Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara

Ndụ a anyị dị ugbu a, ọ̀ gwụla ya bụ ndụ anyị nwere ike ịdị?

Ò nwere mgbe ọ na-adị gị ka ànyị kwesịrị ịna-adịtekwu ndụ aka?

Ò nwetụla mgbe i chere ma ihe mere anyị ji dịrị ndụ ọ̀ bụ naanị ka anyị gwuo egwu, rụọ ọrụ, lụọ di ma ọ bụ nwunye, mụọ ụmụ, zụọ ha ma kaa nká? (Job 14:1, 2) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na e nwedịrị ndị maara ihe chetụkwarala ụdị ihe a.—Gụọ Ekliziastis 2:11.

Ndụ anyị dị ò nwere isi? Anyị ga-amata ma anyị bu ụzọ chọpụta otú ụmụ mmadụ si bido dịwa ndụ. Mgbe ọtụtụ ndị leruchara anya n’otú ụbụrụ anyị na akụkụ ahụ́ anyị ndị ọzọ si arụ ọrụ, ha kwubiri na a ga-enwerịrị Onye kere anyị nakwa na onye ahụ ma ihe. (Gụọ Abụ Ọma 139:14.) Ọ bụrụ na e nwere Onye kere anyị, ọ ga-abụrịrị na e nwere ihe mere o ji kee anyị. Anyị mata ihe mere o ji kee anyị, ndụ anyị ga-enwe isi.

Gịnị mere e ji kee mmadụ?

Chineke kere nwoke na nwaanyị mbụ ma nye ha ọrụ ga na-eme ha obi ụtọ. O bu n’obi ka ha mụjupụta ụwa, mee ka ọ ghọọ paradaịs ma dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.—Gụọ Jenesis 1:28, 31.

Ihe a niile emezubeghị n’ihi na nne na nna anyị mbụ nupụụrụ Chineke isi. Ma, Chineke ajụghị anyị. Ọ ka ga-emere anyị ihe o bu n’obi kee anyị, meekwa ka ụwa dịrị otú ọ chọrọ. Baịbụl gwara anyị na Chineke na-arụ ọrụ kemgbe iji zọpụta ndị na-erubere ya isi nakwa na ụwa a ga-emecha dịrị otú ọ chọrọ ka ọ dị. Chineke chọrọ ka i soro ná ndị ga-adị ndụ ebighị ebi. (Gụọ Abụ Ọma 37:29.) Gbalịa na-amụ Baịbụl ka ị mata ihe ị ga-eme iji dịrị ndụ otú Chineke bu n’obi.