Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Chineke Ga-eme Ka Ahụhụ Niile Kwụsị n’Oge Na-adịghị Anya

Chineke Ga-eme Ka Ahụhụ Niile Kwụsị n’Oge Na-adịghị Anya

Habakọk bụ ezigbo mmadụ, ya na Jehova dịkwa ná mma. Ọ jụrụ Jehova, sị: “Jehova, ruo ole mgbe ka m ga na-eti mkpu enyemaka, ma ị dịghị anụ ya? Ruo ole mgbe ka m ga na-akpọku gị ka i nyere m aka napụta m n’ihe ike, ma ị dịghị azọpụta m?” (Habakọk 1:2, 3) Ajụjụ a Habakọk jụrụ, ò gosiri na o nweghị okwukwe? Mba. Chineke gwara Habakọk na o nwere oge a kara aka ọ ga-eme ka ahụhụ kwụsị.—Habakọk 2:2, 3.

Ọ bụrụ na gịnwa, enyi gị, ma ọ bụ onye ezinụlọ gị na-ata ahụhụ, i nwere ike ichewe na Chineke na-egbu oge ịgbata ọsọ enyemaka. Ma, Baịbụl gwara anyị, sị: “Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”—2 Pita 3:9.

OLEE MGBE CHINEKE GA-EME KA NSOGBU ỤWA KWỤSỊ?

Ọ ga-eme ya n’oge na-adịghị anya. Jizọs kwuru na e nwere ọgbọ ga-ahụ ihe ndị ga-eme n’ụwa ga-egosi na a banyela n’oge ikpeazụ nke “usoro ihe a.” (Matiu 24:3-42) Ihe ndị ahụ Jizọs kwuru na-eme n’oge anyị a. Ọ na-egosi na oge eruwela mgbe Chineke ga-eme ka ahụhụ juru n’ụwa a kwụsị. *

Ma, oleekwanụ otú Chineke ga-esi mee ka ahụhụ niile kwụsị? Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, o gosiri na Chineke ga-emeli ka ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata kwụsị. Legodị ihe ụfọdụ o mere.

Ọdachi Ndị Na-emere Onwe Ha: Mgbe Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya na-akwọ ụgbọ ha n’Oké Osimiri Galili, oké ifufe na ebili mmiri malitere, na-achọ ime ka ụgbọ ha kpuo. Ma, Jizọs gosiri na ya na Nna ya ga-akwụsịli oké ifufe, ebili mmiri, na ihe ndị ọzọ. (Ndị Kọlọsi 1:15, 16) Jizọs sịrị ebili mmiri na oké ifufe ahụ: “Shịị! Daa jụụ! Ifufe ahụ wee kwụsị, ebe niile wee daa jụụ.”—Mak 4:35-39.

Ọrịa: A ma Jizọs ama n’ihi na ọ gwọrọ ndị ìsì, ndị ngwọrọ, ndị akwụkwụ, ndị ekpenta na ndị na-arịa ụdị ọrịa ọ bụla. ‘Ọ gwọrọ ndị niile ahụ́ na-adịghị mma.’—Matiu 4:23, 24; 8:16; 11:2-5.

Ụkọ Nri: Jizọs ji ike Nna ya nyere ya mee ka obere ihe oriri e nwere zuoro ọtụtụ puku mmadụ. Baịbụl kwuru na Jizọs nyere ọtụtụ puku mmadụ nri ugboro abụọ mgbe ọ na-eje ozi n’ụwa.—Matiu 14:14-21; 15:32-38.

Ọnwụ: Baịbụl kọrọ banyere mmadụ atọ Jizọs kpọlitere n’ọnwụ. Ihe a gosiri na Jehova nwere ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. N’ime ndị ahụ ọ kpọlitere n’ọnwụ, e nwere onye nke nọrọ abalị anọ n’ili tupu ya akpọlite ya.—Mak 5:35-42; Luk 7:11-16; Jọn 11:3-44.

^ para. 5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara oge ikpeazụ, gụọ isi nke 9 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike ịga na www.pr418.com/ig danloduo ya n’efu.