Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-akụzi Eziokwu

Na-akụzi Eziokwu

“Jehova, . . . okwu gị dum bụ eziokwu.”—ỌMA 119:159, 160.

ABỤ: 29, 53

1, 2. (a) Olee ọrụ kacha mkpa ná ndụ Jizọs, n’ihi gịnịkwa? (b) Ebe anyị bụ “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ,” gịnị ka anyị kwesịrị ime ka anyị nwee ike ịna-eme nke ọma n’ozi ọma?

JIZỌS KRAỊST bụ ọkwá nkà nakwa onye ozizi. (Mak 6:3; Jọn 13:13) Ọrụ abụọ a doro ya anya nke ọma. Ebe ọ bụ ọkwá nkà, ọ mụtara otú e si eji ngwá ọrụ ya arụ ọrụ, nakwa otú e si eji osisi rụpụta ihe ndị ga-abara ndị mmadụ uru. Ebe ọ bụkwa onye ozizi ma mara Okwu Chineke nke ọma, o ji ihe ndị ahụ ọ ma nyere ndị mmadụ aka ka ha ghọta eziokwu dị n’Okwu Chineke. (Mat. 7:28; Luk 24:32, 45) Mgbe Jizọs gbara afọ iri atọ, ọ hapụrụ ọrụ ọkwá nkà ya, n’ihi na ọ ma na izi ndị mmadụ ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa. O kwuru na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke bụ otu n’ime ihe mere Chineke ji zite ya n’ụwa. (Mat. 20:28; Luk 3:23; 4:43) Jizọs mere ka ikwusa ozi ọma bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ ya. Ọ chọkwara ka ndị ọzọ soro ya na-eme otú ahụ.—Mat. 9:35-38.

2 O nwere ike ịbụ na anyị abụghị ndị ọkwá nkà, ma o doro anya na anyị na-ekwusa ozi ọma. Ọrụ ahụ dị ezigbo mkpa nke na Chineke sokwa na-arụ ya. A kpọrọ anyị “ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ.” (1 Kọr. 3:9; 2 Kọr. 6:4) Anyị ma na “okwu [Jehova] dum bụ eziokwu.” (Ọma 119:159, 160) Ọ bụ ya mere anyị ga-eji hụ na anyị “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi” n’ozi anyị. (Gụọ 2 Timoti 2:15.) N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-agba mbọ na-eme ka otú anyị si eji Baịbụl akụzi ihe na-akakwu mma, n’ihi na Baịbụl bụ ngwá ọrụ bụ́ isi anyị ji na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Jehova, Jizọs nakwa Alaeze Chineke. Ka anyị nwee ike ịna-eme nke ọma n’ozi anyị, nzukọ Jehova enyela anyị ngwá ọrụ ndị ọzọ dị mkpa. Anyị kwesịrị ịma otú e si eji ha ezi ozi ọma. Ihe anyị na-akpọ ha bụ Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe.

3. N’obere oge a fọrọnụ anyị ga-eji ezi ozi ọma, olee ihe anyị kwesịrị ilekwasị anya na ya? Olee otú Ọrụ Ndịozi 13:48 ga-esi enyere anyị aka ime otú ahụ?

3 I nwere ike na-eche ihe mere e ji akpọ ya Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe kama ịkpọ ya Ihe Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma. Ọ bụ n’ihi na ihe ‘ikwusa” pụtara bụ izi mmadụ ozi. Ma “ịkụzi ihe” pụtara ịkọwa ozi ahụ ị na-ezi mmadụ ka o nwee ike ịghọta ihe ọ nụrụ, ma mee ihe ọ mụtara n’ozi ahụ. N’obere oge a fọrọnụ anyị ga-eji ezi ozi ọma, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl na ịkụziri ha eziokwu. Nke a pụtara na anyị ga-eji ịnụ ọkụ n’obi na-achọ “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ma nyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Gụọ Ọrụ Ndịozi 13:44-48.

4. Olee otú anyị ga-esi amata “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi”? Oleekwanụ otú anyị ga-esi achọta ha?

4 Olee otú anyị ga-esi ama “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi”? Naanị otú anyị nwere ike isi ama ha bụ izi ha ozi ọma otú ahụ Ndị Kraịst oge mbụ mere. N’ihi ya, anyị kwesịrị ime ihe a Jizọs kwuru. Ọ sịrị: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu banyere, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya.” (Mat. 10:11) Anyị anaghị atụ anya ka ndị na-achọghị ịmụta eziokwu, ndị mpako, ma ọ bụ ndị ihe gbasara Chineke na-anaghị amasị gee ntị n’ozi ọma. Anyị na-achọ ndị chọrọ ịmụta eziokwu, ndị dị umeala n’obi, na ndị agụụ eziokwu na-agụ. Anyị nwere ike iji ịchọ ndị mmadụ tụnyere ihe o yiri ka Jizọs mere mgbe ahụ ọ bụ ọkwá nkà. Ọ na-ebu ụzọ chọta ezigbo osisi tupu ya arụọ oche, ibo ụzọ, yok, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ. Ọ chọtachaa ezigbo osisi, ya ewerezie ngwá ọrụ ya na nkà ya rụọ ihe ọ chọrọ ịrụ. N’ihi ya, ihe anyị ga-ebu ụzọ eme taa bụ ịchọta ndị chọrọ ịmụta eziokwu, anyị chọtachaa ha, anyị ewerezie ngwá ọrụ na nkà anyị nyere ha aka ka ha bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Mat. 28:19, 20.

5. Olee ihe anyị kwesịrị ịma gbasara ngwá ọrụ ndị dị n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe? Nye ihe atụ. (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)

5 Ngwá ọrụ nke ọ bụla nwere uru ọ bara. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere ngwá ọrụ ọkwá nkà ndị Jizọs ji rụọ ọrụ. * Ọ ga-enwe ngwá ọrụ ndị ọ ga-eji atụ osisi, aka ya ihe, akwọbi ya, akpọpu ya, eme ka osisi hara nhata, nakwa nke ọ ga-eji akụkọta ha ọnụ. Otú ahụ ka ọ dịkwa Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe. Nke ọ bụla n’ime ya nwere uru ọ bara. N’ihi ya, ka anyị chọpụta otú anyị nwere ike isi jiri ngwá ọrụ ndị a dị mkpa e nyere anyị kụziere ndị mmadụ ihe.

IHE NDỊ ANYỊ JI EME KA NDỊ MMADỤ MATA ANYỊ

6, 7. (a) Olee otú i sirila jiri kaadị jw.org mee ka ndị mmadụ mata anyị? (b) Olee ihe abụọ anyị na-eji akwụkwọ ịkpọ òkù ọmụmụ ihe eme?

6 Kaadị JW.ORG. Ha bụ obere kaadị anyị ji eme ka ndị mmadụ mata anyị, na-ejikwa ha eme ka ndị mmadụ mata jw.org, bụ́ ebe ha nwere ike ịmatakwu anyị ma ọ bụdị kwuo ka anyị mụwara ha Baịbụl. Ihe karịrị narị puku mmadụ anọ ekwuola na jw.org ka a mụwara ha Baịbụl. Kwa ụbọchị, ọtụtụ narị mmadụ na-ekwukwa ka a mụwara ha Baịbụl. I nwere ike ijide kaadị ole na ole ma jiri ya na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ma ohere ya dapụta.

7 Akwụkwọ Ịkpọ Òkù Ọmụmụ Ihe. E nwere ihe abụọ a na-eji akwụkwọ a eme. Ihe e dere na ya kwuru, sị: “Bịa soro Ndịàmà Jehova mụwa Baịbụl.” Akwụkwọ a kwuru na i nwere ike ịmụ Baịbụl ma ị bịa ‘ọmụmụ ihe anyị’ “ma ọ bụ mmadụ abịa ka gị na ya mụwa Baịbụl.” Akwụkwọ ịkpọ òkù a na-eme ka ndị mmadụ mata anyị, na-emekwa ka “ndị maara mkpa ime mmụọ ha” soro anyị mụwa Baịbụl. (Mat. 5:3) Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na-anabata ndị mmadụ n’ọmụmụ ihe anyị, ma hà kwere ka anyị na ha na-amụ Baịbụl ma ọ bụ na ha ekweghị. Ọ bụrụ na ha abịa, ha ga-amụta ọtụtụ ihe na Baịbụl.

8. Gịnị mere o ji dị mkpa ka ndị mmadụ bịa ọmụmụ ihe anyị, ọ bụrụgodị otu ugboro? Nye ihe atụ.

8 Ọ dị mkpa ka anyị na-akpọ ndị mmadụ òkù ka ha na-abịa ọmụmụ ihe anyị, ọ bụrụgodị otu ugboro ka ha ga-abịa. N’ihi gịnị? N’ihi na ha bịa, ha ga-achọpụta na Ndịàmà Jehova na-akụzi eziokwu dị na Baịbụl ma na-enyere ndị mmadụ aka ka ha mata Chineke, ma okpukpe ụgha anaghị eme otú ahụ. (Aịza. 65:13) Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye bi n’Amerịka aha ha bụ Ray na Linda, chọpụtara ihe a ihe dị ka ọtụtụ afọ gara aga. Ha kweere na Chineke ma chọọ ka ha matakwuo ya. N’ihi ya, ha kpebiri na ha ga-aga chọọchị niile e nwere n’obodo ha ma chọpụta ihe abụọ tupu ha ahọrọ nke ha ga-aga. Ihe mbụ ha kwuru ha ga-eji amata nke ha ga-aga bụ na ha ga-amụta ihe na ya. Ihe nke abụọ bụ na ndị chọọchị ahụ ga-eji ejiji ndị sịrị na ha na-efe Chineke kwesịrị ịna-eji. O were ha ọtụtụ afọ ịgacha chọọchị ndị ahụ e nwere n’obodo ha, n’ihi na ha dị ọtụtụ. Ma, ha enwetaghị ihe ha chọrọ. E nweghị otu mkpụrụ ihe ha mụtara, ndị na-aga chọọchị ndị ahụ na-eji ejiji na-adịghị mma. Mgbe ha gachara chọọchị nke ikpeazụ, Linda gawara ọrụ, Ray alawakwanụ ụlọ. Mgbe Ray nya ụgbọala ya na-ala, ọ hụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, ya agwa onwe ya, sị: ‘Ka m banye hụ ihe ha na-eme ebe ahụ.’ Ma mgbe ọ banyere, ọ hụrụ ihe dị ezigbo iche. Obi na-atọ ndị niile nọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ụtọ, ha jikwa ejiji dị mma. Ray nọ ọdụ n’ihu oche, ihe ọ mụtara tọkwara ya ụtọ. Ihe a dị ka ihe Pọl onyeozi kwuru banyere otu nwoke bịara ọmụmụ ihe Ndị Kraịst na nke mbụ ya ma kwuo, sị: “N’ezie, Chineke nọ n’etiti unu.” (1 Kọr. 14:23-25) Si mgbe ahụ gawa, Ray na-abịa ọmụmụ ihe na Sọnde niile. O mechakwara bịawa ọmụmụ ihe etiti izu. Linda bịawakwara ọmụmụ ihe. N’agbanyeghị na ha dị afọ iri asaa na ụma, ha malitere ịmụ Baịbụl, e meekwa ha baptizim.

IHE NDỊ ANYỊ NA NDỊ MMADỤ JI AMALITE MKPARỊTA ỤKA

9, 10. (a) Olee ihe mere iji traktị ndị ahụ ezi ozi ọma ji dị mfe? (b) Kọwaa otú e si enyefe mmadụ traktị bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

9 Traktị. Anyị nwere traktị asatọ n’ihe anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. Ha na-adị mfe anyị na ndị mmadụ iji ha amalite mkparịta ụka nke ọma. Kemgbe afọ 2013 a malitere ibipụta ha, e bipụtala ihe dị ka ijeri ise. Ihe mere ha ji magbuo onwe ha bụ na ị mụta otú e si enyefe otu, i nwere ike inyefe ha niile n’ihi na ọ bụ otu ụzọ ka e si enyefe ha. Olee otú i nwere ike isi jiri traktị mee ka gị na mmadụ malite mkparịta ụka?

10 Were ya na ị chọrọ inyefe mmadụ traktị a bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Olee ihe ị ga-eme? Gosi onye ahụ ajụjụ dị n’ihu ya ma jụọ ya, sị: “Ì chetụla echiche ihe Alaeze Chineke bụ? Ị̀ ga-asị na ọ bụ . . . ?” Gwazie onye ahụ ka ọ họrọ otu n’ime azịza atọ dị ebe ahụ. Kama ikwu ma ọ zatara ya ma ọ bụ na ọ zataghị ya, sapee ebe e dere “Gịnị ka Baịbụl Kwuru?” ma gụọrọ ya Daniel 2:44 na Aịzaya 9:6 e dere ebe ahụ. Mgbe gị na ya kwuchara, gaa n’isiokwu bụ́ “Ihe Ị Ga-echebara Echiche,” nke dị n’azụ traktị a ma jụọ ya ajụjụ bụ́: “Olee otú ihe ga-adị ma Alaeze Chineke chịwa ụwa a?” I nwere ike ịza ajụjụ a mgbe ọzọ gị na ya ga-ekwurịta okwu. Mgbe ọzọ ị bịara, i nwere ike igosi ya isiokwu nke asaa nke broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! O so n’akwụkwọ anyị ji amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl.

IHE NDỊ ANYỊ JI EME KA NDỊ MMADỤ NWEE MMASỊ

11. Olee ihe e bu n’obi na-ebipụta magazin anyị? Olee ihe anyị kwesịrị ịma banyere ha?

11 Magazin. Ụlọ Nche na Teta! bụ magazin a kacha ebipụta ma na-asụgharị n’ụwa niile. N’ihi na ndị mmadụ ná mba niile na-agụ magazin ndi a, e dere isiokwu ndị na-agba n’ihu ha otú ha ga-amasị ndị mmadụ n’ebe niile. Anyị kwesịrị iji ha na-enyere ndị mmadụ aka ka ha lekwasị anya n’ihe kacha mkpa ná ndụ taa. Ma, ka anyị nwee ike inyefe ha ndị kwesịrị ịgụ ha, ọ dị mkpa ka anyị mata ndị e bu n’obi dee nke ọ bụla.

12. (a) Olee ndị e bu n’obi bipụta Teta!? Olee ihe mere e ji na-ebipụta ya? (b) Olee otú i sirila jiri Teta! nyere mmadụ aka n’oge na-adịbeghị anya?

12 Ndị e bu n’obi na-ebipụta Teta! bụ ndị matụ ma ọ bụ ndị na-amaghị ihe Baịbụl na-akụzi. O nwere ike ya abụrụ na o nweghị ihe ọ bụla ha ma Ndịàmà Jehova na-akụzi, nweekwa ike ịbụ na ihe a na-eme n’okpukpe agwụla ha ike. Ha nwekwara ike ịbụ ndị na-amaghị na Baịbụl nwere ike ịbara mmadụ uru n’oge a. Ihe bụ́ isi Teta! na-akụziri ndị mmadụ bụ na Chineke dị adị. (Rom 1:20; Hib. 11:6) Ihe ọzọ bụ na ọ na-enyere ndị na-agụ ya aka ikweta na Baịbụl bụ “n’eziokwu . . . okwu Chineke.” (1 Tesa. 2:13) Isiokwu gbara n’ihu Teta! atọ n’afọ 2018 bụ: “Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ,” “Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ,” na “Ihe Ga-enyere Ndị Na-eru Uju Aka.”

13. (a) Olee ndị e bu n’obi bipụta Ụlọ Nche ọhaneze? (b) Olee otú i sirila jiri Ụlọ Nche ọhaneze nyere mmadụ aka n’oge na-adịbeghị anya?

13 Ndị e bu n’obi na-ebipụta Ụlọ Nche nke ọhaneze bụ ndị kweere na Chineke nakwa na Baịbụl. O nwere ike ịbụ na ha ma ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru, ma ha anaghị aghọtacha ihe ọ na-akụzi. (Rom 10:2; 1 Tim. 2:3, 4) N’afọ 2018, e bipụtara Ụlọ Nche ọhaneze atọ, isiokwu gbara n’ihu ha zara ajụjụ ndị a: “Baịbụl Ọ̀ Ka Bara Uru Taa?,” “Olee Otú Ihe Ga-adị n’Ọdịnihu?,” na “Ihe Banyere Gị Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

IHE NDỊ NA-EME KA NDỊ MMADỤ NWEE MMASỊ ỊMỤ BAỊBỤL

14. (a) Olee uru vidio anọ so n’Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe bara? (b) Olee otú i sirila jiri vidio ndị ahụ nyere mmadụ aka n’oge na-adịbeghị anya?

14 Vidio. N’oge Jizọs, ngwá ọrụ ọkwá nkà ndị na-eji ọkụ eletrik arụ ọrụ adịghị. Ma n’oge anyị a, ndị ọkwá nkà na-eji ngwá ọrụ ji ọkụ eletrik arụ ọrụ na-arụ ọrụ ha. Ngwá ọrụ ndị ahụ bụ mma e ji akwọ osisi, ihe e ji agbapu osisi, ihe e ji akpụcha osisi, ihe e ji akụ ntu, nakwa ọtụtụ ndị ọzọ. E wezụga akwụkwọ anyị ndị e bipụtara ebipụta, anyị nwekwara vidio ndị mara mma anyị na-egosi ndị mmadụ. Anọ n’ime ha so n’ihe ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ Baịbụl. Ha bụ, Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?, Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?, Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?, na Olee Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ? N’ime vidio anọ a, nke ọ bụla na-eruchaghị nkeji abụọ na-adị mma iji zie mmadụ ozi ọma na nke mbụ ya. Anyị nwere ike igosi ndị nletaghachi anyị ndị nke na-ewe oge ma ọ bụ anyị egosi ha ndị nwere oge buru ibu ha ga-eji ele ha. Ngwá ọrụ ndị a magburu onwe ha nwere ike ime ka ndị mmadụ nwee mmasị ịmụ Baịbụl nakwa ịbịa ọmụmụ ihe anyị.

15. Nye ihe atụ uru ndị mmadụ nwere ike irite ma ha lee vidio anyị n’asụsụ ha.

15 Dị ka ihe atụ, otu nwanna nwaanyị hụrụ otu nwaanyị si Maịkronishia, onye na-asụ asụsụ Yapiz. Nwanna nwaanyị a gosiri ya vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? n’asụsụ Yapiz. Mgbe vidio a malitere, nwaanyị a sịrị: “Ihe a bụ asụsụ m. Ihe a ọ̀ bụ ná nrọ? Otú o si ekwu okwu gosiri na mụ na ya si otu ebe. Ọ na-asụ asụsụ m.” Mgbe o lechara vidio a, o kwuru na ya ga-agụ akwụkwọ anyị niile dị n’asụsụ ya na jw.org, leekwa vidio niile dị ebe ahụ. (Tụlee Ọrụ Ndịozi 2:8, 11.) Ihe atụ ọzọ bụ banyere nwanna nwaanyị bi n’Amerịka, onye nwa nwanne ya nwoke bi ná mba ọzọ. O zigaara nwa nwanne ya a ihe ga-ebuga ya na jw.org, bụ́ ebe ọ ga-ele vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? n’asụsụ ya. Nwa nwanne ya a lere vidio ahụ ma zigara ya ozi iimel, sị: “Ebe kwuru na e nwere onye ọjọọ na-achị ụwa a masịrị m karịchaa. M kwuru ka a bịa mụwara m Baịbụl.” O bi ná mba machibidoro ọrụ anyị iwu.

IHE NDỊ ANYỊ JI AKỤZIRI NDỊ MMADỤ EZIOKWU

16. Kọwaa ihe e bu n’obi bipụta brọshọ ndị a: (a) Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. (b) Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! (ch) Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa?

16 Broshọ. Olee otú i nwere ike isi kụziere mmadụ ihe ma ọ bụrụ na onye ahụ amachaghị otú e si agụ ihe ma ọ bụ na o nweghị akwụkwọ anyị n’asụsụ ya? Anyị nwere ihe ị ga-eji eme ya. Ọ bụ broshọ bụ́ Gee Chineke Ntị Ka I Wee Dị Ndụ Ebighị Ebi. * Ngwá ọrụ magburu onwe ya anyị na-eji amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl bụ broshọ bụ́ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke! I nwere ike igosi mmadụ isiokwu iri na anọ dị n’azụ brọshọ a ma jụọ ya nke kacha amasị ya. O gosichaa gị ya, gị na ya malite ịmụ ya. Ì meela ụdị ihe a mgbe ị gara nletaghachi? Brọshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? bụ brọshọ nke atọ so n’ihe ndị anyị ji akụziri ndị mmadụ ihe. Ihe e bu n’obi bipụta ya bụ ka anyị jiri ya mee ka ndị anyị na-amụrụ ihe mata gbasara nzukọ Jehova. Ka i nwee ike ịmụta otú ị ga-esi jiri ya na-enyere ndị ị na-amụrụ Baịbụl aka mgbe ọ bụla gị na ha na-amụ ihe, gụọ Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ nke Mach, 2017.

17. (a) Olee ihe e bu n’obi kpọmkwem bipụta akwụkwọ ndị anyị ji amụrụ ndị mmadụ Baịbụl? (b) Olee ihe ndị niile a na-aga ime baptizim kwesịrị ime? N’ihi gịnị?

17 Akwụkwọ. Ọ bụrụ na gị na mmadụ ji brọshọ malite ịmụ Baịbụl, unu mụtụ ya, unu nwere ike mụwa akwụkwọ bụ́ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Akwụkwọ a ga-eme ka onye ahụ mụtakwuo ihe ndị na-ataghị akpụ Baịbụl na-akụzi. Unu mụchaa ya, ya abụrụkwa na onye ahụ na-eme nke ọma, unu mụwa akwụkwọ Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke. Akwụkwọ a ga-akụziri ya otú ọ ga-esi eme ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl n’ihe ndị ọ na-eme kwa ụbọchị. Cheta na e kwesịrị ịna-amụrụ ndị ọhụrụ e mere baptizim ihe ruo mgbe ha mụchara akwụkwọ abụọ a. Nke a ga-enyere ha aka mee ka okwukwe ha sie ezigbo ike.—Gụọ Ndị Kọlọsi 2:6, 7.

18. (a) Ebe anyị bụ ndị na-akụzi eziokwu, olee ihe 1 Timoti 4:16 chọrọ ka anyị na-eme? Olee uru ọ bara? (b) Olee ihe kwesịrị ịbụ mkpa anyị mgbe anyị na-eji Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe na-akụzi ihe?

18 Ebe anyị bụ Ndịàmà Jehova, Jehova nyere anyị ọrụ ‘ikwusa eziokwu nke ozi ọma ahụ,’ bụ́ nke ga-eme ka ndị mmadụ nweta ndụ ebighị ebi. (Kọl. 1:5; gụọ 1 Timoti 4:16.) Ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ a, e nyela anyị Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe, nke nwere ihe ndị dị anyị mkpa anyị ga-eji akụzi ihe. (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Ihe Ndị Anyị Ji Akụziri Ndị Mmadụ Ihe.”) Ka anyị gbaa mbọ were ha zie ozi ọma nke ọma otú anyị nwere ike. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-ekpebi nke ọ ga-eji ezi ozi ọma nakwa mgbe ọ ga-eji ya ezi ozi ọma. Cheta na ihe bụ́ mkpa anyị abụghị naanị inyefe ndị mmadụ akwụkwọ, ọ bụghịkwanụ inye ndị na-enweghị mmasị akwụkwọ anyị. Kama, ọ bụ ime ka ndị chọrọ ịmụta eziokwu, ndị dị umeala n’obi, na ndị chọrọ ịmata Chineke, ya bụ, “ndị niile nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi,” bụrụ ndị na-eso ụzọ Jizọs.—Ọrụ 13:48; Mat. 28:19, 20.

^ para. 5 Gụọ isiokwu bụ́ “Ọkwá Nkà” na igbe isiokwu ya bụ́ “Igbe Ọrụ Ọkwá Nkà.” Ha gbara n’Ụlọ Nche Ọgọst 1, 2010.

^ para. 16 Ọ bụrụ na onye ị na-amụrụ ihe amaghị otú e si agụ ihe, gwa ya ka ọ na-ele anya na brọshọ Gee Chineke Ntị, ebe ọ bụ na o nwere ọtụtụ foto.