Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị Na-agụ Kpakpando na Ndị Na-akọ Ọdịnihu Hà Na-ahụ Ọdịnihu n’Eziokwu?

Ndị Na-agụ Kpakpando na Ndị Na-akọ Ọdịnihu Hà Na-ahụ Ọdịnihu n’Eziokwu?

ỊGỤ KPAKPANDO

Ịgụ kpakpando bụ otu ụzọ e si agba afa. Ndị na-eme ya kwetara na e nwere ike iji kpakpando, ọnwa na planet dị iche iche mata otú ihe ga-adịrị mmadụ n’ọdịnihu. Ha sịrị na ebe kpakpando, ọnwa na planet nọ mgbe a mụrụ mmadụ ga-ekpebi ụdị onye ọ ga-abụ na otú ihe ga-adịrị ya n’ọdịnihu. Ọ bụ eziokwu na ịgụ kpakpando malitere ọtụtụ afọ gara aga na Babịlọn, ma ndị mmadụ ka na-eme ya taa. N’afọ 2012, a jụrụ ndị mmadụ n’Amerịka gbasara ịgụ kpakpando. Ọtụtụ n’ime ha kwuru na ịgụ kpakpando dịtụwara ka sayensị, ụfọdụ ekwuo na o doro anya na ọ bụ sayensị. Ihe a ha kwuru ọ̀ bụ eziokwu? Mba. Lee ihe mere anyị ji sị na ọ bụghị eziokwu.

  • Planet na kpakpando enweghị ikike ịkpa ndụ mmadụ aka otú ahụ ndị na-agụ kpakpando kwuru.

  • Ọtụtụ mgbe, ihe ha na-ekwu nwere ike ime onye ọ bụla, n’ihi na ha anaghị akapị okwu ọnụ.

  • Ihe ndị na-agụ kpakpando taa na-adabere na ya akọ ihe ga-eme bụ ihe ndị mmadụ kweere n’oge ochie, nke bụ́ na planet ndị ọzọ na-agba ụwa gburugburu. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na planet ndị ọzọ na-agba anyanwụ gburugburu.

  • Mmadụ gakwuru ndị na-agụ kpakpando jụọ ha gbasara otu ihe, ihe ha na-aza na-adị iche iche.

  • Ndị na-agụ kpakpando kere ndị mmadụ ụzọ iri na abụọ. Ụzọ nke ọ bụla nwere ihe e ji mara ya, nweekwa aha ìgwè kpakpando ọ na-aza. Ha na-eji mgbe a mụrụ mmadụ amata ebe ha ga-etinye onye ahụ. Ma ebe ọ bụ na ụwa anọghị otu ebe kemgbe ọtụtụ narị afọ, ọ pụtara na oge ha kenyere ìgwè kpakpando ndị ahụ adabaghịzi adaba.

Ha sịrị na ihe ndị ahụ e ji mara ụzọ nke ọ bụla na-enyere ha aka ịmata otú mmadụ si akpa àgwà. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị a mụrụ n’otu ụbọchị n’ọnwa anaghị akpa otu ụdị àgwà. Ụbọchị a mụrụ mmadụ anaghị eme ka a mata otú onye ahụ si akpa àgwà. Kama ndị na-agụ kpakpando ịchọ ịmata otú mmadụ si akpa àgwà n’eziokwu, ha na-eji ihe mmadụ chere akọwa àgwà mmadụ. Ihe a ó nweghị ike ime ka ha kwuo na mmadụ bụ ihe ọ na-abụghị?

ỊKỌ ỌDỊNIHU

Kemgbe oge ochie, ndị mmadụ na-agakwuru ndị na-akọ ọdịnihu. Ụfọdụ ndị na-akọ ọdịnihu na-enyocha ime ahụ́ anụmanụ ma ọ bụ mmadụ ma ọ bụkwanụ otú oké ọkpa si atụ nri ka ha mata ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ụfọdụ na-eji otú akwụkwọ tii dị ma ọ bụ kọfị ekwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Taa, ihe ndị ha ji akọ ọdịnihu bụ ịgụ kpakpando, ịgụ akara aka, ịkọwa nrọ, enyo na ihe ndị ọzọ. Ọ̀ bụ ndị na-akọ ọdịnihu ga-agwa anyị nke bụ́ eziokwu gbasara ọdịnihu? Mba. Lee ihe mere anyị ji sị mba.

Ndị na-akọ ọdịnihu anaghị ekwu otu ihe. Ha jiri ihe dị iche iche ha ji akọ ọdịnihu chọọ ịma ihe ga-eme n’ọdịnihu, ọtụtụ mgbe, ihe ha na-ekwu na-adị iche iche. Ọ bụrụgodị na ọ bụ otu ihe ka ha ji mee ya, ihe ha na-ekwu na-adị iche iche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na mmadụ ajụọ mmadụ abụọ na-akọ ọdịnihu otu ajụjụ, ha ejiri otu ihe chọọ ịmata ya, ha abụọ kwesịrị inwe otu olu n’ihe ha chọpụtara. Ma ọtụtụ mgbe, ha anaghị enwe otu olu.

A na-enyozi ndị na-akọ ọdịnihu na ụzọ ndị ha si eme ya enyo. Ọtụtụ ndị na-ekwu na ihe ndị ahụ ha sị na ha ji akọ ọdịnihu bụ naanị ihe ha ji emegharị ndị mmadụ anya. Ihe ha na-eme bụ ha lee mmadụ anya, ha amata ihe ha ga-akọ. Dị ka ihe atụ, ndị sị na ha bụ e jewe a kpọtụrụ n’ihe banyere ịkọ ọdịnihu na-ebu ụzọ jụọ onye ha na-akọrọ ọdịnihu ihe ụfọdụ, ma lewe ihe ọ ga-aza ma ọ bụ ihe ọ ga-eme nke nwere ike inyere ha aka ịmata gbasara onye ahụ. Ihe a na-eme ka ọ dịzie onye ahụ ka onye na-akọ ọdịnihu ọ̀ ma ihe gbasara ya n’amaghị na ọ bụ yanwa gwara ya ihe ndị ahụ. Ụfọdụ ndị na-akọ ọdịnihu esila otú a gwuo ọtụtụ ndị wayo.

IHE BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ

Ihe ịgụ kpakpando na ịkọ ọdịnihu na-egosi bụ na e bula ụzọ kpebie otú ọdịnihu onye ọ bụla ga-adị. Mana, ọ̀ bụ eziokwu? Baịbụl gwara anyị na anyị nwere ike ịhọrọ ihe anyị ga-ekwere ma ọ bụ ihe anyị ga-achọ ime, nakwa na ihe anyị họọrọ ga-ekpebi otú ọdịnihu anyị ga-adị.—Jọshụa 24:15.

Ihe ọzọ mere ndị na-efe Chineke ekwesịghị itinye aka n’ịgụ kpakpando na ịkọ ọdịnihu bụ na Chineke kpọrọ ụdị ịgba afa ọ bụla asị. Baịbụl kwuru, sị: “A gaghị ahụ n’etiti unu onye ọ bụla . . . nke na-agba afa, onye na-eme anwansi ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-achọ ihe mgbaàmà ọdịnihu ma ọ bụ dibịa anwansi, ma ọ bụ onye na-akọ ndị ọzọ ọgwụ ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ onye na-agba afa ase ma ọ bụ onye ọrụ ya bụ ịkọ ọdịnihu ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ajụ ndị nwụrụ anwụ ase. N’ihi na onye ọ bụla nke na-eme ihe ndị a bụ ihe arụ n’anya Jehova.” aDiuterọnọmi 18:10-12.

a Ọ bụ aha “Onye Kasị Elu n’ụwa niile.”—Abụ Ọma 83:18.