Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | Ọ BỤRỤ NA MMADỤ ANWỤỌ, NKE YA Ọ̀ GAALA?

Mbọ Ndị Mmadụ Gbara Ka Ha Ghara Ịnwụ Anwụ

Mbọ Ndị Mmadụ Gbara Ka Ha Ghara Ịnwụ Anwụ

EZE NDỊ CHAỊNA AHA YA BỤ CHIN SHI HUANG

ONYE NA-EME NCHỌPỤTA AHA YA BỤ KWỤAN PỌNSE DE LEỌN

Ọnwụ bụ onye iro anyị. Anyị niile na-atụ ya ụjọ. Anyị na-eme ihe niile anyị nwere ike ime ka ọ ghara igbu anyị. Ọ bụrụkwa na onye anyị hụrụ n’anya anwụọ, o nwere ike ịdị anyị ka ọ bụghị eziokwu na ọ nwụọla. Ọ bụrụ na anyị ka na-eto eto, anyị nwere ike iche na ọnwụ emekataghị kpara anyị aka. Anyị nwere ike ịna-eche otú ahụ ruo mgbe ọ ga-emecha doo anyị anya na anyị agaghị agbata ya n’ọsọ.

Ndị chịrị Ijipt n’oge ochie gbasiri mbọ ike ka ha mara ma ò nwere ihe ha ga-eme ka ha ghara ịnwụ anwụ. Ma hanwa ma ọtụtụ puku ndị ọrụ ha wepụtara oge buru ibu na-achọ ihe ha ga-eme ka ha dịrị ndụ na-aga. Ihe gosiri na ha gbasịrị mbọ ike bụ nnukwu ụlọ ndị ha wuru, bụ́ ebe ha na-eli ndị eze ha. Ma, ụlọ ndị ahụ gosikwara otú mbọ niile ha gbara si kụọ afọ n’ala.

Ndị eze Chaịna gbakwara mbọ ka ha ghara ịnwụ anwụ. Ma, ihe ha mere dị iche n’ihe ndị chịrị Ijipt mere. Ha nọ na-achọ ọgwụ ọ ga-abụ ha ṅụọ, ọnwụ agaghịzi egbu ha. Otu eze ha a na-akpọ Chin Shi Huang gwara ndị ọkachamara ya ka ha mepụtara ya ọgwụ ọ ga-abụ mmadụ ṅụọ, ọnwụ agakwaghị egbu ya. Ihe e ji mee ụfọdụ n’ime ọgwụ ndị ha gwakọtara bụ ihe ndị nwere ike igbu mmadụ. O nwekwara ike ịbụ na ihe mechara gbuo eze ahụ bụ otu n’ime ihe ndị ahụ ha gwakọtara.

O nwere otu nwoke Spen aha ya bụ Kwụan Pọnse de Leọn. N’afọ 1513, nwoke a ji ụgbọ mmiri si n’obodo Puweto Riko gawa ịchọ otu mmiri a sịrị na-eme ka mmadụ ghara ịka nká. Ọ bụ mgbe ọ na-achọ mmiri ahụ ka ọ chọtara obodo a na-akpọ Flọrịda, nke dị n’Amerịka. Ma mgbe afọ ole na ole gafere, nwoke ahụ nwụrụ mgbe ya na ndị nwe Flọrịda lụchara ọgụ. Kemgbe ahụ, o nwebeghị onye chọtara mmiri ahụ a sịrị na-eme ka mmadụ ghara ịka nká.

Ma ndị chịrị Ijipt ma ndị eze Chaịna ma ndị ọzọ gbachara mbọ ka ha ghara ịnwụ anwụ. Ò nwere onye ga-asị na mbọ ha gbara enweghị isi n’agbanyeghị na otú ha si chọọ inweta ihe ha chọrọ adịghị anyị mma? O doro anya na o nweghị onye n’ime anyị chọrọ ịnwụ anwụ.

Ò NWERE MGBE ỌNWỤ GA-AKWỤSỊ?

Gịnị mere na o nweghị onye n’ime anyị chọrọ ịnwụ anwụ? Baịbụl gwara anyị ihe kpatara ya. Ọ sịrị na  Onye kere anyị, bụ́ Jehova Chineke, * mere “ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya” nakwa na ‘o tinyere mgbe ebighị ebi n’obi ụmụ mmadụ.’ (Ekliziastis 3:11) Ọ ga-adị anyị mma ịnọ ndụ n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụghị ịnọ ndụ naanị ihe dị ka afọ iri asatọ. (Abụ Ọma 90:10) Ọ bụ ihe anyị niile chọrọ.

Gịnị mere Chineke ji tinye “mgbe ebighị ebi” n’obi anyị? Ọ̀ bụ ka iwe na-ewe anyị ma anyị cheta na anyị na-anwụ anwụ? Mbanụ! Chineke agaghị eme ụdị ihe ahụ. Kama, o kwere anyị nkwa na ọnwụ ga-akwụsị. Ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru na ọnwụ ga-akwụsị nakwa na Chineke ga-eme ka anyị dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ,  “Chineke Ga-eme Ka Ọnwụ Kwụsị.”

Jizọs Kraịst kwuru hoo haa, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ọ dị ha mkpa ịmata gị nke ọma, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ihe a Jizọs kwuru gosiri na o nwere mgbe ọnwụ ga-akwụsị ịkpa ike. Ihe a o kwuru gosikwara na ọ bụ naanị Chineke nwere ike imemila ọnwụ.

^ para. 9 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.