Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Maara?

Ị̀ Maara?

N’oge Baịbụl, ọ bụrụ na mmadụ akpachara anya dọwaa uwe ya, gịnị ka ọ pụtara?

BAỊBỤL kwuru oge dị iche iche ndị mmadụ dọwara uwe ha. Mmadụ gụọ ụdị ihe ahụ n’oge anyị a, o nwere ike iju ya anya. Ma, ndị Juu na-adọwa uwe ha iji gosi na ezigbo iwe eweela ha, na ihe wutere ha, na e mechuru ha ihu, na obi adịghị ha mma, ma ọ bụkwanụ na ha na-eru uju.

Dị ka ihe atụ, Ruben ‘dọwara uwe ya’ mgbe ọ matara na e reela Josef nwanne ya ka ọ gaa gbawa ohu, nke pụtara na mbọ ọ na-agba ịnapụta ya akụọla afọ n’ala. Nna ha bụ́ Jekọb ‘dọwara ákwà mgbokwasị ya’ mgbe o chere na anụ ọhịa adọgbuola Josef. (Jen. 37:18-35) Job ‘dọwara uwe elu ya’ mgbe a gwara ya na ụmụ ya niile anwụọla. (Job 1:18-20) Otu nwoke “nke yi uwe mwụda dọwara adọwa” bịakwutere Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, gwa ya na e meriela ndị Izrel n’agha, gbuo ụmụ ya abụọ, burukwa igbe ọgbụgba ndụ Chineke. (1 Sam. 4:12-17) Mgbe Josaya nụrụ ihe e kwuru n’akwụkwọ Iwu a na-agụrụ ya, ghọtakwa ihe ndị Izrel mejọrọ, “ọ dọwara uwe ya.”—2 Eze 22:8-13.

Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe, Nnukwu Onye Nchụàjà bụ́ Keyafas “dọwara uwe elu ya” mgbe ọ nụrụ ihe o chere na ọ bụ ikwulu Chineke. (Mat. 26:59-66) Ndị Rabaị nyere iwu na onye ọ bụla nụrụ ka e kwuluru aha Chineke kwesịrị ịdọwa uwe ya. Ma, mgbe e bibichara ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ndị Rabaị kwuru na “onye nụrụ ka e kwuluru Aha Chineke ekwesịzighị ịdọwa uwe ya, n’ihi na ọ ga-eme ka mmadụ na-eyizi uwe dọkara adọka mgbe niile.”

N’eziokwu, mmadụ ịdọwa uwe ya abaghị uru n’anya Chineke ma ọ bụrụ na mwute onye ahụ nwere esighị ya n’obi. Ọ bụ ya mere Jehova ji gwa ndị ya ka ha ‘dọwaa obi ha, ọ bụghị uwe ha,’ nakwa ka ha ‘lọghachikwute ya.’—Joel 2:13.