Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE ONYEÀMÀ JEHOVA NA ONYE AGBATA OBI YA KPARỊTARA

Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?

Gịnị Mere Chineke Ji Hapụ Ụmụ Mmadụ Ka Ha Na-ata Ahụhụ?

N’ebe a, e dere ihe Onyeàmà Jehova na onye agbata obi ya nwere ike ịkparịta. Ka anyị were ya na Onyeàmà Jehova aha ya bụ Mary gara n’ụlọ otu nwaanyị aha ya bụ Sarah.

AHỤHỤ ANYỊ NA-ATA Ọ̀ NA-EMETỤ CHINEKE N’OBI?

Mary: Sarah, ndeewo. Olee otú i mere?

Sarah: Adị m mma.

Mary: Ụbọchị ahụ m bịara na nke gị, o nwere ajụjụ anyị lebara anya. Ajụjụ ahụ bụ, ‘Ahụhụ anyị na-ata ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?’ * I kwuru na o teela ajụjụ ahụ gbawara gị gharịị, karịchaa, kemgbe mama gị nwechara ihe mberede okporo ụzọ.

Sarah: Ihe i kwuru bụ eziokwu.

Mary: Biko, olee otú mama gị mere taa?

Sarah: Ọ na-abụ ahụ́ dịtụ ya mma taa, echi ya aka ya njọ. Ma, ọ dị mma taa.

Mary: Obi dị m ụtọ na ọ gbakewela. Ama m na ihe ahụ mere ya ga-eme ka obi na-ajọ gị njọ mgbe ụfọdụ.

Sarah: Ọọ eziokwu. Mgbe ụfọdụ, ihe m na-eche bụ ma ò nwere mgbe nsogbu ya ga-ebi.

Mary: Ọọ ihe onye ọ bụla ọ dị otú a ọ dị gị ga-eche. Ì chetara na mgbe anyị kwuchara okwu n’ụbọchị ahụ m bịara, na m jụrụ gị ma ị̀ ma ihe mere Chineke ji hapụ ụmụ mmadụ ka ha na-ata ahụhụ n’agbanyeghị na o nwere ike ịkwụsị ya?

Sarah: Echetara m.

Mary: Tupu anyị ahụ ihe Baịbụl kwuru banyere ya, ka anyị lebagharịa anya n’ihe anyị kwuru n’ụbọchị ahụ.

Sarah: Nsogbu adịghị.

Mary: Anyị mụtara na e nwere otu nwoke fere Chineke n’oge ochie nke jụrụ Chineke ihe mere o ji kwe ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ma, Chineke abaraghị ya mba maka na ọ jụrụ ya ajụjụ ma ọ bụkwanụ gwa ya na okwukwe ya esighị ike.

Sarah: Ọọ ihe ọhụrụ m mụtara n’ụbọchị ahụ.

Mary: Ihe ọzọ anyị mụtara bụ na obi anaghị atọ Jehova Chineke ụtọ ma ọ hụ ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ‘o wutere ya’ mgbe ndị fere ya n’oge ochie nọ na-ata ahụhụ. * Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ ịnụ na ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Chineke n’obi?

Sarah: Obi dị m ụtọ.

Mary: Ihe ọzọ anyị kwukwara n’ụbọchị ahụ bụ na ike Chineke enweghị atụ. N’ihi ya, ọ ga-akwụsịli ahụhụ anyị na-ata mgbe ọ bụla ọ chọrọ.

Sarah: Ọọ ya na-agbagwoju m anya. Gịnị mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na-eme n’ụwa n’agbanyeghị na ọ ga-akwụsịli ya?

ÒNYE KWURU EZIOKWU?

Mary: Ka anyị gụọ akwụkwọ Jenesis. Ọ bụ ya ga-enyere anyị aka ịmata azịza ajụjụ a ị jụrụ. Ị̀ ma ihe Baịbụl kwuru gbasara Adam na Iv na mkpụrụ osisi a sị ha erila?

 Sarah: Ama m. M mụtara ya na Sọnde skul mgbe m dị obere. Chineke gwara ha erila mkpụrụ osisi ahụ, ha akpọchie ntị rie ya.

Mary: I kwutere ya. Ma, ka anyị leba anya n’ihe ndị mere tupu Adam na Iv emehie. Ihe ndị ahụ ga-enyere anyị aka ka anyị mata ihe mere anyị ji ata ahụhụ. Biko, gụọ Jenesis isi nke atọ, amaokwu nke mbụ ruo nke ise.

Sarah: Ebe ahụ kwuru, sị: “Agwọ kasị dị akọ n’ime anụ ọhịa niile Jehova bụ́ Chineke kere. O wee malite ịgwa nwaanyị ahụ, sị: ‘Ọ̀ bụ eziokwu na Chineke sịrị unu erila mkpụrụ si n’osisi ọ bụla dị n’ubi a?’ Nwaanyị ahụ wee sị agwọ ahụ: ‘Anyị nwere ike iri mkpụrụ si n’osisi ndị dị n’ubi a. Ma, a bịa n’iri mkpụrụ si n’osisi dị n’etiti ubi a, Chineke sịrị: “Unu erila mkpụrụ si na ya, ee e, unu emetụla ya aka ka unu ghara ịnwụ.”’ Agwọ ahụ wee sị nwaanyị ahụ: ‘Unu agaghị anwụ ma ọlị. N’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu riri mkpụrụ si na ya, anya unu ga-emeghe, unu ga-adịkwa ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.’”

Mary: Ị gụtara ya. Ka anyị leruo amaokwu ndị ahụ anya. Ihe mbụ anyị gụtara bụ na agwọ gwara Iv okwu. Ebe ọzọ na Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu ji agwọ ahụ gwa Iv okwu. * Setan jụrụ Iv ajụjụ gbasara iwu Chineke nyere ha banyere otu osisi dị n’ubi ahụ. Gịnị ka Chineke gwara Adam na Iv na ọ bụ ihe ga-eme ha ma ha rie mkpụrụ si n’osisi ahụ?

Sarah: Ọ gwara ha na ha ga-anwụ.

Mary: Gbam! Mgbe Iv zachara Setan azịza ahụ, Setan boro Chineke ebubo. Ọ gwara Iv, sị: “Unu agaghị anwụ ma ọlị.” Setan kpọrọ Chineke onye ụgha.

Sarah: Anụtụbeghị m ihe a i kwuru.

Mary: Okwu Setan kpatara mgbe o boro Chineke ebubo na ọ bụ onye ụgha abụghị ihe a ga-edozili ngwa ngwa. Ị̀ ghọtara ihe mere o ji dị otú ahụ?

Sarah: Mba. O dochaghị m anya.

Mary: Ka m meere gị ihe atụ ga-eme ka ị ghọta ihe m na-ekwu. Ka e were ya na otu ụbọchị, abịakwutere m gị, sị gị na m ka gị ike. Olee otú ị ga-esi egosi m na ihe m kwuru abụghị eziokwu?

Sarah: M nwere ike ịsị gị, ‘Ngwanụ ka anyị nwaa, ka anyị mata mbe abụọ nke bụ́ oké.’

Mary: I kwutere ya. I nwere ike ịchọta ihe dị ezigbo arọ, kwuzie ka a mara onye ga-ebuli ya n’ime anyị abụọ. Ọ gaghị ewe oge a mata mbe abụọ nke bụ́ oké.

Sarah: Aghọtala m ihe ị na-ekwu.

Mary: Ma, ọ bụrụkwanụ na ihe m gwara gị bụ na ị bụ onye ụgha? Otú a ga-esi achọpụta ma ihe m kwuru ọ̀ bụ eziokwu ga-adịzi iche.

Sarah: Ọọ ya. Ọ ga-adị iche.

Mary: A naghị eji ọkpụkpụ aka amata ma mmadụ ọ̀ bụ onye ụgha ka ọ̀ bụ na ọ bụghị.

Sarah: Nke ahụ bụ eziokwu.

Mary: Naanị otú a ga-esi amata ma ihe m kwuru ọ̀ bụ eziokwu bụ ikwe ka oge gafee ka ndị mmadụ lewe anyị abụọ, jirizie aka ha mata onye bụ́ onye ụgha.

Sarah: Aghọtawala m ihe ị na-ekwu.

Mary: Legodị anya n’ebe ndị ahụ anyị gụrụ na Jenesis. Setan ò kwuru na ya ka Chineke ike?

Sarah: Mba.

Mary: Ọ gaghị ewe Chineke oge igosi na ya ka ya ike. Ma, kama ikwu na ya ka Chineke ike, Setan sịrị na ihe Chineke kwuru abụghị eziokwu. E nwere ike ịsị na ọ gwara Iv, sị: ‘Chineke ghaara unu ụgha. Ọọ mụnwa na-agwa unu eziokwu.’

Sarah: Chaị! Ọ̀ọ ihe merenụ?

Mary: Ma, ebe Chineke maara ihe, ọ ghọtara na otú kacha mma ọ ga-esi edozi okwu ahụ Setan kpatara bụ ikwe ka oge gafee. Ka oge na-aga, ọ ga-edo onye ukwu na onye nta anya onye bụ́ onye ụgha.

OKWU ỌZỌ SETAN KPATARA

Sarah: Ma ozugbo Iv nwụrụ, ọ̀ bụ na o doghị onye ukwu na onye nta anya na Chineke kwuru eziokwu?

 Mary: E nwere ike ikwu otú ahụ. Ma, e nwere ihe ọzọ Setan kwuru. Legodị anya ọzọ n’amaokwu nke ise. Ị̀ hụrụ ihe ọzọ Setan gwara Iv?

Sarah: O kwuru na ọ bụrụ na Iv erie mkpụrụ osisi ahụ, anya ya ga-emeghe.

Mary: I kwutere ya. Ọ sịkwara na Iv ‘ga-adị ka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.’ Ihe Setan na-ekwu bụ na Chineke leziri anya jụ inye ụmụ mmadụ ihe ga-abara ha uru.

Sarah: Èziokwu?

Mary: Ihe ahụ o kwuru abụghị obere okwu.

Sarah: Gịnị ka i bu n’obi?

Mary: Ọ bụghị naanị Iv ka ihe ahụ Setan kwuru gbasara. Setan na-ekwu na ihe ga-akara ma Iv ma mmadụ niile mma ma Chineke kwụsị ịchị ha. Ma, Jehova maara na otú kacha mma ọ ga-esi gosi na Setan bụ onye ụgha bụ ịhapụ Setan ka o jiri aka ya gbaa onwe ya n’anwụ. Ọ bụ ya mere Chineke ji hapụ Setan ka ọ chịtụgodị ụwa. Ọ bụkwa maka na Setan na-achị ụwa mere ndị mmadụ ji atagbu onwe ha n’ahụhụ. * Ma, olileanya dị.

Sarah: Olileanya gịnị?

Mary: Baịbụl kwuru ihe abụọ magburu onwe ya gbasara Chineke. Nke mbụ bụ na mgbe ọ bụla anyị na-ata ahụhụ, ọ na-emetụ Jehova Chineke n’obi. Dị ka ihe atụ, ka anyị gụọ ihe Eze Devid kwuru n’Abụ Ọma 31:7. Devid tara ezigbo ahụhụ. Ma, ka anyị hụ ihe ọ gwara Chineke n’ekpere. Biko, gụọ ya.

Sarah: Ọ dị mma. Ọ sịrị: “M ga-aṅụrị ọṅụ, nweekwa obi ụtọ n’obiọma gị, n’ihi na ị hụwo mmekpa ahụ́ m; ị marawo ahụhụ mkpụrụ obi m na-ata.”

Mary: N’agbanyeghị na Devid tara ahụhụ, ihe kasiri ya obi bụ na ọ ma na Jehova na-ahụ nsogbu niile na-abịara ya. Ọ̀ bụ na obi adịghị gị ụtọ na Jehova ma ihe niile na-emenụ, marakwa ihe niile na-enye anyị nsogbu n’obi, ma nke ndị mmadụ na-amaghị?

Sarah: À na-ajụkwa ajụ?

Mary: Nke abụọ bụ na Chineke agaghị ekwe ka anyị na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi. Baịbụl kwuru na Chineke ga-anapụ Setan ọchịchị n’oge na-adịghị anya. N’oge ahụ, ọ ga-ewepụ nsogbu niile Setan kpataara ụmụ mmadụ, ma nke ọ kpataara gị na mama gị. M ga-achọ ịbịa n’izu ọzọ ka m gosi gị ihe mere obi ga-eji sie gị ike na Chineke ga-eme ka ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata kwụsị n’oge na-adịghị anya. *

Sarah: Nsogbu adịghị. Aga m anọ ya.

È nwere ihe Baịbụl kwuru na-edoghị gị anya? Ka è nwere ihe Ndịàmà Jehova na-akụzi ma ọ bụ ihe ha na-eme nke ị na-aghọtaghị? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ ya Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ. Obi ga-atọ Onyeàmà Jehova ahụ ụtọ ka gị na ya kpaa ya.

^ para. 7 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Onyeàmà Jehova na Onye Agbata Obi Ya Kparịtara—Ahụhụ Anyị Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?” Ọ gbara n’Ụlọ Nche Julaị 1, 2013. I nwekwara ike inweta ya na www.pr418.com/ig.

^ para. 63 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe e kwuru n’isiokwu a, gụọ isi nke 9 nke akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.