Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent

Mụta Ihe n’Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent

“O nyere otu onye talent ise, nye onye nke ọzọ abụọ, nyekwa onye nke ọzọ otu.”—MAT. 25:15.

1, 2. Gịnị mere Jizọs ji tụọ ilu banyere talent?

JIZỌS tụrụ ilu banyere talent iji mee ka ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ghọta ọrụ o nyere ha. Anyị kwesịrị ịghọta ihe ilu a pụtara n’ihi na ọ gbasara Ndị Kraịst niile, ma hà nwere olileanya ịga eluigwe ma ọ̀ bụ ibi n’ụwa.

2 Jizọs tụrụ ilu banyere talent mgbe ọ na-aza ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ gbasara ‘ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ usoro ihe a.’ (Mat. 24:3) N’ihi ya, o so n’ihe ndị ga-egosi na Jizọs achịwala n’eluigwe, ọ na-emezukwa n’oge anyị a.

3. Olee ihe ndị anyị mụtara n’ilu ndị ahụ Jizọs tụrụ na Matiu isi 24 na 25?

3 Mgbe Jizọs tụụrụ ndị na-eso ụzọ ya ilu banyere talent, ọ tụrụ ilu atọ ọzọ so n’ihe ịrịba ama nke oge ikpeazụ a. Ilu ahụ niile gosiri àgwà dị iche iche ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị inwe. E dere ilu ndị ahụ malite na Matiu 24:45 ruo 25:46. Ilu nke mbụ kwuru banyere ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ya bụ, ụmụnna ole na ole e tere mmanụ, ndị e nyere ọrụ ịkụziri ndị Jehova ihe n’oge ikpeazụ a. Ha kwesịrị ikwesị ntụkwasị obi, nweekwa uche. Ilu nke abụọ kwuru banyere ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. Jizọs ji ilu ahụ dọọ ndị niile e tere mmanụ aka ná ntị na ha kwesịrị ịdị njikere, na-echekwa nche n’ihi na ha amaghị ụbọchị ma ọ bụ oge awa ọ ga-abịa. Ilu nke atọ Jizọs tụrụ bụ banyere talent. O ji ya kụziere ndị e tere mmanụ na ha kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike n’ọrụ o nyere ha. Ilu ikpeazụ Jizọs tụụrụ ha bụ gbasara ndị nwere olileanya ibi n’ụwa, ya bụ, ilu banyere ndị bụ́ atụrụ na ndị bụ́ ewu. O kwuru na ha kwesịrị iji obi ha niile na-akwado ndị e tere mmanụ, ya bụ, ụmụnna Jizọs ndị nọ n’ụwa. * Ka anyị leba anya n’ihe ilu banyere talent ahụ pụtara.

NNA UKWU AHỤ NYERE NDỊ OHU YA EGO BURU IBU

4, 5. Ònye bụ nwoke ahụ ma ọ bụ nna ukwu ahụ Jizọs kwuru okwu ya? Gịnị bụ otu talent?

4 Gụọ Matiu 25:14-30. O teela akwụkwọ anyị kwuru na ọ bụ Jizọs bụ nwoke ahụ ma ọ bụ nna ukwu ahụ nakwa na ọ gawara mba ọzọ mgbe ọ laghachiri eluigwe n’afọ 33. N’ilu Jizọs bu ụzọ tụọ, o kwuru ihe mere o ji gawa mba ọzọ. Ọ sịrị na ọ bụ ka “ọ gaa nweta ike ọchịchị.” (Luk 19:12) Ọ bụghị ozugbo Jizọs ruru eluigwe ka ọ malitere ịchị n’Alaeze Chineke. * Kama, ọ nọdụrụ ala “n’aka nri Chineke, malite mgbe ahụ gaa n’ihu, ọ nọ na-echere ruo mgbe a ga-edebe ndị iro ya ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ ya.”—Hib. 10:12, 13.

5 Nwoke ahụ e kwuru okwu ya n’ilu ahụ nwere talent asatọ. N’oge ochie, ọ bụ nnukwu ego. * Tupu ọ gawa mba ọzọ, o kere ndị ohu ya talent ndị ahụ, buru n’obi na ha ga-eji ya zụọ ahịa ma ọ gawa mba ọzọ. Dị ka nwoke ahụ, Jizọs nwere ihe bara ezigbo uru tupu ọ gawa eluigwe. Gịnị bụ ihe ahụ? Ọ bụ ọrụ ahụ ọ rụrụ mgbe ọ nọ n’ụwa.

6, 7. Gịnị ka talent ndị ahụ nọchiri anya ya?

6 Jizọs weere ikwusa ozi ọma ka ọrụ kacha mkpa. (Gụọ Luk 4:43.) Ozi ọma o kwusara mere ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Ma, ọ ma na ọrụ a ka ga-arụ buru ibu nakwa na ọtụtụ ndị ga-anabata ozi ọma. Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Welienụ anya unu lee ubi, na ihe a kụrụ na ha achaala maka owuwe ihe ubi.” (Jọn 4:35-38) Ọ na-ekwu banyere ịchịkọta ọtụtụ ndị ọzọ ga-abụ ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụrụ na ihe a kụrụ n’ubi achaa, ezigbo onye ọrụ ubi agaghị ahapụ ya ka ọ laa n’iyi. Jizọs mere ka ezigbo onye ọrụ ubi. Tupu ya alaghachi eluigwe, o nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m.” (Mat. 28:18-20) Otú ahụ ka Jizọs si nye ha akụ̀ bara ezigbo uru, ya bụ, ikwusa ozi ọma.—2 Kọr. 4:7.

7 Gịnịzi ka anyị ga-aghọta n’ihe a? Ebe ọ bụ na Jizọs nyere ndịozi ya ọrụ ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya, e nwere ike ikwu na ihe o mere mgbe ahụ bụ inyefe ha “ihe ndị o nwere,” ya bụ, talent ya. (Mat. 25:14) N’ihi ya, talent ndị ahụ bụ ọrụ o nyere ha, nke bụ́ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya.

8. N’agbanyeghị na talent ole nna ukwu ahụ nyere ndị ohu ya dị iche iche, gịnị ka ọ chọrọ ka ha mee?

8 N’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere talent, o kwuru na nna ukwu ahụ nyere otu ohu ya talent ise, nye onye nke ọzọ talent abụọ, nyekwa onye nke atọ otu talent. (Mat. 25:15) Ọ bụ eziokwu na talent ole nna ha ukwu nyere ha dị iche iche, o bu n’obi na ha niile ga-agbalịsi ike jiri talent ndị ahụ zụọ ahịa, ya bụ, na ha ga-eji ike ha niile na-eje ozi. (Mat. 22:37; Kọl. 3:23) Malite n’ụbọchị Pentikọst nke afọ 33, ndị na-eso ụzọ Kraịst malitere iji talent ndị ahụ na-arụ ọrụ Nna ha ukwu. Akwụkwọ Ọrụ Ndịozi kọọrọ anyị otú ha si jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ozi ọma, na-emekwa ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. *Ọrụ 6:7; 12:24; 19:20.

OTÚ NDỊ OHU AHỤ SI JIRI TALENT NDỊ AHỤ ZỤỌ AHỊA N’OGE IKPEAZỤ A

9. (a) Olee ihe ohu abụọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi ji talent e nyere ha mee, oleekwa ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ha mere? (b) Gịnị ka “atụrụ ọzọ” na-eme?

9 Kemgbe oge ikpeazụ a, nke ka nke, malite n’afọ 1919, Ndị Kraịst e tere mmanụ kwesịrị ntụkwasị obi nọ n’ụwa ji talent ndị ahụ Nna ha ukwu nyere ha na-azụ ahịa. Ụmụnna e tere mmanụ, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, na-eme ka ohu abụọ mbụ ahụ Jizọs kwuru banyere ha n’ilu ya. Ha ji ike ha niile na-ekwusa ozi ọma. Ọ baghị uru ichewe banyere onye e nyere talent ise na onye e nyere talent abụọ. N’ilu ahụ, ohu abụọ ahụ rụsiri ọrụ ike ma mee ka talent ha dịzie okpukpu abụọ. Ò nwere otú ihe a si gbasa ndị nwere olileanya ibi n’ụwa? Eenụ. Ilu Jizọs tụrụ banyere atụrụ na ewu na-akụziri anyị na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa nwere ihe ùgwù iji obi ha niile na-akwado ụmụnna Jizọs e tere mmanụ n’ozi ọma ha na-ekwusa. N’oge ikpeazụ a tara akpụ, ndị e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” bụ “otu ìgwè atụrụ.” Ha niile ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Jọn 10:16.

10. Olee otu n’ime ihe na-egosi na Jizọs na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke?

10 Jizọs tụrụ anya na ndị na-eso ụzọ ya ga-arụpụta ezigbo ihe. Dị ka anyị kwuru na mbụ, Ndị Kraịst oge mbụ kwesịrị ntụkwasị obi gbasiri mbọ ike ka ọtụtụ ndị bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Gịnị na-eme n’oge ikpeazụ a, bụ́ mgbe ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara talent ahụ na-emezu? Ndị na-eso ụzọ Jizọs kwesịrị ntụkwasị obi ji obi ha niile na-ekwusa ozi ọma karịa otú e kwusatụrụla ya. Otú ha si arụsi ọrụ ike emeela ka a na-eme ọtụtụ narị puku ndị ọhụrụ baptizim kwa afọ, ha esoro na-ekwusa ozi ọma. Ihe a niile na-egosi na ikwusa ozi ọma so n’ihe gosiri na Jizọs na-achị ugbu a n’Alaeze Chineke. O doro anya na ihe a niile na-eme ya obi ụtọ.

Kraịst nyere ndị na-ejere ya ozi ọrụ bara ezigbo uru, nke bụ́ ikwusa ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

OLEE MGBE NNA UKWU AHỤ GA-ABỊA?

11. Gịnị mere anyị ji kwuo na ọ bụ n’oge oké mkpagbu ahụ ka Jizọs ga-abịa ka ya na ndị ohu ya mee mpịazi?

11 Jizọs ga-abịa ka ya na ndị ohu ya “mee mpịazi” ná ngwụcha oké mkpagbu ahụ dị ezigbo nso. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? N’amụma ahụ Jizọs buru na Matiu isi 24 na 25, o kwuru ugboro ugboro banyere ọbịbịa ya. Mgbe ọ na-ekwu banyere ikpe ọ ga-ekpe n’oge oké mkpagbu ahụ, o kwuru na ndị mmadụ ‘ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.’ Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya bi n’oge ikpeazụ ka ha na-eche nche. Ọ sịrị: “Unu amaghị ụbọchị Onyenwe unu ga-abịa.” Ọ sịkwara ha: “Ọ bụ n’oge awa unu na-echeghị na ọ ga-abụ ka Nwa nke mmadụ ga-abịa.” (Mat. 24:30, 42, 44) N’ihi ya, mgbe Jizọs kwuru na “nna ukwu nke ndị ohu ahụ lọtara, ya na ha wee mee mpịazi,” o doro anya na ọ na-ekwu banyere mgbe ọ ga-abịa ikpe ndị mmadụ ikpe na ibibi ụwa Setan. *Mat. 25:19.

12, 13. (a) Olee ihe nna ukwu ahụ gwara ohu nke mbụ na nke abụọ? (b) Olee mgbe a ga-aka ndị e tere mmanụ akara ikpeazụ? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Ndị A Kara Akara Tupu Ha Anwụọ.”) (ch) Olee ụgwọ ọrụ ndị bụ́ atụrụ ga-enweta?

12 N’ilu ahụ, Jizọs kwuru na mgbe nna ukwu ahụ bịara, ọ chọpụtara na ohu nke mbụ na nke abụọ kwesịrị ntụkwasị obi. Onye nke e nyere talent ise enwetala ise ọzọ, nke e nyere talent abụọ enweta abụọ ọzọ. Nna ha ukwu gwara onye nke ọ bụla, sị: “I mere nke ọma, ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi! I kwesịrị ntụkwasị obi n’ilekọta ihe ole na ole. M ga-eme gị onye na-elekọta ọtụtụ ihe.” (Mat. 25:21, 23) Gịnị ka Jizọs, bụ́ Nna anyị ukwu, ga-eme mgbe ọ ga-abịa ikpe ikpe n’ọdịnihu?

13 Ohu nke mbụ na nke abụọ nọchiri anya Ndị Kraịst e tere mmanụ na-arụsi ọrụ ike. Tupu oké mkpagbu ahụ amalite, a ga-aka ndị a e tere mmanụ akara ikpeazụ. (Mkpu. 7:1-3) Tupu Amagedọn ebido, Jizọs ga-enye ha ụgwọ ọrụ ha n’eluigwe. Ọ ga-ekwu na ndị nwere olileanya ibi n’ụwa bụ atụrụ n’ihi na ha kwadoro ụmụnna ya e tere mmanụ n’ozi ọma ha kwusara. N’ihi ya, ọ ga-eme ka ha nwee ihe ùgwù ibi n’ụwa mgbe Alaeze ya ga na-achị.—Mat. 25:34.

AJỌ OHU DỊ UMENGWỤ

14, 15. Ihe Jizọs kwuru ọ̀ pụtara na ọtụtụ ndị e tere mmanụ ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ? Kọwaa.

14 N’ilu ahụ, ohu nke ikpeazụ gara zoo talent ya n’ala kama iji ya zụọ ahịa ma ọ bụ nye ya ndị na-echekwa ego. Ihe a o mere adịghị mma n’ihi na ọ kpachaara anya mee ihe ghọrọ nna ya ukwu ahịa. Nna ya ukwu kpọrọ ya “ajọ ohu dị umengwụ” ma nara ya talent ahụ, nye ya ohu ahụ nwere talent iri. A tụpụrụ ohu a na-abaghị uru “n’ọchịchịrị dị n’èzí.” “N’ebe ahụ ka ọ ga-akwa ákwá ma taa ikikere ezé.”—Mat. 25:24-30; Luk 19:22, 23.

15 Ebe ọ bụ na otu n’ime ndị ohu atọ ahụ zoro talent ya n’ala, ọ̀ pụtara na Jizọs na-ekwu na e kee ndị na-eso ụzọ ya ụzọ atọ, otu ụzọ ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ? Mbanụ. Chegodị ihe ndị ọzọ Jizọs kwuru. N’ilu ọ tụrụ gbasara ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, o kwuru banyere ajọ ohu nke tiri ndị ohu ibe ya ihe. Ihe ahụ o kwuru apụtaghị na ọ na-ebu amụma na ụfọdụ ndị ohu ya ga-abụ ajọ ohu. Kama, o ji ya dọọ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi aka ná ntị ka ha ghara ịkpa àgwà ka ajọ ohu ahụ. Otú ahụkwa ka ọ dị n’ilu Jizọs tụrụ gbasara ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke. Ihe o kwuru apụtaghị na e kee ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ ụzọ abụọ, na otu ụzọ ga-eme ka ụmụ agbọghọ ise ahụ dị nzuzu. Kama, o ji ya dọọ ndị e tere mmanụ aka ná ntị banyere ihe nwere ike ime ma ọ bụrụ na ha akwụsị iche nche ma ghara ịdị njikere. * N’ihi ya, n’ilu ahụ Jizọs tụrụ banyere talent, ihe ọ na-ekwu abụghị na ọtụtụ ndị e tere mmanụ n’oge ikpeazụ a ga-abụ ajọ ohu dị umengwụ. Kama, Jizọs na-adọ ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ aka ná ntị ka ha na-arụsi ọrụ ike, ya bụ, ka ha jiri talent ha “zụọ ahịa” ma ghara ime ka ajọ ohu ahụ.—Mat. 25:16.

16. (a) Olee ihe ndị anyị mụtara n’ilu Jizọs tụrụ gbasara talent? (b) Olee otú isiokwu a si mee ka anyị ghọtakwuo ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara talent? (Kwuo ihe dị n’igbe bụ́ “ Otú Anyị Kwesịrị Isi Ghọta Ilu Jizọs Tụrụ Banyere Talent.”)

16 Olee ihe abụọ anyị mụtara n’ilu ahụ Jizọs tụrụ gbasara talent? Nke mbụ bụ na Nna ukwu ahụ bụ́ Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ akụ̀ bara ezigbo uru, ya bụ, ọrụ ikwusa ozi ọma na ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. Nke abụọ bụ na Jizọs chọrọ ka anyị niile na-ekwusasi ozi ọma ike. Anyị mee otú ahụ, obi kwesịrị isi anyị ike na Nna anyị ukwu ga-akwụ anyị ụgwọ maka na anyị nwere okwukwe, na-eche nche ma kwesị ntụkwasị obi.—Mat. 25:21, 23, 34.

^ para. 3 A kọwara onye bụ́ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche, n’Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, peeji nke 21-22, paragraf nke 8-10. Isiokwu bu nke a ụzọ kọwara ndị bụ́ ụmụ agbọghọ iri ahụ na-amaghị nwoke. A kọwara ilu banyere atụrụ na ewu n’Ụlọ Nche October 15, 1995, peeji nke 23-28, nakwa n’isiokwu a na nke na-eso ya.

^ para. 5 N’oge Jizọs nọ n’ụwa, otu talent bụ ihe dị ka puku dinarịọs isii. A na-akwụ onye ọrụ otu dinarịọs n’ụbọchị. Ọ pụtara na mmadụ ga-arụ ọrụ iri afọ abụọ tupu ya arụta otu talent.

^ para. 8 Mgbe ndịozi Jizọs nwụchara, Setan mere ka ọtụtụ ndị dapụ n’ezi ofufe. Ruo ọtụtụ narị afọ, e nweghị ezigbo mbọ a gbara iji kwusaa ozi ọma. Ma, a maliteghachiri ikwusa ozi ọma n’oge “owuwe ihe ubi,” ya bụ, n’oge ikpeazụ a. (Mat. 13:24-30, 36-43) Gụọ Ụlọ Nche Julaị 15, 2013, peeji nke 9 ruo 12.

^ para. 15 Gụọ paragraf nke 13 n’isiokwu bụ́ “Ị̀ Ga ‘Na-eche Nche’?” n’Ụlọ Nche a.