Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

“Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”

“Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”

“Udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu . . . nche.”​—FIL. 4:7.

ABỤ: 76, 141

1, 2. Olee ihe ndị mere tupu a tụọ Pọl na Saịlas mkpọrọ na Filipaị? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

WEREGODỊ ya na ị na-ahụ ihe na-emenụ. N’ihe dị ka n’etiti abalị, Pọl na Saịlas, bụ́ ndị ozi ala ọzọ, nọ n’ime ime ụlọ mkpọrọ dị na Filipaị. A kpọchisiri ụkwụ ha ike n’ọtọsị. Azụ ka na-egbukwa ha mgbu n’ihi ihe e tiri ha. (Ọrụ 16:​23, 24) Ihe a niile mere n’egbughị oge. Ìgwè mmadụ iwe ji nọkatara dọkpụrụ ha baa n’ọma ahịa ka e kpee ha ikpe. A dọkara uwe ha, pịakasịa ha ahụ́. (Ọrụ 16:​16-22) Ihe a bụ arụrụala. Ebe Pọl bụ nwa amaala Rom, e kwesịrị ikpe ya ikpe ziri ezi. *

2 Ka Pọl nọ n’ụlọ mkpọrọ ahụ gbara ọchịchịrị, ọ ga-abụ na ọ nọ na-eche ihe ndị mere n’ụbọchị ahụ, na-echekwa gbasara ndị Filipaị. E nweghịdị ụlọ nzukọ ndị Juu n’obodo ahụ otú e nwere n’ọtụtụ obodo ndị ọzọ Pọl garala. N’ihi ya, ndị Juu chọọ ife Chineke, ha na-esi n’obodo ahụ pụọ, gaa n’akụkụ osimiri. (Ọrụ 16:​13, 14) Tupu e nwee ụlọ nzukọ ndị Juu n’obodo, a ga-enwerịrị ihe ruru ụmụ nwoke ndị Juu iri. Ọ̀ ga-abụ na ha erughị iri n’obodo ahụ? O doro anya na ndị Filipaị na-eji ịbụ nwa amaala Rom eme ọnụ. (Ọrụ 16:21) Ọ̀ ga-abụ ya mere na ha echetụdịghị na Pọl na Saịlas, bụ́ ndị Juu, nwekwara ike ịbụ ụmụ amaala Rom? Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, a tụrụ Pọl na Saịlas mkpọrọ n’enweghị ihe ha mere.

3. Gịnị nwere ike ime ka mkpọrọ a tụrụ Pọl gbagwojuo ya anya, ma olee ihe o mere?

3 O nwekwara ike ịbụ na Pọl nọ na-eche gbasara ihe ndị mere ọnwa ole na ole gara aga. Ọ nọ n’akụkụ nke ọzọ nke Oké Osimiri Ejiyan, dị n’Eshia Maịnọ. Ka Pọl nọ ebe ahụ, mmụọ nsọ gbochiri ya ugboro ugboro ikwusa ozi ọma n’ebe ụfọdụ. Ọ dị ka à ga-asị na mmụọ nsọ nọ na-enu ya aka ka ọ gaa ebe ọzọ. (Ọrụ 16:​6, 7) Ma, olee ebe ọ bụ? A gwara ya ebe ọ bụ n’ọhụụ ọ hụrụ na Troas. A gwara ya, sị: “Gafeta na Masedonia.” O doro anya na ọ bụ ihe Jehova chọrọ. N’ihi ya, Pọl zara òkù ahụ ozugbo. (Gụọ Ọrụ Ndịozi 16:​8-10.) Ma, gịnịzi mere? Ọ dịghị anya ọ batara Masedonia, a tụọ ya mkpọrọ. Gịnị mere Jehova ji kwe ka ụdị ihe a mee Pọl? Afọ ole ka ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ? Ọ bụrụgodị na ajụjụ ndị a nọ na-echu Pọl ụra, ọ kwụsịghị inwe okwukwe na obi ụtọ. Ya na Saịlas malitere ‘ikpe ekpere na iji abụ na-eto Chineke.’ (Ọrụ 16:25) Udo nke Chineke mere ka obi ruo ha ala.

4, 5. (a) Olee otú nsogbu bịaara anyị nwere ike isi yie nke Pọl? (b) Olee otú ihe si gbanwee otú Pọl na-atụghị anya ya?

4 Ikekwe, e nweela mgbe ụfọdụ ọ dị gị otú ahụ ọ dị Pọl. Obi siri gị ike na i kwere ka mmụọ nsọ na-eduzi gị, ma ihe agaghị otú ị tụrụ anya ya. Ọtụtụ nsogbu abịara gị, ma ọ bụ e nwee ihe ndị mere gị, nke mere ka ọtụtụ ihe gbanwee ná ndụ gị. (Ekli. 9:11) Ka ị na-eche gbasara nsogbu ndị a, i nwere ike na-eche ihe mere Jehova ji kwe ka ihe ụfọdụ mee. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, gịnị ga-enyere gị aka ịtachi obi ma tụkwasị Jehova obi gị niile? Iji mata azịza ajụjụ a, ka anyị kọọ ihe ndị ọzọ mere Pọl na Saịlas.

5 Ka Pọl na Saịlas ji abụ na-eto Chineke, ọtụtụ ihe a na-atụghị anya ha mere. Na mberede, oké ala ọma jijiji mere. Ọnụ ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ emeghee. Agbụ e kere ndị mkpọrọ ahụ niile tọpụrụ. Pọl mere ka onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ ghara igbu onwe ya. Onye nche ụlọ mkpọrọ ahụ na ndị ezinụlọ ya niile mere baptizim. N’isi ụtụtụ echi ya, ndị isi obodo dunyere ndị uwe ojii ka ha tọhapụ Pọl na Saịlas. Ndị isi ahụ gwara ha ka ha si n’obodo ahụ pụọ. Mgbe ha matara na Pọl na Saịlas bụ ụmụ amaala Rom, ha ghọtara na ihe ha mere dị ezigbo njọ. Ha eduru Pọl na Saịlas pụọ. Ma, tupu Pọl na Saịlas alawa, ha gara hụ Lidia, bụ́ nwanna nwaanyị e mere baptizim n’oge na-adịbeghị anya. Ha jikwa ohere ahụ gbaa ụmụnna ndị ọzọ ume. (Ọrụ 16:​26-40) Ị̀ hụlanụ otú egwú si dagharịa?

Ọ “KARỊRỊ ECHICHE NIILE”

6. Gịnị ka anyị ga-atụle ugbu a?

6 Gịnị ka anyị na-amụta n’ihe a niile merenụ? Jehova ga-emeli ihe a na-atụghị anya ya. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ichegbuwe onwe anyị ma ọnwụnwa bịara anyị. O doro anya na Pọl echefughị ihe ọ mụtara echefu. Otú anyị si mata bụ ihe o kwuru gbasara nchegbu na udo nke Chineke n’akwụkwọ ozi o degaara ụmụnna nọ na Filipaị. Ka anyị buru ụzọ tụlee ihe Pọl kwuru ná Ndị Filipaị 4:​6, 7. (Gụọ ya.) Anyị ga-elebakwa anya n’ebe ndị ọzọ Baịbụl kọrọ otú Jehova si mee ihe a na-atụghị anya ya. N’ikpeazụ, anyị ga-eleba anya n’otú “udo nke Chineke” nwere ike isi nyere anyị aka ịtachi obi ma anyị tụkwasị Jehova obi anyị niile.

7. Gịnị ka Pọl ji akwụkwọ ozi o mechara degara ụmụnna nọ na Filipaị kụzie? Gịnịkwa ka anyị na-amụta na ya?

7 O doro anya na mgbe ụmụnna ndị nọ na Filipaị gụrụ akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ha, ha chetara ihe mere Pọl na Saịlas na otú ha na-atụghị anya Jehova si nyere ha aka. Gịnị ka Pọl ji akwụkwọ ozi ahụ na-akụziri ha? O ji ya na-asị ha, ‘Unu echegbula onwe unu. Kpeenụ ekpere. Unu ga-enwe udo nke Chineke.’ Ma, cheta na Pọl kwuru na “udo nke Chineke . . . karịrị echiche niile.” Gịnị ka ọ pụtara? Otú e si kwuo ya n’ụfọdụ Baịbụl bụ udo nke Chineke nke “karịrị ihe niile anyị chọrọ” ma ọ bụ “ihe karịrị ihe niile ndị mmadụ bu n’obi.” Ihe Pọl na-ekwu bụ na “udo nke Chineke” karịrị ihe ọ bụla anyị nwere ike ịtụ anya ya. N’ihi ya, ọ bụ eziokwu na anyị nwere ike anyị agaghị ama ihe anyị ga-eme ma nsogbu bịara anyị, Jehova ma. O nwekwara ike ime ihe anyị na-atụghị anya ya.​—⁠Gụọ 2 Pita 2:⁠9.

8, 9. (a) N’agbanyeghị na a tara Pọl ahụhụ na Filipaị, olee ihe ọma ndị merenụ? (b) Gịnị mere ụmụnna nọ na Filipaị ejighị ihe Pọl kwuru gwuo egwu?

8 Ọ ga-abụrịrị na akwụkwọ ozi ahụ Pọl degaara ụmụnna nọ na Filipaị mere ka obi sie ha ike ka ha na-eche banyere ihe Jehova meere ha kemgbe afọ iri ihe ndị ahụ mechara. Ihe Pọl dere bụ eziokwu. Ọ bụ eziokwu na Jehova kwere ka e megbuo Pọl na Saịlas, ma ihe ndị ahụ merenụ mere ka ‘a kwado ozi ọma, jirikwa iwu mee ka o guzosie ike.’ (Fil. 1:⁠7) Ndị isi obodo ahụ agaghị anwa anwa ọzọ kpagbuo ọgbakọ Ndị Kraịst malitere ọhụrụ n’obodo ha. O nwere ike bụrụ ihe Pọl mere mere ka Luk, bụ́ onye ya na ya so na-eje ozi, nwee ike ịnọ na Filipaị mgbe Pọl na Saịlas lara. Luk nyekwuuru ndị ghọrọ Ndị Kraịst ọhụrụ n’obodo ahụ aka.

9 N’eziokwu, mgbe ụmụnna ndị nọ na Filipaị gụrụ akwụkwọ ozi Pọl, ha ghọtara na ọ bụghị ihe o chepụtara n’onwe ya. Ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara Pọl, ma o mere ihe gosiri na o nwere “udo nke Chineke.” Mgbe o degaara ụmụnna ndị ahụ akwụkwọ ozi ahụ, a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya dị na Rom. Ma, ọ ka gosiri na o nwere “udo nke Chineke.”​—⁠Fil. 1:​12-14; 4:​7, 11, 22.

“UNU ECHEGBULA ONWE UNU BANYERE IHE Ọ BỤLA”

10, 11. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e nwee nsogbu na-echu anyị ụra? Gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịtụ anya ya?

10 Gịnị ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị banyere ihe ọ bụla ma nwee “udo nke Chineke”? Ihe Pọl gwara ndị Filipaị gosiri na ọ bụ ekpere ga-eme ka anyị kwụsị ichegbu onwe anyị. N’ihi ya, e nwee ihe na-echegbu anyị, anyị kwesịrị ịkọrọ ya Jehova. (Gụọ 1 Pita 5:​6, 7.) Jiri obi gị niile rịọ Jehova, ebe ị ma na ihe gbasara gị na-emetụ ya n’obi. I kpewe ekpere, ‘kelee’ ya maka ihe ọma ndị o meere gị. Anyị ga-atụkwasịkwu ya obi ma anyị cheta na ọ ga-emeli ihe karịrị “ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.”​—⁠Efe. 3:⁠20.

11 Ihe Jehova na-emere anyị nwere ike iju anyị anya otú ahụ o juru Pọl na Saịlas. O nwere ike ọ bụghị ihe pụrụ iche, ma ọ na-abụkarị ihe ga-egboro anyị mkpa. (1 Kọr. 10:13) Ma, ọ pụtaghị na anyị ga-afanye aka n’ụkwụ na-eche ka Jehova dozie nsogbu ahụ. Anyị kwesịrị ịna-eme ihe anyị na-ekpe n’ekpere. (Rom 12:11) Ihe anyị na-eme ga-egosi na ihe anyị rịọrọ si anyị n’obi, gosikwa na anyị chọrọ ka Jehova gọzie anyị. Ma, anyị kwesịkwara ịghọta na ihe Jehova ga-emere anyị abụghị naanị ihe anyị rịọrọ ya, ihe anyị bu n’obi, na ihe anyị tụrụ anya ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-emere anyị ihe anyị na-atụghị anya ya. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ a kọrọ na Baịbụl ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-emeliri anyị ihe anyị na-atụghị anya ya.

IHE NDỊ A NA-ATỤGHỊ ANYA HA JEHOVA MERE

12. (a) Gịnị ka Eze Hezekaya mere mgbe Senakerib bụ́ eze Asiria yiri ya egwu? (b) Gịnị ka anyị mụtara n’otú Jehova si mee ka nsogbu ahụ bie?

12 Baịbụl kọrọ ugboro ugboro gbasara otú Jehova si mee ihe a na-atụghị anya ya. Mgbe Hezekaya bụ eze Juda, Senakerib bụ́ eze Asiria busoro ndị Juda agha ma weghara obodo niile e wusiri ike, e wezụga Jeruselem. (2 Eze 18:​1-3, 13) Senakerib mechara bịa ịlụso Jeruselem ọgụ. Gịnị ka Eze Hezekaya mere mgbe e yiri ha egwu? Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ya aka, gakwurukwa onye amụma Jehova bụ́ Aịzaya ka o nye ya ndụmọdụ. (2 Eze 19:​5, 15-20) Hezekaya gbalịkwara ime ihe gosiri na o nwere ezi uche. Ọ kwụrụ Senakerib ihe ọ manyere ya kwụọ. (2 Eze 18:​14, 15) Ka oge na-aga, Hezekaya kwadebere maka ogologo oge e nwere ike ịnọchibido obodo ha. (2 Ihe 32:​2-4) Ma, olee otú nsogbu ahụ si bie? Jehova dunyere otu mmụọ ozi ya ka o gbuo otu narị puku ndị agha Senakerib na iri puku asatọ na puku ise n’otu abalị. N’eziokwu, Hezekaya atụdịghị anya na ụdị ihe a ga-eme.​—⁠2 Eze 19:⁠35.

Gịnị ka anyị mụtara n’ihe mere Josef?​—Jen. 41:⁠42. (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. (a) Gịnị ka anyị mụtara n’ihe mere Josef? (b) Olee ihe a na-atụghị anya ya meere nwunye Ebreham, bụ́ Sera?

13 Chegodị gbasara Josef, bụ́ nwa Jekọb. Mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’Ijipt, ọ̀ ma na a ga-eme ya osote eze Ijipt ma ọ̀ bụkwanụ na Jehova ga-eji ya zọpụta ezinụlọ ya ka agụụ ghara ịgụgbu ha? (Jen. 40:15; 41:​39-43; 50:20) O doro anya na ihe Jehova mere karịrị ihe Josef tụrụ anya ya. Cheekwa gbasara nne nne Josef bụ́ Sera. Mgbe Sera mere agadi, ọ̀ tụrụ anya na Jehova ga-eme ka ọ mụta nwa, ọ bụghị iji nwa ohu ya nwaanyị mụtara mere nwa? O doro anya na Sera echetụdịghị na ọ ga-amụta Aịzik.​—⁠Jen. 21:​1-3, 6, 7.

14. Gịnị kwesịrị ime ka anyị tụkwasị Jehova obi?

14 N’eziokwu, anyị anaghị atụ anya na Jehova ga-arụ ọrụ ebube wepụrụ anyị nsogbu anyị niile tupu ụwa ọhụrụ o kwere nkwa ya abịa. Anyị anaghịkwa agwa Jehova ka o meere anyị ihe pụrụ iche. Ma, anyị ma na Chineke ahụ nyeere ndị fere ya aka otú ha na-atụghị anya ya bụ Chineke anyị, bụ́ Jehova. (Gụọ Aịzaya 43:​10-13.) Ihe a kwesịrị ime ka anyị tụkwasị ya obi. Anyị ma na Jehova ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-eme ihe ọ chọrọ. (2 Kọr. 4:​7-9) Olee ihe ndị anyị mụtara n’ihe ndị a Baịbụl kọrọ? Akụkọ Hezekaya, Josef, na Sera gosiri na anyị tụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị yiri ka a gaghị emerili ha emeri.

Anyị tụkwasị Jehova obi, ọ ga-enyere anyị aka imeri nsogbu ndị yiri ka a gaghị emerili ha emeri

15. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe “udo nke Chineke?” Olee otú ọ ga-esi kwe omume?

15 Olee otú anyị ga-esi nwee “udo nke Chineke” n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara anyị? Otú anyị ga-esi eme ya bụ anyị na Chineke anyị, bụ́ Jehova, ịdị n’ezigbo mma. Ọ bụ naanị “n’aka Kraịst Jizọs,” bụ́ onye ji ndụ ya chụọ àjà, ka anyị ga-esi bịaruo ya nso. Ihe mgbapụta ahụ Chineke nyere anyị bụ ihe ọzọ dị ịtụnanya o meere anyị. O meela ka Jehova nwee ike ịgbaghara anyị mmehie, anyị enwee akọnuche dị ọcha ma bịaruo ya nso.​—⁠Jọn 14:6; Jems 4:8; 1 Pita 3:21.

Ọ GA-ECHE OBI UNU NA IKE ICHE ECHICHE UNU NCHE

16. Olee uru anyị ga-erite ma anyị nweta “udo nke Chineke”? Nye ihe atụ.

16 Olee uru anyị ga-erite ma anyị nweta “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile”? Baịbụl sịrị na ọ ‘ga-eche obi anyị na ike iche echiche anyị nche site n’aka Kraịst Jizọs.’ (Fil. 4:⁠7) Okwu e si sụgharịta ‘iche obi anyị nche’ bụ okwu e ji akọwa ndị agha ọrụ ha bụ ichebe obodo e wusiri ike n’oge ochie. Filipaị bụ ụdị obodo ahụ. Ndị bi na ya na-ehi ụra nke ọma n’abalị n’ihi na ha ma na ndị agha na-eche ọnụ ụzọ ámá ha nche. Otú ahụ ka ọ dị ma anyị nwee “udo nke Chineke.” Obi na-eru anyị ala. Anyị ma na Jehova na-elekọta anyị, chọọkwa ka ihe gaziere anyị. (1 Pita 5:10) Anyị ghọta ihe a, ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-echegbu onwe anyị ma ọ bụ mee ka anyị ghara ịda mbà.

17. Gịnị ga-enyere anyị aka inwe obi ike na ọdịnihu ga-aka mma?

17 N’oge na-adịghị anya, oké mkpagbu nke a na-enwetụbeghị ụdị ya n’ụwa ga-abịa. (Mat. 24:​21, 22) Anyị amachaghị ihe ga-eme anyị n’otu n’otu. Ma, anyị ekwesịghị ịna-echegbu onwe anyị. Ọ bụ eziokwu na anyị amaghị ihe niile Jehova ga-eme, anyị ma Chineke anyị. Anyị ma ihe ndị o meere ndị fere ya n’oge gara aga. Anyị ahụla na n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, Jehova ga-ahụ na e mezuru ihe bụ́ nzube ya. Mgbe ụfọdụ, ọ na-eme ya otú a na-atụghị anya ya. Mgbe ọ bụla Jehova meere anyị ihe anyị na-atụghị anya ya, anyị na-enwe “udo nke Chineke nke karịrị echiche niile.”

^ para. 1 Ọ dị ka Saịlas ọ̀ bụkwa nwa amaala Rom.​—⁠Ọrụ 16:⁠37.