Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”

“Ihe I Kwere ná Nkwa, Mezuo Ya”

“Mezuo nkwa i kwere Jehova.”—MAT. 5:33.

ABỤ: 63, 59

1. (a) Olee ihe Jefta na Hana mere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

JEFTA bụ onye ndú obi kara na onye agha na-anaghị atụ egwu. Hana, bụ́ nwunye Elkena, abụrụ nwaanyị dị umeala n’obi, onye na-elekọta di ya na ụlọ ya nke ọma. E wezụga na ha abụọ fere otu Chineke, è nwere ihe ọzọ ha mere? Onye nke ọ bụla kwere Chineke nkwa. Ha abụọ mezukwara nkwa ha kwere. Ihe ha mere kwesịrị ịkụziri ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị kwere Jehova nkwa taa ihe. Ma, ajụjụ ndị e kwesịrị ịza bụ: Gịnị ka ikwe Chineke nkwa pụtara? Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji nkwa anyị kwere Chineke gwuo egwu? Olee ihe ndị anyị ga-amụta n’aka Jefta na Hana?

2, 3. (a) Na Baịbụl, gịnị ka ikwe Chineke nkwa pụtara? (b) Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ikwe Chineke nkwa?

2 Na Baịbụl, mmadụ ikwe Chineke nkwa pụtara na onye ahụ ji obi ya niile gwa Chineke na ya ga-arụrụ ya ọrụ, nye ya onyinye, jeere ya ozi, ma ọ bụ ghara ime ihe ụfọdụ. A naghị amanye mmadụ amanye ikwe ụdị nkwa ahụ. Onye ọ bụla na-eji aka ya ekwe ya. Ma, Chineke na-ewere ya ka ihe dị nsọ na ihe onye kwere ya ga-emezurịrị n’ihi na ọ dị ka ebe mmadụ ṅụrụ iyi na e nwere ihe ọ ga-eme ma ọ bụ ihe ọ na-agaghị eme. (Jen. 14:22, 23; Hib. 6:16, 17) Gịnị ka Baịbụl kwuru gosiri na anyị ekwesịghị iji nkwa anyị kwere Chineke gwuo egwu?

3 Iwu Mozis kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ekwe Jehova nkwa ma ọ bụ ṅụọ iyi . . . , ya emebila ihe o kwuru. Dị ka ihe niile si ya n’ọnụ pụta si dị, otú ahụ ka ọ ga-eme.” (Ọnụ Ọgụ. 30:2) Sọlọmọn mechara si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Mgbe ọ bụla i kwere Chineke nkwa, egbula oge imezu ya, n’ihi na ihe ndị nzuzu adịghị atọ ya ụtọ. Ihe i kwere ná nkwa, mezuo ya.” (Ekli. 5:4) Jizọs kwuru ihe gosiri na anyị ekwesịghị iji nkwa anyị kwere Chineke gwuo egwu. Ọ sịrị: “A gwara ndị oge ochie, sị, ‘Aṅụla iyi n’emezughị ya, kama mezuo nkwa i kwere Jehova.’”—Mat. 5:33.

4. (a) Gịnị mere na anyị ekwesịghị iji nkwa anyị kwere Chineke gwuo egwu? (b) Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta gbasara Jefta na Hana?

4 N’ihi ya, o doro anya na ikwe Chineke nkwa abụghị ihe egwuregwu. Otú anyị si ewere nkwa anyị kwere nwere ike ime ka anyị na Jehova dị ná mma ma ọ bụ ghara ịdị ná mma. Devid dere, sị: “Ònye ga-arịgo n’ugwu Jehova, ònyekwa ga-agbago n’ebe nsọ ya? Ọ bụ onye ọ bụla aka ya dị ọcha, onye obi ya dịkwa ọcha, onye . . . na-adịghịkwa aṅụ iyi ụgha.” (Ọma 24:3, 4) Olee nkwa Jefta na Hana kwere Chineke? Ọ̀ dịịrị ha mfe imezu ya?

HA MEZURU NKWA HA KWERE CHINEKE

5. Olee nkwa Jefta kwere Chineke? Gịnịzi mere?

5 Jefta mezuru nkwa o kwere Jehova mgbe ọ na-aga ịlụso ndị Amọn agha, bụ́ ndị nọ na-eyi ndị Chineke egwu. (Ikpe 10:7-9) Jefta chọsiri ike imeri n’agha ahụ. Ọ bụ ya mere o ji kwe Chineke nkwa, sị: “Ọ bụrụ na i nyefee ụmụ Amọn n’aka m, ọ ga-erukwa na onye ọ bụla pụtaranụ, onye si n’ọnụ ụzọ ụlọ m pụta izute m mgbe m si n’ebe ụmụ Amọn nọ lọta n’udo, ga-aghọ nke Jehova.” Gịnịzi mere? Jefta meriri ndị Amọn. Mgbe o si agha ahụ na-alọta, onye bịara zute ya bụ ada ya ọ hụrụ n’anya. Ọ bụ ya bụ onye “ga-aghọ nke Jehova.” (Ikpe 11:30-34) Gịnị ka ada Jefta ga-eme?

6. (a) Ọ̀ dịịrị Jefta na ada ya mfe imezu nkwa o kwere Chineke? (b) Gịnị ka ị mụtara na Diuterọnọmi 23:21, 23 na Abụ Ọma 15:4 banyere ikwe Chineke nkwa?

6 Ka ada Jefta nwee ike imezu nkwa nna ya kwere, o kwesịrị iji oge ya niile na-ejere Jehova ozi n’ụlọikwuu ya. Jefta ò kwere nkwa ahụ n’ebughị ụzọ chee echiche? Mba. O nwere ike ịbụ na ọ ma na ọ bụ nwa ya nwaanyị ga-esi n’ụlọ ya pụta izute ya. Ma, ọ dịghịrị Jefta na ada ya mfe imezu nkwa ahụ. Ọ ga-efu ha oké ihe. Mgbe Jefta hụrụ ada ya, ọ “dọwara uwe ya,” kwuokwa na obi agbawaala ya. Ada ya ‘kwaara ọnọdụ ya dị ka nwa agbọghọ na-amaghị nwoke ákwá.’ Maka gịnị? Jefta enweghị nwa nwoke. Naanị otu nwa nwaanyị ọ mụtara agaghị alụ di, nke o ji amụtara ya ụmụ ụmụ. O nweghị onye ga-amụta nwa ga-aza aha ya ma ọ bụ keta ihe ya. Ma, ọ bụghị ihe ndị a bụ ihe kacha Jefta na ada ya mkpa. Jefta sịrị: “Mụ onwe m emegheworo Jehova ọnụ m, enweghịkwa m ike ịgbanwe ihe m kwuru.” Ada ya kwukwara, sị: “Mee m ihe si n’ọnụ gị pụta.” (Ikpe 11:35-39) Ha abụọ na-erubere Chineke isi. Ha agaghị echewe otú ha ga-esi ghara imezu nkwa ha kwere Chineke, bụ́ Onye Kasị Elu, n’agbanyeghị ihe ọ ga-efu ha.—Gụọ Diuterọnọmi 23:21, 23; Abụ Ọma 15:4.

7. (a) Olee nkwa Hana kwere Chineke, maka gịnị? Gịnị ka Chineke meere ya? (b) Olee ihe a ga-eme Samuel n’ihi nkwa Hana kwere? (Kwuo ihe e dere n’ala ala peeji.)

7 Hana bụ onye ọzọ mezuru nkwa o kwere Jehova. O kwere nkwa ahụ mgbe obi na-adịghị ya mma, ya ana-echegbu onwe ya n’ihi na ọ mụtaghị nwa nakwa n’ihi mkparị a na-akparị ya. (1 Sam. 1:4-7, 10, 16) Hana gwara Chineke otú ọ dị ya n’obi ma kwe ya nkwa, sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, ọ bụrụ nnọọ na i lekwasị anya ná mmekpa ahụ́ nke ohu gị nwaanyị ma cheta m, wee ghara ichefu ohu gị nwaanyị ma nye ohu gị nwaanyị nwa nwoke, m ga-enye ya Jehova ụbọchị ndụ ya niile, ọ dịghịkwa agụba ga-emetụ ya n’isi.” * (1 Sam. 1:11) Jehova nụrụ ekpere Hana ma mee ka ọ mụta nwa nwoke. Obi tọgburu Hana atọgbu. Ma, o chefughị nkwa o kwere Chineke. Mgbe ọ mụrụ nwa nwoke, o kwuru, sị: “Ọ bụ n’aka Jehova ka m rịọtara ya.”—1 Sam. 1:20.

8. (a) Ọ̀ dịịrị Hana mfe imezu nkwa o kwere Chineke? (b) Olee otú ihe Devid kwuru n’Abụ Ọma 61 si chetara gị ihe ọma Hana mere?

8 Ozugbo a napụrụ Samuel ara, mgbe ọ dị ihe dị ka afọ atọ, Hana mezuru nkwa o kwere Chineke. O chetụdịghị otú ọ ga-esi ghara imezu nkwa o kwere. Ọ kpọọrọ Samuel kpọgara Ilaị, bụ́ Nnukwu Onye Nchụàjà, n’ụlọikwuu dị na Shaịlo, ma sị: “Ọ bụ maka nwa okoro a ka m kpere ekpere ka Jehova meere m ihe m rịọrọ ya. Ma mụ onwe m agbazinyewo ya Jehova. Ụbọchị niile ọ dị ndụ, ọ bụ onye a rịọtaara Jehova.” (1 Sam. 1:24-28) Nwa okoro ahụ bụ́ Samuel nọ n’ụlọikwuu ahụ “na-eto n’ebe Jehova nọ.” (1 Sam. 2:21) Ma, olee otú ọ ga-adị Hana? Ọ hụrụ nwa ya n’anya. Ma, ya na ya agaghị na-anọ kwa ụbọchị n’oge ọ na-eto. Chegodị otú ọ ga-esi na-agụ ya agụụ ịna-amakụ nwa ya, na-egwusa ya egwuregwu, na-azụ ya, ya bụ, na-ahụ ka ọ na-eto, na-ahụkwa ihe ndị ọ na-eme. Ọ na-abụ, ezigbo nne cheta ihe ndị a, obi adị ya ezigbo ụtọ. N’agbanyeghị ihe a niile, Hana akwaghị ụta na o mezuru nkwa o kwere Chineke. Ọ ṅụrịrị ọṅụ n’ime Jehova.—1 Sam. 2:1, 2; gụọ Abụ Ọma 61:1, 5, 8.

Ị̀ na-emezu nkwa i kwere Jehova?

9. Olee ajụjụ ndị a ga-aza?

9 Ugbu a anyị ghọtarala na mmadụ ekwesịghị iji nkwa o kwere Chineke gwuo egwu, ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a: Olee ụdị nkwa Ndị Kraịst nwere ike ikwe? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi kpebisie ike imezu nkwa anyị kwere?

NKWA I KWERE MGBE I NYEFERE CHINEKE ONWE GỊ

Nkwa i kwere mgbe i nyefere Chineke onwe gị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee nkwa kacha mkpa Onye Kraịst nwere ike ikwe? Gịnị ka ọ pụtara?

10 Nkwa kacha mkpa Onye Kraịst nwere ike ikwe bụ nkwa o kwere mgbe o nyefere Jehova onwe ya. Gịnị mere anyị ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na o ji obi ya niile kwe Jehova nkwa n’ekpere na ọ ga-eji ndụ ya jeere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ. Jizọs sịrị na onye ahụ ‘jụrụ onwe ya,’ ya bụ, kwụsị ime otú sọrọ ya, ma kwe nkwa na ya ga-ewere ime uche Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ ya. (Mat. 16:24) Malite ụbọchị ahụ, ‘ọ bụ nke Jehova.’ (Rom 14:8) Onye kwere Jehova nkwa na o nyefeela ya onwe ya ekwesịghị iji ya egwu egwu. O kwesịrị iwere ya otú ahụ ọbụ abụ si were nkwa o kwere Chineke. Ọ sịrị: “Gịnị ka m ga-eji kwụọ Jehova ụgwọ uru niile ọ na-eme ka m rite? M ga-emezu nkwa niile m kwere Jehova, ee, m ga-emezu ha n’ihu ndị ya niile.”—Ọma 116:12, 14.

11. Gịnị mere n’ụbọchị e mere gị baptizim?

11 Ì nyefeela Jehova onwe gị, e mee gị baptizim iji gosi na i meela otú ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ magburu onwe ya. Cheta na ụbọchị e mere gị baptizim n’ihu ndị mmadụ, a jụrụ gị ma ì nyefeela Jehova onwe gị nakwa ma ị̀ ghọtara na “nnyefe i nyefere Chineke onwe gị na baptizim a ga-eme gị na-egosi na ị ghọọla Onyeàmà Jehova, nke nọ ná nzukọ Chineke o ji mmụọ nsọ ya na-eduzi.” Ị zaa ee n’ajụjụ abụọ a, ọ pụtara na i kwupụtala n’ihu ọha na i nyefeela Jehova onwe gị kpamkpam nakwa na i ruru eru ka e mee gị baptizim ka ị bụrụ onye na-ejere Jehova ozi. O doro anya na ihe a i mere tọgburu Jehova atọgbu.

12. (a) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? (b) Olee àgwà Pita kwuru na anyị kwesịrị inwe?

12 Ma, baptizim e mere gị abụghị ebe okwu biri. Anyị mechaa baptizim, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-ejere Chineke ozi otú ahụ anyị kwere ya ná nkwa mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. N’ihi ya, anyị nwere ike ịjụ onwe anyị, sị: ‘Mụ na Jehova ànyị na-adịkwu ná mma kemgbe m mere baptizim? M̀ ka ji obi m niile na-efe ya? (Kọl. 3:23) M̀ na-ekpe ekpere mgbe niile, na-agụchi Okwu Chineke anya, na-agachi ọmụmụ ihe na ozi ọma anya? Ka ime ihe ndị a ọ̀ gwụwala m ike?’ Pita onyeozi kwuru na ozi anyị na-ejere Jehova agaghị anyụ ka ọkụ ma anyị tụkwasị ihe ọmụma, ntachi obi, na nsọpụrụ Chineke n’okwukwe anyị.—Gụọ 2 Pita 1:5-8.

13. Gịnị ka Onye Kraịst nyefere Chineke onwe ya ma mee baptizim kwesịrị ịghọta?

13 O nweghị otú anyị ga-esi kagbuo nkwa anyị kwere Chineke mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Ike gwụ mmadụ ijere Jehova ozi ma ọ bụ ibi ndụ ka Onye Kraịst, o kwesịghị ikwuwe na ya enyefeghị Chineke onwe ya n’eziokwu nakwa na baptizim o mere abụghị nke ezigbo ya. * E nwere ike ikwu na baptizim o mere gosiri na o meela ka onye ọ bụla mara na ya ejirila obi ya niile nyefee Chineke onwe ya. Ọ ga-aza Jehova na ọgbakọ ya ajụjụ ma o mee mmehie ọ bụla jọgburu onwe ya. (Rom 14:12) Anyị achọghị ka e kwuo na ‘anyị ahapụla ịhụnanya ahụ anyị nwere na mbụ.’ Kama, anyị chọrọ ka Jizọs gwa anyị, sị: “Amaara m ihe ndị ị na-eme, na ịhụnanya na okwukwe na ije ozi na ntachi obi gị, amakwaara m na ihe ndị ị na-eme n’oge na-adịbeghị anya karịrị ndị i mere n’oge gara aga.” (Mkpu. 2:4, 19) Ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-emezu nkwa anyị kwere Jehova mgbe anyị nyefere ya onwe anyị. Anyị mee otú ahụ, obi ga-abụ ya sọ aṅụrị.

NKWA I KWERE MGBE Ị LỤRỤ DI MA Ọ BỤ NWUNYE

Nkwa i kwere mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye (A ga-akọwa ya na paragraf nke 14)

14. Olee nkwa nke abụọ kacha mkpa mmadụ nwere ike ikwe, n’ihi gịnịkwa?

14 Nkwa nke abụọ kacha mkpa mmadụ nwere ike ikwe bụ nkwa o kwere mgbe ọ lụrụ di ma ọ bụ nwunye. N’ihi gịnị? N’ihi na alụmdi na nwunye dị nsọ. Mgbe nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ, ha na-anọ n’ihu Chineke na ndị akaebe kwe ibe ha nkwa. Ha na-ekwe nkwa na ha ga-ahụ ibe ha n’anya, na-elekọta ibe ha ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ha na-ekwekwa nkwa na ha ga-eme otú ahụ ‘n’oge niile ha abụọ ga-adị ndụ n’elu ala dị ka ndokwa alụmdi na nwunye Chineke mere si dị.’ O nwere ike ịbụ na ọ bụghị otú a ka ụfọdụ ndị si kwuo nke ha. Ma, ha kwere nkwa n’ihu Chineke. Ha abụọ si otú ahụ ghọọ di na nwunye. Ọ bụ naanị ọnwụ kwesịrị ikewa ha. (Jen. 2:24; 1 Kọr. 7:39) Jizọs kwuru, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” N’ihi ya, nwoke na nwaanyị na-agba akwụkwọ ekwesịghị iche na ha nwere ike ịgba alụkwaghịm ma ha nwee nsogbu.—Mak 10:9.

15. Gịnị mere Ndị Kraịst anaghị eji alụmdi na nwunye egwu egwu ka ndị ụwa?

15 Nke bụ́ eziokwu bụ na ebe ọ bụ na ụmụ mmadụ ezughị okè, e nweghị alụmdi na nwunye zuru okè. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ndị lụrụ di na nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Ọ dị mwute na o nweghị ihe ọtụtụ ndị n’ụwa ji alụmdi na nwunye kpọrọ. E nwee ihe seere ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha, ha na-agba alụkwaghịm. Ma, Ndị Kraịst anaghị eme otú ahụ. Ọ bụrụ na anyị emezughị nkwa anyị kwere mgbe anyị lụrụ di ma ọ bụ nwunye, ọ pụtara na anyị ghaara Chineke ụgha. Ị manụ na Chineke kpọrọ ndị ụgha asị. (Lev. 19:12; Ilu 6:16-19) Pọl onyeozi kwuru na ọ bụrụ na mmadụ alụọla nwunye, ka ọ ghara ịchọwa otú ọ ga-esi hapụ ya. (1 Kọr. 7:27) Ihe mere Pọl ji kwuo ya bụ na ọ ma na obi anaghị adị Jehova mma ma mmadụ jiri aghụghọ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm.—Mal. 2:13-16.

16. Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ịgba alụkwaghịm na mmadụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya?

16 Jizọs kụziri na naanị ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm bụ ma otu n’ime ha kwaa iko, onye nke ọzọ ajụ ịgbaghara ya. (Mat. 19:9; Hib. 13:4) Mmadụ chọọkwanụ ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya? Baịbụl kwukwara hoo haa ihe e kwesịrị ime. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 7:10, 11.) Baịbụl ekwughị na e nwere ihe kwesịrị ime ka di na nwunye hapụ ibe ha. Ma, ụfọdụ Ndị Kraịst bụ́ di na nwunye ekpebiela ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha n’ihi ihe ụfọdụ, dị ka ma ọ bụrụ na di ha ma ọ bụ nwunye ha ekweghị ha fee Jehova maka na ọ dapụla n’ezi ofufe ma ọ bụ na-akụ ha isi aba okpu. *

17. Gịnị ka di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ga-eme ka ha ghara itisa?

17 Di na nwunye gakwuru ndị okenye ka ha nye ha ndụmọdụ iji dozie ihe na-esere ha, ndị okenye kwesịrị ịjụ ha ma hà eleela vidio bụ́ Olee Otú E Si Amata Ezigbo Ịhụnanya? mụọkwa broshọ bụ́ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na vidio a na broshọ a mere ka a mata ihe Baịbụl kwuru nyeerela ọtụtụ di na nwunye aka ịna-ebi n’udo. Otu nwanna na nwunye ya kwuru, sị: “Kemgbe anyị mụwara broshọ a, anyị na-enwe obi ụtọ karịa otú anyị nwetụrụla.” E nwere otu nwaanyị ya na di ya chọrọ itisa n’agbanyeghị na ha abụọ ebiela afọ iri abụọ na abụọ. O mechara kwuo, sị: “Anyị abụọ emeela baptizim. Ma, ọ na-abụ, di m na-ekwu n’elu, mụ ana-ekwu n’ala. Vidio a pụtara n’oge dabara adaba. Anyị na-emekwu nke ọma ugbu a.” Ị̀ lụọla di ma ọ bụ nwunye? Gbalịsie ike ka ị na-eme ihe Jehova gwara di na nwunye ka ha na-eme. I mee otú ahụ, ọ ga-enyere gị aka ịna-emezu nkwa i kwere mgbe ị lụrụ di ma ọ bụ nwunye. Obi ga na-adịkwa gị ụtọ.

NKWA NDỊ NA-EJE OZI OGE NIILE PỤRỤ ICHE KWERE

18, 19. (a) Gịnị ka ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst merela? (b) Gịnị ka e nwere ike ikwu banyere ndị na-eje ozi oge niile pụrụ iche?

18 Ì chetara ihe anyị kwuburu gbasara nkwa Jefta na Hana kwere? Nkwa ahụ mere ka ada Jefta na nwa Hana jiri ndụ ha niile jeere Jehova ozi pụrụ iche n’ụlọikwuu ya. Ụdị ndụ ahụ mere ka obi dị ha ezigbo ụtọ. Taa, ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst agbaala ụmụ ha ume ijewe ozi oge niile ma were ozi Chineke ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Anyị kwesịrị ịna-aja ndị mere otú ahụ mma.—Ikpe 11:40; Ọma 110:3.

Nkwa i kwere mgbe ị malitere ozi oge niile pụrụ iche (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19 Ihe dị ka puku mmadụ iri isii na asaa na-eje ozi oge niile pụrụ iche n’ụwa niile. Ụfọdụ na-eje ozi na Betel. E nwere ndị na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova, nweekwa ndị nlekọta sekit, nweekwa ndị nlekọta sekit ndị na-akụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ òtù na-achị isi haziri, ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị ozi ala ọzọ, ndị na-arụ ọrụ n’Ala Mgbakọ ma ọ bụ n’ebe ndị anyị nwere ụlọ akwụkwọ. Onye ọ bụla n’ime ha kwere nkwa pụrụ iche, ya bụ, na ya ga na-arụ ọrụ ọ bụla e nyere ya n’ozi Jehova, na ya agaghị na-ebi ndụ okomoko, nakwa na ya agaghị na-arụ ọrụ ego n’ebughị ụzọ nata ikike. Ọ bụghị ndị na-eje ụdị ozi ahụ ka e weere ka ndị pụrụ iche, kama ọ bụ ozi ha na-eje. Ha ghọtara na ha kwesịrị iji obi umeala na-emezu nkwa ha kwere ruo oge niile ha na-eje ụdị ozi ahụ.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-eme “kwa ụbọchị”? N’ihi gịnị?

20 Nkwa ole ka i kwerela n’ime nkwa ndị anyị kwuru gbasara ha? Ọ̀ bụ otu, abụọ, ka ọ̀ bụ ha atọ? O doro anya na ị ghọtara na i kwesịghị iji nkwa i kwere egwu egwu. (Ilu 20:25) Ọ bụrụ na mmadụ emezughị nkwa o kwere Jehova, o nwere ike ịkpatara ya ezigbo nsogbu. (Ekli. 5:6) N’ihi ya, ka anyị jiri obi ụtọ ‘na-abụku aha Jehova abụ ruo mgbe ebighị ebi, ka anyị wee na-emezu nkwa anyị kwa ụbọchị.’—Ọma 61:8.

^ para. 7 Hana kwere Jehova nkwa na nwa ya ga-abụ onye Naziraịt ná ndụ ya niile. Ihe ọ pụtara bụ na a ga-edo nwa ya iche, nyefeekwa ya Jehova ka ọ na-ejere ya ozi dị nsọ.—Ọnụ Ọgụ. 6:2, 5, 8.

^ para. 13 N’ihi ihe niile ndị okenye na-eme iji chọpụta ma mmadụ ò ruru eru ime baptizim, ọ ga-esi ezigbo ike ịhụ ebe mmadụ mechara baptizim, ya abụrụ na baptizim ahụ abụghị nke ezigbo ya.