Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU ỤLỌ NCHE A | NDỊ MMỤỌ OZI HÀ DỊ ADỊ N’EZIOKWU?

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Gbasara Ndị Mmụọ Ozi

Ị̀ ga-achọ ịma nke bụ́ eziokwu gbasara ndị ndị mmụọ ozi bụ, otú ha si malite na ihe ha na-eme? E nweghị ebe ka mma anyị ga-esi amata nke bụ́ eziokwu ma ọ bụghị na Baịbụl bụ́ Okwu Chineke e ji ike mmụọ nso dee. (2 Timoti 3:16) Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi?

  • Otú ahụ Chineke bụ Mmụọ ka ndị mmụọ ozi bụkwa. Ha “adịghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ.” Ndị mmụọ ozi na-erubere Chineke isi bi n’eluigwe, ha na-ahụkwa Chineke ihu na ihu.​—⁠Luk 24:39; Matiu 18:10; Jọn 4:⁠24.

  • E nwere mgbe ụfọdụ ndị mmụọ ozi bịara n’ụwa n’ụdị mmadụ, gaa ozi Chineke dunyere ha. Mgbe ha gachara, ha ghọghachiri mmụọ ma laghachi n’eluigwe.​—⁠Ndị Ikpe 6:​11-23; 13:​15-20.

  • Na Baịbụl, a na-akọwakarị ndị mmụọ ozi ka ụmụ nwoke. Mgbe ụfọdụ Baịbụl kwuru na ha bịara n’ụwa, ha bịara n’ụdị ụmụ nwoke. Ọ bụ eziokwu na a na-akọwa ndị mmụọ ozi otú a, ha abụghị ụmụ nwoke, ha abụghịkwa ụmụ nwaanyị. Ha anaghị alụ ibe ha. Ha anaghịkwa amụta ndị mmụọ ozi ọzọ. Ihe ọzọ bụ na e bughị ụzọ kee ndị mmụọ ozi n’ụwa a ha abụrụ ụmụaka ma ọ bụ ndị agadi, ha emechazie ghọọ ndị mmụọ ozi. Ọ bụ Jehova kere ndị mmụọ ozi. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji akpọ ha “ụmụ ezi Chineke.”​—⁠Job 1:6; Abụ Ọma 148:​2, 5.

  • Baịbụl kwuru gbasara ‘asụsụ dị iche iche nke ụmụ mmadụ na nke ndị mmụọ ozi.’ Ihe a Baịbụl kwuru gosiri na ndị mmụọ ozi nwere asụsụ ha na-asụ. Ọ bụ eziokwu na o nweela mgbe Chineke si n’aka ndị mmụọ ozi gwa ụmụ mmadụ okwu, ọ chọghị ka anyị na-efe ha ma ọ bụ na-arịọ ha arịrịọ n’ekpere.​—⁠1 Ndị Kọrịnt 13:1; Mkpughe 22:​8, 9.

  • Baịbụl kwuru na e nwere iri puku kwuru iri puku ndị mmụọ ozi. Ọ ga-abụ na ha dị ọtụtụ ijeri ndị mmụọ ozi.​—⁠Daniel 7:10; Mkpughe 5:⁠11.

  • Ndị mmụọ ozi “dị ike nke ukwuu.” Ike ha kagburu nke ụmụ mmadụ akagbu. Ha kakwa ụmụ mmadụ mara ihe. Ha na-agbakwa oké ọsọ. Otú ha si agba ọsọ karịrị otú ụmụ mmadụ nwere ike ichetụ n’echiche.​—⁠Abụ Ọma 103:20; Daniel 9:​20-23.

  • N’agbanyeghị na ndị mmụọ ozi siri ike dị egwu, marakwa ihe karịa ụmụ mmadụ, ọ bụghị ihe niile ka ha ga-emeli. E nwekwara ihe ndị ha na-amaghị.​—⁠Matiu 24:36; 1 Pita 1:⁠12.

  • Chineke kere ndị mmụọ ozi ka ha nwee àgwà ya dị iche iche, nyekwa ha ikike iji aka ha ekpebi ihe ha ga-eme. Ọ pụtara na ndị mmụọ ozi nwere ike ikpebi ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ otú ahụ ọ dịkwa ndị mmadụ. Ma, ọ dị mwute na ụfọdụ ndị mmụọ ozi kpebiri inupụrụ Chineke isi.​—⁠Jud 6.