Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị na-abụghị di na nwunye ehie otu ebe chi abọọ n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya, è nwere ike ikwu na ha mere mmehie a ga-eji hiwere ha kọmitii ikpe?

Ee, ọ bụrụ na e nweghị ezigbo ihe kpatara ya, ọ bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ gosiri na ha akwaala iko. N’ihi ya, e kwesịrị ihiwere ha kọmitii ikpe, ọ gwụkwala ma è nwere ezigbo ihe kpatara ha ji hie chi abọọ.—1 Kọr. 6:18.

Ndị okenye kwesịrị ịsa anya ná mmiri mgbe ha na-eleba ọnọdụ nke ọ bụla anya ka ha nwee ike ikpebi ma è kwesịrị ihiwe kọmitii ikpe. Dị ka ihe atụ, nwanna nwoke na nwanna nwaanyị ahụ hà na-akpa maka ọlụlụ? Ndị okenye hà enyebuola ha ndụmọdụ gbasara otú ha si eme ma ha nọkọta? Gịnị mere ha ji hie otu ebe chi abọọ? Hà kpara ya akpa? Ò nwere ihe ọzọ ha gaara eme, ka è nwere ihe merenụ nke ha na-amaghị ihe ha ga-eme eme, dị ka ihe gbata gbata nke mere na o nweghị ihe ọzọ ha ga-eme ma ọ bụghị ihi otu ebe chi abọọ? (Ekli. 9:11) Olee ebe ha hiri ụra? Ebe ọ bụ na ọnọdụ niile abụghị otu, e nwere ike inwe ihe ndị ọzọ dị mkpa ndị okenye ga-eleba anya kpebie ihe ha ga-eme.

Mgbe ndị okenye lebachara ihe niile anya, ha ga-ekpebi ma hà kwesịrị ihiwe kọmitii ikpe.