Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ihe Mmadụ Iji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe Pụtara?

Olee Ihe Mmadụ Iji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe Pụtara?

“Ka Chineke onye na-enye ntachi obi na nkasi obi mee ka unu nwee n’etiti onwe unu ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere.”​—ROM 15:5.

ABỤ: 17, 13

1, 2. (a) Olee otú obi dị ọtụtụ ụmụnna n’ihi na ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe? (b) Olee ajụjụ ndị dị mkpa anyị ga-aza gbasara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

OTU nwanna nwaanyị bi na Kanada kwuru, sị: “Iji ofufe Chineke kpọrọ ihe emeela ka m na-enwekwu obi ụtọ, meekwa ka m na-edi nsogbu ndị na-abịara m kwa ụbọchị.” Otu nwanna bi na Brazil sịrị: “Mụ na nwunye m na-enwe obi ụtọ kemgbe afọ iri abụọ na atọ anyị lụrụ n’ihi na anyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe.” Nwanna bi na Filipinz kwukwara, sị: “Iji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-eme ka obi na-eru m ala. Ọ na-emekwa ka otú m si emeso ụmụnna ndị si ebe dị iche iche ihe kakwuo mma.”

2 Ihe ụmụnna ndị ahụ kwuru na-egosi na mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe bara ezigbo uru. N’ihi ya, anyị nwere ike jụọ onwe anyị, sị: ‘Olee otú m ga-esi jirikwuo ofufe Chineke kpọrọ ihe ka m nwee ike irite uru ndị ahụ e kwuru okwu ha?’ Tupu anyị azaa ajụjụ a, anyị kwesịrị ịghọta ihe Baịbụl kwuru banyere ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ndị mmụọ nsọ Chineke na-eduzi, nakwa ndị na-eche echiche otú Jehova si eche. N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ atọ ndị a dị mkpa. (1) Olee ihe mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe pụtara? (2) Olee ihe atụ ndị ga-enyere anyị aka iji ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe? (3) Olee otú mbọ anyị na-agba inwe “uche nke Kraịst” ga-esi eme ka anyị jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe?

OLEE IHE MMADỤ IJI OFUFE CHINEKE KPỌRỌ IHE PỤTARA?

3. Olee otú Baịbụl si kọwaa ihe dị iche n’onye anụ ahụ́ na-achị na onye mmụọ nsọ na-achị?

3 Pọl onyeozi mere ka anyị mata ihe mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe pụtara mgbe o kwuru banyere ihe dị iche ‘n’onye mmụọ nsọ na-achị’ na “onye anụ ahụ́ na-achị.” (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 2:14-16.) Olee ihe dị iche na ha abụọ? A kọwara “onye anụ ahụ́ na-achị” ka onye na-anaghị anabata “ihe ndị metụtara mmụọ Chineke, n’ihi na ha bụụrụ ya ihe nzuzu; ọ pụghịkwa ịmara ha.” Ma, “onye mmụọ nsọ na-achị” bụ onye “na-enyocha ihe niile” ma nwee “uche nke Kraịst.” Pọl gwara anyị ka anyị bụrụ ndị mmụọ nsọ na-achị. Olee otú ọzọ onye anụ ahụ́ na-achị si dị iche n’onye mmụọ nsọ na-achị?

4, 5. Olee àgwà ndị e ji amata onye anụ ahụ́ na-achị?

4 Ka anyị buru ụzọ tụlee àgwà ndị e ji amata onye anụ ahụ́ na-achị. Ihe e ji mara ndị ụwa bụ na ha na-eme ihe na-abara naanị onwe ha uru. Pọl kọwara ya dị ka “mmụọ nke na-arụ ọrụ ugbu a n’ime ụmụ nnupụisi.” (Efe. 2:2) Mmụọ a na-eme ka ọtụtụ ndị soro ndị ọzọ na-eme ihe ha na-eme. Ha na-elekwasị anya n’ihe anụ ahụ́. N’ihi ya, ọtụtụ n’ime ha na-eme ihe ha chere ziri ezi, ha anaghịkwa agba mbọ eme ihe Chineke kwuru. Ihe na-abụkarị mkpa onye anụ ahụ́ na-achị bụ ịchụ ego, isi ọnwụ na ọ ga-enweta ihe ndị o chere ruuru ya, nakwa ka ndị mmadụ na-akwanyere ya ùgwù.

5 Olee ihe ọzọ e nwere ike iji amata onye anụ ahụ́ na-achị? Ndị na-akpa àgwà ndị ahụ Baịbụl kpọrọ “ọrụ nke anụ ahụ́” so ná ndị anụ ahụ́ na-achị. (Gal. 5:19-21) N’akwụkwọ mbụ Pọl degaara ọgbakọ dị na Kọrịnt, o kwuru àgwà ndị ọzọ ndị anụ ahụ́ na-achị na-akpa. Àgwà ndị ahụ bụ ịkpata nkewa, ịdụnyere mmadụ úkwù ma e nwee esemokwu, ịkpata esemokwu, ịkpọpụ ibe ha n’ụlọikpe, akwanyereghị ndị isi ùgwù, iribiga nri ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè. Ha anaghịkwa agbaliri ọnwụnwa ọsọ ma ọ bịara ha. (Ilu 7:21, 22) Jud kwuru na àgwà ndị anụ ahụ́ na-achị na-akpa ga-akakwu njọ nke na ha agaghị eji “ihe ime mmụọ kpọrọ ihe.”—Jud 18, 19.

6. Olee ihe e ji amata onye mmụọ nsọ na-achị?

6 Oleezi ihe mmadụ ịbụ “onye mmụọ nsọ na-achị” pụtara? Onye mmụọ nsọ na-achị na-agbalị ka ya na Chineke na-adị ná mma, ma onye anụ ahụ́ na-achị anaghị eme otú ahụ. Ndị mmụọ nsọ na-achị na-agbalị ‘iṅomi Chineke.’ (Efe. 5:1) Nke a pụtara na ha na-agbalị ịmụta otú Jehova si eche echiche ma na-ele ihe anya otú o si ele ya. Ha ma na Chineke dị adị. Ndị mmụọ nsọ na-achị na-erubere Jehova isi n’ihe niile ha na-eme. Ma ndị anụ ahụ́ na-achị anaghị eme otú ahụ. (Ọma 119:33; 143:10) Kama onye mmụọ nsọ na-achị ilekwasị anya n’ihe anụ ahụ́, ọ na-agbalị igosi na ya nwere “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) Iji kọwakwuo ihe mmadụ ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị pụtara, chegodị banyere ihe atụ a: Otú ahụ e nwere ike isi kpọọ onye ahịa doro anya onye ọchụnta ego, ka e nwekwara ike isi kpọọ onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, onye mmụọ nsọ na-achị.

7. Olee ihe Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ nsọ na-achị?

7 Baịbụl kwuru okwu ọma banyere ndị mmụọ nsọ na-achị. Matiu 5:3 kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha, n’ihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.” Ndị Rom 8:6 kwuru uru mmadụ ịbụ onye mmụọ nsọ na-achị bara. Ọ sịrị: “Ịtụkwasị uche n’anụ ahụ́ pụtara ọnwụ, ma ịtụkwasị uche na mmụọ nsọ pụtara ndụ na udo.” Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ihe ndị gbasara ofufe Chineke, anyị na Chineke ga na-adị ná mma, obi ga-erukwa anyị ala, anyị ga-enwekwa olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu.

8. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịbụ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe ma nọgide na-eme otú ahụ?

8 Ma, anyị bi n’ụwa ọjọọ. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị anaghị eche echiche otú Chineke si eche, anyị kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka anyị ghara ịna-eche echiche otú ha si eche. Ọ bụrụ na anyị anaghị eche echiche otú Jehova si eche, ụwa ga-eme ka obi anyị dịrị n’ihe anụ ahụ́, meekwa ka anyị na-eche echiche otú ha si eche. Olee ihe anyị ga-eme ka ụdị ihe a ghara ime anyị? Olee otú anyị ga-esi jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe?

NDỊ ANYỊ GA-AMỤTA IHE N’AKA HA

9. (a) Gịnị ga-enyere anyị aka iji ofufe Chineke kpọrọ ihe? (b) Olee ndị anyị ga-atụle gbasara ha ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

9 Ọ bụrụ na nwatakịrị ana-ele ihe ndị mụrụ ya na-eme ma na-akpa àgwà ọma ka ha, ọ ga-ama ihe. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Ọ bụrụ na anyị ana-ele ihe ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na-eme ma na-akpa àgwà ọma ka ha, anyị ga-ejikwa ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ma anyị ekwesịghị ịkpawa àgwà ndị anụ ahụ́ na-achị na-akpa. (1 Kọr. 3:1-4) Baịbụl gwara anyị gbasara ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe na ndị anụ ahụ́ na-achị. Ebe ọ bụ na mkpa anyị bụ ka anyị bụrụ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe, ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ndị anyị ga-eṅomi. Ha bụ Jekọb, Meri, na Jizọs.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jekọb? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Olee otú Jekọb si gosi na ya bụ onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

10 Nke mbụ, ka anyị tụlee gbasara Jekọb. Ihe adịghịrị ya mfe otú ahụ ọ na-adịghịrị anyị taa. O diri nsogbu Ịsọ nwanne ya na-enye ya, bụ́ onye chọrọ igbu ya. O bighị na nke a. O dikwara ihe nna nwunye ya mere ya, bụ́ onye gbara mbọ imegbu ya. Jekọb ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị n’oge ahụ bụ ndị “anụ ahụ́” na-achị. O nwere okwukwe ná nkwa ahụ Jehova kwere Ebreham. O lekọtara ezinụlọ ya nke ọma n’ihi na ọ ma na ezinụlọ ya ga-eso emezu nkwa ahụ. (Jen. 28:10-15) Ihe Jekọb kwuru na ihe ndị o mere gosiri na o chefughị nkwa ahụ Jehova kwere. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ chọpụtara na Ịsọ nwanne ya nwere ike igbu ya, ọ gwara Chineke, sị: ‘Ana m arịọ gị, napụta m . . . Gị onwe gị asịwo, “N’ezie, m ga-emeso gị ihe n’ụzọ dị mma, m ga-emekwa ka mkpụrụ gị baa ụba dị ka ájá dị n’oké osimiri.”’ (Jen. 32:6-12) Jekọb nwere okwukwe ná nkwa ahụ ma gosi ya n’omume.

Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Meri? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11. Olee ihe gosiri na Meri ji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

11 Ka anyị tụleekwa banyere Meri. Gịnị mere Jehova ji họrọ ya ka ọ bụrụ nne Jizọs? O doro anya na ọ bụ n’ihi na o ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Olee otú anyị si mara? Ihe o kwuru mgbe ọ gara n’ụlọ ndị ikwu ya bụ́ Zekaraya na Elizabet mere ka anyị mara. (Gụọ Luk 1:46-55.) Ihe Meri kwuru gosiri na o ji Okwu Chineke kpọrọ ihe, nakwa na ọ ma Akwụkwọ Nsọ Hibru nke ọma. (Jen. 30:13; 1 Sam. 2:1-10; Mal. 3:12) Chetakwa na mgbe Meri na Josef lụchara, ha enweghị mmekọahụ ruo mgbe a mụrụ Jizọs. Olee ihe nke a na-egosi? Ọ na-egosi na ihe bụ́ mkpa ha bụ ime uche Jehova, ọ bụghị ihe na-agụ ha agụụ. (Mat. 1:25) Ka oge na-aga, Meri nọ na-ele ihe niile na-eme ná ndụ Jizọs ka ọ na-etolite ma gee ntị n’ihe niile o ji amamihe Chineke nyere ya kwuo. Ihe ọzọ bụ na Meri “buuru okwu a niile nke ọma n’obi ya.” (Luk 2:51) O doro anya na o nwere ezigbo mmasị ná nkwa Chineke kwere banyere Mesaya. Ihe a Meri mere, ọ̀ bụ na ọ gaghị enyere anyị aka iche otú anyị ga-esi mee ka ime uche Chineke bụrụ ihe kacha anyị mkpa ná ndụ?

12. (a) Olee otú Jizọs si ṅomie Nna ya? (b) Olee otú anyị nwere ike isi ṅomie Jizọs? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

12 Ma, a bịa ná ndị niile dịrị ndụ n’ụwa, ònye kacha jiri ofufe Chineke kpọrọ ihe? O doronụ anya na ọ bụ Jizọs. N’oge niile ọ dịrị ndụ n’ụwa ma jee ozi ya, o gosiri na ọ chọrọ ime ka Nna ya bụ́ Jehova. Jizọs chere echiche ka Jehova, kpaa àgwà ka ya, mee uche ya, ihe wutekwara ya otú o si ewute Jehova. (Jọn 8:29; 14:9; 15:10) Dị ka ihe atụ, jiri ihe Aịzaya kwuru gbasara ụdị ọmịiko Jehova nwere tụnyere ihe Mak kwuru gbasara ụdị ọmịiko Jizọs nwere. (Gụọ Aịzaya 63:9; Mak 6:34.) Ànyị dị njikere mgbe ọ bụla inyere ndị nọ ná mkpa aka ma si otú ahụ na-eṅomi Jizọs? Ihe ọzọ bụ na Jizọs ji ndụ ya niile na-ekwusa ozi ọma ma na-akụziri ndị mmadụ ihe. (Luk 4:43) Ihe ndị a niile o mere bụ ihe e ji ama onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe.

13, 14. (a) Olee ihe anyị ga-amụta n’aka ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’oge anyị a? (b) Nye ihe atụ.

13 Ọ bụghị naanị ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. E nwekwara ọtụtụ ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’oge anyị a, bụ́ ndị na-agbalị iṅomi Jizọs. O nwere ike bụrụ na ị hụla otú ha si anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma, na-emesapụ aka, na-enwe ọmịiko, ma ọ bụ na-akpa àgwà ọma ndị ọzọ. N’agbanyeghị na ha na ezughị okè na-alụ, ha na-agbalịsi ike na-akpa àgwà ọma ndị a Jehova chọrọ ka anyị na-akpa. Otu nwanna nwaanyị bi na Brazil aha ya bụ Rachel sịrị: “Iji ejiji ka ndị ụwa na-amasịkarị m, ya emezie ka m na-eji ejiji na-adịghị mma n’anya. Ma, eziokwu m mụtara mere ka m gbasie mbọ ike bụrụ onye ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. O siiri m ike ịgbanwe. Ma mgbe m mechara gbanwee, obi tọgburu m atọgbu, mụ ejirikwa ndụ m na-eme ihe bara uru.”

14 Otu nwanna bi na Filipinz aha ya bụ Reylene nwere nsogbu nke ya. Obi ya niile dị n’ịga mahadum na inweta ezigbo ọrụ. Ọ sịrị: “Obi m adịghịzi n’ihe ndị m bu n’obi ime n’ofufe Chineke. Ma, m mechara ghọta na e nwere ihe m na-anaghị eme nke ka ọrụ m na-arụ mkpa. N’ihi ya, m gbanwere otú m si eche echiche ma mee ka ofufe Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ m.” Kemgbe ahụ, Reylene na-atụkwasị nkwa Jehova kwere obi, nke dị na Matiu 6:33, 34. Reylene kwuru, sị: “O doro m ezigbo anya na Jehova ga na-elekọta m.” Ọ ga-abụ na e nwere ụmụnna ndị dị otú a n’ọgbakọ unu. Ọ̀ bụ na anyị agaghị achọ iṅomi ha ka ha na-eṅomi Kraịst?—1 Kọr. 11:1; 2 Tesa. 3:7.

NWEE “UCHE NKE KRAỊST”

15, 16. (a) Ka anyị nwee ike ịdị ka Kraịst, gịnị ka anyị kwesịrị ime? (b) Olee ihe ga-enyere anyị aka inwe “uche nke Kraịst”?

15 Olee otú ị ga-esi eṅomi Kraịst? 1 Ndị Kọrịnt 2:16 kwuru na anyị kwesịrị inwe “uche nke Kraịst.” Ndị Rom 15:5 gwakwara anyị ka anyị nwee “ụdị echiche ahụ Kraịst Jizọs nwere.” N’ihi ya, ka anyị nwee ike iṅomi Kraịst, anyị kwesịrị ịmata otú o si eche echiche na otú o si akpa àgwà. Anyị kwesịkwara iso nzọụkwụ ya. Ihe bụ́ mkpa Jizọs bụ adịm ná mma ya na Jehova. N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-eme ka Jizọs, anyị na-emekwa ka Jehova. Ọ bụ ya mere anyị ji kwesị ịna-eche echiche ka Jizọs.

16 Olee otú anyị ga-esi eme ya? Ndị na-eso ụzọ Jizọs hụrụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ, nụ ihe ndị ọ kụziiri ndị mmadụ, hụ otú o si meso ndị dị iche iche ihe, nakwa otú o si mee ihe Chineke kwuru. Ha sịrị: ‘Anyị bụ ndị àmà nke ihe niile o mere.’ (Ọrụ 10:39) Taa, anyị enweghị ike ịhụ Jizọs. Ma, Jehova enyela anyị Akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, bụ́ ndị ga-enyere anyị aka ịmata Jizọs nke ọma. Ọ bụrụ na anyị na-agụ akwụkwọ ndị ahụ, anyị ga-amụta otú Jizọs si eche echiche. Ọ ga-eme ka anyị “sochie nzọụkwụ ya anya,” meekwa ka anyị jiri ‘otu uche ahụ kee onwe anyị dị ka ihe agha,’ otú Kraịst mere.—1 Pita 2:21; 4:1.

17. Olee otú iche echiche ka Kraịst ga-esi enyere anyị aka?

17 Olee otú ịmụta ịna-eche echiche ka Kraịst ga-esi nyere anyị aka? Otú ahụ ezigbo nri na-eme ka ahụ́ gbasie anyị ike, ka iche echiche ka Kraịst ga-emekwa ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ihe ọ bụla merenụ, ọ ga-ejizi nwayọọ nwayọọ na-adịrị anyị mfe ịmata ihe Jizọs gaara eme ma ọ bụrụ ya ka ihe ahụ mere. Ya emezie ka anyị na-eme mkpebi ndị dị Chineke mma, meekwa ka akọnuche anyị dị ọcha. Ọ̀ bụ na i cheghị na ihe ndị a kwesịrị ime ka anyị ‘yiri Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ka uwe’?—Rom 13:14.

18. Olee ihe ndị ị mụtarala gbasara mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe?

18 Anyị atụleela ihe mmadụ iji ofufe Chineke kpọrọ ihe pụtara. Anyị amụtakwala na anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’aka ndị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe. N’ikpeazụ, anyị amụtala otú inwe “uche nke Kraịst” ga-esi enyere anyị aka ịna-eche echiche ka Jehova, anyị na ya adịkwa n’ezigbo mma. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ anyị ga-atụle gbasara iji ofufe Chineke kpọrọ ihe. Dị ka ihe atụ, olee otú anyị ga-esi mara ma ànyị ji ofufe Chineke kpọrọ ihe n’eziokwu? Olee ihe anyị ga-eme ka anyị jiri ofufe Chineke kpọrọkwuo ihe? Olee otú iji ofufe Chineke kpọrọ ihe ga-esi enyere anyị aka n’ihe anyị na-eme kwa ụbọchị? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu na-eso nke a.