Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

‘Unu Maara Ihe Ndị A, Unu Ga-enwe Obi Ụtọ ma Unu Na-eme Ha’

‘Unu Maara Ihe Ndị A, Unu Ga-enwe Obi Ụtọ ma Unu Na-eme Ha’

“Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.”​—⁠JỌN 4:34.

ABỤ: 80, 35

1. Olee otú mmadụ ịchọ ihe ga-abara naanị onwe ya uru e ji mara ụwa nwere ike isi kpaa anyị aka?

GỊNỊ mere o ji esiri anyị ike ime ihe ndị anyị mụtara n’Okwu Chineke? Otu n’ime ihe kpatara ya bụ na ka anyị nwee ike ime ihe ziri ezi, anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi. “N’oge ikpeazụ” a, o siri ike mmadụ ịnọgide na-adị umeala n’obi n’ihi na ọtụtụ ndị bụ “ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako,” nakwa “ndị na-adịghị ejide onwe ha.” (2 Tim. 3:​1-3) Mgbe ohu Chineke nụrụ ihe ọjọọ ndị mmadụ mere ma ọ bụ otú ha si na-ekpori ndụ, o nwere ike ịkatọ ihe ọjọọ ahụ, ma na-enwere ha anyaụfụ n’ihi otú ihe si na-agara ha. (Ọma 37:1; 73:⁠3) Mmadụ nwedịrị ike ịna-ajụ, sị: ‘Ò nwere uru ọ ga-abara m ma m na-achọ ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru? Ọ bụrụ na m na-eme onwe m “dị ka onye ka nta,” ọ̀ ga-eme ka ndị ọzọ ghara ịna-akwanyere m ùgwù?’ (Luk 9:48) Ọ bụrụ na anyị ana-achọ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru otú ụwa si eme, ọ ga-eme ka ọgbakọ ghara ịdị n’otu, meekwa ka o siere ndị mmadụ ike ịmata na anyị bụ Ndị Kraịst. Anyị mụọ banyere ihe ndị ohu Chineke dị umeala n’obi mere ma na-eme ka ha, Jehova ga-agọzi anyị.

2. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka ndị fere Chineke n’oge ochie?

2 Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịna-eṅomi ndị ohu Chineke n’oge ochie, anyị kwesịrị ịchọpụta ihe ha mere nke mere ha ji bụrụ ndị enyi Chineke. Olee otú ha si bụrụ ndị enyi Chineke? Olee otú o si gọzie ha? Olee otú ha si nweta ike ha ji mee uche ya? Ụdị ọmụmụ ihe a bụ otu ụzọ dị mkpa anyị si eme ka okwukwe anyị sie ike.

IHE NDỊ NA-EME KA OKWUKWE ANYỊ NA-ESI IKE

3, 4. (a) Olee otú Jehova si akụziri anyị ihe? (b) Gịnị mere na ọ bụghị naanị ịmụta banyere Chineke ga-eme ka okwukwe anyị sie ike?

3 Jehova na-enye anyị ihe ndị dị anyị mkpa iji mee ka okwukwe anyị sikwuo ike. Ọ na-eji Baịbụl, akwụkwọ anyị, ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet, Ihe Omume Tiivi Ndịàma Jehova, ọmụmụ ihe na mgbakọ anyị, na-enye anyị ndụmọdụ ma na-akụziri anyị ihe. Ma, ihe Jizọs kwuru na Jọn 4:34 gosiri na ịmụta banyere Chineke abụghị naanị ebe okwu biri. Olee ihe ọzọ anyị ga-eme? Jizọs kwuru, sị: “Ihe oriri m bụ ka m mee uche onye zitere m, ka m rụchaa ọrụ ya.”

4 Jizọs weere ime uche Chineke ka nri. Otú ahụ iri ezigbo nri si eme ka obi na-atọ anyị ụtọ, na-emekwa ka ahụ́ na-agbasi anyị ike, ka ime uche Chineke si eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike. Dị ka ihe atụ, è nwetụla mgbe ike gwụrụ gị, gị eburu ya gaa nzukọ ozi ubi, ma mgbe i jechara ozi ọma lọta, obi ana-atọ gị ụtọ, ike adịkwa gị?

5. Olee uru anyị ga-erite ma anyị na-akpa àgwà ka ndị nwere amamihe?

5 Ime ihe ndị anyị na-amụta n’Okwu Chineke na-egosi na anyị nwere amamihe. (Ọma 107:43) Inwe amamihe ga-abara anyị ezigbo uru. Baịbụl kwuru, sị: “Ọ dịghịkwa ihe ọ bụla ọzọ na-atọ gị ụtọ nke pụrụ ịha ka ya. . . . Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ, ndị na-ejidesikwa ya aka ike ka a ga-akpọ ndị obi ụtọ.” (Ilu 3:​13-18) Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na unu maara ihe ndị a, unu ga-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na unu ana-eme ha.” (Jọn 13:17) Ndị na-eso ụzọ Jizọs ga-anọgide na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na ha ana-eme ihe ọ gwara ha. Ime ihe Jizọs kụziiri ha na ihe ndị o mere abụghị naanị ihe ha ga-eme otu ugboro. Ha ga na-eme ha mgbe niile.

6. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-eme ihe ndị anyị mụtara?

6 Anyị kwesịrị inwe ndidi ma anyị na-eme ihe ndị anyị kwesịrị ime. Dị ka ihe atụ, onye na-arụzi ụgbọala nwere ike inwe ngwá ọrụ, marakwa ọrụ nke ọma. Ma, ihe ndị a agaghị abara ya uru ma ọ bụrụ na o jighị ha arụ ọrụ. Ọ bụrụgodị na ọ rụọla ọrụ a n’oge ndị gara aga, marakwa nke a na-akọ na ya, ọ ga-anọgide na-arụ ya ka o nwee ike ịma nke a na-akọ na ya. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyị. Mgbe mbụ anyị mụtara banyere Chineke, anyị nwere ike inwe obi ụtọ n’ihi na anyị na-eme ihe anyị mụtara na Baịbụl. Ma, ka anyị nwee ike ịnọgide na-enwe obi ụtọ, anyị kwesịrị ịna-eme ihe Jehova na-akụziri anyị kwa ụbọchị.

7. Olee ihe anyị ga-eme ma anyị gụọ banyere ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, nke ga-eme ka anyị nwee amamihe?

7 N’isiokwu a, anyị ga-atụle ihe ụfọdụ nwere ike ime ka o siere anyị ike ịdị umeala n’obi. Anyị ga-atụlekwa otú ndị fere Chineke n’oge gara aga si dịrị umeala n’obi mgbe ha nọ n’ụdị ọnọdụ ndị ahụ. Ma ihe anyị ga-eme abụghị naanị ịgụ ihe ndị ahụ. Anyị ga na-echebara ha echiche ma na-eme ha eme.

NA-EWERE NDỊ ỌZỌ KA NDỊ HÀ OTU

8, 9. Olee otú ihe a kọrọ n’Ọrụ Ndịozi 14:​8-15 si gosi na Pọl onyeozi dị umeala n’obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

8 Uche Chineke bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:⁠4) Olee otú i si ewere ụdị mmadụ dị iche iche na-amụtabeghị eziokwu Baịbụl? Ọ bụ eziokwu na Pọl onyeozi gara n’ụlọ nzukọ dị iche iche ikwusara ndị ma ihe ụfọdụ gbasara Chineke ozi ọma, ma ọ bụghị naanị ndị Juu ka ọ gbalịrị ikwusara ozi ọma. Ihe ndị ahụ na-efe chi ụgha dị iche iche ga-eme ma Pọl kwusaara ha ozi ọma ga-egosi ma ọ̀ dị umeala n’obi.

9 Mgbe Pọl na-eje ozi ala ọzọ nke mbụ ya, ya na Banabas gara n’obodo Listra. Ndị Likeonia bi ebe ahụ weere ha ka chi ma kpọwa ha aha chi ha bụ́ Zus na Hemis. Ihe a ò mere ka isi buwe Pọl na Banabas? Hà weere ya na ha enwerela onwe ha ugbu a ná mkpagbu a kpagburu ha n’obodo abụọ ikpeazụ ha gara kwusaa ozi ọma? Hà chere na otú a ndị mmadụ si na-esogharị ha ga-eme ka ọtụtụ ndị gee ntị n’ozi ọma? Mbanụ. Ha were iwe, dọwaa uwe ha ma maba n’etiti ìgwè mmadụ ahụ, na-eti mkpu, sị: “Gịnị mere unu ji eme ihe ndị a? Anyị onwe anyị kwa bụ mmadụ ndị nwere otu ụdị adịghị ike ndị unu nwere.”​—⁠Ọrụ 14:​8-15.

10. Olee ihe mere Pọl na Banabas ewereghị ya na ha ka ndị Likeonia?

10 Mgbe Pọl na Banabas kwuru na ha bụ ndị na-ezughị okè, ihe ha na-ekwu abụghị na otú ha si efe ofufe na otú ndị ahụ na-efe chi ụgha si efe ofufe bụ otu. Chineke họpụtara ha ka ha jeere ya ozi ka ndị ozi ala ọzọ. (Ọrụ 13:⁠2) O jikwa mmụọ nsọ ya tee ha mmanụ meekwa ka ha nwee olileanya ịga eluigwe. Ma, ihe ndị a niile abụghị ihe ga-eme ka isi buwe ha. Ha ghọtara na ndị Likeonia nwekwara ike inwe ụdị olileanya a ha nwere ma ọ bụrụ na ha egee ntị n’ozi ọma.

11. Olee otú anyị nwere ike isi eṅomi Pọl n’ịdị umeala n’obi mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma?

11 Olee otú anyị ga-esi eṅomi Pọl n’ịdị umeala n’obi? Nke mbụ, anyị kwesịrị izere ịnara otuto ma ọ bụ ịchọ ka e too anyị maka ihe ndị Jehova nyeere anyị aka ime n’ozi ya. Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịkwara ịjụ onwe ya, sị: ‘Olee otú m si were ndị m na-ezi ozi ọma? Ò nwere agbụrụ ma ọ bụ obodo m kpọrọ asị n’amaghị ama?’ N’ụwa niile, Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ka ha chọpụta asụsụ ndị bi n’ókèala ha na-asụ. Ha chọrọ inyere ọtụtụ mmadụ aka ka ha nụ ozi ọma. Mgbe ụfọdụ, ha na-agbalị ịmụ asụsụ ma ọ bụ omenala obodo ndị mmadụ na-eleda anya. Ma, ha anatụdịghị eche na ha ka ndị ha na-ezi ozi ọma mma. Kama, ha na-agbalị ịghọta onye nke ọ bụla nke ọma ka ha nwee ike ime ka ozi ọma Alaeze ruo ya n’obi.

NA-AKPỌ NDỊ ỌZỌ AHA N’EKPERE GỊ

12. Olee otú Epafras si gosi na ya anaghị eche naanị gbasara onwe ya?

12 Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi bụ ịna-etinye ụmụnna anyị n’ekpere, bụ́ ‘ndị nataworo okwukwe nke bụ́ ihe ùgwù anyị na ha nwere n’ụzọ há nhata.’ (2 Pita 1:⁠1) Epafras mere otú ahụ. Baịbụl kpọrọ ya aha naanị ugboro atọ. Ọ bụ n’akwụkwọ ozi ndị Pọl dere ka a kpọrọ ya aha. Mgbe a tụrụ Pọl mkpọrọ n’ụlọ ya dị na Rom, o degaara Ndị Kraịst bi na Kọlọsi akwụkwọ ozi, gwa ha na Epafras ‘na-adọgbu onwe ya n’ọrụ mgbe niile n’ekpere ya n’ihi ọdịmma ha.’ (Kọl. 4:12) Epafras maruru ụmụnna ya ala. Ihe banyere ha na-emetụkwa ya n’obi. N’agbanyeghị na ọ bụ “onye mkpọrọ ibe” Pọl, o meghị ka ọ ghara ịma nsogbu ndị ọzọ nọ na ya. (Faị. 23) O mekwara ihe gbasara ya. Ọ̀ bụ na nke a egosighị na ọ naghị eche naanị gbasara onwe ya? Itinye ụmụnna anyị n’ekpere na-akpa ezigbo ike, nke ka nke, ma anyị na-akpọ ha aha.​—⁠2 Kọr. 1:11; Jems 5:⁠16.

13. Olee otú i nwere ike isi eme ka Epafras ma ị na-ekpe ekpere?

13 Chee gbasara ndị i nwere ike ịkpọ aha ma ị na-ekpe ekpere. Ọtụtụ ụmụnna anyị na-etinye ụmụnna nọ n’ọgbakọ ha n’ekpere otú ahụ Epafras mere. Ndị ọzọ ha na-etinyekwa n’ekpere bụ ezinụlọ ndị nwere ọtụtụ nsogbu ha na ha na-alụ, ndị ọnwụnwa kpụ ọkụ n’ọnụ bịaara ma ọ bụ ndị nwere ihe ndị dị ezigbo mkpa ha ga-ekpebi. E nwere ụmụnna ndị a kpọrọ aha ha n’isiokwu bụ́ “Ebe Ndị A Tụrụ Ndịàmà Jehova Mkpọrọ n’Ihi Ihe Ha Kweere,” nke dị na jw.org. Ọtụtụ ụmụnna na-etinyekwa ha n’ekpere. (Gaa n’ebe e dere AKỤKỌ pịa ebe e dere OKWU IKPE.) Ndị ọzọ anyị kwesịkwara ịna-etinye n’ekpere anyị bụ ndị mmadụ nwụnahụrụ, ndị ọdachi dakwasịrị, ndị a na-alụ agha n’obodo ha, nakwa ndị ihe na-esiri ike. O doro anya na e nwere ọtụtụ ụmụnna anyị kwesịrị itinye n’ekpere anyị. Ekpere anyị ga-abakwara ha uru. Ọ bụrụ na anyị ana-etinye ha n’ekpere, ọ na-egosi na anyị anaghị achọ ihe ga-abara naanị onwe anyị uru, kama, ihe ga-abara ndị ọzọ uru. (Fil. 2:⁠4) Jehova na-aza ụdị ekpere a.

“NA-ANỤ IHE NGWA NGWA”

14. Olee ihe Jehova mere nke gosiri na ọ bụ ya kacha ege ntị?

14 Otú ọzọ anyị ga-esi egosi na anyị dị umeala n’obi bụ ma anyị dị njikere ige ndị ọzọ ntị nke ọma. Jems 1:19 kwuru na anyị kwesịrị ịbụ ndị “na-anụ ihe ngwa ngwa.” Jehova mere ihe anyị kwesịrị iṅomi ma a bịa n’ige ndị ọzọ ntị. (Jen. 18:32; Jọsh. 10:14) Chegodị ihe anyị ga-amụta ná mkparịta ụka Jehova na Mozis nwere, nke e dere n’Ọpụpụ 32:​11-14. (Gụọ ya.) Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mkpa ka Mozis kwuo uche ya tupu Jehova emee ihe ọ chọrọ ime, o gere ya ntị ma nye ya ohere ikwu otú ọ dị ya n’obi. Olee mmadụ ga-emedali obi gee onye na-emejọ ihe ntị ma mee ihe o kwuru? Jehova na-ege ntị mgbe ndị ohu ya ji okwukwe na-ekpe ekpere.

15. Olee otú anyị ga-esi ṅomie Jehova n’ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù?

15 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịjụ onwe ya, sị: ‘Ọ bụrụ na Jehova nwere ike iweda onwe ya ala gee ndị mmadụ ntị otú ahụ o gere Ebreham, Rechel, Mozis, Jọshụa, Manoa, Ịlaịja, na Hezekaya, ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ịna-akwanyekwuru ụmụnna m ùgwù, gee ntị n’ihe bara uru ha na-ekwu, ma mee ihe ndị ha kwuru? È nwere onye nọ n’ọgbakọ anyị ma ọ bụ n’ezinụlọ m m kwesịrị iwepụta oge gee ntị? Olee ihe m ga-eme banyere ya? Olee otú m ga-esi eme ya?’​—⁠Jen. 30:6; Ikpe 13:9; 1 Eze 17:22; 2 Ihe 30:⁠20.

‘MA ELEGHỊ ANYA, JEHOVA GA-EJI ANYA YA HỤ’ NSOGBU M

Devid kwuru, sị: “Hapụnụ ya.” Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16 na nke 17)

16. Olee ihe Devid mere mgbe Shimiaị kpasuru ya iwe?

16 Ịdị umeala n’obi na-enyere anyị aka ijide onwe anyị ma a kpasuo anyị iwe. (Efe. 4:⁠2) Ihe a kọrọ na 2 Samuel 16:​5-13 gosiri na ọ bụ eziokwu. (Gụọ ya.) Devid na ndị na-ejere ya ozi diri mkparị Shimiaị onye ikwu Eze Sọl kparịrị ha nakwa nkume ọ tụrụ ha. Devid diri ya n’agbanyeghị na o nwere ike ịkwụsị ya. Olee otú Devid si gbalịa jide onwe ya? Ihe e dere n’Abụ Ọma nke atọ ga-enyere anyị aka ịchọpụta ya.

17. Gịnị nyeere Devid aka ijide onwe ya? Olee otú anyị nwere ike isi eṅomi ya?

17 Okwu mmeghe Abụ Ọma nke atọ gosiri na Devid dere ya “mgbe ọ na-agba ọsọ n’ihi Absalọm nwa ya.” Amaokwu nke mbụ na nke abụọ dabara n’ihe e kwuru na Samuel nke Abụọ isi iri na isii. Abụ Ọma 3:4 kwuru ihe mere obi ji sie Devid ike. Ọ sịrị: “M ga-eji olu m kpọkuo Jehova, ọ ga-esikwa n’ugwu nsọ ya za m.” Anyịnwa kwesịkwara ikpe ekpere ma mmadụ mee anyị ihe ọjọọ. Anyị mee otú ahụ, Jehova ga-enye anyị mmụọ nsọ ya ga-enyere anyị aka idi ya. Ọ bụrụ na mmadụ emee gị ihe ọjọọ, ì nwere ike ijide onwe gị ma ọ bụ gbaghara onye ahụ? Obi ò siri gị ike na Jehova hụrụ ihe ahụ e mere gị, nakwa na ọ ga-agọzi gị?

“AMAMIHE BỤ ISI”

18. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na-eme ihe Chineke kwuru?

18 Ime ihe anyị ma na o ziri ezi na-eme ka Jehova gọzie anyị. Ka a sịkwa ihe mere Ilu 4:7 ji kwuo na “amamihe bụ isi.” Ọ bụ eziokwu na ihe ọmụma na-eme ka anyị nwee amamihe, ma ihe na-egosi na anyị nwere amamihe abụghị naanị ịghọta ihe. Mkpebi ndị anyị na-eme na-egosikwa na anyị nwere amamihe. Ụmụ ahụhụ na-egosi na ha nwedịrị amamihe. Otú ha si egosi ya bụ na ha na-akwadebe nri ha n’oge ọkọchị. (Ilu 30:​24, 25) Kraịst, onye a kpọrọ “amamihe nke Chineke,” mere ihe dị Nna ya mma mgbe niile. (1 Kọr. 1:24; Jọn 8:29) Chineke ma ihe dị iche na mmadụ ịhọrọ ihe dị mma ọ ga-eme na ime ihe ahụ eme. Ọ na-agọzi ndị dị umeala n’obi, bụ́ ndị na-enwe ndidi, na-emekwa ihe ha ma na o ziri ezi. (Gụọ Matiu 7:​21-23.) N’ihi ya, ka anyị na-agba mbọ na-eme ka o kwe onye ukwu na onye nta n’ọgbakọ omume ịdị umeala n’obi ma na-efe Jehova. Ime ihe ndị anyị ma na ha bụ ihe ziri ezi na-ewe oge, na-achọkwa ka anyị na-enwe ndidi. Ma, ime otú ahụ na-egosi na anyị dị umeala n’obi. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ ugbu a, nakwa ruo mgbe ebighị ebi.