Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

izọs ọ̀ kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ n’eziokwu?

Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ. O ruola abalị anọ ọ nwụrụ tupu Jizọs akpọlite ya

Baịbụl kwuru hoo haa na e nwere ndị Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Ihe a Baịbụl kwuru abụghị akụkọ ifo n’ihi na Baịbụl kwuru oge na ebe ọ nọ kpọlite ndị ahụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, n’oge ọkọchị n’afọ 31, Jizọs si n’obodo Kapaniọm na-aga obodo Nen, oké ìgwè mmadụ sokwa ya. Mgbe ha rutere Nen, ha hụrụ ìgwè mmadụ ọzọ. Baịbụl kwuru na ìgwè mmadụ ahụ na-aga ili nwa otu nwaanyị di ya nwụrụ. Ma, Jizọs kpọlitere nwa okorobịa ahụ n’ọnwụ. Ihe mere ị ga-eji kweta na akụkọ a bụ eziokwu bụ na o mere n’ihu mmadụ niile ahụ, e dekwara ya n’Okwu Chineke, bụ́ Baịbụl.—Gụọ Luk 7:11-15.

Jizọs kpọlitekwara enyi ya Lazarọs n’ọnwụ. O ruola abalị anọ ọ nwụrụ tupu Jizọs akpọlite ya. Ihe mere ị ga-eji kweta na Jizọs kpọlitere Lazarọs n’ọnwụ n’eziokwu bụ na ọtụtụ ndị hụrụ mgbe ọ kpọlitere ya.—Gụọ Jọn 11:39-45.

Gịnị mere Jizọs ji kpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ?

Jizọs kpọlitere ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ n’ihi na o nwere ọmịiko n’ebe ndị mmadụ nọ. Ihe ọzọ bụ na ọ chọrọ igosi na Nna ya, bụ́ Onye nyere anyị ndụ, enyela ya ikike ọ ga-eji merie ọnwụ.—Gụọ Jọn 5:21, 28, 29.

Mkpọlite ahụ Jizọs kpọlitere ndị mmadụ n’ọnwụ na-eme ka obi sie anyị ike na ihe ndị ọ gwara anyị ga-eme n’ọdịnihu ga-eme n’eziokwu. Ọ ga-akpọlite ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, ma ndị ajọ omume na–amaghị ihe ọ bụla gbasara ezi Chineke. A ga-enye ha ohere ka ha mụọ gbasara Jehova Chineke ma hụ ya n’anya.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 24:15.