Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Olee ihe mere ọtụtụ ndị jizi ekweta na e nwere Onye kere ihe niile?

Ọ̀ bụ na otú e si kee anyị adịghị ebube?

Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, otu onye na-ede abụ dere, sị: “I kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube.” (Abụ Ọma 139:14) Ọ bụrụ na i chee echiche banyere otú nwa nọ n’afọ si aghọ mmadụ ma na-eto n’afọ nne ya, ọ̀ bụ na ọ naghị eju gị anya? Ọtụtụ ndị kwetara na o nwere Onye kere ihe niile dị ndụ.—Gụọ Abụ Ọma 139:13-17; Ndị Hibru 3:4.

Ọ bụ Onye kere eluigwe na ụwa ma mee ka ụwa dị mma obibi nyere ụmụ mmadụ na ihe ndị ọzọ ndụ. (Abụ Ọma 36:9) Ọ gwara ụmụ mmadụ okwu ma mee ka anyị mata onye ọ bụ.—Gụọ Aịzaya 45:18.

Ụmụ mmadụ hà si n’anụmanụ bido ịdị ndụ?

Ahụ́ mmadụ na nke anụmanụ yitụrụ. Ma, ihe mere ha ji yie bụ na e kere ma mmadụ ma anụmanụ ka ha biri n’ụwa. Onye kere ihe niile esighị n’anụmanụ kee mmadụ, kama o ji ájá si n’ala kee mmadụ mbụ.—Gụọ Jenesis 1:24; 2:7.

O nwere ihe abụọ mere mmadụ ji dị iche n’anụmanụ. Nke mbụ bụ na e kere mmadụ ka o nwee ike ịmata Onye kere ya, hụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù. Nke abụọ bụ na e kere mmadụ ka ha na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, ma e keghị anụmanụ ka ha na-anọru otú ahụ. Ma ugbu a, mmadụ niile na-anwụ anwụ n’ihi na anyị ketara ọnwụ n’aka nwoke mbụ dịrị ndụ n’ụwa. Nwoke a bufere anyị ọnwụ n’ihi na o nupụụrụ Onye kere ya isi.—Gụọ Jenesis 1:27; 2:15-17.