Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Ga-esi Yipụ Mmadụ Ochie Ahụ, Gharakwa Iyiri Ya Ọzọ

Otú Anyị Ga-esi Yipụ Mmadụ Ochie Ahụ, Gharakwa Iyiri Ya Ọzọ

“Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya.”​—KỌL. 3:9.

ABỤ: 83, 129

1, 2. Olee ihe ndị mmadụ chọpụtarala banyere Ndịàmà Jehova?

ỌTỤTỤ ndị ekwuola gbasara àgwà pụrụ iche ha hụrụ Ndịàmà Jehova na-akpa. Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Anton Gill dere gbasara ụmụnna anyị nọ na Jamanị mgbe ndị Nazi chịrị. Ọ sịrị: “Ndị Nazi ejighị anya ahụ Ndịàmà Jehova. . . . N’afọ 1939, Ndịàmà Jehova nọ n’ogige ịta ahụhụ adịla puku mmadụ isii.” O kwukwara na n’agbanyeghị ahụhụ a tara ha, ha mere ihe gosiri na a ga-atụkwasịli ha obi, na obi ruru ha ala, na ha na-erubere Chineke isi, nakwa na ha dị n’otu.

2 N’oge na-adịbeghị anya, ndị Saụt Afrịka chọpụtakwara àgwà pụrụ iche Ndịàmà Jehova nwere. O nwere oge a na-anaghị ekwe ka Ndịàmà Jehova bụ́ ndị isi ojii na ndị ọcha zukọta. Ma, n’ụbọchị Sọnde, n’abalị iri na asatọ n’ọnwa iri na abụọ n’afọ 2011, ụmụnna anyị karịrị puku iri asaa na asatọ, bụ́ ndị si n’agbụrụ dị iche iche na Saụt Afrịka na mba ndị dị ya nso, zukọtara n’ámá egwuregwu kacha buo ibu n’obodo Johanisbọg ka ha gere ihe omume pụrụ iche a ga-eme. Otu nwoke so bụrụ manịja n’ámá egwuregwu ahụ kwuru gbasara ndị ahụ zukọtaranụ, sị: “Kemgbe ndị mmadụ na-ezukọta n’ámá egwuregwu a, ọ bụ unu kacha kpaa ezigbo àgwà. Unu niile yi uwe dị mma. Unu emeekwa ka ámá egwuregwu a dị ezigbo ọcha. Ma nke ka nke, unu si agbụrụ dị iche iche.”

3. Gịnị mere nzukọ Jehova ji dị iche n’okpukpe ndị ọzọ?

3 Ihe a ndị na-abụghị Ndịàmà Jehova kwurula gosiri na nzukọ Jehova pụrụ nnọọ iche. (1 Pita 5:⁠9) Ma, gịnịzi mere anyị ji dị iche n’okpukpe ndị ọzọ? Okwu Chineke na mmụọ nsọ na-enyere anyị aka ịgbalịsi ike ‘iyipụ mmadụ ochie ahụ,’ ma ‘yiri mmadụ ọhụrụ ahụ.’​—⁠Kọl. 3:​9, 10.

4. Gịnị ka anyị ga-eleba anya n’isiokwu a, n’ihi gịnịkwa?

4 Anyị yipụ mmadụ ochie ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara iyiri ya ọzọ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị nwere ike isi yipụ mmadụ ochie ahụ, ihe mere o ji dị mkpa, na ihe mere ọ ga-eji kwe omume n’agbanyeghị otú mmadụ merurula ihe ọjọọ. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị nọrọla n’ọgbakọ ọtụtụ afọ nwere ike ime ka ha ghara iyiri mmadụ ochie ahụ ọzọ. Gịnị mere anyị ji kwesị ileba anya n’ihe ndị a? Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị feburu Jehova kwụsịrị ịkpachapụ anya ma malite ịkpa àgwà ọjọọ ha na-akpabu. N’ihi ya, anyị niile kwesịrị iburu n’obi ndụmọdụ a sịrị: “Ka onye chere na ya guzosiri ike lezie anya ka ọ ghara ịda.”​—⁠1 Kọr. 10:⁠12.

WEPỤNỤ ỌCHỊCHỌ Ọ BỤLA GBASARA ỊKWA IKO

5. (a) Nye ihe atụ na-egosi ihe mere anyị ji kwesị iyipụ mmadụ ochie ahụ n’egbughị oge. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee àgwà ndị so ná mmadụ ochie ahụ e kwuru ná Ndị Kọlọsi 3:​5-9?

5 Gịnị ka ị ga-eme ma uwe gị ruo unyi, na-esikwa ísì? Ị ga-eyipụ ya ozugbo. Otú ahụ ka ọ dị ma anyị mata na anyị na-eme ihe na-adịghị Jehova mma, anyị kwesịrị ịgbanwe n’egbughị oge otú ahụ Pọl gwara Ndị Kraịst n’oge ya ka ha mee. Ọ sịrị ha: “Wepụnụ ha niile n’ebe unu nọ.” Ka anyị tụlee mmehie abụọ so ná mmehie Pọl kwuru banyere ha, ya bụ, ịkwa iko na adịghị ọcha.​—⁠Gụọ Ndị Kọlọsi 3:​5-9.

6, 7. (a) Olee otú okwu Pọl si gosi na anyị kwesịrị ịgbalịsi ike yipụ mmadụ ochie ahụ? (b) Olee ụdị ndụ Sakura biri? Olee ihe nyeere ya aka ịgbanwe?

6 Ịkwa iko. Na Baịbụl, ihe so ‘n’ịkwa iko’ bụ mmadụ abụọ na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ na nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị. Pọl gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha ‘mee ka akụkụ ahụ́ ha nwụọ,’ ya bụ, ka ha wepụ ọchịchọ ọ bụla gbasara “ịkwa iko.” Ihe Pọl kwuru mere ka o doo anya na anyị kwesịrị ịgbalịsi ike wepụ ụdị ọchịchọ ahụ. Ma, anyị ga-emerili n’ọgụ anyị na-alụso ihe na-agụ anụ ahụ́ anyị agụụ.

Chegodị ihe mere Sakura * bụ́ onye bi na Japan. Mgbe ọ na-eto eto, owu na-amakarị ya, obi ana-ajọkwa ya njọ. Mgbe ọ dị afọ iri na ise, ọ malitere ịkwa iko aghara aghara ka owu ghara ịna-ama ya. O mechara kwuo na ya tere ime ugboro atọ. O kwuru, sị: “Mgbe m malitere ịkwa iko, ọ dị m ka obi ò ruru m ala, mụ ana-eche na m bara uru nakwa na ndị mmadụ hụrụ m n’anya. Ma, ka m na-akwa iko, ka obi na-ajọkwu m njọ.” Sakura megidere ihe a ruo mgbe ọ dị afọ iri abụọ na atọ. Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ ya ihe. Ihe ọ mụrụ tọrọ ya ụtọ, Jehova enyere ya aka ịkwụsị inwe mmekọahụ rụrụ arụ, nyekwara ya aka ka ihere ghara ịna-eme ya, nakwa ka akọnuche ya ghara ịna-ama ya ikpe. Sakura bụ ọsụ ụzọ oge niile ugbu a, owu anaghịzi ama ya. Ọ sịrị: “Obi dị m ezigbo ụtọ na Jehova hụrụ m n’anya.”

OTÚ ANYỊ GA-ESI KWỤSỊ ADỊGHỊ ỌCHA

8. Olee ụfọdụ ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghara ịdị ọcha n’anya Chineke?

8 Adịghị ọcha. Na Baịbụl, “adịghị ọcha” apụtaghị naanị ịkwa iko. O nwekwara ike ịpụta ịṅụ sịga na ikwu okwu rụrụ arụ. (2 Kọr. 7:1; Efe. 5:​3, 4) Omume ọjọọ ndị mmadụ na-eme na nzuzo sokwa, dị ka ịgụ akwụkwọ ndị nwere ike ime ka mmadụ chọọ ịkwa iko ma ọ bụ ikiri ndị gba ọtọ. Omume ọjọọ ndị a nwere ike ime ka mmadụ chọwa otú ọ ga-esi gboo onwe ya agụụ mmekọahụ.​—⁠Kọl. 3:⁠5. *

9. Olee nsogbu o nwere ike ịkpatara mmadụ ma ọ na-eme ihe nwere ike ime ka “agụụ mmekọahụ” na-agụ ya?

9 Ọ na-agụ ndị na-elekarị ndị gba ọtọ agụụ ịna-enwe mmekọahụ. O nwekwara ike rie ha isi. Ihe ndị a chọpụtara gosiri na otú ndị ikiri ndị gba ọtọ ririla ahụ́ si eme bụkwa otú ndị aṅụrụma na ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ riri ahụ́ si eme. Ka a sịkwa ihe mere ikiri ndị gba ọtọ ji akpata nsogbu. O nwere ike ime ka ihere mewe onye ahụ, ya aghara ịna-arụ ọrụ ya nke ọma. O nwekwara ike ime ka ezinụlọ ghara ịna-enwe obi ụtọ, kpata ịgba alụkwaghịm, na mmadụ igbu onwe ya. Mgbe o mere otu afọ otu nwoke kwụsịrị ikiri ndị gba ọtọ, o dere, sị: “M na-akwanyeziri onwe m ùgwù ugbu a.”

10. Olee otú Ribeiro si kwụsị ikiri ndị gba ọtọ?

10 Ọ naghị adịrị ọtụtụ ndị mfe ịkwụsị ikiri ndị gba ọtọ. Ma, ihe Ribeiro bi na Brazil mere gosiri na mmadụ ga-akwụsịli ya. Ribeiro kwapụrụ n’ụlọ ha mgbe ọ ka na-eto eto, mechaa nweta ọrụ n’otu ụlọ ọrụ na-eji akwụkwọ ndị a tụfuru atụfu arụpụta ihe. Ọ na-ahụ ebe e sere ndị gba ọtọ n’ebe ahụ. O kwuru, sị: “Ile ndị gba ọtọ ji nwayọọ nwayọọ rie m isi. O ruziri nke na ọ na-adịzi m ka nwaanyị mụ na ya bi pụwa apụwa, ka m lee fim ndị gba ọtọ.” Otu ụbọchị Ribeiro nọ n’ọrụ, o lere anya n’ebe e kposara akwụkwọ a ga-eji rụpụta ihe ọzọ, hụ otu akwụkwọ isiokwu ya bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ. O wepụtara ya gụọ. Ihe ọ mụtara mere ka ya na Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl. Ma, o were ya ogologo oge tupu ya akwụsị àgwà ọjọọ ahụ ọ na-akpa. Gịnịzi nyeere ya aka? O kwuru, sị: “Ekpere m na-ekpe, Baịbụl m na-amụ, na ichebara ihe ndị m na-amụ echiche mere ka m ghọtakwuo àgwà Chineke, ya emee ka m hụkwuo Jehova n’anya karịa otú o si agụ m agụụ ikiri ndị gba ọtọ.” Baịbụl na mmụọ nsọ nyeere Ribeiro aka iyipụ mmadụ ochie ahụ ma mee baptizim. Ọ bụkwa okenye n’ọgbakọ ugbu a.

11. Gịnị ga-enyere mmadụ aka ịkwụsị ile ndị gba ọtọ?

11 Ghọta na ọ bụghị naanị ịmụ Baịbụl ka Ribeiro mere iji kwụsị ikiri ndị gba ọtọ. O chebakwuuru ihe ọ na-agụ echiche ma kwe ka o ruo ya n’obi. Ọ rịọkwara Jehova ka o nyere ya aka. Ihe ndị a nyeere ya aka ịhụkwu Chineke n’anya, nke mere ka agụụ ikiri ndị gba ọtọ na-agụ ya kwụsị. Ihe ga-akacha nyere mmadụ aka ịkwụsị ikiri ndị gba ọtọ bụ onye ahụ na Jehova ịdị n’ezigbo mma, na onye ahụ ịkpọ ihe ọjọọ asị.​—⁠Gụọ Abụ Ọma 97:⁠10.

WEPỤNỤ IWE, OKWU MKPARỊ, NA ỊGHA ỤGHA

12. Gịnị nyeere Stephen aka ịkwụsị iwe ọkụ na ịkpọ mmadụ iyi?

12 Ndị na-ewe iwe ọkụ na-akparị mmadụ. O doro anya na ụdị àgwà a agaghị eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ. Otu nna bi n’Ọstrelia aha ya bụ Stephen kwuru, sị: “M na-akpọbụ ndị mmadụ iyi. Obere ihe mee, mụ ewewe iwe. Mụ na nwunye m gbasara ugboro atọ. Anyị nọ na-akwado otú anyị ga-esi gbaa alụkwaghịm.” Ndịàmà Jehova malitere ịmụrụ di na nwunye a Baịbụl. Gịnị mere mgbe Stephen mewere ihe ọ na-amụta na Baịbụl? Ọ sịrị: “Udo bịara dị n’ezinụlọ anyị. Jehova nyeere m aka. Ugbu a, obi ruziri m ala. Iwe na ọnụma anaghịzi eju m obi. Ọ bụghịzi obere ihe mee, mụ ana-ewe iwe.” Taa, Stephen bụ ohu na-eje ozi. Nwunye ya bụ ọsụ ụzọ oge niile ọtụtụ afọ. Ndị okenye nọ n’ọgbakọ Stephen na-eje ozi kwuru, sị: “Stephen bụ nwanna dị nwayọọ, na-arụsi ọrụ ike, dịkwa umeala n’obi.” Ha ahụtụbeghị ebe o were iwe. Stephen ọ̀ naara otuto ahụ? Ọ sịrị: “Ihe ọma ndị a agaaraghị abịara m ma a sị na mụ ekweghị ka Jehova nyere m aka ịgbanwe ndụ m.”

13. Gịnị mere iwe ji dị njọ? Olee aka ná ntị Baịbụl dọrọ anyị?

13 O nwere ezigbo ihe mere Baịbụl ji dọọ anyị aka ná ntị ka anyị hapụ iwe, okwu mkparị, na iti mkpu. (Efe. 4:31) Ọ dị mwute na ụdị àgwà ahụ na-akpata ọgụ. Ndị ụwa nwere ike were ya ka o nweghị ihe ọ bụ, ma ọ na-egosi na anyị anaghị asọpụrụ Onye kere anyị. Ọtụtụ agbanweela àgwà ọjọọ ha na-akpabu ma yikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ.​—⁠Gụọ Abụ Ọma 37:​8-11.

14. Onye iwe ọkụ ò nwere ike imecha dịrị umeala n’obi?

14 Chegodị banyere otu nwanna aha ya bụ Hans. Ọ bụ okenye n’otu ọgbakọ dị n’Ọstria. Onye na-ahaziri ndị okenye ọrụ n’ọgbakọ ọ nọ sịrị: “O so n’ụmụnna ndị a ga-asị dị ezigbo umeala n’obi. Ma, o bughị àgwà a pụta ụwa. Mgbe ọ na-eto eto, ọ malitere ịṅụ oké mmanya, na-alụkwa ọgụ. O nwere mgbe ọ ṅụchara tọọ tọọ jiri iwe gbuo enyi ya nwaanyị, a tụọ ya mkpọrọ afọ iri abụọ. Ná mmalite, ihe ndị mere ya n’ụlọ mkpọrọ emeghị ka ọ gbanwee. Ka oge na-aga, mama ya gwara otu okenye ka ọ bịa hụ Hans n’ụlọ mkpọrọ. Hans malitere ịmụ Baịbụl. O kwuru, sị: “Ọ dịghịrị m mfe iyipụ mmadụ ochie ahụ. Amaokwu Baịbụl ndị gbara m ume bụ Aịzaya 55:​7, bụ́ ebe sịrị: ‘Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya,’ na 1 Ndị Kọrịnt 6:​11, bụ́ ebe kwuru gbasara ndị hapụrụ mmehie ha, sị: ‘Ma nke ahụ bụkwa ihe ụfọdụ n’ime unu bụbu.’ Jehova nweere m ndidi ruo ọtụtụ afọ, jiri mmụọ nsọ ya nyere m aka ka m yiri mmadụ ọhụrụ ahụ.” Hans mere baptizim mgbe ọ nọ n’ụlọ mkpọrọ. A tọhapụrụ ya mgbe afọ iri na asaa na ọnwa isii gachara. Ọ sịrị: “M na-ekele Jehova maka na o meere m ebere ma gbaghara m.”

15. Olee àgwà ndị mmadụ na-akpakarị, ma olee ihe Baịbụl kwuru banyere ya?

15 E wezụga okwu mkparị, ịgha ụgha sokwa ná mmadụ ochie ahụ. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-agha ụgha ka ha ghara ịkwụ ụtụ isi ma ọ bụ ghara ịta ahụhụ ihe ha metara. Ma, Jehova bụ “Chineke nke eziokwu.” (Ọma 31:⁠5) N’ihi ya, ọ chọrọ ka “onye ọ bụla” na-efe ya “na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,” ghara ịna-agha “ụgha.” (Efe. 4:25; Kọl. 3:⁠9) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-ekwu eziokwu, a sịgodị na o nwere ike imechu anyị ihu ma ọ bụ siere anyị ike.​—⁠Ilu 6:​16-19.

OTÚ HA SI MERIE

16. Olee ihe nwere ike inyere mmadụ aka iyipụ mmadụ ochie ahụ?

16 Iyipụ mmadụ ochie ahụ abụghị ihe anyị ga-emeli n’ike anyị. Ndị a kọrọ banyere ha n’isiokwu a, ya bụ, Sakura, Ribeiro, Stephen, na Hans gbalịsiri ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ha. Ihe nyeere ha aka imeri bụ mmụọ nsọ na ike Okwu Chineke na-akpa. (Luk 11:13; Hib. 4:12) Anyị chọọ irite uru n’ike Baịbụl na-akpa, anyị kwesịrị ịna-agụ ya kwa ụbọchị, chebara ihe anyị na-agụ echiche, na-ekpekwa ekpere mgbe niile ka Jehova nye anyị amamihe na ike anyị ga-eji na-eme ihe anyị na-amụta. (Jọsh. 1:8; Ọma 119:97; 1 Tesa. 5:17) Anyị ga-eritekwa uru ma anyị na-akwado ihe a ga-amụ n’ọmụmụ ihe, na-agakwa ọmụmụ ihe. (Hib. 10:​24, 25) Anyị kwesịkwara iji ọtụtụ ihe nzukọ Jehova na-ewepụtara anyị ugbu a kpọrọ ihe.​—⁠Luk 12:⁠42.

Olee otú anyị ga-esi yipụ mmadụ ochie ahụ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

17. Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu na-eso nke a?

17 Anyị atụleela ụfọdụ àgwà ọjọọ Ndị Kraịst kwesịrị iyipụ ma ghara iyiri ha ọzọ. Ma, ọ̀ bụ naanị ihe a chọrọ anyị n’aka ka anyị na Chineke nwee ike ịdị ná mma? Mba. Anyị kwesịkwara iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ. N’isiokwu na-eso nke a, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi yiri mmadụ ọhụrụ ahụ dị ka uwe.