Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Ekwensu?

Ònye Bụ Ekwensu?

Ònye bụ Ekwensu?

Ị̀ GA-ASỊ na Ekwensu bụ . . .

  • Mmụọ?

  • Ihe ọjọọ dị́ mmadụ n’obi?

  • Ihe ndị mmadụ chere na ọ dị adị?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ekwensu gwara Jizọs okwu ma “nwaa ya ọnwụnwa.” (Matiu 4:1-4) Ihe ọ pụtara bụ na Ekwensu bụ ajọ mmụọ, ọ bụghị ihe ọjọọ dị́ mmadụ n’obi ma ọ bụ ihe ndị mmadụ chere na ọ dị adị.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Ekwensu bụbu mmụọ ozi dị nsọ, mana ‘o guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ọ ghọrọ onye ụgha na onye iro Chineke.

  • Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ sooro Setan nupụrụ Chineke isi.—Mkpughe 12:9.

  • Ekwensu na-eme ka ndị mmadụ ghara ịma na ọ bụ mmụọ dị adị.—2 Ndị Kọrịnt 4:4.

Ekwensu ò nwere ike iduhie mmadụ?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na e nweghị onye bụ́ Ekwensu nke na-eduhie ndị mmadụ. Ma, ụjọ na-atụ ndị ọzọ na ndị mmụọ ọjọọ nwere ike ịbanye n’ime ha na-akpa ike. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ekwensu na-akpa ụmụ mmadụ aka ọjọọ, ma ọ bụghị mmadụ niile ka ọ na-eduhie.

OLEE IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL?

  • Ekwensu na-eji aghụghọ eduhie ndị mmadụ.—2 Ndị Kọrịnt 11:14.

  • Mgbe ụfọdụ, ndị mmụọ ọjọọ na-aba n’ime ụfọdụ ndị, na-eme ha ihe masịrị ha.—Matiu 12:22.

  • Ma Chineke ga-enyeliri gị aka iguzogide Ekwensu.—Jems 4:7.