Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤKỌ NDỤ

Jehova Gọziri Mkpebi M Mere nke Ukwuu

Jehova Gọziri Mkpebi M Mere nke Ukwuu

Chi abọwala mgbe anyị tinyechara traktị n’okpuru ibo ụzọ ndị dị n’ụlọ ndị ikpeazụ anyị gara ozi ọma. Ihe a mere n’afọ 1939. Anyị hapụrụ ụlọ n’etiti abalị, jiri ụgbọala gbaa ihe karịrị otu awa ruo n’obere obodo a na-akpọ Jọplin nke dị n’ebe ndịda Mizuri, n’Amerịka. Ozugbo anyị ji nwayọọ gachaa ozi anyị, anyị banyere n’ụgbọala anyị gaa n’ebe anyị kwuru na anyị ga-ezukọ chere ka ụmụnna ndị ọzọ anyị na ha so pụta. Ma, gịnị mere anyị ji gaa ozi ọma n’isi ụtụtụ ahụ ma hapụ ebe ahụ ngwa ngwa. M ga-akọrọ gị ma e mechaa.

OBI dị m ụtọ na ndị mụrụ m bụ Ndịàmà Jehova. Aha nna m bụ Fred Molohan, aha mama m abụrụ Edna. Ha ji Okwu Chineke zụọ m. Ha bụ Ndị Mmụta Baịbụl (ma ọ bụ Ndịàmà Jehova) kemgbe afọ iri abụọ tupu a mụọ m n’afọ 1934. Anyị bi n’obere obodo a na-akpọ Pasọn nke dị n’ebe ndịda Kansas. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mmadụ niile nọ n’ọgbakọ anyị bụ ndị e tere mmanụ. Anyị na-ejechi ozi ọma na ọmụmụ ihe anya. Anyị na-eji ehihie Satọdee aga ozi ọma okporo ámá. Ihe a na-akpọ ya ugbu a bụ ikwusa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị. Mgbe ụfọdụ, ike na-agwụ anyị, ma papa m na-enyekarị anyị aịs krim ma anyị mechie.

Obere ọgbakọ anyị nwere ọtụtụ ebe anyị na-ezi ozi ọma, ma ọtụtụ obere obodo nakwa ugbo ndị dị n’obodo ndị dị nso. Anyị nye ndị na-akọ ugbo ebe ahụ akwụkwọ, ha na-enye anyị akwụkwọ nri na àkwá ndị ọkụkọ ha ka yiri, ma ọ bụkwanụ ha anwụnye anyị ọkụkọ. Ebe ọ bụ na papa m ebula ụzọ nye onyinye maka akwụkwọ ndị ahụ, anyị na-ewerezi nri ndị ahụ gaa rie.

OTÚ ANYỊ SI ZIE OZI ỌMA

Papa m na mama m zụrụ gramafon anyị ji aga ozi ọma. Anaghị m akpọli ya n’ihi na m ka dị obere, ma obi na-atọ m ụtọ inyere ha aka ma ha na-akpọrọ ndị ha na-amụrụ ihe na ndị ha na-agara nletaghachi okwu ihu ọha Nwanna Rutherford kwuru e tinyere na teepụ.

Ebe mụ na papa m na mama m nọ n’ihu ụgbọala anyị a rụnyere ígwè okwu

Papa m rụnyere ígwè okwu n’ụgbọala anyị ka anyị nwee ike iji ya na-aga ozi ọma. Ụgbọala a nyeere anyị ezigbo aka ikwusa ozi ọma Alaeze. Anyị na-ebu ụzọ akpọnye egwú ka ndị mmadụ nwee mmasị. Obere oge, anyị akpọnye okwu ihu ọha si na Baịbụl e tinyere na teepụ. Okwu ahụ kpọchaa, anyị enye ndị nwere mmasị akwụkwọ.

Mgbe anyị gara n’obere obodo aha ya bụ Kerival dị na Kansas, ndị uwe ojii gwara papa m na ha agaghị ekwe ya buru ụgbọala ahụ bata n’ebe ọhanaeze na-anọkarị ezu ike n’ụbọchị Sọnde. Ma ha gwara ya dọwa ya n’èzí. N’ihi ya, papa m dọwara ụgbọala ya n’okporo ámá dị nso ebe ahụ ma chee ya ihu n’ebe ahụ ọhanaeze na-anọkarị ka ha nwee ike ịna-anụ okwu ihu ọha ahụ e tinyere na teepụ. Ọ na-atọgbu m atọgbu iso papa m na nwanne m nwoke nke tọrọ m aga ụdị ozi ọma a.

Tupu afọ 1940, anyị si n’ụzọ pụrụ iche zie ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-emegide anyị. Anyị na-ebili n’isi ụtụtụ (otú ahụ anyị mere na Jọplin dị na Mizuri) ma jiri nwayọọ tinye traktị ma ọ bụ akwụkwọ n’okpuru ibo ụzọ ndị mmadụ. Anyị mechaa, anyị agaa n’ebe anyị na-ezukọ n’ebe dị nso n’obodo ahụ ka anyị mara ma è nwere ndị ndị uwe ojii nwụchiri.

N’afọ ndị ahụ, ụzọ ọzọ anyị si zie ozi ọma bụ ịgagharị ebe niile na-agbasara ndị mmadụ ozi. Ka anyị nwee ike ikwusa ozi ọma Alaeze, anyị na-eyi obodobo akwụkwọ e ji ekwusa ozi ọma ma kwụrụ n’ahịrị na-agagharị n’obodo. Echetara m mgbe anyị gara ụdị ozi ọma a n’obodo anyị. Ụmụnna kwụ n’ahịrị ma yiri obodobo akwụkwọ e dere “Okpukpe Bụ Ọnyà na Ihe Aghụghọ” na-agagharị. Ha ji ụkwụ gaa ihe karịrị otu kilomita na ọkara n’obodo ahụ, mechaa laghachi n’ụlọ anyị. Obi dị anyị ụtọ na e nweghị onye nyere ha nsogbu, kama e nwere ọtụtụ ndị nọ na-achọ ịma ihe na-emenụ.

MGBAKỌ NDỊ ANYỊ GARA N’OGE M DỊ OBERE

Ezinụlọ anyị na-esi Kansas aga mgbakọ na Teksas. Papa m na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè. N’ihi ya, anyị na-abanye ụgbọ okporo ígwè n’akwụghị ụgwọ gaa mgbakọ, letakwa ndị ikwu anyị. Nwanne mama m nke nwoke tọrọ ya aha ya bụ Fred Wismar na Eulalie nwunye ya bi na Tempụl, dị na Teksas. Nwanne mama m a mụtara eziokwu mgbe afọ 1900 gachara, mee baptizim ma kụziere ụmụnne ya ihe ndị ọ mụtara, mama m sokwa na ha. Ụmụnna ndị bi n’ebe kacha mepee emepee na Teksas ma ya nke ọma n’ihi na o jeela ozi ebe ahụ ka onye nlekọta zoonu (a na-akpọ ya onye nlekọta sekit ugbu a). Ọ dị obiọma, na-enwekwa obi ụtọ, obi na-atọkwa m ụtọ mụ na ya ịnọ. O ji ọgbakọ kpọrọ ihe. M mụtakwara ọtụtụ ihe n’aka ya mgbe m ka na-eto eto.

N’afọ 1941, anyị ji ụgbọ okporo ígwè gaa mgbakọ ukwu na Sent Luiz dị na Mizuri. A gwara ụmụaka bịara mgbakọ ahụ ka ha bịa nọrọ ọdụ n’ebe pụrụ iche e debeere ha n’ala mgbakọ ahụ ka ha nwee ike ịnụ okwu Nwanna Rutherford ga-ekwu. Isiokwu okwu ahụ bụ “Ụmụ Eze.” Mgbe Nwanna Rutherford kwuchara, ọ tụrụ anyị n’anya na ya na ndị na-enyere ya aka nyere anyị akwụkwọ ọhụrụ aha ya bụ Children. Ụmụaka karịrị puku iri na ise nwetara akwụkwọ a.

N’ọnwa Eprel afọ 1943, anyị gara mgbakọ na Kọfevil dị na Kansas. Isiokwu ya bụ “Òkù Ime Ihe.” A mara ọkwa ná mgbakọ ahụ na ọgbakọ niile ga-amalite inwe ụlọ akwụkwọ ọhụrụ a na-akpọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. E nyekwara anyị akwụkwọ nwere isi iri ise na abụọ a ga-eji na-eduzi ụlọ akwụkwọ a. M mere ihe omume mbụ m n’afọ ahụ. Mgbakọ ahụ pụụrụ m iche n’ihi na e mere mụ na mmadụ ole na ole ndị ọzọ baptizim ná mmiri jụrụ ezigbo oyi e nwere n’ugbo dị nso ebe ahụ.

M CHỌRỌ IJE OZI NA BETEL

M gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị n’afọ 1951 ma kpebie ihe m ga-achọ iji ndụ m eme. Nwanne m nwoke aha ya bụ Jerry jere ozi na Betel. M chọkwara ije ozi na Betel, n’ihi ya, m dejupụtara akwụkwọ ma ziga ya n’ọfis anyị dị na Bruklin. N’oge na-adịghị anya, a kpọrọ m ka m bịa jewe ozi na Betel. M bidoro ije ozi ebe ahụ n’abalị iri n’ọnwa Mach afọ 1952. Mkpebi a m mere baara m ezigbo uru n’ihi na o mere ka m jiri ndụ m niile jeere Chineke ozi.

M bu n’obi na m ga-arụwa ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ ka m nwee ike soro na-ebipụta magazin na akwụkwọ anyị ndị ọzọ. Ma ọrụ e nyere m bụ ibunye ndị mmadụ nri n’oge nri, e mechaakwa gwa m ka m rụwa n’ebe a na-esi nri. Ọrụ a tọrọ m ụtọ, m mụtakwara ọtụtụ ihe na ya. O nwedịghị mgbe m rụrụ ọrụ n’ebe a na-ebi akwụkwọ. Ma, otú e si haziere anyị ọrụ baara m uru n’ihi na o mere ka m nwee oge m ji amụ ihe n’ehihie n’ọ́bá akwụkwọ dị na Betel. O mekwara ka mụ na Chineke dịrị ná mma, okwukwe m esiekwa ike. O mere ka m kpebisie ike na m ga na-ejere Jehova ozi na Betel otú m nwere ike. Nwanne m Jerry pụrụ na Betel n’afọ 1949 ma lụọ Patricia, ma ha bi n’ebe dị nso na Bruklin. Ha nyeere m ezigbo aka ma gbaa m ume mgbe ahụ m ka bịara ọhụrụ na Betel.

Obere oge m bịara Betel, a malitere ịchọ ndị na-eje ozi na Betel ha ga-etinye aha ha n’ebe a na-etinye aha ndị ga na-aga n’ọgbakọ ndị ọzọ ekwu okwu ihu ọha. Ụmụnna ndị aha ha dị ebe ahụ ga-aga n’ebe na-agaghị akarị narị kilomita atọ na iri abụọ na abụọ ma e si na Bruklin gawa ya. Ha ga-ekwu okwu ihu ọha, sorokwa ọgbakọ ahụ jee ozi ọma. Eso m n’ụmụnna ndị a họọrọ. Eji m ụjọ gaa kwuo okwu ihu ọha mbụ m n’ọgbakọ, nke na-ewe otu awa n’oge ahụ. M na-ejikarị ụgbọ okporo ígwè aga ọgbakọ ndị e kenyere m. M na-echeta ihe mere n’otu ehihie Sọnde n’oge oyi nke afọ 1954. M banyere n’ụgbọ okporo ígwè na-aga Niu Yọk, m tụkwara anya na m ga-abata Betel ná mgbede. Ma, oké ifufe fere, snoo adaakwa. Njin ụgbọ okporo ígwè anyị kwụsịrị ịrụ ọrụ. M mechara rute Niu Yọk Siti n’elekere ise nke ụtụtụ Mọnde. M si n’ụzọ ụgbọ okporo ígwè na-agba n’okpuru ala laghachi Betel bido ịrụ ọrụ ozugbo n’ebe anyị na-esi nri. Abịachaghị m n’oge, ike gwụkwara m n’ihi na ehighị m ụra n’abalị. Ma, ihe ndị a niile e nweghị ihe ha bụ ma e jiri ha tụnyere obi ụtọ m nwere n’ijere ụmụnna m ozi nakwa ná ndị enyi ọhụrụ m metere ná ngwụsị izu ndị ahụ pụrụ iche m ji jee ozi.

Ebe anyị na-akwado ime ihe omume n’ụlọ ọrụ redio anyị bụ́ WBBR

N’afọ ole na ole m malitere ije ozi na Betel, a kpọrọ m ka m soro ná ndị na-eme ihe omume n’ụlọ ọrụ redio anyị a na-akpọ WBBR. Ebe ụlọ ọrụ a dị bụ n’okpukpu nke abụọ nke ụlọ elu anyị dị na 124 Kolọmbịa Haịts. M so ná ndị na-eme ihe omume n’ọmụmụ Baịbụl a na-agbasara ọhaneze kwa izu. Nwanna A. H. Macmillan, bụ́ onye jerela ozi na Betel ọtụtụ afọ, so ná ndị na-eme ihe omume a na-eme n’ụlọ ọrụ redio anyị ahụ. Anyị na-akpọ ya Nwanna Mac. Anyịnwa bụ́ ndị na-eto eto na Betel n’oge ahụ mụtara ọtụtụ ihe n’aka ya n’ihi na o ji obi ya niile na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu ndị bịaara ya.

Anyị na-enye ndị mmadụ akwụkwọ anyị ji akpọsa ihe anyị na-eme na redio anyị n’ozi ọma, ka ha nwee ike inwe mmasị

N’afọ 1958, a gbanweere m ọrụ. M malitere inyere ndị gụchara akwụkwọ n’Ụlọ Akwụkwọ Gilied aka. M na-enyere ha aka inweta akwụkwọ ikike e ji agafe mba ọzọ, haziekwa otú ha ga-esi gaa ebe e zigara ha. Iji ụgbọelu eme njem dị ezigbo ọnụ n’oge ahụ, n’ihi ya, ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha na-eji ụgbọelu aga ebe e zigara ha. Ọtụtụ ndị e zigara Afrịka na Eshia ji ụgbọ mmiri gaa. Mgbe ọtụtụ afọ gachara, ụgwọ ụgbọelu bịara daa, ya emee ka ọtụtụ ndị ozi ala ọzọ jiri ụgbọelu na-aga ebe e zigara ha.

Ebe m na-edokọta asambodo ụmụ akwụkwọ Gilied tupu ụbọchị ha ga-agụcha akwụkwọ

ỊGA MGBAKỌ

E nyekwuru m ọrụ n’afọ 1960. Ọrụ ahụ bụ ịchọta ụgbọelu ga-ebu ụmụnna si n’Amerịka gaa mgbakọ mba niile e nwere na Yurop n’afọ 1961. M so ụgbọelu a si na Niu Yọk gaa mgbakọ ahụ na Hambọg dị na Jamanị. Mgbe e mechiri mgbakọ ahụ, mụ na ụmụnna atọ ndị ọzọ si Betel kwụrụ ụgwọ ụgbọala anyị ji si Jamanị gaa Ịtali leta alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Rom. Anyị si ebe ahụ gaa Frans, gbafee ugwu Pireniis banye Spen, bụ́ ebe a machibidoro ozi anyị iwu. Anyị nyere ụmụnna anyị nọ na Baselona ụfọdụ akwụkwọ anyị. Anyị fụchiri ya ka onyinye a chọrọ inye mmadụ. Obi tọrọ anyị ezigbo ụtọ ịhụ ha. Anyị si ebe ahụ gaa Amstadam, bụ́ ebe anyị banyere ụgbọelu na-aga Niu Yọk.

N’afọ 1962, e nyekwuru m ọrụ ịhazi otú ndị ga-aga mgbakọ mba niile a ga-enwe n’ebe dị iche iche n’ụwa ga-esi aga ya. Ọ bụ mgbakọ e nwere n’afọ 1963 isiokwu ya bụ “Ozi Ọma Ebighị Ebi.” E mere ndokwa ka ụmụnna narị ise na iri asatọ na atọ gaa mgbakọ ahụ a ga-enwe na Yurop, Eshia, na Ebe Ndịda Pasifik. Ha ga-agakwa Honolulu dị na Hawaị nakwa Pasadena dị na Kalịfọnịa. Ha ga-agakwa ilegharị anya na Lebanọn na Jọdan, bụ́ ebe ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl. Ngalaba anyị na Betel mere ndokwa maka ụgbọelu na ebe ndị ahụ ga-aga mgbakọ ahụ ga-ebi, nwetakwara ha akwụkwọ ikike.

ONYE ỌHỤRỤ MỤ NA YA SOZI EJE OZI

E nwere ihe ọzọ mere afọ 1963 ji bụrụ afọ pụrụ iche ná ndụ m. N’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Jun, m lụrụ Lila Rogers, onye Mizuri. O jeela ozi na Betel afọ atọ tupu mgbe ahụ. Mgbe otu izu anyị gbara akwụkwọ gachara, mụ na ya so gaa legharịa anya n’ebe dị iche iche n’ụwa. Anyị gara Gris, Ijipt na Lebanọn. Anyị banyere ụgbọelu si Beirut gaa n’obere ọdụ ụgbọelu dị na Jọdan. A machibidoro ọrụ anyị iwu n’obodo ahụ, a gwakwara anyị na a naghị enye Ndịàmà Jehova akwụkwọ ikike ịbanye obodo ahụ. N’ihi ya, anyị amaghị ihe ga-eme ma anyị rute ebe ahụ. Obi tọgburu anyị atọgbu, ya ejukwa anyị anya na mgbe anyị rutere, anyị hụrụ ìgwè mmadụ guzo n’ọdụ ụgbọelu ahụ. Ha ji ihe e dere “Ndịàmà Jehova Nnọọnụ”! Obi dịkwa anyị ezigbo ụtọ na anyị gara n’obodo ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl, jiri anya anyị hụ ebe Ebreham, Aịzik na Jekọb biri, hụkwa ebe Jizọs na ndịozi ya kwusara ozi ọma, nakwa ebe Iso Ụzọ Kraịst si gbasaa “ruo nsọtụ ụwa.”—Ọrụ 13:47.

Kemgbe afọ iri ise na ise ugbu a, nwunye m Lila anọgidela na-enyere m aka n’ozi niile anyị jere. Anyị gara Spen na Pọtugal ọtụtụ ugboro n’oge ndị a machibidoro ọrụ anyị iwu ná mba ndị a. Anyị gara gbaa ụmụnna anyị nọ ebe ahụ ume, wegakwara ha akwụkwọ anyị na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Anyị gakwara leta ụmụnna anyị ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ na Kadiz dị na Spen. Obi bụ m sọ aṅụrị na m ji Baịbụl gwa ha okwu gbara ha ume.

Mgbe anyị na nwanne m Jerry na nwunye ya Patricia na-aga mgbakọ e nwere n’afọ 1969 isiokwu ya bụ “Udo n’Elu Ụwa”

Kemgbe afọ 1963, enyela m aka hazie otú ụmụnna si gaa mgbakọ mba niile e nwere n’Afrịka, Ọstrelia, Kọntinent Etiti na Ndịda Amerịka, Yurop, Ime Ime Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Hawaị, Niu Ziland, na Pueto Riko. Mụ na nwunye m agaala mgbakọ ndị anyị na-agaghị echefu echefu, ma nke anyị gara na Wọọsọọ dị na Poland n’afọ 1989. Ọtụtụ ụmụnna si Rọshịa bịara mgbakọ ahụ. Nke a bụ mgbakọ mbụ ha. Ọtụtụ ụmụnna ndị anyị hụrụ anọọla n’ụlọ mkpọrọ ndị Sọviet Yuniọn ọtụtụ afọ n’ihi okwukwe ha.

Ịga leta alaka ụlọ ọrụ anyị dị gburugburu ụwa ma gbaa ndị ezinụlọ Betel na ndị ozi ala ọzọ ume na-atọ m ụtọ. Nke ikpeazụ anyị gara bụ nke anyị gara na Saụt Koria. Anyị gara leta ụmụnna iri ise ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Suwọn. Ha adaghị mbà, kama ha na-atụsi anya ike mgbe ha ga-apụta n’ụlọ mkpọrọ jewekwara Jehova ozi. Nleta ahụ anyị gara leta ha gbara anyị ezigbo ume.—Rom 1:11, 12.

MMỤBA A NA-ENWE NA-ENYE ANYỊ ỌṄỤ

Ahụla m otú Jehova si gọzie ndị ya mee ka ha na-amụba kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga. Mgbe e mere m baptizim n’afọ 1943, e nwere ihe dị ka otu narị puku ndị nkwusa. Ma taa, e nwere ndị nkwusa karịrị nde asatọ na-ejere Jehova ozi ná mba narị abụọ na iri anọ. Mbọ dị ukwuu ndị gụrụ akwụkwọ na Gilied gbara so mee ka e nwee mmụba a. Obi dị m ụtọ na mụ na ọtụtụ n’ime ụmụnna ndị a rụkọrọ ọrụ, mụ enyekwara ha aka ịga ebe e zigara ha.

Obi na-atọ m ụtọ na m kpebiri ịga Betel mgbe m na-eto eto, ma si otú ahụ jekwuoro Jehova ozi. Jehova anọgidela na-agọzi m kemgbe ahụ. E wezụga ozi anyị na-eje na Betel, bụ́ nke na-atọ m ụtọ, obi na-atọkwa mụ na nwunye m ụtọ iso ụmụnna anyị nọ n’ọgbakọ dị iche iche na Bruklin aga ozi ọma kemgbe ihe karịrị afọ iri ise ugbu a, anyị emetakwala ọtụtụ ndị enyi.

Nwunye m na-enyere m aka n’ozi m na-eje na Betel kwa ụbọchị. N’agbanyeghị na m karịala afọ iri asatọ na anọ, obi dị m ụtọ na m ka na-arụ ọrụ. M na-enye aka akwadebe ozi alaka ụlọ ọrụ anyị na-ezipụ.

Mụ na Lila taa

Obi dị anyị ụtọ na anyị nọ ná nzukọ Jehova magburu onwe ya ma jiri anya anyị na-ahụ na ihe e kwuru na Malakaị 3:18 bụ eziokwu. Ebe ahụ sịrị: “Unu ga-ahụkwa ọzọ ihe dị iche n’etiti onye ezi omume na onye ajọ omume, n’etiti onye na-ejere Chineke ozi na onye na-adịghị ejere ya ozi.” Kwa ụbọchị, anyị na-ahụ ka ihe na-akakwu njọ n’ụwa Setan, ọtụtụ ndị bi na ya enweghị obi ụtọ ná ndụ, ha enweghịkwa olileanya. Ma, ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya na-enwe obi ụtọ, ma n’oge a ihe tara akpụ, ha nwekwara olileanya na ihe ga-emecha dị mma n’ọdịnihu. Ọ bụ ihe ùgwù na anyị na-ekwusara ndị mmadụ ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 24:14) Anyị na-atụ anya na n’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke ga-ewepụ ụwa ochie a ma weta ụwa ọhụrụ. Ọ ga-emere anyị ihe niile Chineke kwere anyị ná nkwa, ma ime ka ahụ́ gbasie anyị ike, nakwa ịdị ndụ ebighị ebi. Mgbe ahụ, ndị ohu Jehova niile nọ n’ụwa ga-enwe obi ụtọ ruo mgbe ebighị ebi.