya mmiri. Ma, Jehova ga-eme ka ndị na-erubere ya isi kwụsị ịnwụ anwụ. Olee otú ọ ga-esi eme ya? Ọ ga-ewepụ ihe mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ, ya bụ, mmehie anyị ketara n’aka Adam. (Ndị Rom 5:12) Jehova ga-eme ka ụmụ mmadụ zuo okè n’ihi na Jizọs achụọla àjà maka ha. * Chineke ga-emecha mee ka onye iro ikpeazụ anyị bụ́ ọnwụ “ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrịnt 15:26) N’oge ahụ, ndị hụrụ Chineke n’anya ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi otú Chineke chọrọ ya. Ahụ́ ga-agbasikwa ha niile ike.

“Ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.” (Mkpughe 21:4) Olee ụdị ihe mgbu na-agaghịzi adị? Ọ bụ ihe mgbu niile mmehie na ezughị okè na-akpatara anyị. O nwere ike ịbụ ụfụ na-afụ anyị ma anyị merụọ ahụ́, obi ọjọọ na-eme anyị mgbe ụfọdụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ na-enye anyị nsogbu. Ihe mgbu ndị a emeela ka ọtụtụ nde mmadụ tagbuo onwe ha n’ahụhụ. Ma, ha niile ga-akwụsị.

N’oge na-adịghị anya, anya mmiri, ọnwụ, na ihe mgbu agaghịzi adị. Ma, i nwere ike ịjụ, sị: ‘Ebee ka ihe ndị a ga-eme?’ ‘Ọ̀ bụ n’eluigwe ka nkwa ndị a Chineke kwere ga-emezu?’ Mba. Ka anyị hụ ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ. Nke mbụ bụ na tupu e dee nkwa ndị ahụ Chineke kwere n’amaokwu ahụ, e bu ụzọ dee na “ụlọikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ.” Ebee ka ụmụ mmadụ bi? Ọ bụ n’ụwa a. (Mkpughe 21:3) Nke abụọ bụ na nkwa ahụ Chineke kwere na “ọnwụ agaghị adị ọzọ” na-egosi na ọ bụ n’ụwa ka ọ ga-ewepụ ọnwụ n’ihi na ọ bụ n’ụwa ka ọnwụ dị kemgbe. Ndị bi n’eluigwe anaghị anwụ anwụ, ma ọnwụ na-echi ndị bi n’ụwa ọnụ n’ala kemgbe. N’ihi ya, nkwa ahụ Chineke kwere ga-emezu n’ụwa.

Chineke ga-ehichapụ anya mmiri niile gbarala ụmụ mmadụ n’ihi ahụhụ ha na-ata na uju ha na-eru

Jehova chọrọ ka obi sie anyị ike na ya ga-emezu nkwa o kwere anyị na ụwa ga-aghọ paradaịs. Mgbe Jehova kwuchara ihe ọma ndị ahụ ọ ga-emere anyị, o kwuru ihe gosiri na ya ga-emezurịrị nkwa ya. Ọ sịrị: “Lee! Ana m eme ihe niile ka ha dị ọhụrụ.” O kwukwara, sị: “Okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.” (Mkpughe 21:5) Ọ́ gaghị adị mma ka ị mụta otú gị na ndị ị hụrụ n’anya ga-esi soro ná ndị obi ga-atọ ụtọ mgbe Chineke ga-emezu nkwa niile o kwere?

Ebe anyị na-atụ aro ka ị gụọ na Baịbụl n’ọnwa Disemba

1 Pita 1-5; 2 Pita 1-3; 1 Jọn 1-5; 2 Jọn 1-13; 3 Jọn 1-14; Jud 1-25Mkpughe 1-22

^ para. 5 Ị chọọ ịmụtakwu banyere àjà Kraịst chụrụ, gụọ isi nke 5 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.