Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Gịnị bụ Alaeze Chineke?

ỤFỌDỤ NDỊ NA-EKWU na ọ bụ ihe dị mmadụ n’obi; ndị ọzọ ana-ekwu na ọ bụrụ na ụmụ mmadụ emee ka udo dịrị n’ụwa, mmadụ na ibe ya adịrịkwa ná mma, na alaeze abịala. Gịnị ka i chere?

IHE BAỊBỤL KWURU

“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. . . . Ọ ga-egwepịa alaeze ndị a niile [ụmụ mmadụ hiwere].” (Daniel 2:44) Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • Alaeze Chineke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa.—Matiu 10:7; Luk 10:9.

  • Chineke ga-eji Alaeze ya mezuo uche ya n’eluigwe nakwa n’ụwa.—Matiu 6:10.

Olee mgbe Alaeze Chineke ga-abịa?

OLEE IHE Ị GA-AZA?

  • O nweghị onye ma

  • N’oge na-adịghị anya

  • Echeghị m na ọ ga-abịa

IHE BAỊBỤL KWURU

“A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba niile; mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.” (Matiu 24:14) E kwusachahaala ozi ọma otú Chineke chọrọ, Alaeze Chineke ga-abịa bibie ụwa ọjọọ a.

IHE ỌZỌ ANYỊ GA-AMỤTA NA BAỊBỤL

  • O nweghị onye ma kpọmkwem mgbe Alaeze Chineke ga-abịa.—Matiu 24:36.

  • Amụma ndị dị na Baịbụl na-egosi na Alaeze Chineke ga-abịa n’oge na-adịghị anya.—Matiu 24:3, 7, 12.