Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | ỊKWỤWA AKA ỌTỌ Ọ̀ BARA URU?

Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

Ọ̀ Ka Bara Uru Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

E nwere otu nwoke aha ya bụ Hitoshi. Ọ na-arụ na ngalaba na-edekọ mkpata na mmefu n’otu ụlọ ọrụ na-achọtara ndị mmadụ ọrụ na Japan. Mgbe ya na otu n’ime ndị isi ha na-eleba anya n’akwụkwọ ha ji edekọ ego, onyeisi ha ahụ gwara ya ka o dee ego ole dị́ iche n’ihe ha gbakọtara. Hitoshi gwara ya na akọnuche ya agaghị ekwe ya dee ihe na-abụghị eziokwu. Onyeisi ya ahụ gwaziri ya na ọ ga-achụ ya n’ọrụ. O mechakwara chụọ ya n’ọrụ.

Mgbe ọnwa ole na ole gachara, obi jọwara Hitoshi njọ n’ihi na ọ maghị ma ọ̀ ga-achọtakwa ọrụ ọzọ. N’otu oge ọ gara ka ụlọ ọrụ na-ewe mmadụ n’ọrụ gbaa ya ajụjụ ọnụ, ọ gwara onye na-agba ya ajụjụ ọnụ na ya agaghị arụ ọrụ ọ bụla a na-anaghị akwụwa aka ọtọ na ya. Onye ahụ gwara ya na ọ maghị ebe a nọ. Ndị ezinụlọ Hitoshi na ndị enyi ya gbara ya ume ka ọ nọgide na-akwụwa aka ọtọ. Ma, o bidoro nwewe obi abụọ. O kwuru, sị: “M bịara na-eche ma ọ̀ ka baara m uru ịna-agwa ndị ọzọ na m na-enwe mmasị ịkwụwa aka ọtọ.”

Ihe a mere Hitoshi gosiri na ọ bụghị mmadụ niile na-enwe mmasị ịkwụwa aka ọtọ. Ụfọdụ ndị na-ewere na ịkwụwa aka ọtọ ga-eme ka ahịa ha ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ ha na-eme na-agba ọnyụpaa. Otu nwaanyị na Saụt Afrịka kwuru na ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ anaghị akwụwa aka ọtọ nakwa na mgbe ụfọdụ, ọ na-afọ obere ka o mee ka ọ ghara ịkwụwa aka ọtọ.

O nwere ọtụtụ ihe mmadụ ga-eme, a sị na onye ahụ akwụwaghị aka ọtọ. Otu n’ime ha ndị mmadụ kacha eme bụ ịgha ụgha. O nwere ihe Robert S. Feldman na ndị òtù ya chọpụtara n’otu nchọnchọ ha mere n’afọ ole na ole gara aga. Nwoke a bụ ọkà n’akparamàgwà mmadụ. Ha chọpụtara na ụzọ isii n’ime ụzọ iri ndị dimkpa nọ́ n’ụwa na-agha ụgha, ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu ugboro n’ime nkeji iri ọ bụla ha na mmadụ kparịtara ụka. Feldman kwuru, sị: “Ihe a anyị chọpụtara tụrụ m n’anya. O nweghị onye n’ime anyị tụrụ anya na ndị mmadụ ga na-agha ụgha otú a.” Ị̀ hụlanụ na ụgha a ndị mmadụ na-anaghị achọ ka a ghaara ha, so n’ihe ọjọọ ha kacha eme taa?

Gịnị mere ọtụtụ ndị taa ji agha ụgha, ezu ohi, emekwa ihe ndị ọzọ na-egosi na ha anaghị akwụwa aka ọtọ? Olee ihe akwụwaghị aka ọtọ nwere ike ịkpatara anyị? Ajụjụ kadị mkpa bụ, olee otú anyị ga-esi na-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile?