Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ejila Otú Mmadụ Di Ekpebi Otú Ị Ga-esi Ewere Ya

Ejila Otú Mmadụ Di Ekpebi Otú Ị Ga-esi Ewere Ya

“Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”—JỌN 7:24.

ABỤ: 142, 123

1. Gịnị ka Aịzaya buru n’amụma gbasara Jizọs? Gịnị mere amụma a ji agba anyị ume?

AMỤMA Aịzaya buru gbasara Onyenwe anyị Jizọs Kraịst na-eme ka obi sie anyị ike ma na-eme ka anyị nwee olileanya. Aịzaya kwuru banyere Jizọs, sị: “Ọ bụghị naanị ihe anya ya hụrụ ka ọ ga-eji na-ekpe ikpe, ọ gaghịkwa adọ aka ná ntị naanị dị ka ihe ntị ya nụrụ si dị.” O kwukwara na “ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume.” (Aịza. 11:3, 4) Gịnị mere ihe a Baịbụl kwuru ji agba anyị ume? Ọ bụ n’ihi na anyị bi n’ụwa ịkpọasị juru, nakwa nke ndị mmadụ na-elekwasị anya n’ihe ha hụrụ ekpebi otú ha si ewere ndị ọzọ. Anyị na-atụsi anya ike mgbe anyị ga-enwe Onyeikpe zuru okè, bụ́ onye na-agaghị eji otú anyị dị ekpebi otú ọ ga-esi emeso anyị ihe.

2. Olee ihe Jizọs nyere anyị iwu ka anyị na-eme? Olee ihe anyị ga-atụle n’isiokwu a?

2 Kwa ụbọchị, anyị na-ekwu gbasara ndị ọzọ. Ma ebe anyị na-ezughị okè otú Jizọs zuru, anyị nwere ike kwuo ihe na-adịghị mma banyere ha. Ọ na-adịrị anyị mfe iji ihe anya anyị hụrụ ekpebi ihe. Ma, mgbe Jizọs nọ n’ụwa, ọ gwara anyị, sị: “Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.” (Jọn 7:24) O doro anya na Jizọs chọrọ ka anyị na-eme ka ya. Ọ chọghị ka anyị jiri otú mmadụ dị ekpebi otú anyị ga-esi ewere onye ahụ. N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe atọ ndị mmadụ na-ejikarị ekpebi otú ha ga-esi ewere ndị ọzọ. Ha bụ, agbụrụ mmadụ si na ya, otú mmadụ si nwee ego, nakwa afọ ndụ mmadụ. Na nke ọ bụla, anyị ga-eleba anya n’otú anyị ga-esi eme ihe Jizọs kwuru.

EJILA AGBỤRỤ MMADỤ EKPEBI OTÚ I SI EWERE ONYE AHỤ

3, 4. (a) Gịnị mere Pita onyeozi ji gbanwee otú o si ele ndị Jentaịl anya? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.) (b) Olee ihe ọhụrụ Jehova mere ka Pita ghọta?

3 Chegodị otú obi dị Pita onyeozi mgbe a gwara ya ka ọ gaa Sesaria, n’ụlọ otu onye Jentaịl aha ya bụ Kọnịliọs. (Ọrụ 10:17-29) Pita kweere na ndị Jentaịl adịghị ọcha otú ahụ ndị Juu ndị ọzọ n’oge ya kweere. Ma, e nwere ihe ndị mere o ji gbanwee echiche ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịbeghị anya Pita hụrụ ọhụụ. (Ọrụ 10:9-16) Gịnị ka ọ hụrụ? Ọ hụrụ ka ihe dị ka ibé ákwà nke ụmụ anụmanụ na-adịghị ọcha juru na ya si n’eluigwe na-agbadata n’ebe ọ nọ. Otu olu gwaziri ya, sị: “Bilie, Pita, gbuo rie!” Pita jụwara isi. Mgbe ọ jụrụ, olu ahụ si n’eluigwe asị ya “kwụsị ịkpọ ihe Chineke mere ka ha dị ọcha ihe rụrụ arụ.” Mgbe Pita hụchara ọhụụ ahụ, ọ ghọtaghị ihe olu ahụ na-achọ ịgwa ya. Ozugbo ahụ, ndị ozi Kọnịliọs wụchara. Mgbe mmụọ nsọ mechara ka Pita mata ihe ọ ga-eme, o sooro ha gawa n’ụlọ Kọnịliọs.

4 Ọ bụrụ na Pita lere mmadụ anya n’ihu kpebie ihe ọ ga-eme, ọ garaghị aga n’ụlọ Kọnịliọs. Ndị Juu anaghị aba n’ụlọ ndị Jentaịl. Gịnịkwanụ mere Pita ji gaa n’ụlọ Kọnịliọs n’agbanyeghị na ọ kpọrọ ndị Jentaịl asị? Ọ bụ ọhụụ ahụ ọ hụrụ nakwa otú mmụọ nsọ si duzie ya mere o ji gbanwee echiche ya. Mgbe Pita gechara Kọnịliọs ntị, o kwuru, sị: “N’ezie, ana m aghọta na Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu ya ma na-eme ezi omume bụ onye ọ na-anabata nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Ihe ọhụrụ a Pita mụtara tọrọ ya ezigbo ụtọ. Ọ ga-agbasakwa Ndị Kraịst niile. Olee otú ihe a Baịbụl kwuru banyere ile mmadụ anya n’ihu ga-esi agbasa Ndị Kraịst niile?

5. (a) Gịnị ka Jehova chọrọ ka Ndị Kraịst niile ghọta? (b) N’agbanyeghị na anyị ma nke bụ́ eziokwu, olee ihe ka nwere ike ịdị anyị n’obi?

5 Jehova si n’ọnụ Pita mee ka Ndị Kraịst niile ghọta na ya anaghị ele mmadụ anya n’ihu. N’ebe Jehova nọ, agbụrụ mmadụ si, obodo na asụsụ ya enweghị ihe o mere. Onye ọ bụla na-atụ egwu Chineke ma na-eme ihe dị mma ka ọ na-anabata. (Gal. 3:26-28; Mkpu. 7:9, 10) O doro anya na ị ma na ọ bụ eziokwu. Ma, ọ bụrụkwanụ na i toro n’obodo ma ọ bụ n’ezinụlọ ndị mmadụ na-akpọ ibe ha asị? Ọ bụrụgodị na ị na-eche na ị naghị ele mmadụ anya n’ihu, ọ ga-abụkwa na o nwere ndị ị kpọrọ asị n’obi gị. N’agbanyeghị na Pita nyeere ndị ọzọ aka ịghọta na Jehova anaghị ele mmadụ anya n’ihu, o mechakwara mee ihe gosiri na ọ kpọrọ ndị mmadụ asị. (Gal. 2:11-14) Olee otú anyị ga-esi gee Jizọs ntị ma kwụsị iji ihe anya anyị na-ahụ ekpebi otú anyị ga-esi ewere mmadụ?

6. (a) Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkwụsị ịkpọ ndị ọzọ asị n’obi anyị? (b) Olee ihe ihe otu nwanna a na-akwanyere ùgwù dere gbasara nwanna ọzọ gosiri?

6 Anyị kwesịrị iji Okwu Chineke nyochaa onwe anyị nke ọma ka anyị nwee ike ịchọpụta ma ò nwere ndị anyị kpọrọ asị n’obi anyị. (Ọma 119:105) Anyị nwekwara ike jụọ ndị anyị tụkwasịrị obi ma hà chọpụtara na anyị kpọrọ ndị ọzọ asị, n’ihi na anyị enweghị ike ịchọpụta ya n’onwe anyị. (Gal. 2:11, 14) O nwere ike ịbụ na anyị na-akpọ mmadụ ibe anyị asị, ya abụrụ na anyị amaghị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna a na-akwanyere ùgwù degaara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi ma kọọrọ ha otú otu nwanna nwoke na nwunye ya nọ n’ozi oge niile si eme n’ozi ha. Nwanna a si n’agbụrụ ọtụtụ ndị na-ele anya ka ndị ime ọhịa. Nwanna ahụ a na-akwanyere ùgwù amaghị na ọ kpọrọ ndị agbụrụ nwanna nke ọzọ asị. N’ihe o dere, o kwuru ọtụtụ ihe ọma banyere nwanna ahụ. Ma, otú o si pịachie okwu ya bụ: “Ọ bụ eziokwu na o si ná [mba a], àgwà ya na otú o si ebi ndụ na-enyere ndị ọzọ aka ịghọta na mmadụ isi [n’agbụrụ a] apụtaghị na onye ahụ na-eru unyi ma ọ bụ na-akpa àgwà ka onye ime ọhịa, bụ́ ihe e ji mara ọtụtụ ndị si n’agbụrụ [a].” Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe a? N’agbanyeghị ọrụ anyị na-arụ ná nzukọ Jehova, anyị kwesịrị inyocha onwe anyị nke ọma, ma dị njikere ịnabata aka a na-enyere anyị ka anyị nwee ike ịchọpụta ma ànyị ka kpọrọ ndị ọzọ asị n’obi anyị. Olee ihe ọzọ anyị ga-eme?

7. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị na-emeghe obi anyị?

7 Ọ bụrụ na anyị emeghee obi anyị, anyị agaghị akpọ ndị ọzọ asị, kama anyị ga-ahụ ha n’anya. (2 Kọr. 6:11-13) Ndị gị na ha na-akpa, hà bụ naanị ndị si n’agbụrụ gị, obodo gị, ma ọ bụ ndị gị na ha na-asụ otu asụsụ? Ọ bụrụ otú ahụ, gbalịa ka gị na ndị ọzọ na-akpakwa. I nwere ike ịkpọ ụmụnna ndị si n’agbụrụ ọzọ ka gị na ha rụọ n’ozi ọma, ma ọ bụ ka ha bịa rie nri n’ụlọ gị. (Ọrụ 16:14, 15) I mee otú ahụ, ị ga-ahụ ha n’anya nke ukwuu, ị gaghịzi akpọ ha asị. Ma, e nwere ihe ndị ọzọ nwere ike ime ka anyị jiri otú mmadụ dị kpebie otú anyị ga-esi ewere ya. Ka anyị tụlee gbasara akụnụba.

EJILA OTÚ MMADỤ SI BAA ỌGARANYA MA Ọ BỤ DAA OGBENYE EKPEBI OTÚ I SI EWERE ONYE AHỤ

8. Olee ihe Levitikọs 19:15 kwuru banyere otú anyị kwesịrị isi ele ọgaranya ma ọ bụ ogbenye anya?

8 Otú mmadụ si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye bụ ihe ọzọ nwere ike ikpebi otú anyị si ele onye ahụ anya. Levitikọs 19:15 kwuru, sị: “Unu elela onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya anya n’ihu mgbe unu na-emeso ya ihe, unu enwela mmasị karị n’ebe onye ukwu nọ. Unu ga-ekpe mmadụ ibe unu ikpe ziri ezi.” Ma, olee otú mmadụ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịda ogbenye nwere ike isi mee ka anyị kpebie otú anyị si were onye ahụ?

9. Gịnị ka Sọlọmọn kwuru, gịnịkwa ka ihe ahụ o kwuru na-akụziri anyị?

9 Mmụọ nsọ mere ka Sọlọmọn kwuo, sị: “Onye dara ogbenye ka mmadụ ibe ya na-akpọ asị, ma ndị enyi ọgaranya na-adị ọtụtụ.” (Ilu 14:20) Olee ihe ilu a na-akụziri anyị? Ọ na-akụziri anyị na ọ bụrụ na anyị akpachaghị anya, anyị nwere ike chọọ imete ụmụnna ndị bụ́ aka ji akụ̀ enyi ma hapụ ndị dara ogbenye. Gịnị mere o ji dị njọ iji otú mmadụ si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye ekpebi otú anyị ga-esi were ya?

10. Olee nsogbu Jems dọrọ Ndị Kraịst aka ná ntị gbasara ya?

10 Ọ bụrụ na anyị ejiri otú mmadụ si baa ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye emeso ya ihe, ọ ga-eme ka nkewa dịrị n’ọgbakọ. Ụdị ihe a mere n’ụfọdụ ọgbakọ n’oge ndịozi. Jems dọkwara Ndị Kraịst aka ná ntị gbasara ya. (Gụọ Jems 2:1-4) Anyị kwesịrị ịkpachara anya ka ụdị ihe a ghara ime n’ọgbakọ anyị taa. Olee ihe anyị ga-eme ka anyị ghara iji ihe mmadụ nwere ekpebi otú anyị ga-esi ewere ya?

11. Ihe mmadụ nwere ọ̀ ga-eme ka ya na Jehova dịrị ná mma? Kọwaa.

11 Anyị kwesịrị iwere ụmụnna anyị otú Jehova si were ha. Jehova anaghị ahụ mmadụ n’anya n’ihi na onye ahụ bara ọgaranya ma ọ bụ daa ogbenye. Otú anyị baruru ọgaranya ma ọ bụ otú anyị daruru ogbenye abụghị ya ga-eme ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Ọ bụ eziokwu na Jizọs kwuru na “ọ ga-abụ ihe siri ike onye bara ọgaranya ịba n’alaeze eluigwe,” ma o kwughị na ọ gaghị ekwe omume. (Mat. 19:23) Jizọs kwukwara, sị: “Obi ụtọ na-adịrị unu ndị ogbenye, n’ihi na alaeze Chineke bụ nke unu.” (Luk 6:20) Ma nke a apụtaghị na ndị niile dara ogbenye gere Jizọs ntị, a gọzie ha. Ọtụtụ n’ime ha esoghị Jizọs. Ma nke bụ́ eziokwu bụ na anyị ekwesịghị ikwu na mmadụ na Jehova dị ná mma n’ihi ihe ndị o nwere.

12. Gịnị ka Baịbụl gwara ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye?

12 Ná nzukọ Jehova, e nwere ụmụnna ndị bara ọgaranya na ndị dara ogbenye. Ha niile hụrụ Jehova n’anya ma jiri obi ha niile na-efe ya. Baịbụl gwara ndị bara ọgaranya “ka ha nweekwa olileanya, ọ bụghị n’akụnụba ndị a na-ejighị n’aka, kama n’ebe Chineke nọ.” (Gụọ 1 Timoti 6:17-19.) Baịbụl gwakwara ndị Chineke niile, ma ndị ọgaranya ma ndị ogbenye ka ha ghara ịhụ ego n’anya. (1 Tim. 6:9, 10) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-ele ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha anya, anyị agaghị eji ihe ha nwere ekpebi otú anyị ga-esi were ha. Gịnịkwanụ gbasara afọ ndụ mmadụ? Ọ̀ bụ ihe anyị kwesịrị iji ekpebi otú anyị ga-esi ewere mmadụ? Ka anyị chọpụta.

EJILA AFỌ NDỤ MMADỤ EKPEBI OTÚ I SI EWERE ONYE AHỤ

13. Olee ihe Baịbụl na-akụziri anyị gbasara ịsọpụrụ ndị agadi?

13 Baịbụl na-agwa anyị ka anyị na-asọpụrụ ndị agadi. Levitikọs 19:32 kwuru, sị: “Ị ga-ebiliri onye isi awọ́, sọpụkwara onye mere agadi, tụọkwa egwu Chineke gị.” Ilu 16:31 gwakwara anyị na “isi awọ́ bụ okpueze mara mma mgbe e nwere ya n’ụzọ ezi omume.” Pọl gwakwara Timoti ka ọ ghara ịbara okenye mba, kama ka ọ na-emeso ya ihe ka nna ya. (1 Tim. 5:1, 2) N’agbanyeghị na e nyere Timoti ikike ịgwa ụmụnna ndị merela agadi ihe ndị ha ga na-eme, o kwesịrị ịna-enwere ha ọmịiko ma na-asọpụrụ ha.

14. Olee mgbe anyị kwesịrị ịgbazi onye tọrọ anyị?

14 Ọ bụrụkwanụ na onye tọrọ anyị akpachara anya mee mmehie ma ọ bụ na-eme ka ndị ọzọ na-eme ihe na-adịghị Jehova mma? Jehova anaghị eji afọ ndụ mmadụ ekpebi otú o si ewere onye ahụ. Ọ gaghịkwa eleghara onye mere mmehie anya n’ihi na ọ bụ agadi. Buru ihe a Aịzaya 65:20 kwuru n’obi. Ọ sịrị: “A ga-akọcha onye mmehie, ọ bụ ezie na ọ gbaala otu narị afọ.” N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, e gosikwara ụdị ihe a. (Ezik. 9:5-7) Ma, ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị bụ ịna-asọpụrụ Onye Ochie ahụ, bụ́ Jehova Chineke. (Dan. 7:9, 10, 13, 14) Ọ bụrụ na anyị mee otú ahụ, ụjọ agaghị atụ anyị ịgbazi onye mere mmehie n’agbanyeghị afọ ndụ ya.—Gal. 6:1.

Ị̀ na-akwanyere ụmụnna ndị ị tọrọ ùgwù? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15)

15. Olee ihe anyị mụtara n’aka Pọl onyeozi gbasara ịsọpụrụ ụmụnna ndị anyị tọrọ?

15 Gịnịkwanụ banyere ụmụnna ndị anyị tọrọ? Olee otú i si ele ha anya? Pọl onyeozi gwara Timoti, sị: “Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya n’ihi na ị bụ okorobịa. Kama nke ahụ, bụụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ihe nlereanya, n’ikwu okwu, n’omume, n’ịhụnanya, n’okwukwe, n’ịdị ọcha.” (1 Tim. 4:12) Mgbe Pọl degaara Timoti akwụkwọ a, o nwere ike ịbụ na Timoti dị ihe dị ka afọ iri atọ. Ma, Pọl nyere ya ọrụ ndị dị mkpa ọ ga na-arụ. N’agbanyeghị ihe mere o ji nye ya ndụmọdụ a, ihe o kwuru doro anya. Anyị ekwesịghị iji afọ ndụ nwanna ekpebi otú anyị ga-esi ewere ya. Anyị kwesịrị icheta na Onyenwe anyị Jizọs jechara ozi niile o jere n’ụwa mgbe ọ dị afọ iri atọ na atọ.

16, 17. (a) Olee otú ndị okenye si achọpụta ma nwanna ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi? (b) Olee otú ihe anyị chere nakwa omenala anyị nwere ike isi mee ka anyị ghara ime ihe Baịbụl kwuru?

16 O nwere ike ịbụ na anyị si n’obodo a na-eledakarị ndị na-eto eto anya. Ọ bụrụ otú ahụ, o nwere ike isiri ndị okenye ike ịtụ aro ka a họpụta nwa okorobịa na-eme nke ọma n’ọgbakọ ka ọ bụrụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. Ndị okenye niile kwesịrị icheta na Baịbụl ekwughị afọ ole nwanna ga-eru tupu a tụọ aro ka a họpụta ya ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. (1 Tim. 3:1-10, 12, 13; Taị. 1:5-9) Ọ bụrụ na okenye agbakwasị ụkwụ n’omenala ha kwuo na nwanna erubeghị ka a họpụta ya, ọ naghị eme ihe Baịbụl kwuru. E kwesịrị iji ihe Baịbụl kwuru tụlee ma nwa okorobịa nọ n’ọgbakọ ò ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, ọ bụghị ihe mmadụ chere ma ọ bụ omenala obodo.—2 Tim. 3:16, 17.

17 Ọ bụrụ na ndị okenye ahapụ ihe Baịbụl kwuru a ga-eji ahọpụta mmadụ ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, o nwere ike ime ka a ghara ịhọpụta ụmụnna ruru eru ịbụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi. N’otu mba, e nyere otu ohu na-eje ozi ruru eru ọrụ ndị dị mkpa n’ọgbakọ. Ọ bụ eziokwu na ndị okenye ọgbakọ ahụ kwuru na o ruru ihe Baịbụl kwuru a ga-eji ahọpụta okenye, ha atụghị aro ka a họpụta ya. Ụfọdụ ndị okenye kwuru na ọ dị obere ịbụ okenye. Ọ dị mwute na a họpụtaghị nwanna ahụ naanị n’ihi na ọ dị obere. O yiri ka ọtụtụ ndị okenye na-eche otú ahụ n’ọtụtụ ebe n’ụwa. Ọ dị ezigbo mkpa ka anyị jiri Baịbụl na-ekpebi ihe anyị na-eme, kama iji ihe anyị chere ma ọ bụ omenala anyị. Ime otú ahụ bụ ụzọ anyị ga-esi erubere Jizọs isi ma kwụsị iji otú mmadụ dị ekpebi otú anyị si ewere ya.

NA-EKPE IKPE ZIRI EZI

18, 19. Olee ihe ga-enyere anyị aka ile ụmụnna anyị anya otú Jehova si ele ha?

18 N’agbanyeghị na anyị ezughị okè, anyị nwere ike ịmụta ile ndị ọzọ anya otú Jehova si ele ha anya. (Ọrụ 10:34, 35) Ma, anyị kwesịrị ịna-agbasi mbọ ike na-eme ihe Okwu Chineke na-agwa anyị. Anyị na-eme ihe ndị ahụ, anyị ga na-eme ihe Jizọs kwuru, ya bụ, ka anyị kwụsị iji otú mmadụ dị ekpebi otú anyị ga-esi ele ya anya.—Jọn 7:24.

19 N’oge na-adịghị anya, Eze anyị, bụ́ Jizọs Kraịst ga-ekpe ikpe ziri ezi. Ọ gaghị eji ihe anya ya hụrụ ma ọ bụ ihe ntị ya nụrụ na-ekpe ikpe, kama ọ ga-ekpe ikpe ezi omume. (Aịza. 11:3, 4) Anyị na-atụsi anya oge ahụ ike.