Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa?

Ị̀ ga-achọ ịmatakwu banyere Alaeze Chineke na ihe ndị ọ ga-emere anyị?

Alaeze Chineke bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa n’ihi na Alaeze ahụ ga-eme ka ndị mmadụ na-eme ezi omume n’ebe niile n’ụwa, meekwa ka udo dị. Ọchịchị ụmụ mmadụ enweghị ike ime ka tigbuo zọgbuo, mmegbu, ma ọ bụ ọrịa gharazie ịdị. Ma Alaeze Chineke nwere ike iwepụrụ anyị nsogbu ndị ahụ, ọ ga-emekwa ya. Chineke ahọpụtala Ọkpara ya bụ́ Jizọs ka ọ chịwa n’Alaeze ya. Jehova Chineke ahọpụtakwala ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha soro ya chịa n’Alaeze ahụ.—Gụọ Luk 11:2; 22:28-30.

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ebibi ndị niile na-agba ọchịchị Chineke ụkwụ. N’ihi ya, mgbe anyị na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ihe anyị na-arịọ Chineke bụ ka ọchịchị ya bịa nọchie ọchịchị ụmụ mmadụ.—Gụọ Daniel 7:13, 14; Mkpughe 11:15, 18.

Gịnị mere Alaeze Chineke ga-eji baara ụmụ mmadụ uru?

Jizọs bụ eze kacha mma ga-achị ụmụ mmadụ n’ihi na o nwere ọmịiko. Ebe ọ bụ Ọkpara Chineke, ọ ga-agbatara ndị niile na-akpọku Chineke ọsọ enyemaka.—Gụọ Abụ Ọma 72:8, 12-14.

Alaeze Chineke ga-abara ndị ji obi ha niile na-ekpe ekpere ka ọ bịa uru, ya bụ, ndị na-eme ihe Chineke chọrọ. O nweghị ihe ga-eme ka ị kwaa mmakwaara ma ọ bụrụ na ị mụọ ihe Baịbụl kwuru banyere Alaeze Chineke.—Gụọ Luk 18:16, 17; Jọn 4:23.