Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta

Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta

AJỤỌ gị ma ị̀ bụ Onye Kraịst, gịnị ka ị ga-aza? Ị́ sị ee, mara na i so n’ihe karịrị ijeri mmadụ abụọ n’ụwa niile na-asị na ha bụ Ndị Kraịst. Taa, e nwere ọtụtụ puku chọọchị ndị e weere na ha bụ nke Ndị Kraịst, ma, ihe ndị ha na-akụzi na otú ha si ele ihe anya dịcha iche iche. Ọ bụ ya mere ihe i kweere nwere ike iji dịrị iche n’ihe ndị ọzọ sịkwa na ha bụ Ndị Kraịst kweere. Ì kwesịrị ịchọpụta ma ihe i kweere ò ziri ezi? Ee, ma ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ ụdị Onye Kraịst Baịbụl kwuru ka anyị bụrụ.

Ihe a na-akpọ ndị mbụ soro ụzọ Jizọs Kraịst bụ “Ndị Kraịst.” (Ọrụ Ndịozi 11:26) Ebe ọ bụ na ha niile n’oge ahụ kweere n’otu ihe, ọ dịghị mkpa ka e nwee aha ọzọ e ji mara ha. Ha ji otu obi mee ihe Jizọs Kraịst, bụ́ onye malitere okpukpe Ndị Kraịst, kụziiri ha. Ndị chọọchị unu hà na-akụzi ihe Kraịst kụziri? Ihe ha kweere na ihe ndị mbụ soro ụzọ Kraịst kweere ọ̀ bụ otu? Olee ihe ga-enyere gị aka ịmata ihe ndị a? Ọ bụ naanị Baịbụl ga-enyeliri gị aka ịmata ha.

Chebagodịrị ihe a echiche: Jizọs Kraịst ji ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru kpọrọ ihe n’ihi na ọ ma na ọ bụ Okwu Chineke. Ọ kwadoghị ndị na-eleghara ihe Baịbụl kwuru anya ma ọ bụ ndị ji ọdịnala ha kpọrọ ihe karịa ihe Baịbụl kwuru. (Mak 7:9-13) Ihe ọ pụtara bụ na ihe niile ezigbo ndị na-eso ụzọ Jizọs na-akụzi ga-esirịrị na Baịbụl. Ọ bụ ya mere onye ọ bụla kpọrọ onwe ya Onye Kraịst ji kwesị ịjụ onwe ya sị, ‘Ihe niile a na-akụzi na chọọchị m hà si na Baịbụl?’ Ọ bụ Baịbụl ka ị ga-eji amata azịza ajụjụ a.

Jizọs kwuru na ndị Chineke na-anabata ofufe ha bụ ndị na-efe Chineke n’eziokwu, nakwa na ọ bụ na Baịbụl ka eziokwu dị. (Jọn 4:24; 17:17) Pọl onyeozi kwukwara na a ga-azọpụta anyị ma anyị nweta “ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Timoti 2:4) Ọ bụ ya mere anyị kwesịrị iji hụ na ihe ọ bụla anyị kweere si na Baịbụl. Ma ọ́ bụghị ya, a gaghị azọpụta anyị.

OTÚ ANYỊ GA-ESI CHỌPỤTA MA IHE ANYỊ KWEERE NA IHE BAỊBỤL KWURU HÀ BỤ OTU

Biko, gụọ ajụjụ na azịza isii ndị dị n’isiokwu a, gụọkwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ha. Sapeta amaokwu Baịbụl ndị ahụ na Baịbụl nke gị, ma chebara ihe Baịbụl zara echiche. Jụzie onwe gị, sị, ‘Ihe Baịbụl kwuru n’okwu a ọ̀ bụ ihe chọọchị m na-akụzi?’

Ajụjụ na azịza ndị a nwere ike inyere gị aka ịchọpụta ihe kacha mkpa i kwesịrị ịchọpụta. Ọ bụrụkwa na ị chọrọ ịchọpụta ma ihe ndị ọzọ chọọchị unu na-akụzi hà si na Baịbụl, obi ga-adị Ndịàmà Jehova ụtọ iji Baịbụl nyere gị aka. Gbalịa gwa Onyeàmà Jehova ọ bụla ị hụrụ ka gị na ya na-amụ Baịbụl. I nwekwara ike ịga n’adres Ịntanet anyị, bụ́ jw.org/ig, kwuo na ị chọrọ ka gị na Onyeàmà Jehova na-amụ Baịbụl.