Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ònyedị na-achị ụwa a?

Ọ bụrụ na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a, ndị mmadụ agaraghị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ

Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ma, ọ bụrụ ya na-achị ụwa a, ndị mmadụ agaraghị na-atagbu onwe ha n’ahụhụ. (Diuterọnọmi 32:4, 5) Baịbụl gosiri na e nwere onye ọjọọ na-achị ụwa a.—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Oleekwanụ otú onye ọjọọ ahụ si chịwazie ụmụ mmadụ? Mgbe Chineke kechara Adam na Iv, otu mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi ma gwa Adam na Iv ka ha nupụkwara Chineke isi. (Jenesis 3:1-6) Di na nwunye ahụ rubeere ajọ mmụọ ozi ahụ bụ́ Setan isi. Ebe ọ bụ na ha mere ihe Setan kwuru, Setan bidoro chịwa ha. Ọ bụ naanị Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ. Ma, ọ chọrọ ka ndị mmadụ jiri aka ha họrọ ka ọ chịwa ha maka na ha hụrụ ya n’anya. (Diuterọnọmi 6:6; 30:16, 19) Ọ dị mwute na e duhiela ọtụtụ ndị taa, ha ahọrọzie ka Setan chịwa ha otú ahụ Adam na Iv mere.—Gụọ Mkpughe 12:9.

Ònye ga-eme ka nsogbu ndị mmadụ nwere bie?

Chineke ọ̀ ga-ekwe ka Setan nọgide na-achị ụwa a? Mbanụ! Chineke ga-esi n’aka Jizọs wepụ ihe ọjọọ niile Setan kpataara ụmụ mmadụ.—Gụọ 1 Jọn 3:8.

Jizọs ga-eji ike Chineke nyere ya memilaa Setan. (Ndị Rom 16:20) Ọ bụ mgbe ahụ ka Chineke ga-achịwa ndị mmadụ ma mee ka ha na-enwe obi ụtọ ma biri n’udo otú o bu n’obi mgbe o kere mmadụ.—Gụọ Mkpughe 21:3-5.