Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru
PỌL ONYEOZI si n’ike mmụọ nsọ dee banyere àgwà itoolu mmụọ nsọ Chineke ga-enyere mmadụ aka inwe. (Gal. 5:22, 23) Ọ kpọrọ ọmarịcha àgwà ndị a “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” * Mkpụrụ nke mmụọ nsọ so ná “mmadụ ọhụrụ ahụ” Ndị Kraịst kwesịrị iyiri ka uwe. (Kọl. 3:10) Otú ahụ ọ na-abụ elekọta osisi nke ọma ya amịa mkpụrụ, otú ahụ ka onye mmụọ Chineke na-edu ga-esi na-akpa àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.—Ọma 1:1-3.
Àgwà mbụ bara ezigbo uru so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ Pọl dere bụ ịhụnanya. Olee otú o si baa uru? Pọl sịrị na ‘ọ dịghị ihe ọ bụ’ ma ọ bụrụ na o nweghị ịhụnanya. (1 Kọr. 13:2) Ma, gịnị ka ịhụnanya pụtara? Olee otú anyị ga-esi enwe ya, na-egosikwa ya kwa ụbọchị?
OTÚ E SI EGOSI ỊHỤNANYA
N’agbanyeghị na ọ dịghị mfe ịkọwa ihe ịhụnanya pụtara, Baịbụl kọwara otú e nwere ike isi gosi ya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl sịrị na ịhụnanya nwere “ogologo ntachi obi na obiọma.” Ọ sịkwara na “ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ, na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.” Mmadụ ịhụ mmadụ ibe ya n’anya pụtara na ọ gaghị eji onye ahụ egwuri egwu, ihe gbasara onye ahụ ga na-emetụ ya n’obi. Ọ pụtakwara na ha ga-adị n’ezigbo mma. Ma, onye na-ahụghị mmadụ ibe ya n’anya ga na-ekwo ekworo, na-afụli onwe ya elu, na-akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, na-achọ ọdịmma nke ya, na-agụkọ ihe ọjọọ e mere ya, ọ naghịkwa agbaghara. Kama ịna-akpa àgwà ndị a na-adịghị mma, anyị kwesịrị ịgosi ezigbo ịhụnanya, ya bụ, ụdị ịhụnanya na-anaghị “achọ ọdịmma nke ya.”—1 Kọr. 13:4-8.
OTÚ JEHOVA NA JIZỌS SI GOSI EZIGBO ỊHỤNANYA
N’eziokwu, “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ihe niile ọ na-eme gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya. Ihe ọma kachanụ Chineke meere anyị iji gosi na ọ hụrụ anyị n’anya bụ izite Jizọs ka ọ bịa taa ahụhụ ma nwụọ n’ihi anyị. Jọn onyeozi sịrị: “Ọ bụ site n’ihe a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ebe anyị nọ, n’ihi na Chineke zitere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya n’ụwa ka anyị nwee ike inweta ndụ site n’aka ya. Ịhụnanya ahụ si otú a dịrị, ọ bụghị na ọ bụ anyị hụrụ Chineke n’anya, kama na ọ bụ ya hụrụ anyị n’anya wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ àjà ime udo maka mmehie anyị.” (1 Jọn 4:9, 10) Ịhụnanya Jehova nwere n’ebe anyị nọ mere ka ọ na-agbaghara anyị, anyị enwee olileanya, ma dịrị ndụ.
Otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya bụ na o mere ihe Chineke chọrọ, jiri ndụ ya chụọ àjà. Pọl dere, sị: “[Jizọs] sịrị: ‘Lee! Abịawo m ime uche gị.’ . . . Site ‘n’uche’ ahụ nke o kwuru okwu ya, e dowo anyị nsọ site n’àjà e ji ahụ́ Jizọs Kraịst chụọ naanị otu ugboro.” (Hib. 10:9, 10) O nweghị onye ọ bụla nwere ụdị ịhụnanya a. Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye nwere ịhụnanya karịrị nke a, na mmadụ ga-atọgbọ mkpụrụ obi ya n’ihi ndị enyi ya.” (Jọn 15:13) Ebe ọ bụ na anyị ezughị okè, ànyị nwere ike iṅomi otú Jehova na Jizọs si hụ anyị n’anya? Anyị nwere ike. Ka anyị leba anya n’otú anyị ga-esi mee ya.
‘NA-EJE IJE N’ỊHỤNANYA’
Pọl gwara anyị, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya, dị nnọọ ka Kraịst hụkwara unu n’anya ma nyefee onwe ya maka unu.” (Efe. 5:1, 2) Anyị ‘na-eje ije n’ịhụnanya’ ma anyị na-egosi ndị mmadụ na anyị hụrụ ha n’anya n’ihe ọ bụla anyị na-eme. Ọ bụghị naanị ikwu ya n’ọnụ. Ihe ndị anyị na-eme ga-egosi ya. Jọn dere, sị: “Ụmụntakịrị, ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya, ọ bụghị n’ọnụ ma ọ bụ n’ire, kama n’omume nakwa n’eziokwu.” (1 Jọn 3:18) Dị ka ihe atụ, anyị hụ Chineke na ndị ọzọ n’anya, anyị ga na-ezi ndị mmadụ ‘ozi ọma nke alaeze.’ (Mat. 24:14; Luk 10:27) Anyị ga na-ahụkwa ndị ọzọ n’anya ma anyị nwee ndidi, dịrị obiọma ma na-agbaghara ha. N’ihi ya, Baịbụl gwara anyị, sị: “Ọbụna dị ka Jehova gbaghaara unu kpamkpam, na-emekwanụ otú ahụ.”—Kọl. 3:13.
Ọ bụrụ na anyị nye ndị ọzọ ndụmọdụ ma ọ bụ gbazie ha, ọ pụtaghị na anyị ahụghị ha n’anya. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ nne na nna chọọ ime ka nwa ha kwụsị ibe ákwá, ha na-eme ihe ọ bụla nwa ha chọrọ. Ma nne ma ọ bụ nna hụrụ nwa ya n’anya agaghị eme ihe ọ bụla nwa ya kwuru. Otú ahụ ka ọ dị Chineke. Ọ bụ ‘onye ọ hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị.’ (Hib. 12:6) Ọ bụrụ na anyị hụ mmadụ n’anya, anyị ga-adọ ya aka ná ntị mgbe kwesịrị ekwesị. (Ilu 3:11, 12) Ma, anyị kwesịkwara icheta na anyị bụ ndị mmehie, nweekwa mgbe anyị na-anaghị egosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya. N’ihi ya, onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe ndị anyị kwesịrị igosikwu na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ka anyị tụlee ụzọ atọ anyị ga-esi eme ya.
IHE NDỊ GA-ENYERE ANYỊ AKA ỊNA-AHỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA
Nke mbụ, rịọ Chineke ka o nye gị mmụọ nsọ ya nke ga-eme ka ị hụ ndị ọzọ n’anya. Jizọs sịrị na ‘ndị na-arịọ Jehova mmụọ nsọ’ ka Jehova na-enye mmụọ nsọ ya. (Luk 11:13) Ọ bụrụ na anyị rịọ Jehova mmụọ ya ma ‘nọgide na-eje ije site na mmụọ nsọ,’ anyị ga na-ahụkwu ndị ọzọ n’anya. (Gal. 5:16) Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị bụ okenye n’ọgbakọ, i nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka iji ịhụnanya nye ndị ọzọ ndụmọdụ. Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, i nwere ike rịọ Jehova ka o nye gị mmụọ nsọ ya ga-enyere gị aka ka ị ghara iji iwe dọọ nwa gị aka ná ntị, kama ka i jiri ịhụnanya mee ya.
Nke abụọ, chee echiche nke ọma gbasara otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma mgbe ha kpasuru ya iwe. (1 Pita 2:21, 23) A kpasuo anyị iwe ma ọ bụ megbuo anyị, anyị kwesịrị iche banyere ihe Kraịst mere. Anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Gịnị ka Jizọs ga-eme?’ Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Leigh chọpụtara na ịjụ onwe ya ajụjụ a nyeere ya aka iche echiche tupu ya emee ihe ọ bụla. Ọ sịrị: “E nwere mgbe onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ zigaara ndị ọrụ ibe anyị ndị ọzọ ozi na-adịghị mma gbasara m, nakwa gbasara ọrụ m na-arụ. O were m ezigbo iwe. Ma, m jụrụ onwe m, sị: ‘Olee otú m ga-esi ṅomie Jizọs?’ Mgbe m chebachaara ihe Jizọs gaara eme echiche, m kpebiri ịhapụ okwu ahụ, gharakwa ịrụwa ụka. M mechara mata na onye ahụ mụ na ya na-arụkọ ọrụ nwere ọrịa ọjọọ ya na ya na-alụ, nweekwa ọtụtụ ihe na-echegbu ya. M gwara onwe m na ọ maghị ama dee ihe ahụ o dere. Icheta otú Jizọs si gosi na ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma mgbe a kpasuru ya iwe nyeere m aka igosi na m hụrụ onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ n’anya.” N’eziokwu, anyị ṅomie Jizọs, anyị ga na-ahụ ndị ọzọ n’anya mgbe niile.
Nke atọ, jiri obi gị niile hụ ndị ọzọ n’anya. Ọ bụ ụdị ịhụnanya a ka e ji mara ezigbo Ndị Kraịst. (Jọn 13:34, 35) N’ihi ya, Baịbụl gwara anyị ka anyị nwee “ụdị echiche” ahụ Jizọs nwere. Otú o si gosi na “o mere onwe ya ihe efu ruo ọnwụ” bụ ịhapụ eluigwe. (Fil. 2:5-8) Ọ bụrụ na anyị ṅomie otú o si jiri obi ya niile hụ anyị n’anya, otú anyị si eche echiche na otú obi dị anyị ga-adị ka nke ya. Anyị ga na-ebutekwa ọdịmma ndị ọzọ ụzọ. Olee uru ndị ọzọ anyị ga-erite ma anyị hụ ndị ọzọ n’anya?
URU ANYỊ GA-ERITE MA ANYỊ HỤ NDỊ ỌZỌ N’ANYA
Anyị ga-erite ọtụtụ uru ma anyị gosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ka anyị tụlee abụọ n’ime ha:
-
ỤMỤNNA ANYỊ NỌ N’ỤWA DUM: Anyị ma na ọgbakọ ọ bụla anyị gara n’ụwa niile na ụmụnna anyị ga-eji obi ụtọ nabata anyị n’ihi na anyị hụrụ ibe anyị n’anya. Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ ịmata na ‘òtù ụmụnna anyị niile ndị nọ n’ụwa’ hụrụ anyị n’anya. (1 Pita 5:9) Ọ bụ naanị ụmụnna anyị nwere ụdị ịhụnanya a.
-
UDO: ‘Iji ịhụnanya na-ediri ibe anyị ihe’ na-eme ka anyị dịrị n’udo. (Efe. 4:2, 3) Anyị na-ahụ otú ụmụnna anyị si adị n’udo ma anyị gaa ọmụmụ ihe na mgbakọ. Ọ̀ bụ na i kwetaghị na ụdị udo a pụrụ iche n’ụwa a ndị mmadụ na-adịghị n’udo? (Ọma 119:165; Aịza. 54:13) Ọ bụrụ na anyị na ndị mmadụ adịrị n’udo, anyị na-egosi na anyị ji obi anyị niile hụ ha n’anya. Obi na-adịkwa Nna anyị nke eluigwe ụtọ.—Ọma 133:1-3; Mat. 5:9.
“ỊHỤNANYA NA-EWULI ELU”
Pọl dere, sị: “Ịhụnanya na-ewuli elu.” (1 Kọr. 8:1) Olee otú ịhụnanya si eme ya? N’isi nke iri na atọ n’akwụkwọ mbụ Pọl degaara ndị Kọrịnt, ọ kọwara otú ịhụnanya si ewuli elu. Ịhụnanya na-achọ abamuru nke onye ọzọ. (1 Kọr. 10:24; 13:5) Ebe ọ bụ na ịhụnanya na-eme ka mmadụ na-echebara mmadụ ibe ya echiche, nweekwa ogologo ntachi obi, ọ na-eme ka udo dịrị n’ezinụlọ, meekwa ka ọgbakọ dịrị n’otu.—Kọl. 3:14.
Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ bara uru ma na-ewuli elu karịa ịhụnanya anyị nwere n’ebe mmadụ ibe anyị nọ. Ụdị ịhụnanya ahụ anyị hụrụ Jehova na-eme ka ndị si ebe dị iche iche, agbụrụ dị iche iche, na asụsụ dị iche iche dịrị n’otu, jirikwa obi ụtọ na “otu obi” na-efe Jehova. (Zef. 3:9) Ka anyị kpebisie ike ịna-akpa ọmarịcha àgwà a so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ kwa ụbọchị.
^ para. 2 Isiokwu a bụ nke mbụ n’ime isiokwu itoolu a ga-atụle àgwà nke ọ bụla so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.