Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?

Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?

“Unu onwe unu, nweenụ ndidi.”​—JEMS 5:8.

ABỤ: 78, 139

1, 2. (a) Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: “Ruo ole mgbe”? (b) Gịnị mere obi ga-eji dị anyị ụtọ maka ihe ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge gara aga mere?

NDỊ amụma bụ́ Aịzaya na Habakọk jụrụ Jehova, sị: “Ruo ole mgbe?” (Aịza. 6:11; Hab. 1:⁠2) Eze Devid jụkwara ajụjụ ahụ ugboro ise n’Abụ Ọma nke 13. (Ọma 13:​1, 2) Onyenwe anyị bụ́ Jizọs Kraịst jụdịrị ajụjụ a mgbe ọ hụrụ na ọtụtụ ndị enweghị okwukwe. (Mat. 17:17) N’ihi ya, o kwesịghị iju anyị anya ma anyị jụọ ajụjụ ahụ.

2 Gịnị nwere ike ime ka anyị jụọ, sị: “Ruo ole mgbe”? O nwere ike ịbụ na a na-emegbu anyị, ma ọ bụ na anyị na nká na ọrịa na-alụ. O nwere ike ịbụ na anyị na-echegbu onwe anyị n’ihi “oge dị oké egwu, nke tara akpụ” anyị bi na ya. (2 Tim. 3:⁠1) O nwekwara ike ịbụ na àgwà ọjọọ ndị mmadụ na-akpa na-eme ka ike na-agwụ anyị. Nke ọ bụla ọ bụ, obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ na ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge gara aga jụrụ ajụjụ a nwere ike ịna-enye anyị nsogbu n’obi. Jehova amaghịkwa ha ikpe maka ya.

3. Gịnị nwere ike inyere anyị aka ma nsogbu bịara anyị?

3 Gịnị nwere ike inyere anyị aka ma ụdị nsogbu ahụ bịara anyị? Jems, bụ́ nwanne Jizọs, si n’ike mmụọ nsọ gwa anyị, sị: “Ụmụnna m, nweenụ ndidi ruo n’oge ọnụnọ nke Onyenwe anyị.” (Jems 5:⁠7) N’eziokwu, anyị niile kwesịrị inwe ndidi. Ma, olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ọmarịcha àgwà a?

GỊNỊ BỤ NDIDI?

4, 5. (a) Gịnị ka inwe ndidi pụtara? (b) Olee otú Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, si kọwaa ihe inwe ndidi pụtara? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

4 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ bụ mmụọ nsọ ga-eme ka mmadụ nwee ndidi. Ọ bụrụ na Chineke enyereghị ụmụ mmadụ na-ezughị okè aka, ọ ga-esiri ha ike inwe ndidi ma nsogbu bịara ha. Ndidi bụ onyinye si n’aka Chineke. Otú anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ma Chineke ma ụmụ mmadụ n’anya bụ inwe ndidi. Ọ bụrụ na anyị enweghị ndidi, ịhụnanya anyị nwere n’ebe ndị mmadụ nọ ga-anyụ ka ọkụ. (1 Kọr. 13:4; Gal. 5:22) Mmadụ inwe ndidi pụtara na onye ahụ nwere àgwà ụfọdụ e ji mara Ndị Kraịst. Dị ka ihe atụ, ndidi na ntachi obi bụ nwanne. Ntachi obi na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị, anyị ana-enwekwa ọṅụ. (Kọl. 1:11; Jems 1:​3, 4) Inwe ndidi pụtakwara na anyị agaghị emegwara onye mere anyị ihe ọjọọ, nakwa na anyị ga-eji obi anyị niile na-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara anyị. Baịbụl gwakwara anyị ka anyị ghọta na anyị kwesịrị ịdị njikere ichere. Ọ bụ ihe dị mkpa Jems 5:​7, 8 na-akụziri anyị. (Gụọ ya.)

5 Gịnị mere anyị ji kwesị ịghọta na anyị kwesịrị ịdị njikere ichere Jehova? Jems, bụ́ onye na-eso ụzọ Jizọs, ji Ndị Kraịst tụnyere onye ọrụ ugbo. Ọ bụ eziokwu na onye ọrụ ugbo na-agbasi mbọ ike ịkụ mkpụrụ, ọ gaghị emeli ka mmiri zoo ma ọ bụ ka anwụ chaa, ma ọ bụkwanụ ka mkpụrụ ọ kụrụ too ngwa ngwa. Ọ gaghịkwa emeli ka oge ruo ngwa ngwa. Ọ ghọtara na o kwesịrị inwe ndidi ma chere ka mkpụrụ ọ kụrụ mịa. Otú ahụ ka ọ dị anyị. E nwere ọtụtụ ihe anyị na-agaghị emeli ka anyị na-eche ka Jehova mezuo ihe ndị o kwere ná nkwa. (Mak 13:​32, 33; Ọrụ 1:⁠7) Anyị kwesịrị iji ndidi chere otú ahụ onye ọrụ ugbo na-eme.

6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Maịka onye amụma mere?

6 Nsogbu ndị anyị na-ahụ ugbu a yiri ụdị nsogbu e nwere n’oge Maịka onye amụma. Maịka dịrị ndụ n’oge eze ọjọọ bụ́ Ehaz na-achị. N’oge ahụ, ihe ọjọọ nọ na-arị ibe ya elu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmadụ nọ na-eme ‘ihe ọjọọ, na-emeta ya nke ọma.’ (Gụọ Maịka 7:​1-3.) Maịka ma na ya agaghị ejili aka ya mee ka nsogbu ndị ahụ kwụsị. Gịnịzi ka ọ ga-eme? Ọ gwara anyị, sị: “Ma mụ onwe m, m ga na-ele anya Jehova. M ga-echere Chineke nke nzọpụta m. Chineke m ga-anụ olu m.” (Maị. 7:⁠7) Anyị kwesịkwara ‘ichere Chineke’ otú ahụ Maịka mere.

7. Gịnị mere anyị ji kwesị iji obi anyị niile chere ka Jehova mezuo nkwa ndị o kwere?

7 Anyị nwee okwukwe ka Maịka, anyị ga-eji obi anyị niile chere Jehova. Anyị adịghị ka onye mkpọrọ na-eche mgbe a ga-egbu ya. Ọ ga-echere, ma ọ̀ chọrọ ma ọ chọghị. Ma, ọ gaghị adị ya ka ụbọchị ahụ ruo eruo. Ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị anyị. Anyị dị njikere ichere Jehova n’ihi na anyị ma na oge ruo, ọ ga-enye anyị ndụ ebighị ebi ahụ o kwere anyị ná nkwa. Ọ bụ ya mere anyị ji jiri “ọṅụ na-enwe ogologo ntachi obi.” (Kọl. 1:​11, 12) Mgbe anyị na-echere, anyị ekwesịghị ịna-atamu ntamu na Jehova na-egbu oge. Anyị mee otú ahụ, obi agaghị adị ya mma.​—⁠Kọl. 3:⁠12.

NDỊ NWERE NDIDI N’OGE OCHIE

8. Olee ihe anyị kwesịrị icheta ka anyị na-atụgharị uche n’akụkọ gbasara ndị nwoke na ndị nwaanyị ndị ji obi ha niile fee Chineke n’oge ochie?

8 Anyị ga-adị njikere ichere Jehova ma anyị cheta ndị nwoke na ndị nwaanyị ji obi ha niile chere ka Jehova mezuo nkwa ndị o kwere. (Rom 15:⁠4) Ka anyị na-atụgharị uche n’akụkọ ha, ọ ga-adị mma ka anyị cheta mgbe ha cheruru, ihe mere ha ji dị njikere ichere, nakwa otú Jehova si gọzie ha n’ihi ndidi ha nwere.

Ebreham cheere ọtụtụ afọ tupu a mụọ ụmụ ụmụ ya, bụ́ Isọ na Jekọb (A ga-akọwa ya na paragraf nke 9 na nke 10)

9, 10. Afọ ole ka Ebreham na Sera cheere Jehova?

Chegodị gbasara Ebreham na Sera. Ha so ná ‘ndị sitere n’okwukwe na ndidi keta nkwa ndị e kwere.’ Baịbụl gwara anyị na “mgbe Ebreham nwesịrị ndidi, ọ natara nkwa” ahụ Jehova kwere na ọ ga-agọzi ya meekwa ka ụmụ ya dị ọtụtụ. (Hib. 6:​12, 15) Gịnị mere Ebreham ji kwesị inwe ndidi? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ afọ ga-agafe tupu Chineke emezuo nkwa o kwere ya. Nkwa ahụ malitere imezu n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan afọ 1943 Tupu Oge Ndị Kraịst. N’ụbọchị ahụ, Ebreham na Sera nakwa ndị ezinụlọ ha ndị ọzọ gafere Osimiri Yufretis, banye n’Ala Nkwa ahụ. Ebreham cheere ruo afọ iri abụọ na ise tupu a mụọ nwa ya bụ́ Aịzik n’afọ 1918 Tupu Oge Ndị Kraịst. O cheere afọ iri isii ọzọ tupu a mụọ ụmụ ụmụ ya, bụ́ Isọ na Jekọb, n’afọ 1858 Tupu Oge Ndị Kraịst.​—⁠Hib. 11:⁠9.

10 Ala ole ka Ebreham ketara n’Ala Nkwa ahụ? Baịbụl kwuru na Jehova ‘enyeghị ya ihe nketa ọ bụla n’ime ya, ee e, ọbụnadị otu amaụkwụ; kama o kwere nkwa iwere ya nye ya ka ọ bụrụ nke ya, na iwere ya nye mkpụrụ ya nke ga-anọchi ya, mgbe ọ na-enwebeghị nwa.’ (Ọrụ 7:⁠5) Malite mgbe ahụ Ebreham gafechara Osimiri Yufretis, narị afọ anọ na iri atọ gara tupu a hazie ụmụ ụmụ ya ka ha bụrụ mba ga-eketa ala ahụ.​—⁠Ọpụ. 12:​40-42; Gal. 3:⁠17.

11. Gịnị mere Ebreham ji dị njikere ichere Jehova? Oleekwa otú Jehova ga-esi gọzie ya maka ndidi o nwere?

11 Ebreham dị njikere ichere n’ihi na ọ tụkwasịrị Jehova obi na ọ ga-emezu nkwa o kwere ya. (Gụọ Ndị Hibru 11:​8-12.) Ebreham ji obi ụtọ chere n’agbanyeghị na ọ hụghị otú nkwa ahụ niile Jehova kwere si mezuo n’oge ya. Ma chegodị ụdị obi ụtọ Ebreham ga-enwe mgbe a ga-akpọlite ya n’ọnwụ n’ụwa ọhụrụ. Ọ ga-eju ya anya ịhụ otú e si kọọ akụkọ ya na ụmụ ya na Baịbụl. * Cheekwa ụdị aṅụrị ọ ga-enwe ma ọ ghọta ọrụ dị mkpa o so rụọ n’imezu ihe Jehova bu n’obi gbasara mkpụrụ ahụ e kwere ná nkwa. O doro anya na oge niile ahụ o cheere efughị ọhịa.

12, 13. Gịnị mere Josef ji kwesị inwe ndidi? Olee àgwà ọma o nwere?

12 Nwa nwa Ebreham, bụ́ Josef, mekwara ihe gosiri na ọ dị njikere ichere Jehova. E megburu ya ọtụtụ ugboro. Nke mbụ bụ na ụmụnne ya rere ya ka ọ gaa gbawa ohu mgbe ọ dị ihe dị ka afọ iri na asaa. E mechara bo ya ebubo na ọ chọrọ idina nwunye nna ya ukwu n’ike, nke mere ka a tụọ ya mkpọrọ. (Jen. 39:​11-20; Ọma 105:​17, 18) Ọ dịzi ka à tara Josef ahụhụ n’ihi ezi omume ya kama ịgọzi ya. Ma, mgbe afọ iri na atọ gachara, ihe niile gbanwere. A kpọpụtara ya n’ụlọ mkpọrọ, mee ya onye na-esote eze Ijipt.​—⁠Jen. 41:​14, 37-43; Ọrụ 7:​9, 10.

13 Mmegbu e megburu Josef ò mere ka ọsụkọsụ na-asụ ya? Ọ̀ dị ya ka Jehova ọ̀ hapụla ya? Mbanụ. Gịnị nyeere Josef aka iji ndidi chere? Ọ bụ ịtụkwasị Jehova obi. Ọ ghọtara otú Jehova si hazie ihe niile. Ihe ọ gwara ụmụnne ya gosiri na ọ bụ eziokwu. Ọ sịrị ha: “Unu atụla egwu, n’ihi na ànọ m n’ọnọdụ Chineke? Unu onwe unu buuru m ihe ọjọọ n’obi. Chineke bu n’obi ka ọ bụrụ ihe ọma ka o wee mee ihe dị ka ọ dị taa iji chebe ọtụtụ mmadụ ndụ.” (Jen. 50:​19, 20) Josef mechara ghọta na ichere Jehova bara ezigbo uru.

14, 15. (a) Olee ihe pụrụ iche n’otú Devid si nwee ndidi? (b) Gịnị nyeere Devid aka iji ndidi chere Jehova?

14 E megbukwara Eze Devid ọtụtụ ugboro. N’agbanyeghị na Jehova tere ya mmanụ ka ọ bụrụ eze ga-achị Izrel mgbe ọ ka bụ nwata, o cheere ihe dị ka afọ iri na ise tupu e mee ya eze n’obodo ya. (2 Sam. 2:​3, 4) N’oge ahụ ọ nọ na-eche, e nwere mgbe Eze Sọl nọ na-achụgharị ya, na-achọ igbu ya. * Ọ bụ ya mere Devid ji na-agba ọsọ ndụ. Mgbe ụfọdụ, ya agbaga n’obodo ọzọ, mgbe ụfọdụkwa ya agbaga n’ọgba ndị dị n’ọzara. Mgbe e mechara gbuo Sọl n’agha, Devid cheere ọzọ ruo ihe dị ka afọ asaa tupu e mee ya eze mba Izrel.​—⁠2 Sam. 5:​4, 5.

15 Gịnị mere Devid ji dị njikere iji ndidi chere? Ọ zara ajụjụ a n’abụ ọma ahụ ọ jụrụ Jehova ugboro ise, sị: “Ruo ole mgbe?” O kwuru, sị: “Ma mụ onwe m, n’obiọma gị ka m tụkwasịrị obi; ka obi m ṅụrịa ọṅụ n’ihi nzọpụta gị. M ga-abụku Jehova abụ, n’ihi na o mesowo m mmeso ọma.” (Ọma 13:​5, 6) Obi siri Devid ike na Jehova hụrụ ya n’anya, nakwa na ọ gaghị ahapụ ya. O ji obi ụtọ na-atụsi anya ike mgbe Jehova ga-anapụta ya. O chekwara otú Jehova sirila gọzie ya n’oge gara aga. N’eziokwu, Devid ma na oge ahụ o ji chere ga-aba uru.

N’ihe gbasara inwe ndidi, Jehova anaghị atụ anya ka anyị mee ihe ọ na-agaghị achọ ime

16, 17. Olee otú kacha mma Jehova Chineke na Jizọs Kraịst sirila gosi na ha dị njikere ichere?

16 N’ihe gbasara inwe ndidi, Jehova anaghị atụ anya ka anyị mee ihe ọ na-agaghị achọ ime. Ọ bụ ya kacha nwee ndidi. (Gụọ 2 Pita 3:⁠9.) Kemgbe ọtụtụ puku afọ, Jehova ji ndidi na-echere ka o doo onye ọ bụla anya na ebubo ahụ Setan boro ya n’ogige Iden bụ ụgha. Ọ “na-atụ anya” mgbe a ga-edo aha ya nsọ, nke ga-eme ka “ndị niile na-atụ anya ya” nweta ngọzi magburu onwe ya.​—⁠Aịza. 30:⁠18.

17 Jizọs dịkwa njikere ichere. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o rubeere Chineke isi ruo ọnwụ. Ọ bụ eziokwu na o meriri ọnwụnwa ndị bịaara ya, a kpọlite ya n’ọnwụ n’afọ 33. Ma, o cheere ruo n’afọ 1914 tupu ya amalite ịchị. (Ọrụ 2:​33-35; Hib. 10:​12, 13) Ọ ga-echerekwa ruo mgbe ọ ga-achịcha otu puku afọ tupu e bibie ndị iro ya niile. (1 Kọr. 15:25) Ọ ga-apụta na o cheela ọtụtụ afọ. Ma, obi siri anyị ike na nchere ahụ ọ ga-echere ga-aba uru.

GỊNỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA?

18, 19. Gịnị ga-enyere anyị aka ịdị njikere iji ndidi chere?

18 O doro anya na onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịdị njikere ichere, gosikwa na anyị nwere ndidi. Ma, gịnị ga-enyere anyị aka iji ndidi chere? Ọ bụ ịrịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ ya. Cheta na ndidi so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. (Efe. 3:16; 6:18; 1 Tesa. 5:​17-19) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka iji ndidi tachie obi.

19 Chetakwa ihe nyeere Ebreham, Josef, na Devid aka iji ndidi chere mgbe Jehova ga-emezu nkwa o kwere. Ọ bụ okwukwe ha nwere n’ebe Jehova nọ na otú ha si tụkwasị Jehova obi. Ha anọghị na-eche naanị gbasara onwe ha na ihe ndị ha chọrọ. Ka anyị na-eche otú ihe si gaziere ha, ọ ga-eme ka anyị nwee ndidi.

20. Gịnị ka onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 N’ihi ya, a sịgodị na ọnwụnwa na nsogbu abịara anyị, anyị kpebisiri ike ‘ichere’ Jehova. N’eziokwu, anyị nwere ike ịjụ Jehova mgbe ụfọdụ, sị: “Ruo ole mgbe?” (Aịza. 6:11) Ma, mmụọ nsọ Chineke na-enyere onye ọ bụla n’ime anyị aka ikwu ihe Jeremaya onye amụma kwuru. Ọ sịrị: “Jehova bụ òkè m, ọ bụ ya mere m ga-eji chere ya.”​—⁠Ákwá 3:​21, 24.

^ para. 11 E ji ihe dị ka isi iri na ise kọọ akụkọ Ebreham n’akwụkwọ Jenesis. Ihe ọzọ bụ na ndị dere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst kwuru banyere Ebreham ihe karịrị ugboro iri asaa.

^ para. 14 Ọ bụ eziokwu na Jehova jụrụ Sọl mgbe ọ chịrị ihe karịtụrụ afọ abụọ, ọ hapụrụ ya ka ọ na-achị ruo afọ iri atọ na asatọ, ruo mgbe ọ nwụrụ.​—⁠1 Sam. 13:1; Ọrụ 13:⁠21.