Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | IHE Ị GA-EME MA MMADỤ NWỤNAHỤ GỊ

Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ

Ndị Nwụrụ Anwụ Ga-adị Ndụ Ọzọ

N’isiokwu nke abụọ n’Ụlọ Nche a, Gail kwuru na ya echeghị na ọnwụ Rob di ya ga-apụli ya apụ n’obi. Ma, ọ na-atụ anya ịhụ ya ọzọ n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere nkwa ya. Gail sịrị: “Amaokwu Baịbụl kacha amasị m bụ Mkpughe 21:3, 4.” Ebe ahụ sịrị: “Chineke n’onwe ya ga-anọnyekwara ha. Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.”

Gail kwuru, sị: “Ọ bụ nkwa a na-akasi m obi. Ndị m na-emetere ebere ugbu a bụ ndị na-amaghị na ha nwere ike ịhụ onye nwụnahụrụ ha ọzọ.” Gail na-eme ihe gosiri na o kwenyesiri ike na nkwa a Chineke kwere ga-emezu. Ọ na-aga ozi ọma oge niile, na-akọrọ ndị mmadụ na Chineke kwere nkwa na “ọnwụ agaghị adị ọzọ.”

Obi siri Job ike na ọ ga-adị ndụ ọzọ

I nwere ike ịna-eche ma ihe a ọ̀ ga-ekwekwa omume. Ma, legodị ihe mere otu nwoke a na-akpọ Job. Ezigbo ọrịa jidere ya n’otu oge. (Job 2:7) Ọ bụ eziokwu na o weere na ọ ga-akara ya mma ịnwụ, ma o nwere okwukwe na ya nwụọ, Chineke ga-akpọliteli ya n’ọnwụ, ya adịrịkwa ndụ ọzọ n’ụwa a. Ọ bụ ya mere o ji kwuo, sị: “A sị nnọọ na ị ga-ezobe m na Shiol . . . Ị ga-akpọ òkù, mụ onwe m ga-azakwa gị. N’ihi na agụụ ọrụ aka gị ga-agụsi gị ike.” (Job 14:13, 15) Obi siri Job ike na ya nwụọ, ọ ga-agụsi Chineke agụụ ike ịhụ ya ọzọ na ịkpọlite ya n’ọnwụ.

N’oge na-adịghị anya, mgbe Chineke ga-eme ka ụwa a ghọọ paradaịs, ọ ga-akpọlite ma Job ma ọtụtụ ndị ọzọ nwụrụ anwụ. (Luk 23:42, 43) Baịbụl kwuru n’akwụkwọ Ọrụ Ndịozi 24:15 na “a gaje inwe mbilite n’ọnwụ.” Jizọs gwakwara anyị, sị: “Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge awa na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya, wee pụta.” (Jọn 5:28, 29) Job ga-eso ná ndị Chineke ga-emere ihe a. Ọ ga-enweghachikwa “ike okorobịa” ya, ‘ahụ́ ya adịkwa ọhụrụ karịa otú ọ dị n’oge ọ bụ nwata’ ruo mgbe ebighị ebi. (Job 33:24, 25) Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka a ga-emere ndị niile ga-egosi na ha nwere okwukwe na Chineke ga-emezu nkwa o kwere ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ.

Ọ bụrụ na o nweela onye nwụnahụrụ gị, ime ihe ndị anyị kwuru n’akwụkwọ a nwere ike ọ gaghị eme ka ị kwụsị iru uju kpamkpam. Ma, ịtụgharị uche ná nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl nwere ike ime ka i nwee olileanya na ihe ga-aka mma, meekwa ka i nwee ike ị ga-eji na-eme ihe ndị ọzọ i kwesịrị ime.—1 Ndị Tesalonaịka 4:13.

Ọ bụrụ na ị ga-achọ ịmatakwu ihe ga-enyere gị aka idi ọnwụ onye nwụnahụrụ gị, ma ọ bụkwanụ na ị ga-achọ ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka ihe ọjọọ na ahụhụ dịrị, biko, gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Ị ga-ahụ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ma kasie gị obi.