Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | OLE NDỊ BỤ NDỊÀMÀ JEHOVA?

Gịnị Mere Anyị Ji Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma?

Gịnị Mere Anyị Ji Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma?

O nwere ike ịbụ na ihe a kacha jiri mara anyị bụ ozi ọma anyị na-ezi ebe niile. Anyị na-aga n’ụlọ ndị mmadụ, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị nakwa n’ebe ọ bụla anyị nwere ike ịhụ mmadụ, zie ha ozi ọma. Gịnị mere anyị ji eme ya?

Ndịàmà Jehova na-ezi ozi ọma iji too Chineke na iji mee ka a mara aha ya. (Ndị Hibru 13:15) Ihe ọzọkwa bụ na anyị chọrọ ime ihe Jizọs Kraịst gwara anyị mee. Ọ gwara anyị, sị: “Gaanụ mee ndị mba niile ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ m, . . . Na-ezi ha ka ha debe ihe niile m nyere unu n’iwu.”—Matiu 28:19, 20.

Anyị na-ezikwa ndị agbata obi anyị ozi ọma n’ihi na anyị hụrụ ha n’anya. (Matiu 22:39) Anyị ma na ọtụtụ ndị nwere chọọchị nke ha na-aga nakwa na ọ bụghị mmadụ niile na-achọ ige ntị n’ozi ọma anyị na-ezi. Ma, anyị kweere na ihe Baịbụl na-ekwu na-azọ mmadụ ndụ. Ọ bụ ya mere anyị ji “na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, na-ezisa ozi ọma banyere Kraịst,” otú ndị mbụ soro ụzọ Jizọs mere.—Ọrụ Ndịozi 5:41, 42.

Otu nwoke aha ya bụ Antonio Cova Maduro, onye bụ́ ọkà mmụta n’ihe gbasara mmekọrịta ọhaneze, dere na ‘Ndịàmà Jehova na-ata ezigbo ahụhụ ebe ha na-agba mbọ ka ihe odide dị nsọ rute n’ebe kasị anya n’ụwa.’—Ihe a gbara n’akwụkwọ akụkọ ndị Venezuwela a na-akpọ El Universal

Ọtụtụ ndị na-agụ akwụkwọ anyị abụghị Ndịàmà Jehova. Ọtụtụ nde ndị anyị na ha na-amụ Baịbụl na-aga chọọchị ọzọ. Ma, ozi ọma anyị na-ezi ha na-atọ ha ụtọ.

Ọ bụrụ na e nwere ihe ndị ọzọ ị chọrọ ịma gbasara Ndịàmà Jehova, biko

  • Jụọ Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ.

  • Gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ www.pr418.com/ig.

  • Gaa ọmụmụ ihe anyị. Onye ọ bụla nwere ike ịbịa ya, o nweghịkwa onye a na-ana ego.