Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?

Olee Ebe I Lekwasịrị Anya?

“Gị ka m weliri anya m lekwasị, Gị onye bi n’eluigwe.”—ỌMA 123:1.

ABỤ: 143, 124

1, 2. Olee ihe mmadụ ilekwasị Jehova anya pụtara?

ANYỊ bi n’oge “dị oké egwu, nke tara akpụ.” Ihe ga na-esikwu ike tupu Jehova ebibie ụwa ochie a, ma mee ka udo dịrị n’ụwa a. (2 Tim. 3:1) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ònye ka m na-elekwasị anya ka o duzie m ma nyere m aka?’ Anyị nwere ike zaa ozugbo na ọ bụ “Jehova.” Ọ bụkwanụ ya bụ azịza kacha mma.

2 Olee ihe mmadụ ilekwasị Jehova anya pụtara? Oleekwa ihe anyị ga-eme iji hụ na anyị nọgidere na-elekwasị ya anya mgbe nsogbu bịaara anyị? Ọtụtụ narị afọ gara aga, otu ọbụ abụ kwuru na anyị kwesịrị ilekwasị Jehova anya ka o nyere anyị aka mgbe anyị nọ ná nsogbu. (Gụọ Abụ Ọma 123:1-4.) O ji otú anyị si elekwasị Jehova anya tụnyere otú ohu si elekwasị nna ya ukwu anya. Olee ihe ihe a ọbụ abụ ahụ kwuru pụtara? Ohu na-elekwasị nna ya ukwu anya ka o nye ya nri nakwa ka o chebe ya. Ọ na-elekwasịkwa ya anya ka ọ ghọta ihe ndị ọ chọrọ ka o meere ya, ma mee ha. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Anyị kwesịrị imeda obi na-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ka anyị mata ihe Jehova chọrọ ka anyị mee, ma mee ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka mgbe anyị chọrọ ka o nyere anyị aka.—Efe. 5:17.

3. Olee ihe ndị nwere ike ime ka anyị ghara ịna-elekwasị Jehova anya?

3 Ọ bụ eziokwu na anyị ma na anyị kwesịrị ịna-elekwasị Jehova anya, ma mgbe ụfọdụ, ihe nwere ike megharịa anyị anya. Ụdị ihe a mere ezigbo enyi Jizọs aha ya bụ Mata. Baịbụl kwuru na “ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme dọpụrụ uche ya.” (Luk 10:40-42) Ọ bụrụ na ụdị ihe a mere ezigbo ohu Chineke mgbe ya na Jizọs nọ, o kwesịghị iju anyị anya na ụdị ihe a nwekwara ike ime anyị. Oleezi ihe nwere ike ime ka anyị ghara ịna-elekwasị Jehova anya? N’isiokwu a, anyị ga-atụle otú àgwà ndị ọzọ na-akpa nwere ike isi mee ka anyị ghara ịna-elekwasị Jehova anya. Anyị ga-atụlekwa otú anyị ga-esi nọgide na-elekwasị Jehova anya.

IHE DỊ EZIGBO MKPA AKWAA OTU OHU CHINEKE

4. Gịnị mere o nwere ike iji ju anyị anya na Mozis abanyeghị n’Ala Nkwa ahụ?

4 O doro anya na Mozis lekwasịrị Jehova anya ka o duzie ya. N’eziokwu, “o guzosiri ike dị ka à ga-asị na ọ na-ahụ onye ahụ anya bụ́ Onye a na-apụghị ịhụ anya.” (Gụọ Ndị Hibru 11:24-27.) Baịbụl gwara anyị na “e nwetụbeghị onye amụma biliri n’Izrel nke dị ka Mozis, onye Jehova maara ihu na ihu.” (Diut. 34:10) N’agbanyeghị na Mozis na Jehova dị n’ezigbo mma, ọ banyeghị n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:12) Gịnị mere ọ banyeghị?

5-7. Olee nsogbu dapụtaranụ obere oge ndị Izrel hapụrụ Ijipt, oleekwa ihe Mozis mere?

5 N’ihe na-erughị ọnwa abụọ ndị Izrel si n’Ijipt pụta, e nwere nnukwu nsogbu dapụtaranụ tupudị ha erute n’Ugwu Saịnaị. Ha malitere ime mkpesa na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. Ha malitekwara ịtamu ntamu megide Mozis. Ihe bịara ka njọ nke na Mozis besaara Jehova ákwá, sị: “Gịnị ka m ga-eme ndị a? Obere oge ugbu a ha ga-atụ m nkume!” (Ọpụ. 17:4) Jehova gwara Mozis ihe doro anya ọ ga-eme. Ọ gwara ya ka o were mkpara ya kụọ na nkume dị na Horeb ka mmiri gbapụta. Baịbụl kwuru, sị: “Mozis wee mee otú ahụ n’ihu ndị okenye Izrel.” Ndị Izrel ṅụjuru mmiri afọ, ha akwụsị inye Mozis nsogbu.—Ọpụ. 17:5, 6.

6 Baịbụl gwara anyị na Mozis kpọrọ “ebe ahụ Masa nakwa Meriba, n’ihi esemokwu ụmụ Izrel sere nakwa n’ihi ule ha lere Jehova, na-asị: ‘Jehova ọ̀ nọ n’etiti anyị ka ọ̀ bụ na ọ nọghị?’” (Ọpụ. 17:7) Aha abụọ ndị ahụ dabara adaba n’ihi na ha pụtara “Ule” na “Esemokwu.”

7 Olee otú obi dị Jehova n’ihi ihe ahụ mere na Meriba? O lere ya anya na ọ bụ yanwa ka ndị Izrel nupụụrụ isi, ọ bụghị Mozis. (Gụọ Abụ Ọma 95:8, 9.) Ihe ndị Izrel mere jọgburu onwe ya. Ma Mozis mere ihe dị mma. O lekwasịrị Jehova anya ma mee ihe ọ gwara ya.

8. Olee nsogbu dapụtaranụ mgbe ọ fọrọ obere ka ndị Izrel gafechaa ala ịkpa banye n’Ala Nkwa ahụ?

8 Ma, gịnị mere mgbe ụdị ihe a mekwara mgbe ihe dị ka iri afọ anọ gachara? Ọ fọrọ obere ka ha gafechaa ala ịkpa banye n’Ala Nkwa ahụ. Ha rutekwara n’ebe e mechara kpọwa Meriba. Ma, Meriba nke a dị iche na nke mbụ. Ọ dị nso na Kedesh, bụ́ nke dị nso n’Ala Nkwa ahụ. * Ndị Izrel malitekwara ime mkpesa na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. (Ọnụ Ọgụ. 20:1-5) Ma na nke ugbu a, Mozis emeghị ihe dị mma.

9. Gịnị ka Jehova gwara Mozis ka o mee, gịnịkwa ka Mozis mere? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

9 Gịnị ka Mozis mere mgbe ndị Izrel malitekwara ịtamu ntamu? O lekwasịkwara Jehova anya ka ọ gwa ya ihe ọ ga-eme. Ma na nke ugbu a, Jehova agwaghị ya ka ọ kụọ mkpara ya na nkume. Ọ gwara ya ka o were mkpara ya, kpọkọta ndị Izrel n’ihu nkume ahụ ma gwa nkume ahụ okwu. (Ọnụ Ọgụ. 20:6-8) Ma, Mozis agwaghị nkume ahụ okwu. Kama, o ji iwe gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: “Nụrụnụ, unu ndị nnupụisi! Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?” O jizi mkpara ya kụọ nkume ahụ ugboro abụọ.—Ọnụ Ọgụ. 20:10, 11.

10. Olee ihe Jehova mere maka ihe Mozis mere?

10 Jehova wesara Mozis ezigbo iwe. (Diut. 1:37; 3:26) Olee ihe mere iwe ji wee Jehova? E nwere ọtụtụ ihe nwere ike ịkpata ya. Dị ka anyị kwuru ná mmalite, ọ ga-abụ na ihe mere Jehova ji wesa Mozis iwe bụ na o meghị ihe ọ gwara ya mee na nke ugbu a.

11. Olee ihe nwere ike ime ka mkpara Mozis kụrụ na nkume mee ka ndị Izrel chewe na ọ bụghị Jehova mere ka mmiri ahụ gbapụta?

11 E nwekwaara ihe ọzọ nwere ike ịkpata ya. Nnukwu nkume e nwere na Meriba nke mbụ siri ezigbo ike. Ihe ọ sọkwara mmadụ kụọ ya, o nweghị onye ga-atụ anya na mmiri ga-esi na ya gbapụta. Ma, nkume ndị e nwere na Meriba nke abụọ dị iche. Ọtụtụ n’ime ha yiri ụrọ. Ebe ọ bụ na ụdị nkume a esighị ike, mmiri na-eji nwayọọ nwayọọ banye n’ime ya ma dọrọ n’ala ala ya. Ebe ọ dị otú ahụ, mmadụ nwere ike igwu nkume ahụ ma nweta mmiri. N’ihi ya, mgbe Mozis kụrụ mkpara ya na nkume ahụ kama ịgwa ya okwu, ọ̀ ga-abụ na ndị Izrel chere na mmiri ahụ gbapụtara n’onwe ya, na ọ bụghị Jehova mere ka ọ gbapụta? * Anyị amaghị.

OTÚ MOZIS SI NUPỤ ISI

12. Olee ihe ọzọ nwere ike ịbụ ya mere Jehova ji wesa Mozis na Erọn iwe?

12 E nwekwara ike inwe ihe ọzọ mere Jehova ji wesa Mozis na Erọn iwe. Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Ọ̀ bụ na nkume a dị elu ka anyị ga-esi mee ka mmiri gbapụtara unu?” Mgbe Mozis kwuru “anyị,” o nwere ike ịbụ na ọ na-ekwu gbasara ya na Erọn. Ihe Mozis kwuru gosiri na ọ kwanyereghị Jehova ùgwù ọ bụla, bụ́ Onye mere ka mmiri ahụ gbapụta. Ọ ga-abụ ya mere Abụ Ọma 106:32, 33 ji kwuo, sị: “Ha kpasukwara ya iwe na mmiri Meriba, nke mere Mozis ji baa ná nsogbu n’ihi ha. N’ihi na ha mere ihe wutere ya na mmụọ, o wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche.” * (Ọnụ Ọgụ. 27:14) Mozis akwanyereghị Jehova ùgwù ruuru ya. Jehova gwara ya na Erọn, sị: “Unu nupụrụ isi n’iwu m.” (Ọnụ Ọgụ. 20:24) Ihe a ha mere jọgburu onwe ya.

13. Gịnị mere ihe ahụ Jehova mere Mozis ji kwesị ekwesị?

13 Jehova chọrọ ọtụtụ ihe n’aka Mozis na Erọn n’ihi na ọ bụ ha na-edu ndị Izrel. (Luk 12:48) N’oge gara aga, Jehova ekweghị ka ndị Izrel tamuru ntamu malite ná ndị gbara afọ iri abụọ gbagowe banye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụ. 14:26-30, 34) N’ihi ya, o kwesịrị ekwesị ka Jehova meekwa Mozis otu ihe ahụ o mere ndị Izrel n’ihi na o nupụụrụ ya isi. O kweghị ya banye n’Ala Nkwa ahụ otú ahụ ọ na-ekweghị ndị Izrel.

IHE KPATARA NSOGBU AHỤ

14, 15. Olee ihe mere Mozis ji nupụrụ Jehova isi?

14 Gịnị mere Mozis ji nupụrụ Jehova isi? Chetakwa ihe Abụ Ọma 106:32, 33 kwuru. Ọ sịrị: “Ha kpasukwara ya iwe na mmiri Meriba, nke mere Mozis ji baa ná nsogbu n’ihi ha. N’ihi na ha mere ihe wutere ya na mmụọ, o wee jiri egbugbere ọnụ ya kwuo okwu n’echeghị echiche.” Ọ bụ eziokwu na ndị Izrel kpasuru Jehova iwe, ma ọ bụ Mozis ka o wutere. Mozis ejideghị onwe ya, ọ bụ ya mere o ji kwuo okwu n’echeghị nsogbu ndị o nwere ike ịkpata.

15 Mozis kwere ka ihe ndị ọzọ mere mee ka ọ ghara ilekwasị Jehova anya. O mere ihe dị mma mgbe mbụ ndị Izrel tamuru ntamu maka na ha enweghị mmiri ha ga-aṅụ. (Ọpụ. 7:6) Ma, ọ ga-abụ na ike ụwa gwụrụ ya n’ihi na ndị Izrel nupụụrụ Jehova isi ruo ọtụtụ afọ. Ọ̀ ga-abụ na Mozis nọ na-eche otú obi dị ya, kama iche otú ọ ga-esi too Jehova?

16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara ihe Mozis mere echiche?

16 Ọ bụrụ na onye dị ka Mozis, bụ́ onye amụma Jehova, mere mmehie n’ihi na o lekwasịghị Jehova anya, ụdị ihe a nwekwara ike ime anyị. Ọ fọrọ obere ka anyị banye n’ụwa ọhụrụ Jehova kwere anyị ná nkwa, otú ahụ ọ fọrọ obere ka Mozis banye n’Ala Nkwa ahụ n’oge ya. (2 Pita 3:13) O nweghị onye n’ime anyị chọrọ ka ihe ọma a kwaa ya. Ka anyị nwee ike ịbanye n’ụwa ọhụrụ ahụ, anyị kwesịrị ịna-elekwasị Jehova anya, ma na-eme uche ya mgbe niile. (1 Jọn 2:17) Olee ihe anyị ga-amụta n’ihe Mozis mere?

EKWELA KA IHE NDỊ ỌZỌ NA-EME MEGHARỊA GỊ ANYA

17. Olee ihe ga-enyere anyị aka ijide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe?

17 Na-ejide onwe gị ma a kpasuo gị iwe. Ọ bụrụgodị na otu nsogbu na-abịara anyị ugboro ugboro, “ka anyị ghara ịda mbà n’ime ihe dị mma, n’ihi na mgbe oge ruru, anyị ga-aghọrọ mkpụrụ ya ma ọ bụrụ na ike agwụghị anyị.” (Gal. 6:9; 2 Tesa. 3:13) Ọ bụrụ na e nwere onye na-akpasu anyị iwe, ma ọ bụ na e nwere nsogbu anyị na ya na-alụ mgbe niile, ànyị na-ejide onwe anyị ma ghara ikwu okwu n’echeghị echiche? (Ilu 10:19; 17:27; Mat. 5:22) Ndị ọzọ kpasuo anyị iwe, ànyị na-amụta ‘inye ọnụma ahụ ohere’? Ọnụma ònye? Ọnụma Jehova. (Gụọ Ndị Rom 12:17-21.) Gịnị ka inye ọnụma Jehova ohere pụtara? Kama iwewe iwe, anyị ga-eji ndidi chere ka Jehova mee ihe gbasara nsogbu ahụ mgbe dị ya mma. Ọ bụrụ na anyị achọọ imegwara ihe e mere anyị, ọ pụtara na anyị anaghị akwanyere Jehova ùgwù.

18. Olee ihe anyị kwesịrị icheta ma a bịa n’ime ihe a gwara anyị mee?

18 Na-eme ihe ọhụrụ a gwara anyị mee. Ànyị na-ahụ na anyị na-eme ihe ọhụrụ Jehova gwara anyị mee? Ọ bụrụ na anyị ana-eme ya, anyị agaghị na-eme ihe otú anyị mere ya n’oge ndị gara aga. Kama, anyị ga-eme ihe ọhụrụ Jehova si n’aka nzukọ ya na-agwa anyị mee n’egbughị oge. (Hib. 13:17) Anyị ga-akpachakwara anya ka anyị ghara ‘ịgabiga ihe e dere ede.’ (1 Kọr. 4:6) Anyị mee otú ahụ, ọ pụtara na anyị na-elekwasị Jehova anya.

Olee ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe Mozis mere mgbe ndị ọzọ mejọrọ ihe? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19. Olee ihe anyị ga-eme ka ihe ndị ọzọ mejọrọ ghara imebi adịm ná mma anyị na Jehova?

19 Ekwela ka ihe ndị ọzọ mejọrọ mee ka gị na Jehova ghara ịna-adị ná mma. Ọ bụrụ na anyị ana-elekwasị Jehova anya, anyị agaghị ekwe ka ihe ndị ọzọ mejọrọ kpasuo anyị iwe ma ọ bụ mee ka anyị na Jehova ghara ịna-adị ná mma. Nke a dị ezigbo mkpa karịa ma ọ bụrụ na anyị nwere ọrụ anyị na-arụ ná nzukọ Jehova otú ahụ Mozis nwere. Nke bụ́ eziokwu bụ na onye ọ bụla n’ime anyị ga-arụsi ọrụ ike ma na-erubere Jehova isi ka a zọpụta ya. (Fil. 2:12) Ma, ka anyị na-enwekwu ọrụ na nzukọ Jehova, ka Jehova ga na-achọkwu ihe n’aka anyị. (Luk 12:48) Ma, ọ bụrụ na anyị hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu, e nweghị ihe ga-eme ka anyị sụọ ngọngọ ma ọ bụ kewapụ anyị n’ịhụnanya Chineke.—Ọma 119:165; Rom 8:37-39.

20. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?

20 N’oge a tara akpụ anyị bi na ya, ka anyị nọgide na-elekwasị Onye “bi n’eluigwe” anya ka anyị nwee ike ịmata ihe ọ chọrọ ka anyị na-eme. Ka anyị ghara ikwe ka ihe ndị ọzọ mejọrọ mee ka anyị na Jehova ghara ịna-adị ná mma. Ọ bụ ihe a ka ihe mere Mozis na-akụziri anyị. Kama iwewe iwe maka ihe ndị ọzọ mejọrọ, ka anyị kpebisie ike na ‘anya anyị ga-adị n’ebe Jehova Chineke anyị nọ ruo mgbe o meere anyị amara.’—Ọma 123:1, 2.

^ para. 8 Meriba nke a dị iche na Meriba nke dị nso na Refidim nke a na-akpọ Masa. Ma ihe e ji mara Meriba nke a bụ Kedesh. Ihe mere e ji kpọwa ha abụọ Meriba bụ n’ihi na ha tamuru ntamu n’ebe ndị ahụ.—Lee map dị n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl, isi nke 7, peeji nke 38.

^ para. 11 Otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na a bịa n’ihe ndị Juu kweere, ndị ahụ tamuru ntamu megide Mozis na-ekwu na ihe ahụ Mozis mere abụghị ọrụ ebube, n’ihi na Mozis ma na mmiri dị na nkume ahụ. N’ihi ya, ha chọrọ ka Mozis kụọ mkpara ya na nkume ọzọ ka a mara ma mmiri ọ̀ ga-agbapụtakwa. Ma, ihe a bụ ihe ha kweere.

^ para. 12 Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” nke gbara n’Ụlọ Nche October 15, 1987, nke Bekee.