Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Ka O Mezuo Ebumnobi Gị Niile’

‘Ka O Mezuo Ebumnobi Gị Niile’

“Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu, ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.”—ỌMA 37:⁠4.

ABỤ: 89, 140

1. Gịnị ka onye na-eto eto kwesịrị ikpebi banyere ọdịnihu ya, ma gịnị mere ụjọ ekwesịghị ịtụ ya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

UNU bụ́ ndị na-eto eto nwere ike ikweta na tupu mmadụ apalie njem, o kwesịrị ibu ụzọ kpebie ebe ọ chọrọ ịga. Ndụ a anyị dị yiri ebe mmadụ chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ bụ ugbu a ị na-eto eto ka i kwesịrị ikpebi ebe ị ga-aga. Ma, ikpebi ya anaghị adị mfe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Heather sịrị: “Ọ na-atụ ụjọ. Mmadụ kwesịrị ikpebi ihe ọ ga-eji ndụ ya niile mee.” Ma, nwee obi ike. Jehova gwara ndị ya, sị: “Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.”​—⁠Aịza. 41:⁠10.

2. Olee otú i si mara na Jehova chọrọ ka i kpebie ihe ga-abara gị uru n’ọdịnihu?

2 Jehova gwara gị ka i kpebie ihe ị ga-eme n’ọdịnihu nke ọma. (Ekli. 12:1; Mat. 6:20) Ọ chọrọ ka obi na-adị gị ụtọ. Ọmarịcha ihe ndị anyị na-ahụ na ndị anyị na-anụ ụda ha, na ụtọ ihe a na-eri eri gosiri na ọ bụ eziokwu. Cheekwa banyere ihe ndị ọzọ gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya, na-akụzikwara anyị ihe ga-akacha baara anyị uru. Jehova gwara ndị jụrụ ndụmọdụ ya, sị: “Ihe na-adịghị m mma ka unu họọrọ ime. . . . Lee! Ndị ohu m ga-aṅụrị ọṅụ, ma ihere ga na-eme unu. Lee! Ndị ohu m ga-eti mkpu ọṅụ n’ihi na obi dị ha mma.” (Aịza. 65:​12-14) Anyị kpebie ihe ga-abara anyị uru, ọ na-eme ka e too Jehova.​—⁠Ilu 27:⁠11.

IHE NDỊ Ị GA-EME KA OBI DỊ GỊ ỤTỌ N’ỌDỊNIHU

3. Gịnị ka Jehova chọrọ ka i mee?

3 Olee ihe ndị Jehova chọrọ ka i mee? Ị chọọ ka obi na-adị gị ụtọ, i kwesịrị ịmara Jehova ma na-efe ya. Ọ bụ otú Jehova si kee anyị. (Ọma 128:1; Mat. 5:⁠3) O keghị anyị ka ụmụ anụmanụ. Naanị ihe bụ́ mkpa ha bụ iri nri, ịṅụ mmiri, na ịmụ ụmụ. Chineke chọrọ ka ị hazie ihe ndị ị ga-eme otú ga-eme ka obi na-adị gị ụtọ, gị ebiekwa ezigbo ndụ. Onye kere gị bụ “Chineke nke ịhụnanya,” na ‘Chineke obi ụtọ.’ O kekwara ụmụ mmadụ “n’onyinyo ya.” (2 Kọr. 13:11; 1 Tim. 1:11; Jen. 1:27) Obi ga na-adị gị ụtọ ma ị na-eṅomi Chineke, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya. Ị̀ chọpụtala na ihe Ọrụ Ndịozi 20:35 kwuru bụ eziokwu? Ebe ahụ sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” Ihe a bụ eziokwu doro anya banyere ụmụ mmadụ. N’ihi ya, Jehova chọrọ ka ihe kacha gị mkpa bụrụ igosi na ị hụrụ ya n’anya, hụkwa ndị ọzọ n’anya.​—⁠Gụọ Matiu 22:​36-39.

4, 5. Olee ihe mere Jizọs obi ụtọ?

4 Jizọs Kraịst mere ihe unu bụ́ ndị na-eto eto kwesịrị iṅomi. Mgbe ọ bụ nwata, o doro anya na o gwuru egwu, kporiekwa ndụ. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị . . . na oge ịwụli elu.” (Ekli. 3:⁠4) Otú Jizọs si bịaruo Jehova nso bụ na ọ na-amụ Akwụkwọ Nsọ. Mgbe ọ dị afọ iri na abụọ, “nghọta o nwere na ihe ọ na-aza” juru ndị nkụzi nọ n’ụlọ nsọ anya.​—⁠Luk 2:​42, 46, 47.

5 Mgbe Jizọs toro, obi na-adị ya ezigbo ụtọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ ma na ihe so n’ihe ndị Chineke chọrọ ka ọ na-eme bụ “izi ndị ogbenye ozi ọma . . . na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ.” (Luk 4:18) Obi dị Jizọs ụtọ maka na o mere ihe Chineke chọrọ ka o mee. Abụ Ọma 40:8 kwuru otú obi dị Jizọs. Ọ sịrị: “Chineke m, ime uche gị na-atọ m ụtọ.” Ịkụziri ndị mmadụ gbasara Nna ya nke eluigwe mere ya obi ụtọ. (Gụọ Luk 10:21.) Otu ụbọchị Jizọs kụzichaara otu nwaanyị otú ọ ga-esi na-efe Chineke, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.” (Jọn 4:​31-34) Obi dị Jizọs ụtọ maka na o mere ihe gosiri na ọ hụrụ Chineke na ndị mmadụ n’anya. I mee otú ahụ, obi ga-adịkwa gị ụtọ.

6. Gịnị mere i ji kwesị ịgwa ụmụnna ndị ma nke a na-akọ ihe ndị i bu n’obi ime n’ọdịnihu?

6 Ọtụtụ Ndị Kraịst malitere ịsụ ụzọ mgbe ha na-eto eto, nke mere ka obi dị ha ụtọ. Ọ ga-adị mma ka ị gwa ụfọdụ n’ime ha ihe i bu n’obi ime. Ilu 15:22 sịrị: “Atụmatụ na-aghasasị ma ọ bụrụ na a gbaghị izu, ma a na-arụzu ihe ma e nwee ọtụtụ ndị ndụmọdụ.” Ụmụnna ndị ahụ nwere ike ịgwa gị na ozi oge niile ga-eme ka ị mụta ihe ga-abara gị uru ná ndụ gị niile. Mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ ka nọkwa na-amụta ihe n’agbanyeghị na Nna ya akụzierela ya ihe n’eluigwe. Dị ka ihe atụ, ọ mụtara na izi ndị mmadụ ozi ọma na irubere Chineke isi ga-eme ka obi dị mmadụ ụtọ. (Gụọ Aịzaya 50:4; Hib. 5:8; 12:⁠2) Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ gbasara ozi oge niile nwere ike ime gị obi ụtọ.

IHE MERE ỊKỤZIRI NDỊ ỌZỌ OKWU CHINEKE JI BỤRỤ ỌRỤ KACHA MMA

7. Gịnị mere ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ji atọ ọtụtụ ndị na-eto eto ụtọ?

7 Jizọs gwara anyị ‘gaa mee ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya,’ na-akụzikwara ha ihe. (Mat. 28:​19, 20) I kpebie ịna-arụ ọrụ a, ọ pụtara na ị ga-eji ndụ gị eme ihe kacha mma, nke ga-eme ka e too Chineke. Ị ga-abụ aka ochie ka oge na-aga, otú ahụ onye na-amụ ọrụ na-eme. Otu nwanna aha ya bụ Timothy bidoro ịsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ iri na itoolu. N’oge na-adịbeghị anya, ọ sịrị: “Ijere Jehova ozi oge niile na-atọ m ụtọ n’ihi na ọ bụ otú m si egosi na m hụrụ ya n’anya. Mgbe m bidoro, e nweghị ndị m na-amụrụ ihe. Ma, m mechara kwaga ebe ọzọ. Tupu otu ọnwa agafee, m malitere ịmụrụ ọtụtụ ndị Baịbụl. Otu n’ime ha malitere ịbịa ọmụmụ ihe. Mgbe m ji ọnwa abụọ gachaa Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị, * e zigara m ebe ọzọ. M maliteere mmadụ anọ ọmụmụ Baịbụl n’ebe ahụ. Ịkụziri ndị mmadụ Okwu Chineke na-atọ m ụtọ n’ihi na m na-ahụ na mmụọ nsọ na-eme ka ndụ ha gbanwee.”​—⁠1 Tesa. 2:⁠19.

8. Gịnị ka ụfọdụ ndị na-eto eto merela ka ha nwee ike izi ọtụtụ ndị ozi ọma?

8 Ụfọdụ ndị na-eto eto amụọla asụsụ ọzọ. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ Jacob, si Amerịka, dere, sị: “Mgbe m dị afọ asaa, ọtụtụ ụmụ klas anyị na-asụ asụsụ Vietnamiiz. M chọrọ ịgwa ha gbasara Jehova. N’ihi ya, mgbe obere oge gara, m gbawara mbọ ịmụta asụsụ ha. Otú kachanụ m si mụọ ya bụ ile Ụlọ Nche Bekee, leekwa otú e si dee ya na nke Vietnamiiz. M metakwara ndị enyi n’ọgbakọ dị nso, nke na-eji asụsụ Vietnamiiz amụ ihe. Mgbe m dị afọ iri na asatọ, m bidoro ịsụ ụzọ. M mechara gaa Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị. Ụlọ akwụkwọ a abaarala m uru n’ebe m na-asụ ụzọ ugbu a. Ọ bụ naanị m bụ okenye n’otu ìgwè na-eji asụsụ Vietnamiiz amụ ihe. O juru ọtụtụ ndị Vietnam anya na m mụtara asụsụ ha. Ha na-anabata m n’ụlọ ha. Ọtụtụ mgbe, m na-ebido ịmụrụ ha Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha emeela baptizim.”​—⁠Tụlee Ọrụ Ndịozi 2:​7, 8.

9. Olee ihe ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-eme ka ị mụta?

9 Ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-akụziri gị ọtụtụ ihe. Ọ ga-eme ka ị mụta ịna-arụ ọrụ gị nke ọma, otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-ekwurịta okwu, otú ị ga-esi na-akata obi, na otú ị ga-esi na-adị akọ. (Ilu 21:5; 2 Tim. 2:24) Ma ihe ga-akacha mee ka ọrụ a na-eme gị obi ụtọ bụ na ọ ga-eme ka ị mata otú ị ga-esi jiri Baịbụl gwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ị ga-amụtakwa otú gị na Jehova ga-esi na-arụkọ ọrụ.​—⁠1 Kọr. 3:⁠9.

10. Olee otú ị ga-esi na-enwe obi ụtọ n’ime ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị anaghị ekwe echegharị?

10 Ọrụ a ga na-atọ gị ụtọ ọ bụrụgodị na ọtụtụ ndị ị na-ezi ozi ọma anaghị achọ ige ntị. Ọ bụghị ọrụ otu onye. Ọgbakọ na-agbakọ aka achọ ndị ji obi ha niile na-achọ ịmata Chineke. Ọ bụ eziokwu na naanị otu nwanna nwere ike ịhụ onye ga-emecha ghọọ onye na-eso ụzọ Jizọs, mmadụ niile so na-achọ onye ahụ. Mmadụ niile nwekwara ike iso ṅụrịa ọṅụ. Dị ka ihe atụ, Brandon sụrụ ụzọ oge niile afọ itoolu n’ebe ọtụtụ ndị na-anaghị ekwe echegharị. Ọ sịrị: “Ozi ọma na-atọ m ụtọ n’ihi na ọ bụ ihe Jehova gwara anyị mee. M malitere ịsụ ụzọ ozugbo m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ịgba ndị na-eto eto nọ n’ọgbakọ anyị ume na ịhụ otú ha si eme nke ọma na-eme m obi ụtọ. Mgbe m gachara Ụlọ Akwụkwọ Ọmụmụ Baịbụl Maka Ụmụnna Na-alụbeghị Nwaanyị, e zigara m n’ọgbakọ ọzọ. Ọ bụ eziokwu na o nwebeghị onye m mụụrụ ihe n’ebe a mere baptizim, ndị ọzọ emeela otú ahụ. Obi dị m ụtọ na m kpebiri iji oge m niile na-arụ ọrụ a.”​—⁠Ekli. 11:⁠6.

URU IHE NDỊ I KPEBIRI IME NWERE IKE ỊBARA GỊ

11. Olee ụzọ ọtụtụ ndị na-eto eto si na-ejere Jehova ozi?

11 E nwere ọtụtụ ụzọ ị ga-esi jeere Jehova ozi. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eto eto so na-arụ ụlọ ndị a na-arụ ná nzukọ Jehova. A chọkwuru ọtụtụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọhụrụ. Iso na-arụ ya bụ ozi dị nsọ na-eme ka e too Chineke, meekwa gị obi ụtọ. Obi ga-adịkwa gị ụtọ ma gị na ụmụnna ndị ọzọ soro na-arụ ọrụ ahụ. Ị ga-amụtakwa ọtụtụ ihe n’ihi na ọ ga-akụziri gị otú ị ga-esi na-akpachapụ anya ka ị ghara imerụ ahụ́, na-arụsi ọrụ ike, na-erubekwara ndị na-elekọta ọrụ isi.

Ndị banyere n’ozi oge niile ga-enweta ọtụtụ ngọzi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 ruo na nke 13)

12. Olee otú ịsụ ụzọ nwere ike isi mee ka ị rụwa ụdị ọrụ ndị ọzọ?

12 Otu nwanna aha ya bụ Kevin sịrị: “Kemgbe m bụ nwata, m chọrọ ijere Jehova ozi oge niile. M mechara bido ịsụ ụzọ mgbe m dị afọ iri na itoolu. Otú m si na-akpata ihe m ga-eri bụ iso otu nwanna nke na-arụ ụlọ na-arụ ọrụ ga-enye m ohere ijekwuru Jehova ozi. M mụrụ otú e si akụ gbamgbam ụlọ, na otú e si etinye windo na ibo ụzọ. Ka oge na-aga, mụ na ụmụnna ndị na-arụzi Ụlọ Nzukọ Alaeze na ụlọ ụmụnna oké ifufe mebisịrị rụkọrọ ọrụ afọ abụọ. Mgbe m nụrụ na a chọrọ ndị ga-enye aka rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Saụt Afrịka, m tinyere akwụkwọ, a kpọọ m ka m soro rụọ ọrụ ahụ. N’Afrịka ebe a, anyị rụchaa otu Ụlọ Nzukọ Alaeze n’izu ole na ole, anyị agafee n’ọzọ. Anyị niile dị ka otu ezinụlọ. Anyị na-ebikọ ọnụ, na-amụkọ Baịbụl, na-arụkọkwa ọrụ. Iso ụmụnna ndị bi n’ebe a ekwusa ozi ọma kwa izu na-atọkwa m ụtọ. Ihe ahụ m kpebiri mgbe m bụ nwata emeela ka obi na-adị m ụtọ otú m na-atụdịghị anya ya.”

13. Olee otú ije ozi na Betel si eme ka obi na-adị ndị na-eto eto ụtọ?

13 Ụfọdụ n’ime ndị kpebiri ijere Jehova ozi oge niile na-arụ ọrụ na Betel ugbu a. Ozi Betel ga-eme ka obi na-adị gị ụtọ n’ihi na ọ bụ Jehova ka ị na-arụrụ ọrụ ọ bụla ị na-arụ n’ebe ahụ. Ndị nọ na Betel na-enye aka n’ime ka e nweta Baịbụl na akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl. Otu nwanna nọ na Betel aha ya bụ Dustin sịrị: “Ije ozi oge niile bụ ihe m kpebiri ime mgbe m dị afọ itoolu. M bidoro ịsụ ụzọ mgbe m gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Mgbe otu afọ na ọkara gara, a kpọrọ m ka m bịa Betel. M mụtara otú e si eji ígwè ebi akwụkwọ, mechaakwa mụta otú e si emepụta ihe ndị e ji arụ ọrụ na kọmputa. Na Betel, obi na-adị m ụtọ iso ná ndị mbụ na-anụ otú ozi ọma si na-aga n’ụwa niile. Ije ozi ebe a na-atọgbu m atọgbu n’ihi na ihe anyị na-arụ na-enyere ndị mmadụ aka ịbịaru Jehova nso.”

OLEE IHE NDỊ I BU N’OBI IME N’ỌDỊNIHU?

14. Olee ihe ndị ị ga-eme ugbu a ka i nwee ike ije ozi oge niile?

14 Olee ihe ndị ị ga-eme ka i nwee ike ije ozi oge niile? Ihe kacha mkpa bụ na ịkpa àgwà Onye Kraịst ga-enyere gị aka iji oge gị niile na-ejere Jehova ozi. N’ihi ya, na-amụsi Baịbụl ike, na-echebara ihe ị na-amụ echiche, gbaakwa mbọ ịna-aza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. Mgbe ị ka na-aga ụlọ akwụkwọ, i nwere ike ịmụta otú ị ga-esi na-ekwusa ozi ọma nke ọma. Mụta ịna-egosi ndị mmadụ na ihe ha masịrị gị. Otú ị ga-esi na-eme ya bụ iji akọ na-ajụ ha ihe ha chere na ige ntị mgbe ha na-aza gị ya. I nwekwara ike iwepụta onwe gị ịrụ ihe ndị a na-arụ n’ọgbakọ, dị ka ịzacha Ụlọ Nzukọ Alaeze na ịrụzi ihe mebiri na ya. Obi na-adị Jehova ụtọ iji ndị dị umeala n’obi na ndị na-ewepụta onwe ha arụ ọrụ. (Gụọ Abụ Ọma 110:3; Ọrụ 6:​1-3) Pọl onyeozi gwara Timoti ka o soro ya jewe ozi ala ọzọ n’ihi na ụmụnna ‘kọrọ akụkọ ọma banyere ya.’​—⁠Ọrụ 16:​1-5.

15. Gịnị ka ị ga-eme ka i nwee ike inweta ọrụ ị ga-eji na-egbo mkpa gị?

15 Ọtụtụ ndị na-eje ozi oge niile kwesịrị ịna-arụ ọrụ ha ga-eji na-akpata ego. (Ọrụ 18:​2, 3) I nwere ike ịmụ ụdị ọrụ ga-enyere gị aka ma ị sụwa ụzọ. I kpebiwe ụdị ihe ahụ, kọọrọ ya onye nlekọta sekit unu na ndị ọsụ ụzọ nọ na sekit unu. Jụọ ha ụdị ọrụ ndị ọsụ ụzọ nwere ike ịrụ. Baịbụl kwukwara, sị: “Nyefee ọrụ gị n’aka Jehova, atụmatụ gị ga-eguzosikwa ike.”​—⁠Ilu 16:3; 20:⁠18.

16. Olee otú ijere Jehova ozi oge niile mgbe ị na-eto eto ga-esi mee ka i jikere ịrụ ọrụ ndị ọzọ n’ọdịnihu?

16 Ka obi sie gị ike na Jehova chọrọ ka i “jidesie aka ike ná ndụ ahụ nke bụ́ ndụ n’ezie.” (Gụọ 1 Timoti 6:​18, 19.) Ije ozi oge niile ga-eme ka ị mata ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ozi oge niile, meekwa ka ị ghọọ Onye Kraịst ṅụjuru mmiri ara afọ. Ọtụtụ ndị achọpụtala na iji oge ha niile na-ejere Jehova ozi mgbe ha na-eto eto enyerela ha aka ka ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-ebi n’udo. Ọtụtụ ndị bụ ndị ọsụ ụzọ tupu ha alụọ. Mgbe ha lụchara, ha aka na-asụkwa ụzọ.​—⁠Rom 16:​3, 4.

17, 18. Olee otú ihe i kpebiri ime si gbasa obi gị?

17 Ọ bụ obi gị ka ị ga-eji kpebie ihe ị chọrọ ime. Abụ Ọma 20:4 kwuru banyere Jehova, sị: “Ka o nye gị ihe obi gị chọrọ, ka o mezuokwa ebumnobi gị niile.” N’ihi ya, chee ihe ị chọrọ iji ndụ gị eme. Cheekwa ihe Jehova na-eme n’oge anyị a na otú ị ga-esi soro na-ejere ya ozi. Kpebizie ime ihe ga-adị ya mma.

18 Ijere Jehova ozi oge niile ga-eme ka obi na-adị gị ezigbo ụtọ n’ihi na ọ bụ ọrụ na-eme ka a sọpụrụ Chineke. Abụ Ọma 37:4 sịrị: “Ka ihe Jehova na-atọkwa gị ụtọ nke ukwuu, ọ ga-enyekwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.”

^ para. 7 Ihe e ji dochie ya ugbu a bụ Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze.