Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”

Eziokwu Na-eweta “Ọ Bụghị Udo, Kama Mma Agha”

“Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa; abịara m iweta, ọ bụghị udo, kama mma agha.”​—⁠MAT. 10:⁠34.

ABỤ: 125, 135

1, 2. (a) Olee udo anyị na-enwe ugbu a? (b) Olee ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe udo n’oge anyị a? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

ANYỊ niile chọrọ udo ná ndụ anyị. Anyị achọghịkwa ịna-echegbu onwe anyị. Obi dị anyị ụtọ na Jehova na-enye anyị “udo nke Chineke.” Udo a ga-eme ka obi na-eru anyị ala, anyị agharakwa ịna-echegbu onwe anyị. (Fil. 4:​6, 7) Anyị ‘na Chineke dị n’udo’ n’ihi na anyị nyefere ya onwe anyị. Nke a pụtara na anyị na ya dị n’ezigbo mma.​—⁠Rom 5:⁠1.

2 Ma, oge Chineke ga-eweta udo n’ụwa niile eruchabeghị. Ọgba aghara juru ebe niile n’ụwa n’oge ikpeazụ a. Ọtụtụ ndị bụ ndị okwu na ụka. (2 Tim. 3:​1-4) Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị na-alụso Setan ọgụ, na-akụghasịkwa ozizi ụgha ndị ọ na-ezi. (2 Kọr. 10:​4, 5) Ma, ihe nwere ike ime ka anyị na-echegbu onwe anyị karịchaa bụ ma ndị ezinụlọ anyị na-anaghị efe Jehova nyewe anyị nsogbu. Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịna-eme anyị akaje, na-ebo anyị ebubo na anyị na-etisa ezinụlọ. Ha nwekwara ike ikwu na anyị na ha abụkwaghị nwanne ma ọ bụrụ na anyị akwụsịghị ife Jehova. Olee ihe anyị kwesịrị iburu n’obi banyere nsogbu ndị ezinụlọ anyị na-enye anyị? Olee otú anyị nwere ike isi die nsogbu ndị o nwere ike ịkpata?

IHE ANYỊ GA-EBURU N’OBI BANYERE NSOGBU NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ NA-ENYE ANYỊ

3, 4. (a) Olee ihe Jizọs chọrọ ka ndị mmadụ mata n’ihe ọ gwara ha? (b) Olee mgbe o nwere ike isiri mmadụ ike ịbụ onye na-eso ụzọ Jizọs?

3 Jizọs ma na ọ bụghị mmadụ niile ga-ekweta n’ihe ndị ọ na-akụzi. Ọ makwa na ụfọdụ ndị ga na-emegide ndị na-eso ụzọ ya. N’ihi ya, ha kwesịrị inwe obi ike. Mmegide a nwere ike ime ka udo ghara ịdị n’ezinụlọ. Jizọs sịrị: “Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa; abịara m iweta, ọ bụghị udo, kama mma agha. N’ihi na m bịara ịkpata nkewa, nwoke megide nna ya, na nwa nwaanyị megide nne ya, nakwa nwaanyị a lụrụ ọhụrụ megide nne di ya. N’ezie, ndị iro mmadụ ga-abụ ndị ezinụlọ ya.”​—⁠Mat. 10:​34-36.

4 Mgbe Jizọs sịrị “Unu echela na m bịara iweta udo n’elu ụwa,” gịnị ka o bu n’obi kwuo ya? Ọ chọrọ ka ndị mmadụ mata na ha ga-enwe nsogbu ma ha bụrụ ndị na-eso ụzọ ya. N’eziokwu, ihe Jizọs bu n’obi bụ ịkụziri ndị mmadụ eziokwu banyere Chineke, ọ bụghị ikewa ezinụlọ. (Jọn 18:37) Ma ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịmata na ọ gaghị adịrị ha mfe ịbụ ndị na-eso ụzọ ya mgbe niile, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ezigbo ndị enyi ha ma ọ bụ ndị ezinụlọ ha anaghị efe Jehova.

5. Olee nsogbu ndị na-eso ụzọ Jizọs dirila?

5 Jizọs sịrị na otu n’ime ihe ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ịdị njikere idi bụ mmegide ndị ezinụlọ ha na-emegide ha. (Mat. 10:38) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ediela emo a na-akwa ha, nakwa ọjụjụ a jụrụ ha iji gosi na ha na-eme ihe dị Jizọs mma. Ma, ha eritela uru karịa ihe ha tụfuru.​—⁠Gụọ Mak 10:​29, 30.

6. Gịnị ka anyị kwesịrị icheta ma ndị ezinụlọ anyị na-emegide anyị maka na anyị na-efe Jehova?

6 Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị ana-emegide anyị n’ihi na anyị na-efe Jehova, anyị kwesịrị ịna-ahụ ha n’anya. Ma, anyị kwesịkwara icheta na anyị ga-ahụ Chineke na Kraịst n’anya karịa otú anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya. (Mat. 10:37) Anyị kwesịrị ịghọta na Setan nwere ike iji maka na anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya mee ka anyị ghara irubere Jehova isi. Ka anyị tụlee ụfọdụ nsogbu ndị ezinụlọ anyị na-enye anyị, nakwa otú anyị nwere ike isi die ha.

DI MA Ọ BỤ NWUNYE NA-ANAGHỊ EFE JEHOVA

7. Olee otú onye di ma ọ bụ nwunye ya na-anaghị efe Jehova kwesịrị isi were nsogbu ya?

7 Baịbụl gwara anyị na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye “ga-enwe mkpagbu n’anụ ahụ́ ha.” (1 Kọr. 7:28) Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị efe Jehova, o nwere ike ime ka nsogbu gị ka njọ, meekwa ka ịna-echegbu onwe gị. Ma, ọ dị mma ka i were nsogbu gị otú Jehova si were ya. Jehova kwuru na anyị agaghị ahapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị n’ihi na ha anaghị efe Jehova. O kwukwara na anyị agaghị agba ha alụkwaghịm. (1 Kọr. 7:​12-16) N’agbanyeghị na di na-anaghị efe Jehova abụghị ya ga na-akụziri ezinụlọ ya Okwu Chineke, nwunye ya kwesịrị ịna-akwanyere ya ùgwù n’ihi na ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ. Ọ bụrụ na nwunye anaghị efe Jehova, di ya bụ́ Onye Kraịst kwesịkwara ịhụ ya n’anya ma na-elekọta ya nke ọma.​—⁠Efe. 5:​22, 23, 28, 29.

8. Olee ajụjụ ndị i nwere ike ịjụ onwe gị ma di gị gwa gị ka ị ghara ife Jehova otú ị chọrọ?

8 Olee ihe i kwesịrị ime ma di gị ma ọ bụ nwunye gị agwa gị ka ị ghara ife Jehova otú ị chọrọ? Dị ka ihe atụ, di nke otu nwanna nwaanyị gwara ya ụbọchị ndị ọ ga-eji na-aga ozi ọma n’izu. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, jụọ onwe gị, sị: ‘Di m, ọ̀ chọrọ ka m kwụsị ife Jehova kpamkpam? Ma ọ bụghị ya, m̀ nwere ike mee ihe a o kwuru?’ I mee ihe i kwesịrị ime, ị gaghị enwecha nsogbu.​—⁠Fil. 4:⁠5.

9. Olee otú Ndị Kraịst ga-esi na-akụziri ụmụ ha ka ha na-asọpụrụ nna ha ma ọ bụ nne ha na-anaghị efe Jehova?

9 Ọ gaghị adịrị gị mfe ịzụ ụmụ gị ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị efe Jehova. Dị ka ihe atụ, i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị ka ha mee ihe a Baịbụl kwuru. O kwuru, sị: “Sọpụrụ nna gị na nne gị.” (Efe. 6:​1-3) Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị anaghị eme ihe Baịbụl kwuru? Na-asọpụrụ di gị ma ọ bụ nwunye gị, si otú ahụ na-akụziri ụmụ gị ịna-asọpụrụkwa ya. Lekwasị anya n’ebe ndị ọ na-eme nke ọma, ma na-ekele ya maka ha. Ekwula di gị ma ọ bụ nwunye gị okwu ọjọọ n’ihu ụmụ gị. Kama, mee ka ha ghọta na onye ọ bụla ga-eji aka ya kpebie ma ọ̀ ga-efe Jehova ma ọ̀ bụ na ọ gaghị efe ya. Àgwà ọma ụmụ gị nwere ike mee ka di gị ma ọ bụ nwunye gị na-anaghị efe Jehova, fewe ya.

Kụziere ụmụ gị eziokwu Baịbụl mgbe ọ bụla o kwere omume (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye anaghị efe Jehova, olee otú nne ma ọ bụ nna bụ́ Onye Kraịst ga-esi kụziere ụmụ ya eziokwu Baịbụl?

10 Mgbe ụfọdụ, di ma ọ bụ nwunye na-anaghị efe Jehova nwere ike ịgwa ụmụ ya ka ha na-eme ememme ndị na-anaghị efe Jehova ma ọ bụkwanụ na-akụziri ha ozizi ụgha. Ụfọdụ ndị di nwere ike machie nwunye ha bụ́ Onye Kraịst ịkụziri ụmụ ha Baịbụl. N’agbanyeghị ya, nwunye bụ́ Onye Kraịst ga-agbalị kụziere ụmụ ya eziokwu Baịbụl. (Ọrụ 16:1; 2 Tim. 3:​14, 15) Dị ka ihe atụ, di na-anaghị efe Jehova nwere ike ọ gaghị ekwe ka nwunye ya bụ́ Onyeàmà Jehova na-amụrụ ụmụ ya Baịbụl ma ọ bụ kpọrọ ha na-aga ọmụmụ ihe. Ọ bụ eziokwu na ọ ga-eme ihe di ya kwuru, ma ọ ka nwere ike ịgwa ụmụ ya ihe o kweere mgbe ọ bụla o kwere omume. Ụmụ ha ga-esi otú ahụ mụta banyere Jehova, mụtakwa ihe Jehova kwuru bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. (Ọrụ 4:19, 20) Ma, ọ bụ ụmụ ha ga-emecha jiri aka ha kpebie ma hà ga-efe Jehova ma ọ bụ na ha agaghị efe ya.​—⁠Diut. 30:​19, 20. *

IHE Ị GA-EME MA NDỊ EZINỤLỌ GỊ NYEWE GỊ NSOGBU

11. Gịnị nwere ike ịkpatara anyị na ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova esemokwu?

11 O nwere ike ịbụ na mgbe anyị na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl, anyị agwaghị ndị ezinụlọ anyị. Ma, ka okwukwe anyị na-esikwu ike, anyị aghọta na anyị kwesịrị ịgwa ha na anyị chọrọ ife Jehova. (Mak 8:38) Ọ bụrụ na ị kata obi gwa ndị ezinụlọ unu na-abụghị Ndịàmà Jehova na ị chọrọ ife Jehova, ya emee ka gị na ha sewe okwu, tụlee ụfọdụ ihe ị ga-eme ka i belata esemokwu ma ka na-eme ihe dị Jehova mma.

12. Gịnị nwere ike ime ka ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova na-enye anyị nsogbu? Oleekwanụ otú anyị ga-esi ghọta otú obi dị ha?

12 Ghọta otú obi dị ndị ezinụlọ unu na-abụghị Ndịàmà Jehova. Obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ na anyị ma eziokwu Baịbụl. Ma, ndị ezinụlọ anyị nwere ike na-eche na e megharịala anyị anya ma ọ bụ na anyị abaala n’òtù nzuzo. Ha nwekwara ike na-eche na anyị ahụzighị ha n’anya n’ihi na anyị anaghị eso ha eme ememme ndị ha na-eme. Ha nwedịrị ike na-atụ ụjọ na ihe ọjọọ nwere ike ime anyị ma anyị nwụọ. Anyị kwesịrị ịghọta otú obi dị ha ma gee ha ntị nke ọma ma ha kwuwe okwu, ka anyị nwee ike ịmata ihe mere ha ji na-eche otú ahụ. (Ilu 20:⁠5) Pọl onyeozi gbalịrị ịghọta “ụdị mmadụ niile,” ka o nwee ike izi ha ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị agbalịa ghọta ndị ezinụlọ anyị nke ọma, ọ ga-enyere anyị aka ịmata otú anyị ga-esi kụziere ha eziokwu.​—⁠1 Kọr. 9:​19-23.

13. Olee otú anyị kwesịrị isi na-agwa ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova okwu?

13 Na-emeda obi agwa ndị ezinụlọ unu okwu. Baịbụl kwuru, sị, “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile.” (Kọl. 4:⁠6) Anyị nwere ike ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ nsọ ka anyị nwee ike jiri obi ọma na-agwa ha okwu. Anyị na ha ekwesịghị ịna-arụ ụka n’ihe niile na-abụghị eziokwu ha kweere. Ọ bụrụ na ha akpasuo anyị iwe n’ihi ihe ha gwara anyị ma ọ bụ mere anyị, anyị nwere ike ime ihe ndịozi mere. Pọl kwuru, sị: “Mgbe a na-ekwujọ anyị, anyị na-agọzi agọzi; mgbe a na-akpagbu anyị, anyị na-atachi obi; mgbe a na-ekwutọ anyị, anyị na-arịọsi arịrịọ ike.”​—⁠1 Kọr. 4:​12, 13.

14. Olee uru ịna-akpa àgwà ọma bara?

14 Na-akpa àgwà ọma. Ọ bụ eziokwu na imeda obi kwuo okwu nwere ike ime ka anyị na ndị ezinụlọ anyị na-adị n’udo, àgwà ọma anyị nwedịrị ike ịkpakwu ike. (Gụọ 1 Pita 3:​1, 2, 16.) Àgwà ọma anyị ga-eme ka ndị ezinụlọ anyị na-abụghị Ndịàmà Jehova mata na anyị na-ebi n’udo n’ezinụlọ anyị, na-elekọta ụmụ anyị nke ọma, na-ebi ndụ dị ọcha, na-ejikwa ndụ anyị eme ihe bara uru. Ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ anyị abataghị n’ọgbakọ, obi kwesịrị ịna-atọ anyị ụtọ na àgwà ọma anyị na-akpa na-atọ Jehova ụtọ.

15. Olee otú anyị ga-esi kwado akwado ka anyị na ndị ezinụlọ anyị ghara ịrụwa ụka?

15 Kwado akwado. Chee ihe ndị nwere ike ime ka gị na ndị ezinụlọ unu sewe okwu, ma kpebie ihe ị ga-eme. (Ilu 12:​16, 23) Otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Ọstrelia kwuru, sị: “Nna di m anaghị achọ iji ntị anụ eziokwu. Anyị chọọ ịga hụ ya, mụ na di m na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka imeda obi gwa ya okwu ma ọ kpasuo anyị iwe. Anyị na-akwado ihe anyị ga-agwa ya ka mkparịta ụka anyị gaa siriri werere. Anyị na-ekwu oge anyị na ya ga-eji kwurịta okwu n’ekwentị, ka anyị ghara ikwu ogologo okwu ga-eme ka anyị na ya rụwa ụka n’enweghị isi.”

16. Ọ bụrụ na gị na ndị ezinụlọ unu arụrịta ụka, olee otú ị ga-esi mee ka obi ghara ịna-ajọ gị njọ?

16 Nke bụ́ eziokwu bụ na e nwekwara mgbe gị na ndị ezinụlọ unu na-abụghị Ndịàmà Jehova ga-arụ ụka. Ọ bụrụ na gị na ha arụrịta ụka, obi nwere ike ịjọ gị njọ n’ihi na ị hụrụ ha n’anya ma chọọkwa ịna-eme ihe dị ha mma. Ụdị ihe a mee gị, cheta na i kwesịrị ịhụ Jehova n’anya karịa ndị ezinụlọ unu. Nke a nwere ike ime ka ha ghọta na ime ihe Baịbụl kwuru ga-eme ka mmadụ dị ndụ. Ma, è tere ụgba ma è tere azụ̀, cheta na ị gaghị amanye ndị ọzọ ikweta eziokwu. Ma, mee ka ha ghọta otú ime ihe Jehova chọrọ sirila baara gị uru. Chineke hụrụ anyị n’anya ma chọọ ka ha jiri aka ha họrọ ma hà ga-efe ya ma ọ bụ na ha agaghị efe ya otú ahụ o meere anyị.​—⁠Aịza. 48:​17, 18.

Ọ BỤRỤ NA ONYE EZINỤLỌ ANYỊ AHAPỤ JEHOVA

17, 18. Ọ bụrụ na onye ezinụlọ gị ahapụ Jehova, olee ihe ga-enyere gị aka idi ya?

17 A chụọ onye ezinụlọ anyị n’ọgbakọ ma ọ bụ ya asị na ya abụghịzi Onyeàmà Jehova, o nwere ike wute anyị hie nne. O nwere ike ịdị anyị ka à mara anyị mma n’ahụ́. Olee otú ị ga-esi die ya?

18 Lekwasị anya n’ofufe ị na-efe Jehova. Ọ bụrụ na ọ na-ewute anyị na onye ezinụlọ anyị hapụrụ Jehova, anyị kwesịrị ịna-eme ihe ndị ga-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. Anyị kwesịrị ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-akwadebe maka ọmụmụ ihe ma na-agachi ya anya, na-agachi ozi ọma anya, na-arịọkwa Jehova ka o nye anyị ike anyị ga-eji die ya. (Jud 20, 21) Ọ bụrụkwanụ na ị na-eme ihe ndị a, ya aka na-ewute gị? Adakwala mbà. Lekwasị anya n’ofufe ịna-efe Jehova. Ka oge na-aga, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị. Chegodị banyere ihe mere otu onye dere Abụ Ọma 73. O nwere mgbe o ruru ya amalite ịna-echegbu onwe ya. Ma, o mechara lewe ihe anya otú kwesịrị ekwesị mgbe ọ banyere ebe a na-efe Chineke. (Ọma 73:​16, 17) Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile na-efe Jehova, ọ ga-eme ka ị kwụsị ịna-echegbu onwe gị.

19. Olee otú ị ga-esi gosi na ị na-anabata aka ná ntị Jehova na-adọ gị?

19 Na-anabata aka ná ntị Jehova na-adọ anyị. Jehova ma na aka ná ntị ọ na-adọ anyị ga-abara anyị niile uru ma onye a chụrụ n’ọgbakọ. Ọ bụ eziokwu na ọ na-ewute anyị ma a chụọ onye ezinụlọ anyị n’ọgbakọ, ma ọ ga-enyere ya aka ịlaghachikwute Jehova n’ọdịnihu. (Gụọ Ndị Hibru 12:11.) Dị ka ihe atụ, Jehova gwara anyị ka anyị na onye mere ihe ọjọọ ma jụ ichegharị ‘kwụsị ịna-akpakọ.’ (1 Kọr. 5:​11-13) N’agbanyeghị otú o si wute anyị, anyị ekwesịghị ịna-akpọ ya n’ekwentị, na-ezigara ya ozi n’ekwentị, na-edegara ya akwụkwọ ozi, na-ezigara ya ozi iimel, ma ọ bụ na-ezigara ya ozi n’Ịntanet mgbe ọ na-adịghị mkpa.

20. Olee ihe anyị kwesịrị ịna-enwe olileanya ya?

20 Adakwala mbà. Baịbụl kwuru na ịhụnanya “na-enwe olileanya ihe niile.” N’ihi ya, anyị nwere olileanya na otu ụbọchị, ndị ezinụlọ anyị a chụrụ n’ọgbakọ ga-alaghachikwute Jehova. (1 Kọr. 13:⁠7) Ọ bụrụ na ị hụ na onye ezinụlọ unu a chụrụ n’ọgbakọ agbanwewala àgwà ya, i nwere ike ịrịọ Jehova ka e jiri Baịbụl gbaa ya ume, nakwa ka ọ nabata ihe a Jehova na-agwa anyị, ya bụ, ka anyị ‘Laghachikwute ya.’​—⁠Aịza. 44:⁠22.

21. Gịnị ka ị ga-eme ma ndị ezinụlọ unu na-enye gị nsogbu maka na ị na-eso Jizọs?

21 Jizọs kwuru na anyị kwesịrị ịhụ ya n’anya karịa otú anyị hụrụ mmadụ ọ bụla n’anya. Jizọs kwetasiri ike na ndị na-eso ụzọ ya ga-akata obi na-erubere ya isi ọ bụrụgodị na ndị ezinụlọ ha na-enye ha nsogbu. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu na-enye gị nsogbu n’ihi na ị na-eso Jizọs, tụkwasị Jehova obi. Na-arịọ ya ka o nyere gị aka idi ya. (Aịza. 41:​10, 13) Ka obi na-atọ gị ụtọ na ihe ị na-eme na-atọ Jehova na Jizọs ụtọ, nakwa na ha ga-agọzi gị n’ihi na ị na-erubere ha isi.

^ para. 10 Ị chọọ ịmatakwu otú e si azụ ụmụ n’ezinụlọ nne ma ọ bụ nna na-anaghị efe Jehova, gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” n’Ụlọ Nche, August 15, 2002.