Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndidi Na-eme Ka Anyị Na-enwe Olileanya

Ndidi Na-eme Ka Anyị Na-enwe Olileanya

N’IHI otú ihe si esi ezigbo ike “n’oge ikpeazụ” a, ndị ohu Jehova kwesịrị inwe ndidi karịa otú ha nwere na mbụ. (2 Tim. 3:1-5) Ọtụtụ ndị bi n’ụwa taa bụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, na ndị na-adịghị ejide onwe ha. Ndị na-akpa àgwà ndị a anaghị enwe ndidi. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị, sị: ‘Ndidi ndị mmadụ na-anaghị enwe, ò meela ka m ghara ịna-enwe ndidi? Gịnị ka inwe ezigbo ndidi pụtara? Olee ihe m ga-eme ka e jiri àgwà a mara m?’

IHE NDIDI PỤTARA

Na Baịbụl, ihe ndidi pụtara abụghị naanị mmadụ idi nsogbu siri ike bịaara ya. Onye na-enwe ndidi na-enwe olileanya na ihe ga-aka mma. Ọ naghị eche naanị gbasara onwe ya, ọ na-echekwa gbasara ndị ọzọ ma ndị kpasuru ya iwe ma ọ bụ mee ya ihe ọjọọ. N’ihi ya, e mee ya ihe ọjọọ ma ọ bụ kpasuo ya iwe, ọ na-enwe olileanya na ya na onye ahụ ga-emecha dịrị ná mma. Ọ bụ ya mere “ogologo ntachi obi” * ji bụrụ nke mbụ n’ime àgwà ndị Baịbụl kwuru ịhụnanya nwere. * (1 Kọr. 13:4) Baịbụl kwukwara na ‘ndidi’ so ná “mkpụrụ nke mmụọ nsọ.” (Gal. 5:22, 23) N’ihi ya, olee ihe anyị ga-eme ka anyị na-enwe ezigbo ndidi?

OTÚ ANYỊ GA-ESI NA-ENWE NDIDI

Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-enwe ndidi, anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o nye anyị mmụọ ya, bụ́ nke ọ na-enye ndị tụkwasịrị ya obi. (Luk 11:13) Ọ bụ eziokwu na mmụọ Jehova na-akpa ike, anyị kwesịrị ime ihe anyị na-ekpe n’ekpere. (Ọma 86:10, 11) Nke a pụtara na anyị ga na-agbalịsi ike na-enwe ndidi ka o nwee ike ịgbasi mgbọrọgwụ ike n’obi anyị. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike inwe ndidi. Gịnị ga-enyere anyị aka?

Ihe ga-enyere anyị aka ịna-enwe ndidi bụ ịtụle otú Jizọs si nwee ndidi na iṅomi ya. Mgbe Pọl onyeozi na-ekwu gbasara “mmadụ ọhụrụ ahụ,” nke ‘ndidi’ so na ya, ọ gwara anyị, sị: “Kwenụ ka udo nke Kraịst na-achịkwa obi unu.” (Kọl. 3:10, 12, 15) Otú anyị ga-esi mee ka udo nke Kraịst “na-achịkwa” obi anyị bụ iṅomi okwukwe Jizọs nwere na Chineke ga-eme ka ihe dị mma n’oge dị ya mma. Ọ bụrụ na anyị eṅomie Jizọs, anyị ga na-enwe ndidi n’agbanyeghị ihe ọ bụla e mere anyị.—Jọn 14:27; 16:33.

Anyị niile chọrọ ka ụwa ọhụrụ Chineke bịa ngwa ngwa. Ma anyị ga-amụtakwu ịna-enwe ndidi ma anyị chee gbasara otú Chineke si na-enwere anyị ndidi. Baịbụl mesiri anyị obi ike, sị: “Jehova adịghị egbu oge n’imezu nkwa ya, dị ka ụfọdụ ndị si ewere igbu oge, kama ọ na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.” (2 Pita 3:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara otú Chineke si na-enwere anyị ndidi, anyị ga na-enwekwuru ndị ọzọ ndidi. (Rom 2:4) Oleezi mgbe anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi?

MGBE ANYỊ KWESỊRỊ ỊNA-ENWE NDIDI

E nwere ihe ndị anyị na-eme kwa ụbọchị anyị kwesịrị ịna-enwe ndidi na ha. Dị ka ihe atụ, e nwee ihe dị mkpa anyị chọrọ ikwu mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu, anyị kwesịrị inwe ndidi ka anyị ghara ịnara ha okwu n’ọnụ. (Jems 1:19) Anyị kwesịkwara inwe ndidi mgbe anyị na ụmụnna ndị na-eme ihe na-ewe anyị iwe na-emekọ ihe. Kama iwewe iwe, anyị kwesịrị ịtụle otú Jehova na Jizọs si emeso anyị ihe ma anyị mejọọ ihe. Ha anaghị elekwasị anya n’obere ihe ndị anyị na-anaghị emeta. Kama, ha na-ahụ ebe anyị na-eme nke ọma ma nye anyị oge anyị ga-eji emezi ihe ndị ahụ.—1 Tim. 1:16; 1 Pita 3:12.

Ihe ọzọ nwere ike ime ka o siere anyị ike inwe ndidi bụ mgbe mmadụ gwara anyị na anyị kwuru ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma. Ihe mbụ anyị nwere ike ime ma ụdị ihe a mee bụ iwewe iwe ma ọ bụ ịgọrọwa isi anyị. Ma, Okwu Chineke gwara anyị ihe dị iche anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Onye nwere ndidi ka onye mmụọ ya dị mpako mma. Adịla ngwa ná mmụọ gị ịbụ onye a kpasuru iwe, n’ihi na iwe iwe bụ ihe na-adịgide n’obi ndị nzuzu.” (Ekli. 7:8, 9) Ọ bụrụgodị na ihe e kwuru gbasara anyị abụghị eziokwu, anyị kwesịrị iche echiche tupu anyị emee ihe. Jizọs mekwara ụdị ihe a mgbe ndị mmadụ boro ya ebubo.—Mat. 11:19.

Ndị nne na nna kwesịkwara inwe ndidi mgbe ha chọrọ inyere ụmụ ha aka ịkwụsị àgwà ọjọọ ma ọ bụ ihe ọjọọ na-agụ ha. Chegodị gbasara Mattias onye na-eje ozi na Betel dị na Yurop. Mgbe ọ ka na-eto eto, o diri mkparị ụmụ akwụkwọ ibe ya na-akparị ya n’ihi ihe ndị o kweere. Mgbe ihe a malitere, ndị mụrụ ya amaghị. Ma, ha chọpụtara na nwa ha na-enwe obi abụọ n’ihe ndị o kweere. Nna Mattias aha ya bụ́ Gillis kwuru, sị: “Anyị kwesịrị inwere ya ezigbo ndidi.” Mattias na-ajụkarị ha, sị: “Ònye bụ Chineke? Ọ bụrụkwanụ na Baịbụl abụghị Okwu Chineke? Olee otú anyị si mara na ọ bụ Chineke chọrọ ka anyị mee nke a ma ọ bụ nke ọzọ?” Ọ na-ajụkwa nna ya, sị: “Gịnị mere a ga-eji na-enye m nsogbu ma ọ bụrụ na ihe m kweere abụghị ihe unu kweere?”

Gillis kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, ọ na-eji iwe ajụ anyị ajụjụ, ma ọ bụghị mụ na mama ya ka ọ na-ewesara iwe. Ihe na-ewe ya iwe bụ na o chere na ihe ndị o kweere anaghị ekwe ya megharịa ahụ́.” Gịnị ka Gillis mere gbasara ihe a? O kwuru, sị: “Mụ na ya na-anọ ọdụ kparịta ụka ruo ọtụtụ awa. M na-egekarị ya ntị ma jụọ ya ajụjụ mgbe ụfọdụ ka m nwee ike ịghọta otú obi dị ya na ihe ndị o chere. Mgbe ụfọdụ, m na-akọwara ya ihe ụfọdụ ma gwa ya ka o jiri otu ụbọchị ma ọ bụ karịa chebara ha echiche tupu anyị ekwurịta ha ọzọ. Mgbe ụfọdụkwa, m na-agwa ya ka m jiri abalị ole na ole chebara ihe o kwuru echiche. Otú a mụ na ya si akparịta mgbe niile mere ka Mattias jiri nwayọọ nwayọọ ghọtawa ma kwere n’ozizi ndị dị ka ihe mgbapụta, ọchịchị Chineke, na ịhụnanya Jehova. Ọ dịrịghị anyị mfe ime ka ọ ghọta ihe ndị a niile, o wekwara oge. Ma, nwayọọ nwayọọ ọ malitere ịhụ Jehova n’anya. Obi dị mụ na nwunye m ezigbo ụtọ na mbọ anyị gbara inyere nwa anyị aka n’oge niile ahụ ọ na-eto eto baara ya ezigbo uru ma mee ka eziokwu ruo ya n’obi.”

Gillis na nwunye ya tụkwasịrị Jehova obi ma jiri ndidi nyere nwa ha aka. O chetara ihe mere n’oge gara aga ma kwuo, sị: “M na-agwakarị Mattias na otú mụ na mama ya si hụ ya n’anya mere ka anyị kpesikwuo ekpere ike ka Jehova nyere ya aka ịghọta eziokwu Baịbụl.” Obi dị ha ụtọ na ha nweere nwa ha ndidi.

Anyị kwesịkwara inwe ndidi mgbe anyị na-elekọta enyi anyị ma ọ bụ onye ezinụlọ anyị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ngwa ngwa. Ka anyị tụlee gbasara Ellen * onye bikwa na Yurop.

Ihe dị ka afọ asatọ gara aga, di Ellen dara strok ugboro abụọ nke mere ka ụbụrụ ya ghara ịna-arụ ọrụ nke ọma. Nke a mere na ọ maghịzi ihe bụ́ imetere mmadụ ebere, inwe obi ụtọ, ma ọ bụ ihe iwute mmadụ. Ihe a siiri Ellen ezigbo ike. O kwuru, sị: “M kpesiri ekpere ike ma nwee ezigbo ndidi.” O kwukwara, sị: “Amaokwu Baịbụl kacha akasi m obi bụ Ndị Filipaị 4:13. Ebe ahụ sịrị: ‘N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.’” Jehova nyere Ellen ike o ji die nsogbu ahụ.—Ọma 62:5, 6.

NA-ENWE NDIDI KA JEHOVA

Jehova bụ onye kacha enwe ndidi anyị kwesịrị iṅomi. (2 Pita 3:15) E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru gbasara otú Jehova si nwee ezigbo ndidi. (Nehe. 9:30; Aịza. 30:18) Dị ka ihe atụ, gịnị ka Jehova mere mgbe Ebreham jụrụ ya ihe mere o ji kpebie ibibi Sọdọm? Jehova anapụghị ya okwu n’ọnụ. Kama, o nweere ya ndidi ma gee ya ntị n’ajụjụ ọ bụla ọ jụrụ ya nakwa mgbe ọ na-ekwu ihe na-echegbu ya. Jehova kwughachikwara ihe Ebreham kwuru iji gosi na ọ na-ege ya ntị. O mekwara ka obi sie ya ike na ya agaghị ebibi Sọdọm ọ bụrụgodị na ọ hụ ndị ezi omume iri na ya. (Jen. 18:22-33) Jehova na-enwe ndidi ma na-ege ntị mgbe niile. Ahụ́ anaghịkwa agbakasị ya.

Ndidi bụ àgwà dị ezigbo mkpa so ná mmadụ ọhụrụ ahụ nke Onye Kraịst ọ bụla kwesịrị iyiri. Ọ bụrụ na anyị agbasie mbọ ike na-enwe ezigbo ndidi, anyị na-eto Nna anyị Jehova, bụ́ onye hụrụ anyị n’anya ma na-enwere anyị ndidi. Anyị ga-esokwa ná “ndị ahụ sitere n’okwukwe na ndidi na-eketa nkwa ndị e kwere.”—Hib. 6:10-12.

^ para. 4 N’isiokwu a, anyị ga-eji ndidi dochie anya ogologo ntachi obi.

^ para. 4 Ịhụnanya bụ àgwà nke mbụ a tụlere n’ime isiokwu itoolu a na-atụle àgwà ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ.

^ para. 15 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.