Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Otú Anyị Ga-esi Yiri Mmadụ Ọhụrụ Ahụ, Gharakwa Iyipụ Ya Ọzọ

Otú Anyị Ga-esi Yiri Mmadụ Ọhụrụ Ahụ, Gharakwa Iyipụ Ya Ọzọ

“Yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ.”​—KỌL. 3:10.

ABỤ: 43, 106

1, 2. (a) Gịnị mere ọ ga-eji kwe anyị omume iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ? (b) Olee àgwà ndị so ná mmadụ ọhụrụ ahụ e dere ná Ndị Kọlọsi 3:​10-14?

OKWU ahụ bụ́ “mmadụ ọhụrụ ahụ” gbara ugboro abụọ na Baịbụl Nsọ​—⁠Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ. (Efe. 4:24; Kọl. 3:10) Ọ pụtara àgwà “e kere dị ka uche Chineke si dị.” Anyị ga-enweli ụdị àgwà ahụ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova kere ụmụ mmadụ n’onyinyo ya. N’ihi ya, anyị nwere ike iṅomi ọmarịcha àgwà ndị Jehova nwere.​—⁠Jen. 1:​26, 27; Efe. 5:⁠1.

2 Ebe ọ bụ na anyị ketara ezughị okè n’aka Adam na Iv, ime ihe ọjọọ na-agụ anyị agụụ. Ebe anyị bi nwekwara ike ime ka anyị na-akpa àgwà ụfọdụ. Ma, Jehova ga-enyere anyị aka ịbụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ka anyị bụrụ. Ka anyị nwee ike kpebie ime otú ahụ, anyị ga-eleba anya n’ụfọdụ àgwà ndị so ná mmadụ ọhụrụ ahụ Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee. (Gụọ Ndị Kọlọsi 3:​10-14.) Anyị ga-elebakwa anya n’otú anyị ga-esi eme ya n’ozi ọma.

“UNU NIILE BỤ OTU”

3. Olee otu àgwà so ná mmadụ ọhụrụ ahụ?

3 Mgbe Pọl gwachara anyị ka anyị yiri mmadụ ọhụrụ ahụ, ọ kọwara na eleghị mmadụ anya n’ihu bụ àgwà ọzọ dị mkpa so ná mmadụ ọhụrụ ahụ. O kwuru, sị: “E nweghị onye Grik ma ọ bụ onye Juu, ibi úgwù ma ọ bụ ebighị úgwù, onye mba ọzọ, onye Sitia, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.” * N’ọgbakọ, gịnị mere na e kwesịghị inwe onye na-eche na ọ ka ibe ya mma n’ihi agbụrụ ya, obodo ya, ma ọ bụ ọkwá ya? Ọ bụ n’ihi na ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst “niile bụ otu.”​—⁠Kọl. 3:11; Gal. 3:⁠28.

4. (a) Olee otú ndị na-efe Jehova kwesịrị isi na-emeso ndị ọzọ? (b) Olee ihe nwere ike ime ka o siere Ndị Kraịst ike ịdị n’otu?

4 Ndị yiiri mmadụ ọhụrụ ahụ na-akwanyere ma ụmụnna ha ma ndị ụwa ùgwù, n’agbanyeghị agbụrụ ha, ma ọ bụ ọkwá ha. (Rom 2:11) Ime ụdị ihe a na-esi ike n’obodo ụfọdụ. Dị ka ihe atụ, n’oge ndị gara aga n’obodo Saụt Afrịka, ndị ọchịchị wepụtaara agbụrụ ọ bụla ebe ha ga-ebi. Agbụrụ nke ọ bụla ka bi n’ebe ndị ahụ e wepụtaara ha, ma Ndịàmà Jehova. Òtù Na-achị Isi chọrọ ịgba ụmụnna ume ka ha na ndị agbụrụ dị iche iche na-akpakọrịta. N’ihi ya, n’ọnwa iri n’afọ 2013, Òtù Na-achị Isi haziri ihe ga-enyere ụmụnna si agbụrụ dị iche iche aka ịmatakwu ibe ha. (2 Kọr. 6:13) Olee ihe ha mere?

5, 6. (a) Olee ihe a haziri n’otu obodo ka ụmụnna nwee ike ịdịkwu n’otu? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee uru ndị ọ baarala ha?

5 A haziri ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ na-eji otu asụsụ amụ ihe na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ ọzọ amụ ihe na-ezukọta n’ụfọdụ ngwụcha izu. Ụmụnna ndị si n’ọgbakọ abụọ ahụ gakọrọ ozi ọma na ọmụmụ ihe, gaakwa n’ụlọ onye nke ọ bụla. Ọtụtụ ọgbakọ so mee ya. Alaka ụlọ ọrụ nwetakwara akwụkwọ ozi ndị kọrọ akụkọ ọma gbasara ya, ma nke ndị na-abụghịdị Ndịàmà Jehova detara. Dị ka ihe atụ, otu onyeisi chọọchị sịrị: “Abụghị m Onyeàmà Jehova, ma m ga-asị na otú unu si hazie ozi ọma unu magburu nnọọ onwe ya, unu dịkwa n’otu n’agbanyeghị na unu si agbụrụ dị iche iche.” Olee otú obi dị ụmụnna anyị maka ihe a a haziri?

6 Na mbụ, obi akaghị otu nwanna nwaanyị na-asụ asụsụ Kosa aha ya bụ Noma ịkpọ ụmụnna ndị ọcha na-eji asụsụ Bekee amụ ihe ka ha bịa n’ụlọ ya na-abụghị ụlọ ndị oké ozu. Ma, mgbe ya na ụmụnna ndị ọcha gachara ozi ọma, ya agaakwa n’ụlọ ha, ọ sịrị: “Ha dịkwa ka anyị.” N’ihi ya, mgbe o ruru ọgbakọ na-eji asụsụ Kosa amụ ihe n’aka ịkpọ ụmụnna ndị na-eji asụsụ Bekee amụ ihe ka ha bịa n’ụlọ ha, o siri nri ma kpọọ ụfọdụ ka ha bịa. Otu okenye bụ́ onye ọcha so ná ndị ọ kpọrọ. Noma kwuru, sị: “Obi dị m ụtọ na nwanna ahụ ji obi ụtọ nọrọ n’ihe m ji mere oche.” Ihe a a haziri mere ka ọtụtụ ụmụnna anyị meta ndị enyi ọhụrụ, kpebiekwa na ha ga na-amata ndị si agbụrụ dị iche iche.

“OBI ỌMỊIKO, OBIỌMA”

7. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-enwere ndị mmadụ ọmịiko?

7 Ọnwụnwa ga na-abịara anyị ruo mgbe a ga-ebibi ụwa Setan a. Ọnwụnwa ndị na-abịara anyị bụ enweghị ọrụ, ọrịa, mkpagbu, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ndị ohi izuru ihe ndị anyị nwere, ma ọ bụkwanụ ihe isi ike ndị ọzọ. Iji nyere ibe anyị aka n’oge ọnwụnwa ndị ahụ, anyị kwesịrị iji obi anyị niile na-enwere ha ọmịiko. Anyị nwee obi ọmịiko, ọ ga-eme ka anyị jiri obiọma na-emeso ndị ọzọ. (Efe. 4:32) Àgwà ndị a so ná mmadụ ọhụrụ ahụ ga-enyere anyị aka iṅomi Chineke, nyekwara anyị aka ịkasi ndị ọzọ obi.​—⁠2 Kọr. 1:​3, 4.

8. Olee uru ọ ga-aba ma anyị na-enwere mmadụ niile nọ n’ọgbakọ ọmịiko na obiọma? Nye ihe atụ.

8 Olee otú anyị ga-esi mekwuoro ndị si obodo ọzọ ma ọ bụ ndị na-enweghị ka ọ hà ha nọ n’ọgbakọ anyị ihe ọma? Anyị ga-emeta ha enyi, meekwa ka ha mata na ha bara uru n’ọgbakọ. (1 Kọr. 12:​22, 25) Chegodị ihe mere otu nwanna aha ya bụ Dannykarl, bụ́ onye si Filipinz kwaga Japan. N’ebe ọ na-arụ ọrụ, ọ bụghị otú e si mesoo ndị amaala na-arụ ebe ahụ ka e si mesoo ya. Mgbe ọ gaziri ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova, ọ sịrị: “Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ mmadụ niile bịaranụ bụ ndị Japan, ma ha nabatara m nke ọma ka à ga-asị na ha mabu m.” Ihe ọma ụmụnna nọ na-emere ya nyeere ya aka ịbịaru Jehova nso. E mere ya baptizim. Taa, ọ bụ okenye n’ọgbakọ. Obi na-atọ ndị okenye ibe ya ụtọ na ya na nwunye ya bụ́ Jennifer nọ n’ọgbakọ ha. Ndị okenye kwuru banyere ha, sị: “Ebe ọ bụ na ha bụ ndị ọsụ ụzọ, ha anaghị ebi ndụ okomoko. Ha bụ ndị e ji ama atụ n’ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke.”​—⁠Luk 12:⁠31.

9, 10. Nye ihe atụ gosiri uru ndị anyị na-erite ma anyị na-enwere ndị mmadụ ọmịiko n’ozi ọma.

9 Izi ndị mmadụ ozi ọma bụ ụzọ magburu onwe ya anyị si emere ‘mmadụ niile ihe ọma.’ (Gal. 6:10) Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-enwere ndị si mba ọzọ ọmịiko, na-agbalị ịmụta asụsụ ha. (1 Kọr. 9:23) Mbọ a ha na-agba abaala ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị bụ́ ọsụ ụzọ n’Ọstrelia aha ya bụ Tiffany mụrụ asụsụ Swahili ka o nwee ike inyere ọgbakọ na-eji asụsụ ahụ amụ ihe aka n’obodo Brisben. N’agbanyeghị na o siiri ya ike ịmụ asụsụ ahụ, ọ baarala ya ezigbo uru. Ọ sịrị: “Ị chọọ ka ozi ọma na-atọ gị ụtọ, nọrọ n’ọgbakọ na-eji asụsụ mba ọzọ amụ ihe. Ọ dị ka ebe mmadụ gara mba ọzọ ma ọ ka nọ n’obodo ya. Ị ga-amụta gbasara ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile, jirikwa anya gị hụ otú ha si dịrị n’otu.”

Gịnị mere Ndịàmà Jehova ji enyere ndị si mba ọzọ kwabata aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10 Cheekwa gbasara otu nwanna na nwunye ya bi na Japan. Nwa ha nwaanyị bụ́ Sakiko kwuru, sị: “Anyị nọrọ n’ozi ọma, anyị na-ahụkarị ndị si Brazil kwabata na Japan. Anyị gosi ha amaokwu Baịbụl e dere n’asụsụ ha bụ́ Pọchugiiz, dị ka Mkpughe 21:​3, 4 ma ọ bụ Abụ Ọma 37:​10, 11, 29, ha na-ege ntị nke ọma. Mgbe ụfọdụ, anya mmiri na-agba ha.” Ma, ezinụlọ ahụ mekwara ihe ọzọ gosiri na ha nweere ndị mmadụ ọmịiko. Sakiko sịrị: “Mgbe anyị hụrụ otú o si na-agụsi ha agụụ ike ịmụ gbasara Chineke, anyị mụwara asụsụ Pọchugiiz.” Ezinụlọ ahụ mechara nye aka hiwe ọgbakọ na-eji asụsụ Pọchugiiz amụ ihe. Kemgbe ahụ, ha enyerela ọtụtụ ndị si mba ọzọ kwabata n’obodo ahụ aka ha aghọọ Ndịàmà Jehova. Sakiko kwukwara, sị: “Ịmụ asụsụ Pọchugiiz abụghị obere ọrụ, ma uru ọ bara karịrị mbọ anyị gbara. Anyị na-ekele Jehova nke ukwuu.”​—⁠Gụọ Ọrụ Ndịozi 10:​34, 35.

“YIRINỤ . . . ỊDỊ UMEALA N’OBI”

11, 12. (a) Gịnị mere anyị ji kwesị ibu ezigbo ihe n’obi ma anyị yiri mmadụ ọhụrụ ahụ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-adị umeala n’obi?

11 Ihe mere anyị ji kwesị iyiri mmadụ ọhụrụ ahụ bụ ka anyị sọpụrụ Jehova, ọ bụghị ka ndị mmadụ too anyị. Cheta na otu mmụọ ozi Chineke zudịrị okè mehiere n’ihi na ọ bịara dị mpako. (Tụlee Ezikiel 28:17.) Anyị ezughị okè. N’ihi ya, ọ ga-aka esiri anyị ike ịgbara mpako ọsọ. Ma, anyị nwere ike iyiri ịdị umeala n’obi. Gịnị ga-enyere anyị aka ime otú ahụ?

12 Ihe ga-enyere anyị aka ịna-adị umeala n’obi bụ iwepụta oge kwa ụbọchị na-echebara ihe ndị anyị na-agụ na Baịbụl echiche. (Diut. 17:​18-20) Anyị kwesịrị ichekwa gbasara ihe Jizọs kụziri na ihe ndị o mere gosiri na ọ dị umeala n’obi. (Mat. 20:28) Ọ sadịrị ụkwụ ndịozi ya. (Jọn 13:​12-17) Anyị kwesịkwara ịna-arịọ Jehova mgbe niile ka o nye anyị mmụọ nsọ ya nke ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ichewe na anyị ka ndị ọzọ mma.​—⁠Gal. 6:​3, 4; Fil. 2:⁠3.

13. Olee uru ndị anyị ga-erite ma anyị dịrị umeala n’obi?

13 Gụọ Ilu 22:⁠4. Ịdị umeala n’obi bara ezigbo uru. Ọ bụ àgwà ndị niile ji obi ha niile na-efe Jehova kwesịrị inwe. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọgbakọ ga-adị n’otu, udo adịrịkwa na ya. Ọ ga-emekwa ka Jehova meere anyị amara. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Unu niile, werenụ ịdị nwayọọ n’obi kee onwe unu n’otú unu si emeso ibe unu, n’ihi na Chineke na-emegide ndị mpako, ma ọ na-egosi ndị dị umeala n’obi obiọma na-erughịrị mmadụ.”​—⁠1 Pita 5:⁠5.

YIRINỤ ỊDỊ NWAYỌỌ NA OGOLOGO NTACHI OBI KA UWE

14. Olee onye kacha enwe ndidi, kachakwa adị nwayọọ?

14 N’ụwa taa, ndị mmadụ na-ewere onye dị nwayọọ na onye nwere ogologo ntachi obi, ya bụ, ndidi ka onye na-esighị ike. Ma, ọ bụghị eziokwu. Ọmarịcha àgwà ndị a bụ àgwà Onye kacha ike n’eluigwe na n’ụwa nwere. Ọ bụ ya kacha enwe ndidi, kachakwa adị nwayọọ. (2 Pita 3:⁠9) Chegodị otú Chineke si si n’ọnụ ndị mmụọ ozi zaa Ebreham na Lọt ajụjụ ha nọ na-ajụ ya. (Jen. 18:​22-33; 19:​18-21) Cheekwa otú o si nweere mba Izrel nupụụrụ ya isi ndidi ruo ihe karịrị otu puku afọ na narị afọ ise.​—⁠Ezik. 33:⁠11.

15. Olee ihe Jizọs mere gosiri na ọ dị nwayọọ, nweekwa ndidi?

15 Jizọs dị “nwayọọ.” (Mat. 11:29) O nweere ndị na-eso ụzọ ya ezigbo ndidi n’ihe ndị ha na-anaghị emeta. N’oge niile ọ nọ n’ụwa, o diri mmegide niile ndị ndú okpukpe megidere ya. Ma, o nweere ha ndidi ma dịrị nwayọọ ruo ọnwụ. Mgbe ọ nọ n’osisi ịta ahụhụ, ọ rịọrọ Nna ya ka ọ gbaghara ndị gburu ya. Ọ sịrị: “Ha amaghị ihe ha na-eme.” (Luk 23:34) Jizọs nwere ndidi, dịrịkwa nwayọọ ma mgbe ọ na-ata ahụhụ.​—⁠Gụọ 1 Pita 2:​21-23.

16. Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ndidi ma dịrị nwayọọ?

16 Olee otú anyị ga-esi egosi na anyị nwere ndidi ma dịrị nwayọọ? Pọl kwuru otu ụzọ anyị ga-esi eme ya n’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst ibe ya. Ọ sịrị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.” (Kọl. 3:13) Ihe ga-enyere anyị aka ịna-agbaghara ndị ọzọ bụ ịdị nwayọọ na ịna-enwe ndidi. Ọ bụrụ na anyị na-eme otú ahụ, udo ga na-adị n’ọgbakọ.

17. Gịnị mere ịdị nwayọọ na inwe ndidi ji dị mkpa?

17 Jehova chọrọ ka anyị dịrị nwayọọ ma na-enwere ndị ọzọ ndidi. Ọ bụ àgwà ndị anyị kwesịrị inwe ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka a zọpụta anyị. (Mat. 5:5; Jems 1:21) Nke ka nke, àgwà ndị a ga-eme ka anyị na-asọpụrụ Jehova, meekwa ka anyị nyere ndị ọzọ aka ime ihe Baịbụl kwuru.​—⁠Gal. 6:1; 2 Tim. 2:​24, 25.

“YIRINỤ ỊHỤNANYA DỊ KA UWE”

18. Olee otú ịhụnanya si gbasa eleghị mmadụ anya n’ihu?

18 O nwere otú àgwà ndị a anyị tụlere si gbasa ịhụnanya. Dị ka ihe atụ, onye na-eso ụzọ Jizọs bụ́ Jems nyere ụmụnna ya ndụmọdụ n’ihi na ha na-emere ndị ọgaranya ihe ọma karịa ndị ogbenye. O kwuru na ụdị àgwà ahụ adabaghị adaba n’iwu Chineke nyere nke sịrị: “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” Ya ekwuzie, sị: “Ọ bụrụ na unu na-ele mmadụ anya n’ihu, unu na-eme mmehie.” (Jems 2:​8, 9) Ọ bụrụ na anyị hụrụ ndị mmadụ n’anya, anyị agaghị akpọ ha asị n’ihi ebe ha gụruru n’akwụkwọ, agbụrụ ha, ma ọ bụ otú ndị mmadụ si ele ha anya. N’eziokwu, anyị ekwesịghị ịna-eme ka a sị na anyị anaghị ele mmadụ anya n’ihu. O kwesịrị isi anyị n’obi.

19. Gịnị mere anyị ji kwesị iyiri ịhụnanya dị ka uwe?

19 Ịhụnanya nwere ndidi na obiọma. Ọ naghịkwa “afụli onwe ya elu.” (1 Kọr. 13:⁠4) Ndidi, obiọma, na ịdị umeala n’obi ga-enyere anyị aka ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma Alaeze. (Mat. 28:19) Ọ bụkwa àgwà ndị a ga-eme ka ọ dịrị anyị mfe anyị na ụmụnna niile n’ọgbakọ ịdị n’udo. Olee uru anyị ga-erite ma anyị hụ ụmụnna anyị n’anya? Ọ ga-eme ka ọgbakọ dịrị n’otu, meekwa ka e too Jehova. Ndị ọzọ hụ otú anyị si dịrị n’otu, ha ga-abatakwa n’ọgbakọ. Ọ dabara adaba na Baịbụl ji okwu a gbara ọkpụrụkpụ chịkọta ihe mmadụ ọhụrụ ahụ pụtara. Ọ sịrị: “E wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè.”​—⁠Kọl. 3:⁠14.

‘NA-EMENỤ KA IKE NKE NA-EDUZI UCHE UNU DỊ ỌHỤRỤ’

20. (a) Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? Maka gịnị? (b) Olee ihe anyị na-atụ anya ya n’ọdịnihu?

20 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee ihe m ka ga-agbanwe ka m nwee ike yiri mmadụ ọhụrụ ahụ, gharakwa iyipụ ya?’ Anyị kwesịrị ịrịọsi Chineke arịrịọ ike ka o nyere anyị aka, gbalịsiekwa ike hapụ ịna-eche ihe ọjọọ n’obi anyị ma ọ bụ ịna-akpa àgwà ndị ga-eme ka anyị ghara iketa Alaeze Chineke. (Gal. 5:​19-21) Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘M̀ na-eme ka ike nke na-eduzi uche m dị ọhụrụ?’ (Efe. 4:​23, 24) Anyị ezughị okè. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agbakwu mbọ na-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ ma ghara iyipụ ya. Chegodị otú ndụ ga-adị mgbe mmadụ niile ga-eyiri mmadụ ọhụrụ ahụ, na-akpakwa ọmarịcha àgwà ndị a Jehova nwere.

^ para. 3 N’oge Baịbụl, a na-ele ndị Sitia anya ka ndị ime ọhịa.