Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLEE IHE Ị GA-EME KA Ị KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ?

Nchegbu Gbasara Ezinụlọ

Nchegbu Gbasara Ezinụlọ

Janet kwuru, sị: “Obere oge papa m nwụchara, di m gwara m na o nwere nwaanyị ya na ya na-akpa. Mgbe obere oge gachara, ọ gwaghị m ihe ọ bụla ọzọ, ya ewekọrọ uwe ya, hapụ mụ na ụmụ anyị abụọ.” Janet chọtara ọrụ, ma, ihe a na-akwụ ya anaghị ezuru ya iji lekọta ụmụaka ha. O nwekwara ihe ọzọ na-aka enye ya nsogbu. Janet kwuru, sị: “Abịara m na-echegbu onwe m n’ihi na naanị m na-arụzi ọrụ nne na nna kwesịrị ịrụ. Ọ na-ewute m na enweghị m ike inye ụmụ m ihe niile dị ha mkpa otú nne na nna ndị ọzọ si enye ụmụ ha. M na-echegbukwa onwe m gbasara otú ndị ọzọ si ele mụ na ụmụ m anya. Amaghị m ma hà na-eche na ihe mere di m ji hapụ anyị si m n’aka.”

Janet

Ekpere nyeere Janet aka ya akwụsị ịna-echegbu onwe ya, ya na Chineke adịkwuokwa ná mma. Janet kwuru, sị: “M na-aka echegbu onwe m n’abalị ma ebe niile daa jụụ. Ma, m kpee ekpere, gụọkwa Baịbụl, m na-enwe ike ihi ụra. Ebe na-akacha atọ m ụtọ na Baịbụl bụ Ndị Filipaị 4:6, 7. Ebe ahụ sịrị: ‘Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.’ Ọ na-abụ m kpechaa ekpere n’abalị, Jehova emee ka obi ruo m ala.”

N’otu oge Jizọs na-ezi ndị mmadụ ihe n’elu ugwu, o kwuru ihe ga-enyere anyị aka ma e nwee ihe na-echegbu anyị. Ọ sịrị: “Nna unu maara ihe ndị na-akpa unu tupu unu arịọ ya.” (Matiu 6:8) Anyị kwesịkwara ịrịọ ya ka o nyere anyị aka. Ihe kacha mkpa anyị ga-eme iji ‘bịaruo Chineke nso’ bụ ikpe ekpere. Anyị bịaruo ya nso, ‘ọ ga-abịarukwa anyị nso.’—Jems 4:8.

E nwekwara uru ọzọ ekpere na-abara anyị ma e wezụga ime ka obi ruo anyị ala. Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere,” na-emekwara ndị niile nwere okwukwe na ya ihe ha na-arịọ ya. (Abụ Ọma 65:2) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị na-eso ụzọ ya “ka ha na-ekpe ekpere mgbe niile ma ghara ịda mbà.” (Luk 18:1) Anyị kwesịrị ịnọgide na-arịọ Chineke ka o nyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme mgbe ihe siiri anyị ike, ma nwee okwukwe na ọ ga-aza ekpere anyị. Anyị ekwesịghị inwewe obi abụọ ma ọ̀ dịkwa Chineke n’obi ịza ekpere anyị ma ọ bụkwanụ ma ọ̀ ga-azali ya. Anyị si otú a na-ekpe “ekpere n’akwụsịghị akwụsị,” anyị na-egosi na okwukwe anyị siri ike.—1 Ndị Tesalonaịka 5:17.

OTÚ ANYỊ GA-ESI EGOSI NA ANYỊ NWERE OKWUKWE

Gịnịdị ka mmadụ inwe okwukwe pụtara? Ihe so n’ihe anyị ga-eme tupu a sị na anyị nwere okwukwe bụ ‘ịmata’ onye Chineke bụ. (Jọn 17:3) Anyị ga-ebu ụzọ mụọ Baịbụl mata ihe bụ uche Chineke. Anyị ga-amụta na Chineke na-ahụ onye ọ bụla n’ime anyị nakwa na ọ chọrọ inyere anyị aka. Ma, ọ bụghị naanị ịmụta gbasara Chineke ga-egosi na anyị nwere okwukwe siri ike. Kama, anyị ga na-akwanyekwara Chineke ùgwù ma gbalịa ka anyị na ya bụrụ enyi. Anyị chọọ ka anyị na mmadụ bụrụ enyi, anyị ga-agbarịrị mbọ na-akpakwu ya nso. ‘Okwukwe anyị ga-adị ukwuu karị’ ma ọ bụrụ na anyị na-amụtakwu gbasara Chineke, “na-eme ihe dị ya mma,” ma na-ahụkwa otú o si enyere anyị aka. (2 Ndị Kọrịnt 10:15; Jọn 8:29) Ọ bụ ụdị okwukwe a mere ka Janet kwụsị ịna-echegbu onwe ya.

Janet kwuru, sị: “Ihe kacha nyere m aka inwekwu okwukwe bụ na m na-ahụ otú Jehova si enyere m aka ná nsogbu m niile. O nwere ọtụtụ mgbe a na-emegbu anyị, ya adị m ka nke anyị na-eme ọ̀ gwụla. Ma ọ na-abụ, anyị kọọrọ Jehova mkpa anyị ugboro ugboro, ya esi otú m na-atụghị anya ya za anyị ekpere. Mgbe m na-ekele Jehova, m na-echeta ọtụtụ ihe ọma ndị o meerela m. Ọ na-enye anyị ihe anyị chọrọ mgbe ọ ga-akacha abara anyị uru. O meela ka m nwee ezigbo ndị enyi, ma ụmụnna ndị nwoke ma ndị nwaanyị. Ha na-enyere mụ na ụmụ m aka mgbe niile. Ụmụ m na-amụtakwa ihe n’àgwà ọma ha.” *

“Ama m ihe mere Jehova ji kwuo na Malakaị 2:16 na ya ‘kpọrọ ịgba alụkwaghịm asị.’ Di ma ọ bụ nwunye hapụ ibe ya, gbakwuru nwoke ọzọ ma ọ bụ nwaanyị ọzọ, obi na-agbawa onye nke aka ya dị ọcha. Ọtụtụ afọ agaala kemgbe di m hapụrụ m, ma owu ka na-ama m, ya ana-adịkwa m ka o nweghị uru m bara. Mgbe ọ bụla ọ dị m otú a, m na-agbalị chọọ ihe m ga-eme ga-abara onye ọzọ uru. Ihe a m na-eme na-enyere m aka.” Baịbụl gwara anyị ka anyị ghara ịna-akpa iche. Ime ihe a Baịbụl kwuru nyeere Janet aka, ya aghara ịna-echegbu onwe ya. *Ilu 18:1.

Chineke bụ “nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.”—Abụ Ọma 68:5

Janet kwukwara, sị: “Ihe kacha nyere m aka bụ ịmata na Chineke bụ ‘nna nke ụmụ na-enweghị nna nakwa onyeikpe nke ndị inyom di ha nwụrụ.’ Ama m na o mekataghị hapụ m otú di m mere.” (Abụ Ọma 68:5) Janet ma na Chineke anaghị eji “ihe ọjọọ” ele mmadụ ule. Kama, ọ na-enye anyị niile amamihe na “ike karịrị ike nkịtị” ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị maka nsogbu ọ bụla bịaara anyị.—Jems 1:5, 13; 2 Ndị Kọrịnt 4:7.

Ma, gịnị ga-enyere anyị aka ma ọ bụrụ na anyị na-echegbu onwe anyị maka ihe ọjọọ nwere ike ime anyị?

^ para. 10 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị, gụọ ihe e kwuru n’isiokwu ndị mbụ gbara na Teta! Septemba–Ọktoba 2015, nke isiokwu ya bụ “Ndụ Gị Ọ̀ Dị Otú Ị Chọrọ Ka Ọ Dịrị?” Ọ dịkwa na www.pr418.com/ig.