Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-achọ Ezigbo Akụ̀

Na-achọ Ezigbo Akụ̀

“Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi.”​—⁠LUK 16:⁠9.

ABỤ: 32, 154

1, 2. Gịnị mere a ga-eji nwee ndị ogbenye mgbe niile n’ụwa ochie a?

IHE siri ezigbo ike taa. Ndị ntorobịa na-achọgide ọrụ, o nweghị nke ha na-ahụ. Ọtụtụ ndị na-aga mba ọzọ ebe ihe dịtụ mma n’agbanyeghị na o nwere ike ịta isi ha. Ọtụtụ ndị dara ogbenye, ma n’obodo ndị bara ọgaranya. Ndị ọgaranya na-abakwu ọgaranya, ndị ogbenye ana-adakwu ogbenye. Ihe ndị a chọpụtara n’oge na-adịbeghị anya emeela ka ụfọdụ kwuo na e kee ndị bi n’ụwa ụzọ otu narị, akụ̀ otu ụzọ n’ime ha nwere ha ka akụ̀ niile ụzọ iri itoolu na itoolu nwere. Ọ bụ eziokwu na o siri ike ịmata ma ò ruchara otú ahụ, o doro ewu na ọkụkọ anya na ọtụtụ ijeri mmadụ bụ ogbenye ọnụ ntụ. Ma, ụfọdụ ndị akpaala ego ọtụtụ ndị nwere ike irigide nwụọ. Jizọs ma na ọ ga-adị otú a. Ọ bụ ya mere o ji sị: “Unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile.” (Mak 14:⁠7) Gịnị mere ihe ji dị otú ahụ?

2 Jizọs ma na ihe agaghị aka mma ruo mgbe Alaeze Chineke ga-abịa. Ma “ndị ahịa nke ụwa” e kwuru okwu ha ná Mkpughe 18:3 ma ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma okpukpe ụgha socha n’ụwa Setan. “Ndị ahịa nke ụwa” nọchiri anya iji anyaukwu achụ ego. Ndị na-efe Chineke anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ n’okpukpe ụgha. Ma, ọtụtụ n’ime ha agaghị esepụli aka kpamkpam n’ihe gbasara achụmnta ego nke ụwa Setan.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-elebara anya?

3 Anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị ịna-echebara otú anyị si achụ ego nke ụwa a echiche. Anyị kwesịrị ịna-ajụ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m ga-esi jiri ihe ndị m nwere na-egosi na m tụkwasịrị Chineke obi? Olee otú m ga-esi selata aka n’ihe gbasara achụmnta ego ụwa a? Olee ihe ndị merelanụ gosiri na ndị Chineke taa tụkwasịrị ya obi ha niile n’oge a ihe siri ike?’

IHE ATỤ GBASARA ONYE NA-ELEKỌTA ỤLỌ, BỤ́ ONYE AJỌ OMUME

4, 5. (a) Gịnị mere onye ahụ na-elekọta ụlọ Jizọs ji nye ihe atụ? (b) Olee ndụmọdụ Jizọs nyere ndị na-eso ụzọ ya?

4 Gụọ Luk 16:​1-9. Ihe atụ ahụ Jizọs nyere gbasara onye na-elekọta ụlọ bụ́ onye ajọ omume kwesịrị ime ka anyị chee echiche. Mgbe e boro onye ahụ ebubo na ọ na-ala ego nna ya ukwu n’iyi, o mere ihe gosiri na o nwere “ezi amamihe.” O ‘metara ndị enyi’ ga-enyere ya aka ma a chụọ ya n’ọrụ. * Ma, Jizọs ekwughị ihe a ka ọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ime ihe na-adịghị mma ka agụụ ghara igbu ha n’ụwa a. O kwuru na ụdị ihe ahụ bụ omume “ụmụ nke usoro ihe a.” Ma, e nwere ihe o ji ihe atụ ahụ na-akụziri ha.

5 Jizọs ma na otú ahụ ihe si siere onye ahụ na-elekọta ụlọ ike ka ọ ga-esikwara ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya ike ịkpata ihe ha ga-eri n’ụwa a ọtụtụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ. Ọ bụ ya mere o ji sị ha: “Jirinụ akụ̀ ajọ omume metara onwe unu ndị enyi, ka ọ ga-abụ, mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị, ha ewee nabata unu n’ebe obibi ebighị ebi.” Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe a Jizọs kwuru?

6. Olee otú anyị si mara na achụmnta ego ụwa a esoghị n’ihe Chineke bu n’obi kee ụwa?

6 Ọ bụ eziokwu na Jizọs ekwughị ihe mere o ji sị na akụ̀ bụ “akụ̀ ajọ omume,” Baịbụl mere ka o doo anya na ịchụ ego esoghị n’ihe Chineke bu n’obi kee ụwa. Jehova nyere Adam na Iv ihe niile ha chọrọ n’Iden. (Jen. 2:​15, 16) Mgbe Chineke mechara nye ndị e tere mmanụ mmụọ nsọ n’oge ndịozi Jizọs, ‘ọ dịghị otu onye na-ekwu na nke ọ bụla n’ime ihe ndị o nwere bụ nke ya; kama ha nwekọrọ ihe niile ọnụ.’ (Ọrụ 4:32) Aịzaya onye amụma kwuru na n’ọdịnihu, mmadụ niile ga-eji akụ̀ ndị dị n’ụwa a na-ekpori ndụ. (Aịza. 25:​6-9; 65:​21, 22) Ka ọ dị ugbu a, “ezi amamihe” ga-enyere ndị na-eso ụzọ Jizọs aka iji “akụ̀ ajọ omume” dị n’ụwa a na-enweta ihe ha ga-eri ma na-agbalịsi ike ime ihe dị Chineke mma.

JIRI AKỤ̀ AJỌ OMUME NA-EME IHE BARA URU

7. Olee ndụmọdụ Jizọs nyere na Luk 16:​10-13?

7 Gụọ Luk 16:​10-13. Onye ahụ na-elekọta ụlọ Jizọs kwuru okwu ya metara ndị enyi ọ ga-erite ihe n’aka ha. Ma, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha meta ndị enyi n’eluigwe, ma ọ bụghị maka ihe ha ga-erite. Ihe ndị o kwuru mgbe o nyechara ihe atụ ahụ gosiri otú mmadụ ịtụkwasị Chineke obi si gbasa ihe o ji “akụ̀ ajọ omume” eme. Ihe Jizọs na-ekwu bụ na anyị ‘ga-ekwesịli ntụkwasị obi’ n’ihe anyị ji akụ̀ ahụ eme ma anyị kpata ya. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

8, 9. Nye ihe atụ gosiri otú ụfọdụ ndị si jiri akụ̀ ajọ omume na-eme ihe gosiri na ha tụkwasịrị Chineke obi.

8 Otu n’ime ụzọ doro anya anyị ga-esi gosi na anyị tụkwasịrị Chineke obi bụ iji ego anyị na-akwado ozi ọma Jizọs kwuru na a ga-ekwusa n’ụwa niile. (Mat. 24:14) Otu nwata nwaanyị bi n’India nwere obere igbe ego ọ na-etinye ego kịrịkịrị, ma nke ọ gaara eji azụrụ ihe o ji egwuri egwu. Mgbe igbe ahụ juru, o nyere ego dị na ya ka e jiri ya kwado ozi ọma a na-ekwusa. N’India, otu nwanna nke nwere ugbo akị bekee ji ọtụtụ akị bekee nye onyinye, buga ya n’ọfis ndị nsụgharị dị na Malayalam. O kwuru n’obi ya na ebe ọ bụ na ụmụnna ndị ahụ na-azụ akị bekee, na ibunye ha akị ahụ ga-abara ha uru karịa inye ha ego. O gosiri na o nwere “ezi amamihe.” Ụmụnna bi na Gris na-emekwa ihe yiri ya. Ha na-enye ezinụlọ Betel mmanụ oliv, chiiz, na ihe ndị ọzọ a na-eri eri.

9 Otu nwanna bụ́ onye Sri Lanka, bi ná mba ọzọ, nyere ụmụnna ala ya na ụlọ ya dị n’obodo ha ka ha nọrọ na ya na-amụ ihe, na-eme mgbakọ, nakwa ka ndị nọ n’ozi oge niile biri na ya. O furu nwanna ahụ ezigbo ihe. Ma, ihe ahụ o mere na-enyere ndị nkwusa na-enweghị ka ọ hà ha bi n’obodo ahụ aka. N’obodo ndị a machibidoro ozi ọma anyị iwu, ụmụnna na-ewepụta ụlọ ha ka e jiri ya mere Ụlọ Nzukọ Alaeze, nke na-eme ka ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na ndị ọzọ na-enweghị ego nwee ebe ha ga na-amụ ihe n’emefughị oké ego.

10. Olee ụfọdụ uru anyị ga-erite ma anyị na-emesapụ aka?

10 Ihe ndị a a kọrọ na-egosi otú ndị Chineke si ‘kwesị ntụkwasị obi n’ihe kasị nta,’ ya bụ, n’ihe ha ji akụ̀ ha eme, nke na-abachaghị uru ka akụ̀ Chineke na-enye. (Luk 16:10) Olee otú obi dị ndị a bụ́ ndị enyi Jehova maka ihe ndị a ha na-enye? Ha ghọtara na imesapụ aka bụ otú ha ga-esi nweta “ezi akụ̀.” (Luk 16:11) Otu nwanna nwaanyị nke na-enye onyinye mgbe niile iji kwado ọrụ Alaeze kwuru otú Chineke si na-agọzi ya. Ọ sịrị: “Otú m si emesapụ aka emeela ka m rite ọtụtụ uru na-enweghị atụ kemgbe ọtụtụ afọ. Achọpụtala m na imesapụkwu aka na-eme ka m na-enye ndị mmadụ ihu. Ọ na-eme ka m na-agbaghara ndị ọzọ ma na-enwere ha ndidi. Ọ na-emekwa ka m na-anara ndụmọdụ, na-edikwa ihe ndị na-agbawa obi.” Ọtụtụ ndị achọpụtala na imesapụ aka na-abara ha ezigbo uru.​—⁠Ọma 112:5; Ilu 22:⁠9.

11. (a) Olee otú imesapụ aka si egosi na anyị nwere “ezi amamihe”? (b) Gịnị ka ndị Chineke ji ego ha na-eme taa? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

11 E nwere ụzọ ọzọ anyị si egosi na anyị nwere “ezi amamihe” ma anyị jiri ihe anyị nwere na-akwado ihe gbasara Alaeze Chineke. Ọ na-eme ka anyị nwee ike ịna-enyere ndị ọzọ aka. Ụfọdụ ụmụnna nwere ego, ma ha agaghị abụli ndị ozi oge niile ma ọ bụ kwaga mba ọzọ ịga kwusawa ozi ọma. Obi na-adị ha ụtọ ịmata na a na-eji onyinye ha enyere ndị ọzọ na-ekwusa ozi ọma aka. (Ilu 19:17) A na-ejikwa onyinye si ndị mmadụ n’obi ebipụta ma na-ekesa akwụkwọ anyị, na-akwadokwa ozi ọma a na-ekwusa n’obodo ebe ọtụtụ ndị dara ogbenye, ma ọtụtụ ndị ana-abata n’ọgbakọ. Kemgbe ọtụtụ afọ, Baịbụl na-ada oké ọnụ n’obodo ndị dị ka Kongo, Madagaska, na Rụwanda. Mgbe ụfọdụ, ihe a na-eji azụta otu bụ ego mmadụ rụtara n’otu izu ma ọ bụdị n’otu ọnwa. Ọtụtụ mgbe, ụmụnna anyị na-eche ma ọ̀ bụ ha were ego ha gaara eji zụtara ezinụlọ ha nri zụrụ Baịbụl. Ugbu a, onyinye ọtụtụ ndị na-enye emeela ka nzukọ Jehova na-asụgharị Baịbụl, na-ekesakwa ya ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ nwee nke ya, ndị a na-amụrụ ihe enweekwa nke ha. A na-esi otú ahụ enwe “ịha nhata” n’ihe gbasara onyinye ụmụnna na-enye. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:​13-15.) N’ihi ya, ma ndị na-enye enye ma ndị a na-enye ga-abụli enyi Jehova.

SELATA AKA “N’ỌRỤ EGO A NA-ARỤ NÁ NDỤ A”

12. Olee otú Ebreham si gosi na ọ tụkwasịrị Chineke obi?

12 Otú ọzọ anyị ga-esi meta Jehova enyi bụ iselata aka n’otú anyị si achụ ego, jirikwa ihe ndị anyị nwere na-achụ “ezi akụ̀.” Ebreham bụ nwoke nwere okwukwe n’oge ochie. O rubeere Chineke isi ma hapụ obodo Ọọ bara ọgaranya, gaa biwe n’ụlọikwuu ka o nwee ike ịbụ enyi Jehova. (Hib. 11:​8-10) Ọ tụkwasịrị Chineke obi mgbe niile, mata na ọ bụ ya na-enye ezigbo akụ̀, kama ịchụwa akụ̀ otú ga-egosi na ọ tụkwasịghị Chineke obi. (Jen. 14:​22, 23) Jizọs gwara otu nwa okorobịa bara ọgaranya ka o nwee ụdị okwukwe a. Ọ sịrị ya: “Ọ bụrụ na ị chọrọ ka i zuo okè, gaa ree ihe i nwere nye ndị ogbenye, ị ga-enwekwa akụ̀ n’eluigwe, bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” (Mat. 19:21) Nwoke ahụ enweghị okwukwe ka Ebreham. Ma, e nweela ndị gosiri na ha tụkwasịrị Chineke obi.

13. (a) Olee ndụmọdụ Pọl nyere Timoti? (b) Olee otú anyị ga-esi mee ihe ahụ Pọl kwuru?

13 Timoti nwere okwukwe. Mgbe Pọl kpọchara ya “ezi onye agha nke Kraịst Jizọs,” ọ sịrị ya: “Onye ọ bụla nke na-eje ozi dị ka onye agha adịghị etinye aka n’ọrụ ego a na-arụ ná ndụ, ka ihe ya wee masị onye debara aha ya dị ka onye agha.” (2 Tim. 2:​3, 4) Ma ihe karịrị otu nde ndị ozi oge niile ma ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs taa na-agbalịsi ike ime ihe ahụ Pọl kwuru. Ha anaghị ekwe ka anyaukwu na ngwá ahịa ndị a na-akpọsa n’ụwa a megharịa ha anya. Ha na-echeta na Baịbụl kwuru, sị: ‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’ (Ilu 22:⁠7) Setan chọrọ ka anyị jiri oge anyị niile na ike anyị niile na-agbara achụmnta ego ụwa a ohu. Ụfọdụ ihe ndị anyị na-eme nwere ike ime ka anyị koro ụgwọ ruo ọtụtụ afọ. Ụfọdụ ndị na-agbaziri nnukwu ego rụọ ụlọ, zụọ ụgbọala, gaa mahadum, ma ọ bụdị gbaa akwụkwọ. Anyị na-egosi na anyị nwere ezi amamihe ma anyị hapụ ibi ndụ ndị oké ozu, ghara iji ụgwọ na imefu ego aghara aghara. Anyị ga-enwe ike ịna-ejere Chineke ozi kama ịgbara achụmnta ego ụwa ochie a ohu.​—⁠1 Tim. 6:⁠10.

14. Gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime? Nye ihe atụ.

14 Ọ bụrụ na anyị achọghị ịna-ebi ndụ okomoko, anyị kwesịrị ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke. Otu nwanna na nwunye ya nwere ụlọ ọrụ na-emepụta ihe. Ma, ha chọrọ ịmaliteghachi ozi oge niile. N’ihi ya, ha rere ụlọ ọrụ ahụ, ma ụgbọ mmiri ha ma ihe ndị ọzọ. Ha ewepụtazie onwe ha soro ná ndị na-arụ isi ụlọ ọrụ anyị dị na Wọwik, Niu Yọk. Otú pụrụ iche Chineke si gọzie ha bụ na ha na nwa ha nwaanyị na di ya rụkọrọ ọrụ n’ebe ahụ izu ole na ole. Papa nwanna nwoke ahụ na mama ya sokwa ha rụọ ọrụ n’ebe ahụ. Otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ na Kọlọrado dị n’Amerịka chọtara ọrụ ọ ga na-arụ ụbọchị ụfọdụ n’ụlọ akụ̀. Otú o si arụ ọrụ tọgburu ndị ụlọ akụ̀ ahụ atọgbu, ha asị ka ha nye ya ọrụ oge niile. Ụgwọ a ga na-akwụ ya ga-eji okpukpu atọ ka nke a na-akwụbu ya. Ma, ọrụ ahụ agaghị ekwe ya lekwasị anya n’ozi ya. N’ihi ya, o kweghị arụ ya. Ihe ndị a bụ naanị ụfọdụ n’ime ihe ụmụnna anyị hapụrụla iji jeere Jehova ozi. Otú anyị si kpebisie ike ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke gosiri na anyị ji adịm ná mma anyị na Chineke na ezigbo akụ̀ o nyere anyị kpọrọ ihe karịa ihe ọ bụla anyị ga-enweta n’ịchụ ego ụwa a.

MGBE AKỤ̀ NKE ỤWA A GA-ALA N’IYI

15. Olee akụ̀ ga-akacha mee anyị obi ụtọ?

15 Mmadụ inwe akụ̀ apụtaghị na Chineke agọziela ya. Jehova na-agọzi ndị bụ́ “ọgaranya n’ezi ọrụ.” (Gụọ 1 Timoti 6:​17-19.) Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Lucia * nụrụ na a chọkwuru ndị na-ekwusa ozi ọma n’Albenia, o si n’Ịtali kwaga ebe ahụ n’afọ 1993 n’enweghị ọrụ ego ọ na-arụ. Ma, ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ọ mụtara asụsụ Albenian, jirikwa ya nyere ihe karịrị mmadụ iri isii aka inyefe Jehova onwe ha. Ọtụtụ ndị Jehova anaghị ekwusa ozi ọma n’ebe ọtụtụ ndị na-abata n’ọgbakọ otú ahụ. Ma, ihe ọ bụla anyị mere iji nyere ndị ọzọ aka ịchọta ụzọ ndụ ma nọsie ike na ya bụ ihe anyị na ha ga-eji kpọrọ ihe ruo mgbe ebighị ebi.​—⁠Mat. 6:⁠20.

16. (a) Gịnị ga-eme akụ̀ nke ụwa a? (b) Olee otú ihe anyị ma gbasara ọdịnihu kwesịrị isi mee ka anyị na-ele akụ̀ anya?

16 Jizọs sịrị: “Mgbe akụ̀ dị otú ahụ na-adịkwaghị,” ọ sịghị ‘ọ bụrụ na akụ̀ ahụ adịkwaghị.’ (Luk 16:⁠9) N’oge ikpeazụ a, ụfọdụ ụlọ akụ̀ adaala. Ihe esiekwala ezigbo ike n’ọtụtụ obodo. Ma, ihe ndị a enweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere ihe ga-eme n’ụwa niile n’ọdịnihu. Ụwa Setan ga-akụ afọ n’ala, ma ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya, ma okpukpe ya, ma achụmnta ego ya. Ezikiel na Zefanaya buru amụma na e nweghịzi uru ọlaọcha na ọlaedo ndị mmadụ na-achụ ka à na-anwụ anwụ ga-aba. (Ezik. 7:19; Zef. 1:18) Olee otú obi ga-adị anyị ma anyị kaa nká, chọpụta na ịchụ “akụ̀ ajọ omume” emeela ka anyị ghara inweta ezigbo akụ̀ Chineke chọrọ inye anyị? O nwere ike ịdị anyị ka ebe mmadụ ji oge ya niile kpaa ego, mechaa chọpụta na ego ahụ niile bụ kanta. (Ilu 18:11) O doro anya na akụ̀ nke ụwa a ga-ala n’iyi. N’ihi ya, ekwela ka ihe ọ bụla mee ka ị ghara iji ya ‘metara onwe gị ndị enyi’ n’eluigwe. Ihe ọ bụla anyị mere iji kwado ihe gbasara Alaeze Chineke ga-eme ka anyị bụrụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ.

17, 18. Gịnị ka ndị enyi Chineke ga-enweta n’ọdịnihu?

17 Alaeze Chineke bịa, o nweghị onye ga na-akwụ ụgwọ ihe ọ bụla. Nri ga-abụ atụrụ tawa. A gaghịzi enwe ọgwụ na ndị dọkịta. Ndị bụ́ enyi Jehova n’ụwa ga na-eri ihe kacha mma dị n’ụwa a. A ga-eji ọlaọcha, ọlaedo, na ihe ndị yiri ya na-achọ mma, ọ bụghị iji ha na-akpa ego ma ọ bụ jichie ha. Ndị mmadụ ga-eji ezigbo osisi, nkume, na ígwè na-arụ ọmarịcha ụlọ. Ndị enyi anyị ga na-enyere anyị aka maka na obi dị ha ụtọ, ọ bụghị maka ego. Ọ ga-atọgbu anyị atọgbu mgbe anyị ga na-asụ akụ̀ n’ọnụ n’ụwa ọhụrụ.

18 Ihe ndị a bụ naanị ụfọdụ n’ime ihe ndị magburu onwe ha anyị ga-enweta ma anyị meta ndị enyi n’eluigwe. Ndị na-efe Jehova n’ụwa ga-aṅụrị ọṅụ mgbe ha ga-anụ ka Jizọs na-asị ha: “Bịanụ, unu ndị Nna m gọziri agọzi, ketanụ alaeze ahụ a kwadebeere unu malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.”​—⁠Mat. 25:⁠34.

^ para. 4 Jizọs ekwughị ma ebubo ahụ e boro nwoke ahụ ọ̀ bụ eziokwu ka ọ̀ bụ ụgha. Okwu Grik e si sụgharịta ‘ibo ebubo’ na Luk 16:1 nwere ike ịpụta na a ghagidere onye ahụ na-elekọta ụlọ ụgha. Ma, Jizọs lekwasịrị anya n’ihe onye ahụ na-elekọta ụlọ mere, ọ bụghị n’ihe mere e ji chụọ ya n’ọrụ.

^ para. 15 Akụkọ ndụ Lucia Moussanett gbara na Teta! July 8, 2003, peeji nke 24 ruo 28.