Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | È NWERE ONYE MA IHE GA-EME N’ỌDỊNIHU?

Ọtụtụ Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Anaghị Emezu

Ọtụtụ Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Anaghị Emezu

Ị̀ chọrọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu? Ọtụtụ ndị chọrọ ịma. E nwere ọtụtụ ndị na-ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ma ọtụtụ mgbe, ihe na-emecha mee na-adị iche n’ihe ha kwuru. Gụọ ihe ndị a:

  • NDỊ ỌKÀ MMỤTA SAYENSỊ na-emefu nnukwu ego ka ha nwee ike ịmata ihe ndị ka ga-eme eme. Ha na-eji ọkpọka ngwá ọrụ achọpụta ihe ndị ahụ ma gwazie ọhaneze. Dị ka ihe atụ, ha na-agwa ọhaneze ma mmiri ọ̀ ga-ezo n’ebe ha bi ma ọ bụ na ọ gaghị ezo. Ha na-agwakwa ha otú ala na mmiri na ikuku ndị mmadụ na-emebi nwere ike isi kpaa ụwa aka ọjọọ.

  • NDỊ ỌKACHAMARA na-ekwu otú ihe ga-esi aga n’azụmahịa nakwa n’ọchịchị. E nwere otu nwoke a na-akpọ Warren Buffett. O so ná ndị kacha nwee ego n’ụwa. Ndị mmadụ na-akpọ ya agbara n’ihi na ọ na-ama azụmahịa ọ ga-abụ ya tinye ego na ya, ya erite ezigbo uru. Otu ọkachamara aha ya bụ Nate Silver enyochaala ihe ndị merela eme, ọ na-esikwa n’ihe ndị ọ chọpụtara ekwu ihe ga-eme n’Amerịka. O nweghị ụdị ihe ọ na-anaghị ekwu, ma otú ihe ga-esi aga n’ọchịchị Amerịka ma ndị na-eme fim n’Amerịka a ga-enye ihe nrite.

  • IHE NDỊ E DERE N’OGE OCHIE bụzi ihe ọtụtụ ndị ji mere amụma. Ụfọdụ ndị weere ihe otu nwoke aha ya bụ Mishel de Nọtradam (Nọstradamus) dere n’ihe dị ka narị afọ anọ na iri isii gara aga ka amụma na-emezu n’oge a n’agbanyeghị na ihe o dere edochaghị anya. Ụfọdụ ndị kwuru na njinji ga-eji n’ụwa n’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa Disemba afọ 2012 n’ihi na ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka kalenda ndị Maya gwụrụ.

  • NDỊ ISI OKPUKPE na-ekwu mgbe ụfọdụ na ebelebe ga-egbu n’ụwa. Ha na-ekwu ya ka ha dọọ ndị mmadụ aka ná ntị nakwa ka ndị mmadụ bata n’okpukpe ha. Otu nwoke aha ya bụ Harold Camping na ndị òtù ya zisara ozi ebe niile na ụwa ga-agwụ n’afọ 2011. O doro ewu na ọkụkọ anya na ụwa agwụghị.

  • NDỊ NA-AGBA AFA na-ekwu na ha nwere ike pụrụ iche ha ji amata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Otu nwoke aha ya bụ Edgar Cayce na otu nwaanyị aha ya bụ Jeane Dixon kwuru ihe ụfọdụ ga-eme n’agbata afọ 1901 na afọ 2000, ihe ndị ahụ emechaa mee. Ma, e nwekwara ọtụtụ ihe ha abụọ kwuru na-emechaghị mee. Dị ka ihe atụ, Dixon kwuru na a ga-alụ Agha Ụwa nke Atọ n’afọ 1958, Cayce ekwuo na mmiri ga-erikpu Niu Yọk n’ihe dị ka afọ 1975.

È nwere otú anyị ga-esi amata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu? Ajụjụ a dị mkpa. Ọ bụrụ na ị mata ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu, o nwere ike ime ka ị gbanwee otú i si ebi ndụ ugbu a.