Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”

“Ka Ezi Uche Gị Bụrụ Ihe A Gọziri Agọzi”

Ọ BỤ Devid, bụ́ onye Izrel oge ochie, kwuru ihe a iji jaa otu nwaanyị ọ hụrụ mma. Aha nwaanyị ahụ bụ Abigel. Gịnị mere Devid ji jaa ya mma? Olee otú ihe nwaanyị ahụ mere ga-esi baara anyị uru?

Ọ bụ mgbe Devid na-agbara Eze Sọl ọsọ ka ọ hụrụ nwaanyị a. Abigel bụ nwunye Nebal. Nebal bụ aka ji akụ̀. A na-azụrụ ya ìgwè atụrụ n’ebe ndịda Juda nke bụ́ ugwu ugwu. Devid na ndị ikom ya chebere ndị na-azụrụ Nebal atụrụ na atụrụ ha. Devid mechara dunye ndị ozi ya ka ha gaa rịọ Nebal ka o nye ha ‘ihe ọ bụla aka ya ruru,’ bụ́ ihe a na-eri eri. (1 Sam. 25:8, 15, 16) N’ihi otú Devid na ndị ikom ya si chebe ihe Nebal nwere, a gaghị asị na arịrịọ ahụ adabaghị adaba.

Ma, Nebal mere ihe aha ya pụtara, nke bụ́ “Onye Na-enweghị Uche” ma ọ bụ “Onye Iberiibe.” O ji olu ike saa ndị ozi Devid okwu ma kparịa ha n’enyeghị ha ihe ọ bụla. N’ihi ya, Devid jikeere imesi Nebal ike n’ihi otú o si jiri olu ike saa ndị ozi ya okwu ma kparịa ha. Nebal na ndị ezinụlọ ya ga-ata ahụhụ n’ihi iberiibe ya.—1 Sam. 25:2-13, 21, 22.

Mgbe Abigel chọpụtara na mkpamkpa ga-akpa ma Devid mee ihe o kpebiri ime, ọ katara obi mee ihe. Ọ kwanyeere Devid ùgwù ma rịọ ya ka o cheta adịm ná mma ya na Jehova. Cheta na ọ bụ Devid ga-abụ eze ma Sọl chịchaa. Abigel bugaara ya na ndị ikom ya nri. N’ihi ya, Devid kwuru na Jehova ji nwaanyị a mee ka ọ ghara ime ihe ga-eme ka Chineke were ya ka onye ikpe mara. Devid gwara Abigel, sị: “Ka ezi uche gị bụrụ ihe a gọziri agọzi, ka gị onwe gị, bụ́ onye gbochiri m taa ịba n’ikpe ọmụma ọbara, bụrụkwa onye a gọziri agọzi.”—1 Sam. 25:18, 19, 23-35.

O doro anya na anyị agaghị achọ ime ka Nebal, bụ́ onye ihe ọma e meere ya na-adịghị ya mma. Ihe ọzọ bụ na, anyị hụ na nsogbu eruwela ka mmiri, anyị kwesịrị ime ihe anyị nwere ike ime iji gbochie ya. N’eziokwu, anyị ga-ekwuli ihe ahụ otu ọbụ abụ gwara Chineke. Ọ sịrị ya: “Kụziere m . . . ezi uche na ihe ọmụma.”—Ọma 119:66.

Anyị mee ihe gosiri na anyị ma ihe ma ọ bụ nwee ezi uche, ndị ọzọ nwere ike ịchọpụta. Ma hà kwuru ya ma ọ bụ na ha ekwughị ya, obi nwere ike ịdị ha otú ọ dị Devid, bụ́ onye sịrị: “Ka ezi uche gị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”