Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Olee otú ụmụ mmadụ si bido ime ihe ọjọọ?

Ònye nwara Jizọs ka o mee ihe na-adịghị mma?Matiu 4:8-10

Ọ na-agụ ọtụtụ ndị agụụ ka ha na ndị ọzọ na-adị n’udo, nakwa ka ha na-akwụwa aka ọtọ ma na-eme obiọma. Gịnịzi mere ime ihe ike, mmegbu na arụrụala ji ju ebe niile? A na-anụ akụkọ ndị na-awụ akpata oyi n’ahụ́ n’ebe niile. È nwere onye na-eme ka ndị mmadụ na-akpa àgwà ọjọọ ndị a?—Gụọ 1 Jọn 5:19.

Chineke ò kere ndị mmadụ ka ha na-eme ihe ọjọọ? Mbanụ. Jehova Chineke kere anyị n’onyinyo ya, ya bụ, otú anyị ga-enwe ike ịhụ ndị ọzọ n’anya dị ka yanwa si hụ anyị n’anya. (Jenesis 1:27; Job 34:10) Ma, Chineke kwanyekwaara anyị ùgwù, nye anyị ikike ikpebi ihe anyị ga na-eme. Nne na nna anyị mbụ kpebiri ime ihe ọjọọ. Ha jụrụ ime ka Chineke, ghọzie ndị na-ezughị okè. Anyị si n’aka ha keta mmehie.—Gụọ Diuterọnọmi 32:4, 5.

Ò nwere mgbe ụmụ mmadụ ga-akwụsị ime ihe ọjọọ?

Chineke chọrọ ka anyị ghara ịna-eme ihe ọjọọ. (Ilu 27:11) Ọ bụ ya mere o ji na-akụziri anyị otú anyị ga-esi ghara ịna-eme ihe ọjọọ nakwa otú anyị ga-esi na-enwe ezigbo obi ụtọ. Ka ọ dịgodị, anyị agaghị ahụli ndị ọzọ n’anya otú Chineke si hụ anyị n’anya.—Gụọ Abụ Ọma 32:8.

E nwere ihe mere Chineke ji ka gba nkịtị ihe ọjọọ eju ebe niile. Ọ chọrọ ka mmadụ niile hụ nsogbu ndị ime ihe ọjọọ na-akpata. (2 Pita 3:7-9) Ma, n’oge na-adịghị anya, ndị ga-ebi n’ụwa ga-abụ naanị ndị na-erubere Chineke isi ma na-enwe obi ụtọ.—Gụọ Abụ Ọma 37:9-11.